Gaa n'Isiokwu

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ndịàmà Jehova

Igbo

Akwụkwọ Mgbaafọ Ndịàmà Jehova nke 2016

Ndị pilgrim so n’ụmụnna ndị ha na Nwanna Russell rụkọrọ ọrụ. Ha jikwa ọrụ ha kpọrọ ihe

Ihe Ndị Mere n’Otu Narị Afọ Gara Aga, Ya Bụ, n’Afọ 1916

Ihe Ndị Mere n’Otu Narị Afọ Gara Aga, Ya Bụ, n’Afọ 1916

NÁ MMALITE afọ 1916, a lụọla agha e mechara kpọwa Agha Ụwa Mbụ ihe karịrị otu afọ. Ndị agha a tarala isi ha n’oge ahụ abụghị ihe e ji ọnụ ekwu.

Ụlọ Nche Bekee January 1, 1916, kwuru, sị: “Agha a emeela ka ọtụtụ ndị kpewere Chineke, meekwa ka ọtụtụ ndị na-echegbu onwe ha maka ọdịnihu.” Ụlọ Nche ahụ gwakwara ụmụnna anyị, sị: ‘Ka anyị jiri ọrụ Chineke nyere anyị na ohere anyị nwere ịrụ ya kpọrọ ihe. Ka a ghara inwe onye ga-ada mbà n’obi, kama, ka anyị niile na-anụrụ Chineke na ozi ya ọkụ n’obi.’

Isiokwu afọ 1916 gbara ụmụnna anyị ume ka ha ‘dị ike n’okwukwe’ otú ahụ Ndị Rom 4:20 kwuru. Ọtụtụ Ndị Mmụta Baịbụl mere ihe a a gwara ha. Jehova gọzikwara ha nke ukwuu.

Ndị Pilgrim Gbara Ụmụnna Ume

Ndị na-anọchite anya Watch Tower Society, bụ́ ndị a na-akpọ ndị pilgrim, na-esi n’otu obodo gaa n’obodo ọzọ na-agba Ndị Mmụta Baịbụl ume ma na-agwa ha ihe ndị ha ga na-eme.  N’afọ 1916, ihe dị ka ndị pilgrim iri isii na itoolu agaala ihe karịrị narị puku kilomita asatọ na puku anọ ebe ha na-arụ ọrụ a.

Mgbe otu onye pilgrim aha ya bụ Walter Thorn na-ekwu okwu ná mgbakọ e nwere na Nọfọlk dị́ na Vejinia, o ji Agha Ụwa Mbụ tụnyere agha Ndị Kraịst na-alụ. Ọ sịrị: “E kwuru na ihe dị ka nde ndị amị iri abụọ ruo iri atọ na-alụ agha ugbu a. . . . Ma, ụwa amaghị na e nwere [ndị agha] ọzọ na-alụ agha. Ha bụ ndị agha Onyenwe anyị. Ha ejighị égbè na mma alụ agha otú ahụ Gidiọn na ndị agha ya na-ejighị ha lụọ. Ha na-alụ agha maka eziokwu na ezi omume. Ha na-alụkwa ezi ọgụ nke okwukwe.”

Ijere Jehova Ozi n’Agbanyeghị Nsogbu Ndị Agha Kpatara

Na Frans, e gburu ma ọ bụ merụọ ihe karịrị otu nde mmadụ ahụ́ ná mgbọ a kwara otu ụbọchị. A kpọrọ ya Agha Mbụ A Lụrụ na Somme. A lụrụ ya n’ihe dị ka ọnwa Julaị afọ 1916. N’ebe ọzọ na Frans, ụmụnna anyị bụ́ ndị na-arụsi ọrụ ike  nyeere ọgbakọ ndị e nwere n’ebe ahụ aka n’agbanyeghị na ọ dịghị mfe n’oge ahụ a na-alụ agha. Ụlọ Nche Bekee January 15, 1916, bipụtara akwụkwọ ozi Onye Mmụta Baịbụl aha ya bụ Joseph Lefèvre dere. Nwanna a gbara ọsọ ndụ n’obodo ya bụ́ Denen nke dị na Frans mgbe ndị agha Jamanị weghaara ya n’afọ 1914. Ọ gbagara na Paris bụ́ nke dị n’ebe ndịda Frans ma malite iso Ndị Mmụta Baịbụl e nwere n’obodo ahụ na-enwe ọmụmụ ihe. N’agbanyeghị na ahụ́ adịchaghị ya, o bu ya na-eduzi ọmụmụ ihe niile.

Ka oge na-aga, Nwanna Theophile Lequime gakwuuru Nwanna Lefèvre. Yanwa sikwa na Denen gbaa ọsọ ndụ. Nwanna Lequime bu ụzọ gaa Ọshel dị na Frans, bụ́ ebe ọ nọ malite ịsụgharị isiokwu ụfọdụ gbara n’Ụlọ Nche ma na-ekesara ha ụmụnna ndị nọ ná mpaghara Frans ndị amị na-abatabeghị. Ma, ndị isi ndị amị chụpụrụ ya n’Ọshel mgbe ha bidoro inyo ihe ọ na-eme enyo. Nwanna Lefèvre weere ọbịbịa a Nwanna Lequime bịara na Paris ka otú Jehova si za ya ekpere.

Jehova gọziri ọrụ ụmụnna ndị a rụrụ na Paris. Nwanna Lefèvre kwuru, sị: “Anyị na-adị ihe dị ka mmadụ iri abụọ na ise n’ọmụmụ ihe . . . Ọtụtụ amatala na ha kwesịrị inyefe Chineke onwe ha. Ha na-emekwa nke ọma n’ofufe Chineke. Ọ fọrọ obere ka ọ bụrụ ndị òtù anyị niile na-abịa ọmụmụ ihe kwa izu.”

Ha Etinyeghị Aka n’Agha

Ka a na-alụ agha ahụ, ụmụnna anyị ekweghị eso alụ ya. Nke a kpataara ọtụtụ n’ime ha nsogbu. Na Briten, gọọmenti tiri iwu nke kwuru na nwoke ọ bụla dị́ n’agbata afọ iri na asatọ na iri anọ ga-abarịrị amị. Ma, ọtụtụ Ndị Mmụta Baịbụl ekweghị aba amị.

Dị ka ihe atụ, Ụlọ Nche Bekee April 15, 1916, bipụtara akwụkwọ ozi nwanna si Skọtland aha ya bụ W. O. Warden dere. Ọ sịrị: “Otu n’ime ụmụ m ndị nwoke dị afọ iri na itoolu ugbu a. O kwebeghịkwa aba amị. O si otú a na-agbara Onyenwe anyị àmà. Ọ bụrụgodị na a ga-agbagbu ya, obi  siri m ike na Jehova ga-enyere ya aka iguzosi ike n’eziokwu na n’ezi omume.”

E kpere otu nwa okorobịa bụ́ onye kọpọtụa aha ya bụ James Frederick Scott ikpe n’ihi na ọ jụrụ ịba amị. Nwa okorobịa a bụ onye Edinbọg, nke dị na Skọtland. Mgbe ụlọikpe kpere ya ikpe nụchara ihe ndị mere na o kweghị aba amị, ha kwuru na Nwanna Scott “esoghị ná ndị iwu kwuru ga-aba amị.” N’ihi ya, ha kpelaara ya ikpe.

Ma, a gụpụghị ọtụtụ ụmụnna anyị ná ndị ga-aba amị. Mgbe ọ na-erula ọnwa Septemba afọ 1916, narị ụmụnna anyị abụọ na iri isii na anọ etinyela akwụkwọ ka a gụpụ ha ná ndị ga-aba amị. E nyere mmadụ iri abụọ na atọ n’ime ha ọrụ na-abụghị ọrụ ndị amị. Ụlọ Nche Bekee October 15, 1916, sịrị na “e nyere ndị fọrọnụ n’ime ha ọrụ ga-abara ọhaneze uru, dị ka ịrụ ụzọ, ịgbari okwute, na ọrụ ndị ọzọ.” Ọ sịkwara na “a tara ụfọdụ n’ime ndị e nyere ọrụ ndị ahụ ahụhụ n’ụzọ dị iche iche tupu e nye ha ya.” Ọ bụ naanị ụmụnna ise ka a gụpụrụ ná ndị ga-aba amị.

Nwanna Charles Taze Russell Anwụọ

N’abalị iri na isii n’ọnwa Ọktoba afọ 1916, Nwanna Charles Russell, bụ́ onye na-elekọta ọrụ Ndị Mmụta Baịbụl n’oge ahụ gawara ikwu okwu n’ebe ọdịda anyanwụ Amerịka. Ọ lọtaghị ná ndụ. Ọ nwụrụ n’ehihie Tuzdee abalị iri atọ na otu n’ọnwa Ọktoba na Pampa dị́ na Texas n’ụgbọ okporo ígwè ọ nọ na ya. Ọ dị afọ iri isii na anọ mgbe ahụ.

Ọtụtụ ụmụnna anyị nọ na-eche na ọ ga-esi ezigbo ike inweta onye ga-anọchi Nwanna Russell. Ụlọ Nche Bekee December 1, 1916, bipụtara otú o si hazie ka e si na-arụ ọrụ a o lekọtara ọtụtụ afọ. Ma ajụjụ bụ: Ònye ga-anọchi Nwanna Russell?

A zara ajụjụ a ná nnọkọ Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania na-enwe kwa afọ. E nwere ya ná mmalite afọ 1917. Ndị bịaranụ mere ntụli aka. Ha niile tụliiri otu onye aka. Ma ihe ndị merenụ n’ọnwa ndị na-eso ya gosiri na obi ha anọgideghị na-abụ otu. Ọnwụnwa ndị kpụ ọkụ n’ọnụ ka ga-abịara ụmụnna anyị.