Gaa n'Isiokwu

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ndịàmà Jehova

Igbo

Akwụkwọ Mgbaafọ Ndịàmà Jehova nke 2016

Ndị a bụ ndị nọ n’Ọgbakọ Surabaya n’afọ 1954

 INDONESHIA

Ndị Ozi Ala Ọzọ Gara Ụlọ Akwụkwọ Gilied Abịa n’Indoneshia

Ndị Ozi Ala Ọzọ Gara Ụlọ Akwụkwọ Gilied Abịa n’Indoneshia

Na Julaị afọ 1951, obere ọgbakọ e nwere na Jakata zukọtara ka ha nabata Nwanna Peter Vanderhaegen. Ọ bụ ya bụ onye ozi ala ọzọ mbụ gara Ụlọ Akwụkwọ Gilied e zitere n’Indoneshia. Tupu afọ ahụ agwụ, e zitekwuru ndị ozi ala ọzọ iri na atọ. Ha si Ọstrelia, Jamanị, na Nedalandz. Nke a mere ka ọ fọ obere ka ndị ozi ala ọzọ e zitere n’Indoneshia jiri okpukpu abụọ karịa ndị nkwusa e nwere na ya.

Otu nwanna nwaanyị bụ́ onye ozi ala ọzọ si Nedalandz aha ya bụ Fredrika Renskers kwuru, sị, “Echere m na m rute Indoneshia, m ga na-eji mmegharị ahụ́ agwa ndị mmadụ okwu. Mgbe m rutere, m hụrụ na ọtụtụ ndị na-asụ Dọch, ọ bụ ha ka m kacha ezi ozi ọma n’oge ahụ m bịara ọhụrụ.” Otu nwanna si Ọstrelia aha ya bụ Ronald Jacka kwuru, sị: “Ụfọdụ n’ime anyị na-eji kaadị e dere ihe ole na ole n’asụsụ Indoneshian ezi ozi ọma. Tupu mụ akụọ aka n’ọnụ ụzọ ụlọ mmadụ, m na-ebu ụzọ mụgharịa ihe e dere na kaadị ahụ ma gbalịa ikwughachi ya n’eleghị ya anya.”

N’ihi otú ndị ozi ala ọzọ ahụ si jiri ozi ọma kpọrọ ihe, ndị nkwusa e nwere n’Indoneshia si n’iri atọ na anọ ruo iri itoolu na otu naanị n’otu afọ. N’abalị mbụ n’ọnwa Septemba afọ 1951, e hiwere alaka ụlọ ọrụ anyị n’ụlọ Nwanna André Elias, dị́ n’Ebe Etiti Jakata. E mere Nwanna Ronald Jacka ohu alaka ahụ.

A Malitere Izi Ozi Ọma n’Obodo Ndị Ọzọ

Na Nọvemba afọ 1951, e zigara Nwanna Peter Vanderhaegen ka ọ gaa na-ekwusa ozi ọma na Manado, dị́ n’Ebe Ugwu Sulawesi. Ọ bụ n’obodo a ka Nwanna Theo Ratu na nwunye ya hiwere obere ìgwè. Ọtụtụ ndị obodo ahụ na-asị na ha bụ Ndị Kraịst. Ha ejighịkwa Okwu Chineke egwu egwu. Ọtụtụ n’ime ha na-anabata Ndịàmà Jehova ma gwa ha kọwaara ha ihe  ndị dị na Baịbụl. Ụmụnna anyị bịa izi mmadụ ozi ọma, ihe dị ka mmadụ iri na-ezukọtakarị ịnụ ihe ha na-ekwu. Mgbe nkeji iri na ise gachara, ha na-adịzi ihe dị ka mmadụ iri ise. Tupu otu awa agaa, ha na-eru narị mmadụ abụọ. Ha na-apụtazi n’èzí ka o nwee ike baa ndị bịaranụ.

Ná mmalite afọ 1952, Nwanna Albert Maltby na nwunye ya Jean nwetara ụlọ ndị ozi ala ọzọ ga na-ebi na Surabaya, nke di n’Ebe Ọwụwa Anyanwụ Java. Ọ bụ ya bụ obodo nke abụọ kachanụ n’Indoneshia. Mgbe ha nọ ebe ahụ, ụmụnna nwaanyị isii bụ́ ndị ozi ala ọzọ bịara sonyere ha. Aha ha bụ Gertrud Ott, Fredrika Renskers, Susie Stoove, na nwanne ya Marian, Eveline Platte, na Mimi Harp. Nwanna Nwaanyị Fredrika Renskers  kwuru, sị, “Ọtụtụ ndị obodo ahụ bụ ndị Alakụba na-ebughị okpukpe ha n’isi. Ha na-anabatakwa mmadụ nke ọma. Ọ dị nnọọ ka à ga-asị na ọtụtụ n’ime ha na-eche ka ha nụ eziokwu, n’ihi ya, ọ dị mfe mmadụ inweta ndị ọ ga na-amụrụ Baịbụl. N’ime afọ atọ, ndị nkwusa e nwere n’Ọgbakọ Surabaya bịara ruo iri asaa na ise.”

Ndị ozi ala ọzọ e nwere na Jakata

N’oge ahụ, otu nwoke onye Alakụba degaara alaka ụlọ ọrụ anyị akwụkwọ ka e nyere ya aka ịmụ Baịbụl. Aha nwoke ahụ bụ Azis. Ọ bụ onye Padang, dị́ n’Ebe Ọdịda Anyanwụ Sumatra. Azis na ndị ọsụ ụzọ sí Ọstrelia amụbuola Baịbụl tupu afọ 1940. Ma, ya na Ndịàmà Jehova ahụghịzi n’oge ahụ ndị agha Japan weghara Indoneshia. Otu ụbọchị, ọ hụrụ akwụkwọ Ndịàmà Jehova. O dere, sị: “Mgbe m hụrụ adres alaka ụlọ ọrụ Ndịàmà Jehova dị́ na Jakata n’akwụkwọ ahụ, obi tọrọ m ụtọ na mụ na Ndịàmà Jehova ga-amalitekwa ịmụ Baịbụl.” Alaka ụlọ ọrụ zipụrụ onye nlekọta sekit aha ya bụ Frans van Vliet ka ọ gaa Padang n’egbughị oge. Mgbe o ruru, ọ chọpụtara na Azis eziela onye agbata obi ya aha ya bụ Nazar Ris ozi ọma. Nazar bụ onye ọrụ oyibo ọ na-agụsi agụụ ike ịmata onye Chineke bụ. Azis na Nazar nakwa ndị ezinụlọ ha ghọrọ Ndịàmà Jehova. Nwanna Azis mechara bụrụ okenye ọgbakọ kwesịrị ntụkwasị obi, Nwanna Nazar Ris abụrụ ọsụ ụzọ pụrụ iche. Ọtụtụ ụmụ ya na-emekwa nke ọma n’ọgbakọ.

Nwanna Frans van Vliet na nwanne ya nwaanyị ọ tọrọ aha ya bụ Nel

Mgbe obere oge gachara, Nwanna Frans van Vliet gara na nke otu nwanna onye Nedalandz na-anaghị ejekwa ozi ọma. Nwanna ahụ nọ na Balịkpapan, dị́ n’Ebe Ọwụwa Anyanwụ Kalịmantan, na-arụzi ebe a na-esipụta mmanụ ụgbọala, bụ́ nke e mebiri mgbe a na-alụ agha. Nwanna Frans so nwanna ahụ na-anaghị ejekwa ozi gaa ozi ọma, ma gbaa ya ume ka ọ mụwara ọtụtụ ndị nwere mmasị Baịbụl. Tupu nwanna ahụ alaghachi Nedalandz, o nweela ndị ha na ya na-enwe ọmụmụ ihe na Balịkpapan.

Ka oge na-aga, otu nwanna nwaanyị e mere baptizim ọhụrụ aha ya bụ Titi Koetin kwatara na Banjamasịn dị́ n’Ebe Ndịda Kalịmantan. O kwusaara ndị ikwu ya bi na Dayak ozi ọma,  ọtụtụ n’ime ha aghọọ Ndịàmà Jehova. Ụfọdụ n’ime ha laghachiri n’obodo ha nke dị n’ime ime Kalịmantan hiwe ìgwè ndị mechara ghọọ ọgbakọ.

Ibipụta Akwụkwọ Anyị n’Asụsụ Indoneshian

Ka ụmụnna anyị na-ezi ozi ọma n’obodo dị iche iche n’Indoneshia, ọ bịara dị mkpa ka e nwekwuo akwụkwọ anyị n’asụsụ Indoneshian. N’afọ 1951, a sụgharịrị akwụkwọ anyị a na-akpọ “Kwe Ka Chineke Buru Onye-Ezi-Okwu” n’Indoneshian. Mgbe e bipụtachara ya, ndị ọchịchị gbanwere otú e si asụpe okwu n’asụsụ Indoneshian. Nke a mere ka e degharịa akwụkwọ anyị a. * Mgbe e mechara wepụta ya, o mere ka ọtụtụ ndị Indoneshia nwee mmasị ịgụ ya.

N’afọ 1953, alaka ụlọ ọrụ anyị bipụtara Ụlọ Nche narị abụọ na iri ise n’asụsụ Indoneshian. Nke a bụ Ụlọ Nche mbụ a na-ebipụta kemgbe e biri nke ikpeazụ ya afọ iri na abụọ tupu mgbe ahụ. Ụlọ Nche a dị naanị peeji iri na abụọ ná mmalite. Ọ bụkwa naanị isiokwu ndị a na-amụ amụ dị na ya. Mgbe afọ atọ gachara, ọ malitere ịdị peeji iri na isii. Anyị na-enye ya ụlọ ọrụ na-ebi akwụkwọ, ha ana-ebipụtara anyị ya puku iri kwa ọnwa.

 E bidoro ibipụta Teta! anyị kwa ọnwa n’asụsụ Indoneshian n’afọ 1957. O teghị aka, e bipụtawa ya puku iri kwa ọnwa. N’oge ahụ, akwụkwọ e ji ebipụta akwụkwọ dị ụkọ n’Indoneshia. Iji nweta akwụkwọ a ga-eji na-ebiri anyị akwụkwọ, ụmụnna anyị degaara gọọmenti akwụkwọ ka e nye anyị ikike ịna-atụbata akwụkwọ e ji ebi akwụkwọ. Otu nwoke na-arụ n’ụlọ ọrụ gọọmenti lebara akwụkwọ ahụ anya ma kwuo, sị: “Ụlọ Nche unu bụ otu n’ime magazin kacha mma a na-ebipụta n’Indoneshia. Obi dị m ezigbo ụtọ inyere unu aka inweta ikike unu ga-eji na-atụbata akwụkwọ unu ga-eji na-ebi magazin ọhụrụ unu.”

^ para. 1 Kemgbe afọ 1945, ndị ọchịchị Indoneshia agbanweela otú e si asụpe okwu n’asụsụ Indoneshian ugboro abụọ. Ihe bụ́ isi kpatara ya bụ ka otú ha si asụpe okwu ghara ịdị ka nke ndị Nedalandz.