N’ihe dị ka ọnwa Eprel nke afọ 30, Jizọs gara Jeruselem. Ọtụtụ mmadụ bịakwara Jeruselem maka Ememme Ngabiga. Ha ji anụmanụ chụọ àjà n’ụlọ nsọ n’ihi na ọ bụ otu n’ime ihe ndị a na-eme n’ememme a. Ụfọdụ ndị ji anụmanụ nke ha bịa, ndị ọzọ zụrụ nke ha na Jeruselem.

Mgbe Jizọs banyere n’ụlọ nsọ, ọ hụrụ ndị na-ere anụmanụ n’ebe ahụ. Ha nọ n’ụlọ a rụrụ maka ịnọ na-efe Jehova, na-akpa ego. Olee ihe Jizọs mere mgbe ọ hụrụ ha? O ji eriri mee ụtarị ma were ya chụpụ atụrụ na ehi niile nọ ebe ahụ. Ọ wụfukwara mkpụrụ ego  nke ndị na-agbanwe ego ma kpuo tebụl ha ihu. Ọ gwara ndị na-ere nduru, sị: ‘Wepụnụ ihe ndị a n’ebe a. Unu emezila ka ụlọ Nna m bụrụ ụlọ ahịa.’

Ihe ahụ Jizọs mere juru ndị nọ n’ụlọ nsọ ahụ anya. Ndị na-eso ụzọ ya chetara amụma e buru na Baịbụl gbasara Mezaya. Ọ sịrị: ‘M ga-ekworo ụlọ Jehova ezigbo ekworo.’

Ná ngwụcha afọ 33, Jizọs mere ka ụlọ nsọ dị ọcha nke ugboro abụọ ya. Ọ chọghị ka onye ọ bụla jiri ụlọ Nna ya na-eme ihe na-ekwesịghị ekwesị.

“Unu apụghị ịbụ ndị ohu Chineke na nke Akụnụba.”​—Luk 16:13