Gaa n'Isiokwu

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ndịàmà Jehova

Igbo

Akwụkwọ Mgbaafọ Ndịàmà Jehova nke 2015

 IHE NDỊ E MERE N’AFỌ GARA AGA

“Anyị Ahụwo Ihe Ọhụrụ”

“Anyị Ahụwo Ihe Ọhụrụ”

Mgbe e mere nwanna kpuru ìsì baptizim

E NWERE mgbe Jizọs gwọrọ otu nwoke ahụ́ ya kpọnwụrụ akpọnwụ. Baịbụl kwuru na mgbe ndị mmadụ hụrụ ihe merenụ, o juru ha niile anya. “Ha malitekwara inye Chineke otuto. Egwu wee jide ha, ha wee na-asị: ‘Anyị ahụwo ihe ọhụrụ taa!’” (Luk 5:25-26) Ihe Jehova Chineke si n’aka Ọkpara ya ọ hụrụ n’anya na-eme taa, nakwa n’aka ohu ahụ kwesịrị ntụkwasị obi na ndị niile ji obi ha na-efe Chineke n’ebe niile n’ụwa, emeela ka anyị nwekwuo ihe mere anyị ga-eji kwuo, sị: “Anyị ahụwo ihe ọhụrụ.”