Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ndịàmà Jehova

Họrọ asụsụ Igbo

 ISI NKE 39

Eze Mbụ Chịrị Izrel

Eze Mbụ Chịrị Izrel

Jehova nyere ndị Izrel ndị ikpe ka ha na-edu ha, ma ndị Izrel chọrọ eze ga na-achị ha. Ha gwara Samuel, sị: ‘Obodo ndị dị anyị nso nwere ndị eze na-achị ha. Anyị chọkwara eze ga na-achị anyị.’ Samuel ma na ihe a ha kwuru adịghị mma, n’ihi ya o kpere ekpere maka ya. Jehova gwara ya, sị: ‘Ọ bụghị gị ka ha jụrụ. Ọ bụ mụnwa ka ha jụrụ. Gwa ha na ha ga-enwe eze, ma eze ahụ ga-achọ ọtụtụ ihe n’aka ha.’ N’agbanyeghị ihe a a gwara ha, ha sịrị: ‘Anyị achọghị ịma. Ihe anyị chọrọ bụ eze.’

Jehova gwara Samuel na otu nwoke aha ya bụ Sọl ga-abụ eze mbụ ha. Mgbe Sọl gara Rema ka ọ hụ Samuel, o ji mmanụ wụọ Sọl n’isi, si otú ahụ tee ya mmanụ ịbụ eze.

Samuel mechara kpọkọta ndị Izrel ka o gosi ha eze ọhụrụ ha. Ma ha chọrọ Sọl, ha ahụghị ya. Ị̀ ma ihe mere na ha ahụghị ya? Ọ bụ na ọ gara zoo n’ebe a kwasara ihe. Mgbe ha mechara hụ ya, ha kpọpụtara ya ma gwa ya ka o guzoro n’etiti ha. Sọl kacha ndị niile nọ ebe ahụ ogologo, maakwa ezigbo mma. Samuel sịrị ha: ‘Leenụ onye Jehova họọrọ.’ Ndị Izrel gwara eze, sị: ‘Eze, ị ga-adị ndụ!’

Mgbe Eze Sọl malitere ịchị ndị Izrel, ọ na-ege Samuel ntị, na-erubekwara Jehova isi. Ma, o mechara gbanwee. Dị ka ihe atụ, Sọl ekwesịghị ịchụrụ Jehova àjà. Otu ụbọchị, Samuel gwara Sọl ka o chere ka ọ bịa, ma Samuel abịaghị ozugbo. N’ihi ya, Sọl ji aka ya chụọ àjà ahụ. Gịnị ka Samuel mere? Ọ gwara Sọl, sị: ‘I kwesịghị inupụrụ Jehova isi.’ Sọl ọ̀ mụtara ihe n’ihe a o mere?

Mgbe Sọl mechara gaa ịlụso ndị Amalek agha, Samuel gwara ya ka o gbuo ha niile. Ma, Sọl egbughị eze Egag. Jehova gwara Samuel, sị: ‘Sọl ahapụla m, ọ naghịzi ege m ntị.’ Ihe a were Samuel iwe, ya agwa Sọl, sị: ‘N’ihi na ị kwụsịla irubere Jehova  isi, ọ ga-ahọrọ onye ọzọ ka ọ bụrụ eze.’ Mgbe Samuel chọrọ ịla, Sọl jidere ya n’ala ala uwe elu ya, ya adọkapụ. Samuel gwaziri Sọl, sị: ‘Jehova adọkapụla alaeze gị.’ Jehova ga-enye ya onye ga-ahụ ya n’anya ma na-erubere ya isi.

“Irube isi dị mma karịa àjà.”​—1 Samuel 15:22