Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

Akwụkwọ Mgbaafọ Ndịàmà Jehova nke 2015

Gụọ ihe a ka ị mara ihe Ndịàmà Jehova rụzuru n’afọ 2014 na ihe gbasara Ndịàmà Jehova nọ na Dọminikan Ripọblik.

Isiokwu Afọ 2015

Isiokwu afọ 2015 si n’Abụ Ọma 106:1. Ọ sịrị: “Keleenụ Jehova, n’ihi na ọ dị mma.”

Akwụkwọ Ozi Si n’Aka Òtù Na-achị Isi

Òtù Na-achị Isi na-ekele Ndịàmà Jehova ibe ha nọ n’ụwa niile maka ozi ha ji obi ha niile na-ejere Jehova nakwa otú ha si na-atachi obi.

Ọrụ Na-aga n’Ihu n’Ihu na Wọwik

Ị ga-agụta ihe ga-eme gị obi ụtọ mere n’ebe Ndịàmà Jehova na-ewu isi ụlọ ọrụ ọhụrụ ha na Wọwik.

Ngalaba Na-ahụ Maka Iwu Ụlọ Nzukọ Alaeze n’Ụwa Niile

Ngalaba ọhụrụ a nwere nnukwu ọrụ nke bụ́ ịhụ na a rụchapụrụ ihe karịrị puku ụlọ nzukọ alaeze iri na atọ ngwa ngwa.

Baịbụl E Bipụtara ma Kwee Ka Ọ Ghara Imebi Ngwa Ngwa

Baịbụl Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ e degharịrị edegharị n’asụsụ Bekee n’afọ 2013 mara ezigbo mma, e mekwara ya ka ọ ghara imebi ngwa ngwa.

Nnọkọ Kacha Buo Ibu Ndịàmà Jehova Nwetụrụla

Ndị bịara nnọkọ Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania nke 129 karịrị ndị bịatụrụla nnọkọ a.

E Nyefere Jehova Alaka Ụlọ Ọrụ Anyị Dị na Sri Lanka

E si n’Ịntanet mee ka ụmụnna ndị zukọrọ n’ebe dị iche iche kirie ihe omume ahụ ma nụrụ ihe e kwuru.

Ikpe Gbasara Ndịàmà Jehova

Ndịàmà Jehova ka na-agbasi mbọ ike ka e kwe ha ka ha kpewe okpukpe ha otú ha chọrọ.

Ihe Ndị Mere n’Ebe Dị Iche Iche n’Ụwa

Olee ihe mere ụmụntakịrị nwaanyị abụọ bi ná mba Jọjia ji were ego ha chọburu iji zụọ ekwentị nye ka a rụọ Ụlọ Nzukọ Alaeze?

“Anyị Ahụwo Ihe Ọhụrụ”

Olee ihe ndị na-eme n’oge a e nwere ike iji tụnyere ọrụ ebube ndị Jizọs rụrụ n’oge ọ nọ n’ụwa?

Afrịka

Gụọ gbasara otú anyi si kụziere ndị mmadụ Baịbụl n’afọ 2014 n’Angola, Kongo, Gana, Naịjirịa na Saụt Afrịka.

Amerịka na Mba Ndị Gbara Ya Gburugburu

Gụọ gbasara otú Ndịàmà Jehova si kụziere ndị mmadụ Baịbụl n’afọ 2014 n’Ajentina, Brazil, Heiti, Paragụwaị na Surinama.

Eshia

Gụọ gbasara otú anyị si kụziere ndị mmadụ Baịbụl n’afọ 2014 n’Indonisha, Mọngolịa na Filipinz.

Europe

Gụọ banyere otú anyị si kụziere ndị mmadụ Baịbụl n’afọ 2014 Bọlgeria, Finland, Jamanị, Romenia, Rọshịa, Spen, na Swidin.

Mba Ndị Dị n’Oké Osimiri Pasifik

Gụọ banyere otú anyị si kụziere ndị mmadụ Baịbụl n’afọ 2014 na Kiribati, Agwaetiti Mashal, Papiuwa Niu Gini na Vanụatụ.

Ihe Ndị Ị Ga-eburu n’Uche Gbasara Dọminikan Ripọblik

Gụọ ihe ụfọdụ gbasara obodo a na ndị bi na ya.

Ihe A Chọtara

Ndị ozi ala ọzọ mbụ bịara na Dọminikan Ripọblik, hà nọrọ abalị ole tupu ha amalite ịmụrụ ndị mmadụ Baịbụl?

“Anyị Ga-amata Ndị Ha Bụ”

Mgbe Pablo González chọrọ ndị ọ na-achọ ruo afọ iri na atọ, ọ hụrụ ha.

A Tụrụ Ha Mkpọrọ, Machiekwa Ha

Olee ihe nyeere ụfọdụ Ndịàmà aka idi ọnụ e mekpọrọ ha ọtụtụ afọ n’ụlọ mkpọrọ?

Ha Akwụsịghị Ikwusa Ozi Ọma

Kama ide nletaghachi na awa, ndị nkwusa na-ede nletaghachi kabeeji, deekwa awa akwụkwọ nri.

A Hapụrụ Ha, Mechaakwa Machie Ha

N’afọ 1956, e wepụrụ iwu a machiri Ndịàmà Jehova kemgbe afọ isii na Dọminikan Ripọblik. Ma naanị onwa iri na otu e wepụrụ iwu a, a machikwara ha ọzọ.

Ije Chọọchị Katọlik na Trujillo

Mgbe Chọọchị Katọlik kwadochara ọchịchị trujillo ruo ọtụtụ afọ, o mechara kwụsị ịkwado ya, rịọkwa ndị Dọminikan Ripọblik arịrịọ.

E Mesiri Ha Ike

Mkpọrọ a tụrụ Ndịàmà Jehova, ò mere ka ha kwụsị ikwusa ozi ọma?

Ònye Bụ Onyeisi?

N’oge a machiri anyị iwu, e ji ígwè kọpị kọpị mepụtaghachi Ụlọ Nche, tinye ya ná nnukwu kom kom, fụọ ya ákwà, ma tinye akpụ n’elu ya ma nye ha ọgbakọ niile.

E Nwere Ike Ijide Ha

N’agbanyeghị na a machiri Ndịàmà Jehova nọ na Dọminikan Ripọblik inwe ọmụmụ ihe, ha chọpụtara ndị ha ga-esi na-amụ ihe ka a ghara ijide ha.

Obi Ha Tachiri Mere Ka Ha Nwere Onwe Ha

Mgbe ndị ọchịchị megidere Ndịàmà Jehova nọ na Dọminikan Ripọblik ruo ọtụtụ afọ, ha nwetara enyemaka n’ebe ha na-atụghị anya ya.

“Ụjọ Atụghị M Izi Ndị Mmadụ Ozi Ọma”

Luis Eduardo Montás, gbalịrị ugboro abụọ ka o gbuo Trujillo. Ọ mụtara eziokwu dị na Baịbụl mgbe ọ gara na nke onye dibịa ka o nyere ya aka gbuo Trujillo.

“M Ma na Alaeze Chineke Ga-abịarịrị”

A tụrụ Nwanna Efraín De La Cruz mkpọrọ n’ụlọ mkpọrọ asaa, kụọkwa ya akụghị akụ maka na ọ na-ezi ndị mmadụ ozi ọma. Olee ihe mere na ọ kwụsịghị izi ndị mmadụ ozi ọma kemgbe ihe karịrị afọ iri isii?

“O Nweghị Ihe Ga-eme Ka M Kwụsị Ịbụ Onyeàmà Jehova”

Otu ụkọchukwu gwara Mary Glass na ara ga-agba ya ma ọ gụọ Baịbụl. O mechara gụọ ya ma chọpụta ihe mere e ji sị ya agụla ya.

A Hapụrụ Ha Ka Ha Kwusawa Ozi Ọma

E zitekwuru ndị ozi ala ọzọ na Dọminikan Ripọblik mgbe e gbuchara Trujillo. Ụmụnna anyị mere ka ndị mmadụ mara na Ndịàmà Jehova abụghị ndị ọjọọ.

Enweghị Ọlịla

Ụmụnna anyị akwụsịghị ikwusa ozi ọma n’agbanyeghị ọgba aghara. Olee ihe mere ka o doo anya na Ndịàmà Jehova enweghị ọlịla na Dọminikan Ripọblik

A Chọkwuru Ndị Ozi Ọma

A kọwa gbasara Ndịàmà Jehova nọ na Dọminikan Ripọblik, a ga-akọtarịrị gbasara ụmụnna ndị gara ebe ahụ kwusaa ozi ọma.

Ha Hụrụ Ụmụnna Ha n’Anya

Oké ifufe a na-akpọ Hurricane Georges mebisiri ihe na Dọminikan Ripọblik n’afọ 1998. Ụmụnna anyị nyeere ọtụtụ ndị aka. Nke a mere ka e too Jehova Chineke.

Ihe E Mere Mgbe Ọtụtụ Ndị Batawara n’Ọgbakọ

Mgbe ọtụtụ ndị na-abata n’ọgbakọ, olee otú e si hụ na e nwere ebe a ga-anọ efe Jehova na ndị ga na-elekọta ọgbakọ?

Ndị Na-asụ Asụsụ Heshan Kriol

Ndịàmà Jehova na-ezi ndị na-asụ Heshan Kriol ozi ọma. Ka oge na-aga, e hiwere ọgbakọ ndị na-eji asụsụ a amụ ihe na klas ebe a ga na-akụziri ya ụmụnna.

Mgbe Ala Ọma Jijiji Mere na Heiti

Alaka ụlọ ọrụ dị na Dọminikan Ripọblik gbataara ụmụnna ọsọ enyemaka mgbe ala ọma jijiji mere na Heiti n’afọ 2010. Ọtụtụ ụmụnna anyị nyeere ha aka.

Ihe Ndị A Na-atụ Anya Ga-eme n’Ọdịnihu

Ndịàmà Jehova ekwusaala ozi ọma ọtụtụ ebe na Dọminikan Ripọblik kemgbe 1945. E nwere ihe ndị gosiri na ọtụtụ ndị ka ga-abata n’ọgbakọ.

Jehova Emeela Ka Ọtụtụ Ndị Bata n’Ọgbakọ

N’oge Nwanna Leonardo Amor na-eje ozi na La Vega, e nweghị onye batara n’ọgbakọ. Ndị mmadụ hà mechara bata n’ọgbakọ?

“Mmadụ Iri Abụọ na Abụọ Hapụrụ Chọọchị”

Ndị mmadụ kwuru na Ndịàmà Jehova ji ozizi ụgha na-eduhie ndị mmadụ. Ma, Ndịàmà Jehova na-eji Baịbụl aza ndị mmadụ ajụjụ ha jụrụ, ya edoo ha anya.

M Bụbu Onye Agha Nnupụisi Na-ekweghị na Chineke, Mechaa Fewe Chineke

Nwanna Juan Crispín ekwebughị na Chineke, o chekwara na ịgbanwe ọchịchị n’ike ga-eme ka ụwa dị mma. Oleezi ihe mere o ji fewe Chineke?

Onye Ogbi Mbụ Batara n’Ọgbakọ

José Pérez bụ onye ogbi mbụ batara n’ọgbakọ na Dọminikan Ripọblik. Olee otú e si zie José ozi ọma, ya aghọta ihe Baịbụl na-ekwu nke ọma?

Ọ Chọpụtara Ihe Ga-abara Ya Uru ná Ndụ

Nwanna José Estévez na ndị ezinụlọ ya chọpụtara ihe baara ha uru ná ndụ. Olee otú ha si chpụta na Jehova na-emezu nkwa o kwere?

Achọburu M Ịkwụsị Ife Chineke

N’agbanyeghị na Martín Paredes na-agụ akwụkwọ ka ọ ghọọ ụkọchukwu, ọ chọrọ ịkwụsị ife Chineke. Olee otú akwụkwọ ọ naara mmadụ si mee ka ọ gbanwee?

Ihe Ndị Mere n’Otu Narị Afọ Gara Aga, Ya Bụ, n’Afọ 1915

Olee ihe Ndịàmà Jehova mere maka ọnwụnwa ndị bịaara ha mgbe afọ 1914 gachara?