Gaa n'Isiokwu

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ndịàmà Jehova

Igbo

Ihe Ị Ga-amụta n’Akụkọ Baịbụl

Ihe A Na-aga Ịkọ ná Nkebi nke 13

Ihe A Na-aga Ịkọ ná Nkebi nke 13

Jizọs bịara n’ụwa ka o jiri ndụ ya chụọ àjà iji gbapụta ụmụ mmadụ na-ezughị okè. Ọ bụ eziokwu na ọ nwụrụ, o meriri ụwa. Jehova ahapụghị Ọkpara ya n’ili, ọ kpọlitere ya n’ọnwụ. Jizọs dị umeala n’obi. O jeere ndị ọzọ ozi, ma gbaghara ha mgbe ha mejọrọ ihe. Mgbe a kpọlitechara ya n’ọnwụ, ọ pụtara n’ihu ndị na-eso ụzọ ya. Ọ kụziiri ha otú ha ga-esi rụọ ọrụ dị mkpa o nyere ha rụọ. Ọ bụrụ na ị bụ nne ma ọ bụ nna, nyere nwa gị aka ka ọ ghọta na anyị kwesịrị iso rụọ ọrụ a n’oge anyị a.

IN THIS SECTION

ISI NKE 87

Nri Anyasị nke Onyenwe Anyị

Mgbe Jizọs na ndịozi ya na-enwe nri anyasị nke onyenwe anyị, ọ gwara ha ihe ndị dị mkpa ha ga na-eme.

ISI NKE 88

E Jidere Jizọs

Judas kpọ ìgwè mmadụ ji mma agha na osisi bịa n’ogige Getsemeni ka ha jide Jizọs.

ISI NKE 89

Pita Ekwuo na Ya Amaghị Jizọs

Gịnị mere n’ogige ụlọ Keyafas? Olee ihe mere Jizọs n’ime ụlọ Keyafas?

ISI NKE 90

Jizọs Anwụọ na Gọlgọta

Gịnị mere Paịlet ji nye iwu ka e gbuo Jizọs?

ISI NKE 91

A Kpọlitere Jizọs n’Ọnwụ

Olee ihe ndị dị egwu merenụ mgbe e gbuchara Jizọs?

ISI NKE 92

Jizọs Apụta n’Ihu Ndị Na-egbu Azụ̀

Olee ihe Jizọs mere ka o nwee ike ịgwa ha okwu?

ISI NKE 93

Jizọs Alaghachi Eluigwe

Tupu ya alaghachi n’eluigwe, o nyere ndị na-eso ụzọ ya otu iwu dị mkpa. Ọ kọwakwaara ha ihe ha ghọtahiere.