Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

Akwụkwọ Mgbaafọ Ndịàmà Jehova nke 2016

Ndị a bụ Ndịàmà Jehova e nwere na Semarang, dị́ na Java (n’ihe dị ka afọ 1937)

 INDONESHIA

Ọ Bụ Ebe A Ka M Chọrọ Ibido

Ọ Bụ Ebe A Ka M Chọrọ Ibido

E nwere otu ụbọchị ohu alaka ụlọ ọrụ anyị dị n’Ọstrelia aha ya bụ Alexander MacGillivray nọ na-agagharị n’ọfis ya na-eche ihe ọ ga-eme. O nwere nsogbu ya na ya na-alụ kemgbe ọtụtụ ụbọchị. Ma, o chetala ihe ọ ga-eme. Ugbu a, ọ chọrọ ka ya na Nwanna Frank Rice kwurịta okwu.

Nwanna Frank dị afọ iri abụọ na asatọ n’oge ahụ. Ọ bụkwa kọpọtụa ma ọ bụ ọsụ ụzọ oge niile ahụ́ gbasiri ike. Ọ ka bụ izu ole na ole ka ọ nọrọ n’alaka ụlọ ọrụ. Ọ ghọrọ Onyeàmà Jehova mgbe ọ ka na-eto eto, bidokwa ịsụ ụzọ ozugbo ahụ. O kwusara ozi ọma ihe karịrị afọ iri n’ọtụtụ ebe n’Ọstrelia. Ọ na-eji ịnyịnya, ígwè, ọgba tum tum, na ụlọ ụgbọala na-adọkpu aga ekwusa ozi ọma. Mgbe ọ nọchara izu ole na ole na Betel, o jikeere ịgawa ebe ọhụrụ a chọrọ ka ọ gaa kwusaa ozi ọma.

Nwanna MacGillivray kpọrọ Frank ka ọ bịa n’ọfis ya. Mgbe ọ bịara, ọ tụụrụ ya aka na map ma gosi ya agwaetiti ndị dị nso n’ebe ugwu Ọstrelia. Ọ jụrụ Frank, sị: “Olee ebe ị chọrọ ibido kwusawa ozi ọma n’agwaetiti ndị a? E nweghị nwanna ọ bụla nọ na ha.”

Anya Frank gara n’ọtụtụ agwaetiti mara mma dị n’Oké Osimiri India. A na-akpọ agwaetiti ndị ahụ Nedalandz Ist Indis. Ihe a na-akpọ Nedalandz Ist Indis ugbu a bụ Indoneshia. * Ọtụtụ nde mmadụ bí n’agwaetiti ndị ahụ anụtụbeghị ozi ọma Alaeze Chineke. Frank tụrụ aka na Batavia, bụ́ isi obodo agwaetiti ndị ahụ ma kwuo, sị, “Ọ bụ ebe a ka m chọrọ ibido.” Ihe a na-akpọ Batavịa ugbu a bụ Jakata.

 Ikwusa Ozi Ọma na Java

N’afọ 1931, Nwanna Frank Rice wụchara na Jakata. Jakata bụ nnukwu obodo na-ekwo ekwo n’agwaetiti Java. Ọ chọtara otu ọnụ ụlọ n’ebe dị́ nso n’etiti obodo Jakata ma bujuo ya katọn ndị akwụkwọ anyị dị na ha.

Ndị a bụ Nwanna Frank Rice na Nwanna Clem Deschamp mgbe ha nọ na Jakata

Nwanna Frank kwuru, sị: “Ná mmalite, amaghị m ihe m ga-eme eme, agụụ ịlaghachi ebe m si bịa gụwakwara m. Ndị mmadụ na-akpọ kootu ọcha, kpuru okpu n’isi na-akpagharị, ebe mụnwa na-anwụ n’ọsụsọ n’ihi uwe ndị Ọstrelia na-anyị arọ m na-eyi. Amatụdịghị m otú e si asụ Dọch ma ọ bụ Indoneshian. Mgbe m kpegachaara Jehova ekpere ka o duzie m, m kwuru na a ga-enwerịrị ndị ma asụ Bekee n’ebe  ndị mmadụ na-azụ ahịa n’obodo ahụ. Ọ bụ ebe ahụ ka m malitere izi ndị mmadụ ozi ọma. Ọtụtụ ndị gekwara m ntị.”

Nwanna Frank gbasiri mbọ ike mụtatụ otú e si asụ Dọch n’ihi na ọ bụ ya ka ọtụtụ ndị bi na Jakata na-asụ. Ozugbo ọ mụtatụrụ Dọch, ọ malitere ịga n’ụlọ n’ụlọ na-ezi ozi ọma. O jikwa nwayọọ nwayọọ mụọ otú e si asụ Indoneshian. O kwuru, sị: “Nsogbu m bụ na enweghị m akwụkwọ Indoneshian ọ bụla. Ma, Jehova mere ka m hụ otu onye nkụzi bụ́ onye Indoneshia. O nwere mmasị n’eziokwu Baịbụl na-akụzi. N’ihi ya, o kwetara ịsụgharị akwụkwọ anyị bụ́ Where Are the Dead? (Ebee Ka Ndị Nwụrụ Anwụ Nọ?) Ọ sụgharịkwara ụfọdụ akwụkwọ anyị ndị ọzọ. Tupu a mara ihe na-emenụ, ọtụtụ ndị Indoneshia enweela mmasị ịmụ Baịbụl.”

Na Nọvemba afọ 1931, e si n’Ọstrelia zite ndị ọsụ ụzọ abụọ ọzọ na Jakata. Otu n’ime ha bụ Clem Deschamp. Ọ dị afọ iri abụọ na ise. Onye nke ọzọ bụ Bill Hunter. Ọ dị afọ iri na itoolu. Clem na Bill bu ụgbọala e ji mere ụlọ bịa. Ụdị ụgbọala a so ná ndị mbụ e bubatara n’Indoneshia. Mgbe ha mụtara okwu ole na ole n’asụsụ Dọch, ha malitere ikwusa ozi ọma n’obodo ndị mepere emepe na Java.

Ebe Nwanna Charles Harris ji ígwè na ụgbọala e ji mere ụlọ na-ezi ozi ọma

Onye ọzọ bịaranụ mgbe Nwanna Clem na Bill bịachara bụ otu ọsụ ụzọ ahụ́ gbasiri ike aha ya bụ Charles Harris. O si Ọstrelia. Malite n’afọ 1935, Charles ji ụgbọala o ji mere ụlọ na ígwè gaa kwusaa ozi ọma n’ọtụtụ ebe na Java. O nyefekwara ndị mmadụ akwụkwọ anyị n’asụsụ ise. Asụsụ ndị ahụ bụ: Arabik, Bekee, Chaịniiz, Dọch, na Indoneshian. O nwere afọ ndị akwụkwọ anyị o nyefere ndị mmadụ ruru puku iri na asaa.

Ọtụtụ akwụkwọ anyị Nwanna Charles nyefere ndị mmadụ mere ka ọtụtụ ndị gewe ntị n’ozi ọma. Otu onye ọrụ gọọmenti na Jakata jụrụ Nwanna Clem Deschamp, sị, “Mmadụ ole ka i nwere na-arụrụ gị ọrụ n’Ebe Ọwụwa Anyanwụ Java?”

Nwanna Deschamp zara ya na ọ bụ otu onye.

 Onye ọrụ gọọmenti ahụ ji olu ike jụọ ya, sị: “Ị̀ chọrọ ka m kwere n’ihe a i kwuru? Ọ ga-abụrịrị na e nwere ọtụtụ ndị na-arụrụ gị ọrụ n’ihi otú e sirila kesaa akwụkwọ unu n’ebe niile!”

Ndị ọsụ ụzọ mbụ a akwụsịghị otu ebe birizie na-ezi ozi ọma. Ihe kpatara ya bụ na ha chọrọ izi ọtụtụ ndị ozi ọma. Nwanna Bill Hunter kwuru, sị: “Anyị na-esi na mbido otu agwaetiti ziri ozi ọma ruo ná ngwụcha ya. O siri ike ịhụ onye anyị ziri ozi ọma ugboro abụọ.” Ka ha na-aga n’ụzọ, ha ziri ọtụtụ ndị ozi ọma, nyefeekwa ha akwụkwọ anyị. Ọtụtụ n’ime ndị ahụ ha ziri ozi ọma mechara fewe Jehova.—Ekli. 11:6; 1 Kọr. 3:6.

 Ndị Bi na Sumatra Anụ Ozi Ọma

N’ihe dị ka afọ 1936, ndị ọsụ ụzọ e nwere na Java kwurịtara otú ha ga-esi gaa zie ozi ọma na Sumatra. Sumatra bụ agwaetiti nke isii kacha buo ibu n’agwaetiti ndị e nwere n’ụwa, ala ya adịghịkwa larịị. E nwere ọtụtụ nnukwu obodo, ubi, ala bụ́ mmiri mmiri, na oké ọhịa na ya.

Ndị ọsụ ụzọ ahụ kwekọrịtara iziga Nwanna Frank Rice na Sumatra. Ha tụkọtakwara obere ego ha nwere kwụọrọ ya ụgwọ ụgbọ. Obere oge, Nwanna Frank bu akpa ozi ọma ya abụọ na katọn akwụkwọ anyị iri anọ rute Medan, dị́ n’Ebe Ugwu Sumatra. Ọ bụkwa naanị obere ego fọrọ ya n’akpa. Nwanna Frank nwere okwukwe siri ike. Ozugbo o rutere, ọ malitere izi ndị mmadụ ozi ọma. Obi siri ya ike na Jehova ga-egboro ya mkpa ya ka o nwee ike ịrụ ọrụ ya nke ọma.—Mat. 6:33.

N’izu ikpeazụ Nwanna Frank kwusara ozi ọma na Medan, ọ hụrụ otu onye Nedalandz dị́ obiọma nke kpọrọ ya ka ọ bịa ṅụọ kọfị. Ọ gwara nwoke ahụ na ya chọrọ ụgbọala ọ ga-eji na-ekwusa ozi ọma n’agwaetiti ahụ niile. Nwoke ahụ tụụrụ ya aka n’ụgbọala ya mebiri emebi dị n’ubi ya, ma sị ya, “Ọ bụrụ na ị ga-emezili ya, i nwere ike ịkwụ m otu narị guilder buru ya.” *

Nwanna Frank gwara nwoke ahụ na ya enweghị ụdị ego ahụ.

Nwoke ahụ legidere Nwanna Frank anya ma jụọ ya, sị: “Ị̀ chọrọ n’eziokwu ikwusa ozi ọma n’ebe niile na Sumatra?”

Nwanna Frank zara ya “Ee.”

Nwoke ahụ agwa ya, sị: “Ebe ọ dị otú ahụ, buru ya ma ọ bụrụ na ị ga-emezili ya. I mechaa nweta ego ahụ, gị akwụọ m ya.”

Frank rụziri ụgbọala ahụ. O mechara dee, sị, “M kwajuru akwụkwọ na ya, gbajuo ya mmanụ ụgbọala, ma buru ya gawa izi ndị bi na Sumatra ozi ọma, ma nwee okwukwe na Jehova ga-enyere m aka.”

Ihe a bụ mgbe Nwanna Henry Cockman na Nwanna Nwaanyị Jean na di ya Clem Deschamp nọ na Sumatra n’afọ 1940

 Mgbe Frank kwusachara ozi ọma otu afọ n’ebe niile na Sumatra, ọ laghachiri Jakata. O rere ụgbọala ahụ ego ole ahụ nwoke Nedalandz ahụ sịrị ya kwụọ ma zigara ya ego ahụ na Medan.

Izu ole na ole nke a mechara, Nwanna Frank natara akwụkwọ ozi si Ọstrelia e ji gwa ya ebe ọzọ ọ ga-aga kwusaa ozi ọma. Ọ kwakọtara ihe ya ozugbo ma tinye isi n’Indochaịna izi ndị mmadụ ozi ọma. Ọ bụ ya bụ onye mbụ ga-ezi ozi ọma n’Indochaịna. Ihe a na-akpọzi ebe ndị bụbu Indochaịna bụ Kambodia, Laụs, na Vietnam.

^ para. 4 A na-akpọbukwa ya Dọch Ist Indis. Ndị Nedalandz bịara n’obodo a ihe dị ka narị afọ atọ tupu mgbe ahụ ma malite ịchị ya n’ihi ihe na-eme ka nri tọọ ụtọ e nwere na ya nke na-enye ezigbo ego. N’akwụkwọ a, anyị kpọwa aha ebe ndị anyị na-akọ akụkọ ha, anyị ga-akpọ ha aha a na-akpọ ha ugbu a.

^ para. 3 Otu narị guilder bụ ihe dị ka narị puku naịra abụọ na puku iri na itoolu ugbu a.