Gaa n'Isiokwu

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ndịàmà Jehova

Igbo

Akwụkwọ Mgbaafọ Ndịàmà Jehova nke 2016

 IHE NDỊ E MERE N’AFỌ GARA AGA

Ìhè Na-enwusikwu Ike

Ìhè Na-enwusikwu Ike

NDỊ na-efe Jehova kwetara na ọ bụ Jehova na-eme ka ha ghọta eziokwu dị́ na Baịbụl. N’ihi ya, ha na-ekpesi ekpere ike ka Chineke mee ka ‘ìhè ya nakwa eziokwu ya’ na-edu ha. (Ọma 43:3) Ọ bụ eziokwu na ụwa nọ n’ọchịchịrị n’ihi amaghị Okwu Chineke, Chineke ka na akụziri ndị ya ihe. Nke a emeela ka okporo ụzọ ha yie “ìhè nke na-enwupụ enwupụ ka chi na-abọwanye.” (Ilu 4:18) Ihe Jehova na-akụziri anyị na-eme ka ihe na-aga otú o kwesịrị n’ọgbakọ, na-eme ka anyị kwere ihe ndị bụ́ eziokwu, na-emekwa ka anyị na-akpa ezigbo àgwà. Olee ihe ụfọdụ e mere ka o dokwuo anyị anya n’ime afọ ole na ole gara aga?