Gaa n'Isiokwu

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ndịàmà Jehova

Igbo

Akwụkwọ Mgbaafọ Ndịàmà Jehova nke 2016

 INDONESHIA

Abụbu M Onyeisi Ndị Omempụ, Ma Abụzi M Ezigbo Nwa Amaala

Hisar Sormin

Abụbu M Onyeisi Ndị Omempụ, Ma Abụzi M Ezigbo Nwa Amaala
  • A MỤRỤ YA N’AFỌ 1911

  • E MERE YA BAPTIZIM N’AFỌ 1952

  • ONYE Ọ BỤ Ọ bụbu onyeisi ndị omempụ. Ma o mechara soro na Kọmitii Alaka.

O NWERE ụbọchị otu onye ọrụ gọọmenti ọnụ na-eru n’okwu kpọrọ m ka m bịa n’ọfis ọkàikpe ukwu nke Indoneshia.

Mgbe m bịara, ọ gwara m, sị: “Ị bụ onye Indoneshia. N’ihi ya, gwa m eziokwu. Gịnị n’eziokwu ka Ndịàmà Jehova na-eme n’obodo a?”

Nwanna Sormin gwara ya, sị: “Ka m kọọrọ gị banyere onwe m. M bụbu onyeisi ndị omempụ. Ma ugbu a, m na-akụziri ndị mmadụ Baịbụl. Ọ bụ ya ka Ndịàmà Jehova na-eme n’obodo anyị a. Ha na-enyere ndị ọjọọ dị ka mụ aka ka ha ghọọ ezigbo ụmụ amaala.”

Onye ọrụ gọọmenti ahụ mechara kwuo, sị: “M nụla ọtụtụ mkpesa banyere Ndịàmà Jehova. Ma, ama m na ọ bụ ezigbo chọọchị n’ihi na o nyeere Maazi Sormin aka ịgbanwe.”

GỤKWUO GBASARA YA

AJỤJỤ NDỊ BAỊBỤL ZARA

Gịnị Ga-eme Ka Udo Dịrị n’Ụwa?

Chọpụta otú Chineke ga-esi eme ka Alaeze ya weta udo n’ụwa.