Gaa n'Isiokwu

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ndịàmà Jehova

Igbo

Ihe Ị Ga-amụta n’Akụkọ Baịbụl

 ISI NKE 102

Ọhụụ Ndị E Gosiri Jọn

Ọhụụ Ndị E Gosiri Jọn

Mgbe Jọn onyeozi nọ n’ụlọ mkpọrọ n’agwaetiti Patmọs, Jizọs gosiri ya ọhụụ iri na isii gbasara ihe ndị ga-eme n’ọdịnihu. Ọhụụ ndị ahụ gosiri otú a ga-esi doo aha Jehova nsọ, otú Alaeze ya ga-esi bịa, nakwa otú uche ya ga-esi mee n’ụwa a otú o si eme n’eluigwe.

N’otu n’ime ọhụụ ndị ahụ, Jọn hụrụ Jehova ebe ọ nọ n’ocheeze ya dị ebube n’eluigwe. Ndị okenye iri abụọ na anọ gbakwara ya gburugburu. Ha yi ákwà ọcha, kpurukwa okpueze ọlaedo n’isi. Àmụ̀mà si n’ocheeze ahụ na-egbu, égbè eluigwe esikwa na ya na-agba. Ndị okenye iri abụọ na anọ ahụ na-akpọrọ Jehova isiala, na-efekwa ya. N’ọhụụ ọzọ, Jọn hụrụ oké igwe mmadụ ndị si ná mba niile, ndị niile, na asụsụ niile ka ha na-efe Jehova. Jizọs bụ́ Nwa Atụrụ ahụ na-elekọta ha, durukwa ha gaa ná mmiri nke ndụ. Mgbe e mechara, ọ hụrụ ọhụụ ọzọ ebe Jizọs ghọrọ Eze n’eluigwe, ndị okenye iri abụọ na anọ esorokwa ya na-achị. N’ọhụụ ọzọkwa, Jọn hụrụ ka Jizọs na-alụso ndị mmụọ ọjọọ na dragọn ahụ, ya bụ Setan, agha. Jizọs si n’eluigwe chụda ha n’ụwa.

 N’ọhụụ ọzọ, Jọn hụrụ ebe Nwa Atụrụ ahụ na otu narị puku na iri puku anọ na puku anọ guzo n’Ugwu Zayọn. Ọ hụkwara ka otu mmụọ ozi na-efegharị n’ụwa ma na-agwa ndị mmadụ ka ha tụọ egwu Chineke ma nye Ya otuto.

Ọ hụkwara ọhụụ ọzọ ebe a na-alụ agha Amagedọn. N’agha ahụ, Jizọs na ndị agha ya meriri Setan na ndị niile na-akwado ya. N’ọhụụ nke ikpeazụ, Jọn hụrụ na udo dị ma n’eluigwe ma n’elu ụwa. E bibiela Setan ya na ndị niile so ya na-enupụrụ Chineke isi. Ndị niile nọ n’eluigwe na n’ụwa ana-edo aha Jehova nsọ ma na-efe naanị ya.

“M ga-emekwa ka iro dịrị n’etiti gị na nwaanyị ahụ nakwa n’etiti mkpụrụ gị na mkpụrụ ya. Ọ ga-egwepịa gị isi, ị ga-emerụkwa ya ahụ́ n’ikiri ụkwụ.”—Jenesis 3:15

GỤKWUO GBASARA YA

JIZỌS BỤ ỤZỌ, EZIOKWU, NA NDỤ

Jizọs Emee Ka Ụwa Ghọọ Paradaịs ma Rụchaa Ọrụ Chineke Nyere Ya

Jizọs ka nwere ọtụtụ ihe ndị ọ ga-eme tupu ya enyefee Chineke bụ́ Nna ya Alaeze.