Gaa n'Isiokwu

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ndịàmà Jehova

Igbo

Ihe Ị Ga-amụta n’Akụkọ Baịbụl

 ISI NKE 33

Rut na Neomi

Rut na Neomi

Mgbe nri kọrọ n’Izrel, otu onye Izrel aha ya bụ Neomi na di ya, nakwa ụmụ ha abụọ kwagara Moab. Di Neomi mechara nwụọ. Ụmụ ya lụrụ Rut na Ọpa. Rut na Ọpa bụ ndị Moab. Ọ dị mwute na ụmụ Neomi mechakwara nwụọ.

Mgbe Neomi nụrụ na nri adịkwala n’Izrel, o kpebiri ịlaghachi Izrel. Rut na Ọpa sokwa ya. Ma, mgbe ha na-ala, Neomi gwara ha, sị: ‘Unu hụrụ ụmụ m n’anya, hụkwa mụnwa n’anya. Achọrọ m ka unu lụgharịa di. Laghachinụ Moab.’ Rut na Ọpa gwara ya, sị: ‘Anyị hụrụ gị n’anya. Anyị achọghị ịhapụ gị.’ Neomi nọ na-agwa ha ka ha lawa. Ọpa mechara lawa, ma Rut ekweghị ala. Neomi gwara Rut, sị: ‘Ọpa alawala ka ọ lakwuru ndị nke unu na chi unu. Soro ya lawa.’ Ma Rut gwara ya, sị: ‘M gaghị ahapụ gị. Ndị gị ga-abụ ndị m, Chineke gị ga-abụkwa Chineke m.’ Olee otú i chere obi dị Neomi mgbe Rut gwara ya ihe a?

Rut na Neomi rutere Izrel n’oge a na-ewe ọka bali n’ubi. Otu ụbọchị, Rut gara ka ọ tụtụkọta ọka n’ubi otu nwoke aha ya bụ Boaz. Boaz bụ nwa Rehab. Boaz nụrụ na Rut bụ onye Moab, nakwa na o kweghị ahapụ Neomi maka na ọ hụrụ ya n’anya. Boaz gwara ndị na-arụrụ ya ọrụ ka ha hapụ ọka ụfọdụ n’ubi ka Rut tụtụkọta ha.

 Na mgbede ụbọchị ahụ, Neomi jụrụ Rut, sị: ‘N’ubi onye ka ị rụrụ ọrụ taa?’ Rut sịrị ya: ‘Ọ bụ n’ubi otu nwoke aha ya bụ Boaz.’ Neomi gwara ya, sị: ‘Boaz bụ otu n’ime ndị ikwu di m. Soro ụmụ agbọghọ ndị ọzọ na-arụ ọrụ n’ubi ya. O nweghị ihe ga-eme gị.’

Rut rụgidere ọrụ n’ubi Boaz ruo mgbe e wechara ihe ubi. Boaz hụrụ na Rut rụsiri ọrụ ike, bụrụkwa ezigbo nwaanyị. N’oge ahụ, ọ bụrụ na nwoke anwụọ n’amụtaghị nwa, otu onye ikwu ya ga-alụ nwunye ya. Ọ bụ ya mere Boaz ji lụọ Rut. Ha mụtara otu nwa nwoke aha ya bụ Obed. Obed mechara bụrụ nna nna Eze Devid. Obi tọrọ ndị enyi Neomi ụtọ maka nwa a Rut mụrụ. Ha gwara Neomi, sị: ‘Jehova bu ụzọ nye gị Rut, onye hụrụ gị n’anya. Ugbu a, i nweela nwa nwa. Ka otuto dịrị Jehova.’

“E nwere enyi nke na-arapara n’ahụ́ karịa nwanne.”—Ilu 18:24

GỤKWUO GBASARA YA

ṄOMIE OKWUKWE HA

Rut—“Ezigbo Nwaanyị”

Olee ihe mere ọlụlụ Rut na Boaz lụrụ ji pụọ iche? Olee ihe anyị nwere ike ịmụta n’aka Rut na Neomi banyere ezinụlọ?

KATUUN NDỊ E SERE ESE E JI AKỤZI BAỊBỤL

Rut Bụ Ezigbo Enyi

Ọ bụ eziokwu na Rut abụghị onye Izrel, Jehova gọziri ya n’ihi otú o si hụ Neomi n’anya.

ṄOMIE OKWUKWE HA

Rut—“Ebe Ị Gara Ka M Ga-aga”

Gịnị mere Rut ji hapụ ndị ezinụlọ ya nakwa obodo ya? Olee àgwà ndị o nwere bụ́ ndị mere ka Jehova hụ ya n’anya?

KAADỊ AKỤKỌ NDỊ DỊ NA BAỊBỤL

Kaadị Akụkọ Rut

Olee ihe mere Rut ji hapụ obodo ya? Bipụta kaadị a ka ị mata ihe kpatara ya.

KAADỊ AKỤKỌ NDỊ DỊ NA BAỊBỤL

Kaadị Akụkọ Baịbụl Neomi

Mgbe di Neomi na ụmụ ya abụọ nwụrụ, ọ gwara ndị enyi ya akpọkwala ya Neomi.

FOTO E JI AKỤZI IHE

Ezigbo Enyi Neomi

Foto a e ji akụzi ihe ga-enyere ụmụaka dị n’agbata afọ atọ na afọ isii aka ịmụta gbasara Rut na Neomi.

FOTO E JI AKỤZI IHE

Mụta Ihe n’Àgwà Ndị Rut Nwere

Foto a e ji akụzi ihe na-enyere ụmụaka dị n’agbata afọ isii na afọ asatọ aka ịmụta otú ha nwere ike isi bụrụ ezigbo enyi.

IHE ỤMỤAKA JI AMỤ IHE

Àgwà Ndị E Ji Mara Ezigbo Enyi

Ihe a e ji amụ ihe ga-enyere ụmụaka dị́ n’agbata afọ asatọ na afọ iri na abụọ aka ka ha nwee àgwà ndị e ji mara ezigbo enyi.