Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

Akwụkwọ Mgbaafọ Ndịàmà Jehova nke 2015

 IKWUSA OZI ỌMA NA ỊKỤZI IHE N’ỤWA NIILE

Mba Ndị Dị n’Oké Osimiri Pasifik

Mba Ndị Dị n’Oké Osimiri Pasifik
  • MBA OLE DỊ NA YA 29

  • MMADỤ OLE BI NA HA 40,208,390

  • NDỊ NKWUSA OLE NỌ NA HA 97,583

  • MMADỤ OLE A MỤỤRỤ BAỊBỤL 64,675

Ha Hapụụrụ Ndị Nwere Mmasị Ọtụtụ Akwụkwọ

E nwere ọtụtụ ebe n’agwaetiti Maịkronishia a na-anaghị ezikarị ozi ọma na ha. N’ihi ya, ụfọdụ ndị nkwusa bi n’Agwaetiti Mashal haziri ka ha jiri ụgbọ mmiri gaa ebe ahụ kwusaa ozi ọma. Njem a were ha izu abụọ ịga lọta. Ha si n’agwaetiti a na-akpọ Majuro gaa n’agwaetiti Wọje na Ọmed, nke dị n’ebe a na-akpọ Wọje Atol.

 Tupu ndị nkwusa ndị a amalite njem, ha wetara ụfọdụ magazin na ụfọdụ broshọ kechikọta ha ọnụ. Ha kechiri ha ọtụtụ ka ha nwee ike zie ọtụtụ ndị ozi ọma. Nke ọ bụla n’ime ha dị magazin anọ na broshọ abụọ. Ebe ọ bụ na ndị nkwusa ndị a amaghị mgbe ha ga-alaghachi ebe ahụ, ha hapụụrụ ndị nwere mmasị akwụkwọ ndị ahụ ma gwa ha ka ha nye ha ndị ezinụlọ ha na ndị enyi ha. Izu abụọ ahụ ndị nkwusa ndị a ziri ozi ọma ebe ahụ, ha nyefere narị broshọ ise na iri atọ na otu, nyefeekwa narị magazin asaa na iri ise na isii na akwụkwọ asaa.

“I Meela Maka Otú I Si Cheta Anyị”

N’ọnwa Febụwarị, afọ 2014, ụmụnna isii si Papiuwa Niu Gini gaa n’ime ime obodo ndị dị n’agwaetiti a na-akpọ Kaka ikwusa ozi ọma. Ha kwusara ozi ọma ebe ahụ abalị iri. Ọtụtụ ndị gere ha ntị. Ha nyefere ndị mmadụ akwụkwọ anyị dị otu puku na iri isii na anọ. Otu nwanna nwaanyị aha ya bụ Relvie kwuru, sị: “N’ụbọchị mbụ anyị malitere izi ndị mmadụ ozi ọma, anyị kwusagidere ozi ọma ruo elekere atọ nke ehihie. N’oge ahụ, mmiri anyị ji gwụrụ, ike agwụ anyị ikwu okwu. Akpịrị kpọkwara anyị nkụ n’ihi na anyị akwụsịghị ikwu okwu. Mgbe m nọ na-agwa otu nwata nwaanyị okwu ma chọọ ị gụrụ ya Baịbụl, enweghị m ike ịgụ ya n’ihi na akpịrị kpọrọ m ezigbo nkụ. O nyere m mmiri mụ aṅụọ.”

N’abalị bọtara ụbọchị ndị nkwusa ahụ hapụrụ otu n’ime obodo ndị ha gara, ha na ndị obodo ahụ na ndị isi chọọchị dị ebe ahụ nwere nnọkọ. Nwanna Nwaanyị Relvie kwuru otú obi dị ya mgbe ha zukọrọ. Ọ sịrị: “Ọ dị m otú ahụ ọ dị Stivin mgbe ọ nọ na-azara ọnụ ya n’ihu ụlọikpe Sanhedrin. Naanị ihe dị iche bụ na ndị a anyị na ha kwurịtara okwu adịghị obi ọjọọ.” Mgbe ndị nkwusa isii ahụ kwuchara  okwu, otu nwaanyị bụ́ onye isi Sọnde skul chọọchị Lutheran biliri ọtọ kelee nwanne mama ya maka otú o si bịa kụziere ndị obodo ha Baịbụl. Nwanne mama ya a bụ otu n’ime ndị nkwusa kwuru okwu ná nnọkọ ahụ. Nwaanyị ahụ kwuru, sị: “Ihe a i mere yiri ihe nwaanyị Sameria mere mgbe Jizọs zichara ya ozi ọma. Ọ gara gwa ndị obodo ya ihe Jizọs gwara ya. I meela maka otú i si cheta anyị.”

“Hà Dị Obere Izi Ozi Ọma?”

Kiribati: Onye a bụ Teariki na papa ya Tueti

N’ụtụtụ otu ụbọchị, otu nwata nwoke aha ya bụ Teariki na papa ya Tueti nọ na-ezi ozi ọma na Tarawa. Obodo a dị n’agwaetiti Kiribati. Mgbe ha batara n’otu ụlọ, ha hụrụ ụmụ okorobịa na ụmụ agbọghọ ruru ihe dị ka mmadụ iri. Ha dị n’agbata afọ iri abụọ na otu na iri abụọ na itoolu. Papa Teariki ziri ha ozi ọma Alaeze Chineke. Mgbe o zichara ha ya, otu n’ime ha gwara ya, sị: “Anyị hụrụ na unu kpọ ụmụ unu na-ezi ozi ọma. Gịnị mere unu ji kpọrọ ha bịa? Ha ka dị obere izi ozi ọma banyere Chineke.”

Tueti zara ha, sị: “Ùnu chọrọ ịma ma nwa m a ọ̀ ga-ezili ozi ọma? Unu chọọ, mụ apụọ èzí ka o zie unu ozi ọma.” Ha niile zara, sị: “Ee, anyị chọrọ ka o zie anyị ozi ọma.”

Mgbe Tueti pụrụ n’èzí, Teariki jụrụ ha, sị: “Ùnu ma aha Chineke?”

Otu onye n’ime ha sịrị na “ọ bụ Jizọs.” Onye ọzọ asị na ọ bụ “Chineke.” Onye ọzọ asị na ọ bụ “Onyenwe anyị.”

Teariki gwara ha, sị: “Ka anyị gụọ ya na Baịbụl. Ka anyị sapeta Aịzaya 42:5. Anyị ga-agụkọ ya ọnụ.” Mgbe ha gụchara ya, ọ jụrụ ha, sị: “Ònye ka ebe a na-ekwu banyere ya?”

Otu nwa agbọghọ sịrị na ọ na-ekwu banyere “Chineke.” Teariki kwuru na ọ zatara ya, na ọ na-ekwu banyere ezi Chineke. Ọ gwara ha na ọ bụrụ na ha agụọ amaokwu nke asatọ, na ha ga-ama ihe ezi Chineke a kwuru bụ́ aha ya. Ebe ahụ sịrị: “Abụ m Jehova. Ọ bụ ya bụ aha m; agaghị m enye onye ọzọ nsọpụrụ m.” Mgbe ha gụchara ya, Teariki jụrụ ha, sị: “Ùnu nụrụ ihe Chineke kwuru ebe a bụ́ aha ya?”

 Ha niile zara, sị: “Jehova.”

Ugbu a mmadụ niile nọ na-ege ntị, Teariki jụrụ ha, sị: “Gịnị bụ uru ọ ga-abara anyị ma anyị na-akpọ aha Chineke bụ́ Jehova?” Ọ gwara ha sapeta Ọrụ Ndịozi 2:21 ka ha hụ uru ọ bara. Ebe ahụ sịrị: “Onye ọ bụla nke na-akpọku aha Jehova ka a ga-azọpụta.” Mgbe ha gụchara ya, ya ajụọ ha, sị: “Gịnị bụ uru ọ ga-abara anyị ma anyị na-akpọ aha Chineke bụ́ Jehova?”

Otu nwa agbọghọ nọ ebe ahụ zara, sị: “Ọ ga-eme ka a zọpụta anyị.”

Ozugbo ọ zachara ajụjụ ahụ, papa Teariki batara. Ọ jụrụ ha, sị: “Ugbu a, olee ihe unu chere? Ụmụaka anyị, hà ga-ezili ozi ọma? Ọ̀ dị mma ka anyị na ha soro na-aga ozi ọma?”  Ha niile kwetara na ụmụaka ahụ zuru ka e mee, nakwa na ọ dị mma ka ha soro na-ezi ozi ọma. Tueti gwaziri ha, sị: “Ọ bụrụ na unu amụta ihe Baịbụl na-akụzi, unu nwekwara ike iji Baịbụl zie ozi ọma otú a Teariki ziri.”

Otú E Si Kwusaa Ozi Ọma n’Otu Ime Obodo Dị n’Ugwu

Na Nọvemba afọ 2013, otu nwanna aha ya bụ Jean-Pierre ji ụgbọelu gaa mgbakọ sekit e nwere n’obodo ya. Nwanna a na-eje ozi n’ọfis ndị nsụgharị dị na Pọt-Vila, nke dị na Vanuwatu. Mgbe Nwanna Jean-Pierre rutere n’ọdụ ụgbọelu dị n’obodo a, ọtụtụ ndị nwere mmasị si n’ebe ndịda bịa ebe ahụ ma gwa ya ka o nye ha akwụkwọ anyị. O nyere ha ọtụtụ n’ime magazin ndị o ji bịa. Otu pastọ bịakwutere ya gwa ya ka o nyekwa ya. Ọ rịọrọ nwanna a ka ọ bịa n’obodo ha zie ha ozi ọma. Ọ gwara Jean-Pierre, sị: “Agụụ Okwu Chineke agụgbuola anyị. Biko, bịa n’obodo anyị ka ị zaa anyị ajụjụ ndị anyị nwere.” Mgbe a gbasara mgbakọ ahụ, Nwanna Jean-Pierre jewere obodo ahụ n’isi ụtụtụ echi ya. O ji ụkwụ gaa ọtụtụ awa n’ugwu n’ihi na obodo ahụ dị n’ugwu. O mechara ruo ebe ahụ. Ndị obodo ahụ ji obi ụtọ nabata ya. Ha na ya tụlere Akụkọ Alaeze nke 38. Isiokwu ya bụ, “Ndị Nwụrụ Anwụ Hà Ga-adị Ndụ Ọzọ?” Ya na ihe dị ka mmadụ iri atọ tụlere traktị a. Mgbe ha na-atụle ya, ọ gwara ha ka ha na-asapeta ebe ndị ha chọrọ ịgụ na Baịbụl nke ha. Ya na ha kwurịtara okwu ihe fọrọ obere ka o ruo awa asaa. Nke a gosiri na agụụ Okwu Chineke na-agụsi ndị obodo a ike. Otu nwoke dị afọ iri asaa kwuru, sị: “Kemgbe a mụrụ m, e nwebeghị onye kọwaara m banyere ndị nwụrụ anwụ otú a!”

Nwanna Jean-Pierre hiri n’obodo ahụ. Ya na pastọ ahụ hiri n’otu ọnụ ụlọ. Mgbe o tetara n’ụtụtụ, ọ hụrụ pastọ ahụ ka ọ na-agụ otu n’ime magazin anyị. Jean-Pierre jụrụ ya ihe ọ na-agụ, ya ejiri obi ụtọ sị na ya na-agụ banyere Alaeze Chineke. Pastọ a kwetara na Alaeze Chineke adịghị  n’obi ndị Farisii, bụ́ ndị Jizọs katọrọ na Luk 17:21. N’ihi ya, Alaeze Chineke adịghị n’obi mmadụ, n’agbanyeghị na chọọchị ya na-akụzi na ọ dị n’obi mmadụ. Mgbe Nwanna Jean-Pierre laghachiri Pọt-Vila, ọ na-ejizi ekwentị akpọtụrụ ndị ahụ nwere mmasị o ziri ozi ọma n’obodo ahụ. Ụmụnna nwoke atọ nọ n’ọgbakọ dị nso gara n’obodo ahụ hazie maka Ncheta Ọnwụ Jizọs. Otu narị mmadụ na itoolu bịakwara ya.

Ihe a bụ obodo Vanuwatu