Gaa n'Isiokwu

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ndịàmà Jehova

Igbo

Ihe Ị Ga-amụta n’Akụkọ Baịbụl

 ISI NKE 18

Osisi nke Ọkụ Na-enwu Na Ya

Osisi nke Ọkụ Na-enwu Na Ya

Mozis biri n’obodo Midian afọ iri anọ. Ọ lụrụ nwaanyị, mụọkwa ụmụ. Otu ụbọchị ọ nọ na-elekọta atụrụ ya n’ebe dị nso n’Ugwu Saịnaị, ọ hụrụ ihe dị egwu. Ọkụ nọ na-enwu n’osisi ogwu ma o reghị osisi ogwu ahụ. Mgbe Mozis gara nso ka ọ mara ihe na-emenụ, olu si n’etiti osisi ogwu ahụ kpọọ ya òkù, sị: ‘Mozis! Abịala nso ebe a. Yipụ akpụkpọ ụkwụ gị n’ihi na ebe ahụ i guzo bụ ala nsọ.’ Ọ bụ Jehova si n’ọnụ otu mmụọ ozi ya na-agwa Mozis okwu.

Ụjọ tụwara Mozis, ya ekpuchie ihu ya. Olu ahụ gwara ya, sị: ‘Ahụla m ahụhụ ụmụ Izrel na-ata. M ga-anapụta ha n’aka ndị Ijipt ma kpọba ha n’ala mara mma. Ọ bụ gị ga-esi n’ala Ijipt duru ndị m pụọ.’ Ì chere na ihe a ejughị Mozis anya?

Mozis kwuru, sị: ‘Olee ihe m ga-agwa ndị Izrel ma ha jụọ m onye zitere m?’ Chineke gwara Mozis, sị: ‘Gwa ha na Chineke nke Ebreham, Chineke nke Aịzik, na Chineke nke Jekọb zitere gị.’ Mozis gwaziri Jehova, sị: ‘Ọ bụrụkwanụ na ha egeghị m ntị?’ Jehova gwara Mozis ihe ọ ga-eme ka ha mata na ọ bụ yanwa zitere ya. Jehova gwara ya ka ọ tụpụ mkpara ya n’ala. Mgbe ọ tụpụrụ ya n’ala, ọ ghọrọ agwọ. Mgbe Mozis jidere agwọ ahụ n’ọdụ, ya aghọọ mkpara ọzọ. Jehova sịrị ya: ‘I mee ihe a, ha ga-amata na ọ bụ m zitere gị.’

Mozis kwuru, sị: ‘Amaghị m okwu ekwu.’ Jehova gwara ya, sị: ‘M ga-agwa gị ihe ị ga-ekwu, m ga-ezitekwara gị nwanne gị Erọn ka o nyere gị aka.’ Ihe ndị a Jehova gwara Mozis mere ka ọ ghọta na ọ nọnyeere ya. Ọ kpọọrọ ụmụ ya na nwunye ya laghachi Ijipt.

“Unu echegbula onwe unu banyere otú unu ga-esi ekwu okwu ma ọ bụ ihe unu ga-ekwu; n’ihi na a ga-enye unu ihe unu ga-ekwu n’oge awa ahụ.”​—Matiu 10:19