Gaa n'Isiokwu

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ndịàmà Jehova

Igbo

Ihe Ị Ga-amụta n’Akụkọ Baịbụl

 ISI NKE 80

Jizọs Ahọrọ Ndịozi Iri na Abụọ

Jizọs Ahọrọ Ndịozi Iri na Abụọ

Mgbe Jizọs kwusarala ozi ọma ihe dị ka otu afọ na ọnwa isii, e nwere ihe dị mkpa ọ ga-eme. Ònye na onye ka ọ ga-ahọrọ ga na-eso aga ozi ọma ebe niile? Olee ndị ka ọ ga-azụ ka ha na-elekọta ọgbakọ Ndị Kraịst? Ka Jizọs nwee ike ikpebi ihe ọ ga-eme n’ihe a niile, ọ ga-achọ ka Jehova nyere ya aka. Ọ bụ ya mere o ji gaa n’ugwu ebe ọ ga-anọ naanị ya kpee ekpere abalị dum. N’ụtụtụ echi ya, ọ kpọkọtara ụfọdụ ndị na-eso ụzọ ya si na ha họrọ ndịozi iri na abụọ ya. Ị̀ ma aha ha? Aha ha bụ Pita, Andru, Jems, Jọn, Filip, Batọlọmiu, Tọmọs, Matiu, Jems nwa Alfiọs, Tadiọs, Saịmọn, na Judas Iskarịọt.

Andru, Pita, Filip, Jems

Mmadụ iri na abụọ a ga na-eso ya aga ebe ọ bụla ọ na-aga. Ọ kụziiri ha otú e si ezi ozi ọma ma zipụ ha ka ha kwusawa ozi ọma. Jehova nyere ha mmụọ nsọ ya ka ha chụpụ ndị mmụọ ọjọọ, nakwa ka ha gwọọ ndị mmadụ ọrịa.

Jọn, Matiu, Batọlọmiu, Tọmọs

Jizọs kpọrọ ndịozi iri na abụọ ahụ ndị enyi ya, ọ tụkwasịkwara ha obi. Ndị Farisii lere ha anya ka ndị na-agụghị oké akwụkwọ  na ndị nkịtị. Ma, Jizọs kụziiri ha otú ha ga-esi na-ekwusa ozi ọma. Ha na ya ga-anọ n’oge ndị kacha mkpa ná ndụ ya, ya bụ, tupu e gbuo ya, nakwa mgbe a kpọlitechara ya n’ọnwụ. Ọtụtụ n’ime ndịozi iri na abụọ ahụ bụ ndị Galili, otú ahụ Jizọs bụkwa. Ụfọdụ n’ime ha lụkwara nwaanyị.

Jems nwa Alfiọs, Judas Iskarịọt, Tadiọs, Saịmọn

Ndịozi ahụ ezughị okè, n’ihi ya, e nwere mgbe ha mere ihe na-adịghị mma, nweekwa oge ha kwuru okwu n’echeghị echiche. E nwekwara mgbe ha mere mkpebi ndị na-adịghị mma. Mgbe ụfọdụ, ha mere ihe ndị gosiri na ha enweghị ndidi. E nwekwara mgbe ha sere okwu banyere onye ka ibe ya ukwuu. Ma, ha hụrụ Jehova n’anya, bụrụkwa ezigbo mmadụ. Ọ bụzi ha ga na-elekọta ọgbakọ Ndị Kraịst mgbe Jizọs laghachiri eluigwe.

“Ana m akpọ unu ndị enyi m, n’ihi na ihe niile m nụrụ n’ọnụ Nna m ka m mere ka unu mara.”​—⁠Jọn 15:15