Gaa n'Isiokwu

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ndịàmà Jehova

Igbo

Ihe Ị Ga-amụta n’Akụkọ Baịbụl

 ISI NKE 9

Ebreham na Sera Emechaa Mụta Nwa.

Ebreham na Sera Emechaa Mụta Nwa.

Ebreham na Sera alụọla kemgbe ọtụtụ afọ. Ha hapụrụ ọmarịcha ụlọ ha na Ọọ, gaa biri n’ụlọikwuu. Ma, Sera emeghị mkpesa ọ bụla n’ihi na ọ tụkwasịrị Jehova obi.

Sera chọsiri nwa ike nke na ọ gwara Ebreham, sị: ‘Ọ bụrụ na Hega, onye na-ejere m ozi amụta nwa, m ga-ewere ya ka nwa m.’ Ka oge na-aga, Hega mụtara nwa nwoke. Aha ya bụ Ishmel.

Mgbe ọtụtụ afọ gachara, n’oge Ebreham dị afọ iri itoolu na itoolu, nwunye ya Sera adịrịkwa afọ iri asatọ na itoolu, ndị ọbịa atọ bịara na nke ha. Ebreham gwara ha ka ha bịa zurutụ ike n’okpuru osisi dị ebe ahụ ma soro ha rie nri. Ị̀ ma ndị ndị ọbịa ahụ bụ? Ha bụ ndị mmụọ ozi. Ha gwara Ebreham, sị: ‘N’ụdị oge a n’afọ ọzọ, gị na nwunye gị Sera ga-amụ nwa nwoke.’ Ma, Sera nọ n’ụlọikwuu na-ege ihe ha na-ekwu. Ọ chịrị ọchị n’obi ya, sị: ‘M̀ ga-amụli nwa ebe ọ bụ na mụ emeela agadi?’

N’afọ ọzọ ya, Sera mụrụ nwa nwoke otú ahụ mmụọ ozi Jehova kwuru. Ebreham gụrụ ya Aịzik, nke pụtara “Ọchị.”

 Mgbe Aịzik dị ihe dị ka afọ ise, Sera hụrụ ka Ishmel ji Aịzik na-eme ihe ọchị. Ọ chọrọ ichebe nwa ya nwoke. N’ihi ya, ọ gara gwa Ebreham ka ọ chụpụ Hega na nwa ya Ishmel. Ná mmalite, Ebreham achọghị ime ihe a nwunye ya gwara ya. Ma Jehova chọkwara ichebe Aịzik, n’ihi ya, ọ gwara Ebreham, sị: ‘Gee Sera ntị. M ga-elekọta Ishmel. Ma, m ga-esi n’aka Aịzik mezuo nkwa ahụ m kwere gị.’

“Ọ bụkwa okwukwe ka Sera ji nweta ike ịtụrụ ime mkpụrụ nke afọ, . . . ebe o weere onye ahụ nke kwere nkwa n’onye kwesịrị ntụkwasị obi.”​—Ndị Hibru 11:11