Gaa n'Isiokwu

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ndịàmà Jehova

Igbo

Ihe Ị Ga-amụta n’Akụkọ Baịbụl

 ISI NKE 85

Jizọs Agwọọ Mmadụ n’Ụbọchị Izu Ike

Jizọs Agwọọ Mmadụ n’Ụbọchị Izu Ike

Ndị Farisii kpọrọ Jizọs asị ma na-achọ ihe ha ga-eji maka ya jide ya. Ha kwuru na o kwesịghị ịgwọ mmadụ n’Ụbọchị Izu Ike. N’otu Ụbọchị Izu Ike, Jizọs hụrụ otu nwoke kpuru ìsì ka ọ na-arịọ arịrịọ. Ọ gwara ndị na-eso ụzọ ya, sị: ‘Unu ga-ahụ otú m ga-esi eji ike Chineke gwọọ nwoke a.’ Jizọs ji ọnụ mmiri ya gwọọ ụrọ, ma tee nwoke ahụ n’anya. Jizọs gwara ya, sị: ‘Gaa saa anya gị n’ọdọ mmiri Siloam.’ Nwoke ahụ mere ihe a Jizọs gwara ya, ma hụwa ụzọ. Nke a bụ nke mbụ ọ na-ahụ ụzọ kemgbe a mụrụ ya.

Ihe a juru ndị mmadụ anya. Ha kwuru, sị: ‘Onye a ọ́ bụghị nwoke ahụ nke na-anọ otu ebe arịọ arịrịọ, ka ọ̀ bụ onye yiri ya?’ Nwoke ahụ gwara ha, sị: ‘Ọ bụ m bụ nwoke ahụ kpuru ìsì kemgbe a mụrụ ya.’ Ha jụrụ ya, sị: ‘Gịnịzi mere i ji ahụ ụzọ?’ Mgbe ọ gwara ha ihe mere o jizi na-ahụ ụzọ, ha kpọọrọ ya gakwuru ndị Farisii.

Nwoke ahụ gwara ndị Farisii, sị: ‘Jizọs ji ụrọ tee m n’anya, sị m gaa saa anya m ná mmiri. M mere ihe ọ gwara m, ugbu a, m na-ahụzi ụzọ.’ Ndị Farisii kwuru, sị: ‘Ọ bụrụ na Jizọs na-agwọ mmadụ n’Ụbọchị Izu Ike, ọ bụghị Chineke nyere ya ikike.’ Ma, ndị ọzọ sịrị: ‘Ọ bụrụ na ọ bụghị Chineke nyere ya ikike, ọ gaghị agwọli mmadụ.’

Ndị Farisii kpọrọ nne na nna nwoke ahụ kpuru ìsì  ma jụọ ha, sị: ‘Olee otú nwa unu si hụwa ụzọ?’ Ụjọ tụrụ ndị mụrụ ya n’ihi na ndị Farisii kwuru na a ga-achụpụ onye ọ bụla kweere na Jizọs n’ụlọ nzukọ. Ha gwara ndị Farisii, sị: ‘Anyị amaghị. Jụọnụ ya.’ Ndị Farisii jụwakwara nwoke ahụ ajụjụ ọzọ, ya asị ha: ‘Agwala m unu ihe niile m ma. Gịnị mere unu ji ka na-ajụ m?’ Ihe a o kwuru were ndị Farisii iwe, ha akwapụ ya n’èzí.

Jizọs gara chọọ nwoke ahụ ma jụọ ya, sị: ‘Ì nwere okwukwe n’ebe Mezaya nọ?’ Nwoke ahụ zara ya, sị: ‘M ga-enwe ma m mata onye ọ bụ.’ Jizọs gwara ya, sị: ‘Ọ bụ m bụ Mezaya ahụ.’ Ihe a Jizọs gwara nwoke a, ò gosighị na Jizọs dị obiọma? Ọ bụghị naanị na Jizọs mere ka nwoke ahụ hụwa ụzọ, kama, o mekwara ka o nwee okwukwe.

“Unu ehiewo ụzọ, n’ihi na unu amaghị Akwụkwọ Nsọ, unu amaghịkwa ike nke Chineke.”​—⁠Matiu 22:29