Gaa n'Isiokwu

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ndịàmà Jehova

Igbo

Akwụkwọ Mgbaafọ Ndịàmà Jehova nke 2017

 JỌJIA

Arịọrọ M Jehova Ka O Nyere M Aka Ime Mkpebi Dị Mma

Tamazi Biblaia

Arịọrọ M Jehova Ka O Nyere M Aka Ime Mkpebi Dị Mma
  • A MỤRỤ YA N’AFỌ 1954

  • E MERE YA BAPTIZIM N’AFỌ 1982

  • ONYE Ọ BỤ O so na-ebiri anyị akwụkwọ na nzuzo. O sokwa ná ndị nlekọta sekit mbụ e nwere na Jọjia. O ji ụmụ anọ mgbe ahụ.

EZIGBO iwe were mama m mgbe mụ na Tsitso nwunye m ghọrọ Ndịàmà Jehova. Otu ụbọchị, ọ kpọkọtara ndị ikwu anyị niile ka ha gwa anyị okwu. O chere na ha ga-emeli ka anyị ghara ịbụzi Ndịàmà Jehova. Ha gwara m na ọ bụrụ na akwụsịghị m ịbụ Onyeàmà Jehova, na agaghị m abụzi nwa ha.

M kpebiri na m ga-esi n’ụlọ anyị kwapụ. Ebe ọ bụ na ọrụ m bụ ịkpụ ụ́zụ́, m kpebiri na m ga-akwaga n’obodo Kutaịsi, bụ́ obodo nke abụọ kacha buo ibu na Jọjia. Otu n’ime ihe mere m ji chọọ ịkwaga ebe ahụ bụ na ọ bụ ebe m ga-enweta ọrụ ngwa ngwa. Ihe ọzọ abụrụ na a chọkwuru ndị na-ekwusa ozi ọma n’obodo ahụ. N’ihi ya, arịọrọ m Jehova ka o nyere m aka ná mkpebi ndị m mere.

Obere oge ihe a mechara, m hụrụ otu n’ime ndị m na-amụrụ Baịbụl bi n’otu obere obodo a na-akpọ Jivarị. Mgbe ọ nụrụ na m chọrọ ịkwaga Kutaịsi, ọ gwara m ka m bịa biri n’obodo ha. Ọ gwara m, sị: “Anyị nwere ọnụ ụlọ abụọ. Mụ na nwunye m na ụmụ m biri n’otu, gị na nwunye gị ebiri na nke ọzọ.”

 Ebe ọ bụ na m rịọrọ Jehova ka o nyere m aka ná mkpebi ndị m mere, m gwara onye ahụ m na-amụrụ Baịbụl na m ga-abịa biri n’obodo ha ma ọ bụrụ na mụ achọta ọrụ na ebe anyị ga-ebi ozugbo. Ọ tụrụ m n’anya ná mgbede ụbọchị ahụ na ọ bịaghachiri gosi m ụlọ ọrụ ndị chọrọ ndị ọrụ.

Mgbe abalị ole na ole gachara, mụ na ezinụlọ m kwagara Jivarị. N’ụbọchị anyị kwagara ebe ahụ, enwetara m ọrụ a na-akwụ m ezigbo ụgwọ. Onye were m n’ọrụ nyere m ụlọ ná nnukwu ụlọ ụlọ ọrụ anyị nwe. Obere oge anyị kwafechara, ụmụnna gwara m ka a nọrọ n’ụlọ m na-ebi akwụkwọ anyị. Ebe ọ bụ na anyị nwere ohere n’ụlọ anyị, mụ na nwunye m kwetara.

Ọ bụkwa n’ụlọ anyị ka a nọ na-enwe Ncheta Ọnwụ Jizọs na nnọkọ ndị ọzọ ruo ọtụtụ afọ. A nọkwa n’ụlọ m mee ihe karịrị narị mmadụ ise baptizim. Obi dị m ezigbo ụtọ na Jehova nyeere m aka ná mkpebi ndị m mere, nakwa na m mere ihe ọ chọrọ.