Gaa n'Isiokwu

Gaa na menu nke abụọ

Ndịàmà Jehova

Igbo

Olee Otú I Chere Ihe Ga-adị n’Ọdịnihu?

Olee Otú I Chere Ihe Ga-adị n’Ọdịnihu?

Ì chere na . . .

  • ọ ga-adịgide otú a ọ dị?

  • ọ ga-aka njọ?

  • ọ ga-aka mma?

 GỊNỊ KA BAỊBỤL KWURU?

‘Chineke ga-ehichapụ anya mmiri niile n’anya ụmụ mmadụ, ọnwụ agaghị adị ọzọ, iru uju ma ọ bụ mkpu ákwá ma ọ bụ ihe mgbu agaghịkwa adị ọzọ. Ihe mbụ niile agabigawo.’—Mkpughe 21:3, 4.

OLEE URU Ọ GA-ABARA GỊ?

Ị ga na-arụ ọrụ ị na-agaghị atakwute ájá, ị ga-arụpụtakwa ihe bara uru.—Aịzaya 65:21-23.

Ị gaghịzi na-arịa ọrịa ma ọ bụ na-ata ahụhụ.—Aịzaya 25:8; 33:24.

Obi ga-adị gị na ndị ezinụlọ unu na ndị enyi gị ụtọ, unu agaghịkwa anwụ anwụ.—Abụ Ọma 37:11, 29.

 Ì KWESỊRỊ IKWERE IHE A BAỊBỤL KWURU?

Ee. Lee ihe abụọ mere anyị ji kwuo otú ahụ:

  • Chineke ga-emezuli nkwa o kwere. Ọ bụ naanị Jehova ka Baịbụl kpọrọ “Onye Pụrụ Ime Ihe Niile.” (Mkpughe 15:3) Ọ bụ ya mere obi ji sie anyị ike na ọ ga-emerịrị ka ụwa anyị a ka mma otú ahụ o kwuru. Baịbụl kwuru, sị: “N’ebe Chineke nọ, ihe niile kwere omume.”—Matiu 19:26.

  • Ọ na-agụ Chineke agụụ imezu nkwa o kwere. Dị ka ihe atụ, Baịbụl kwuru na ọ na-agụ Jehova agụụ ịkpọlite ndị nwụrụ anwụ.—Job 14:14, 15.

    Baịbụl kwukwara na mgbe Ọkpara Chineke bịara n’ụwa, ọ gwọrọ ọtụtụ ndị ọrịa. Maka gịnị? Ọ bụ maka na ọ chọrọ. (Mak 1:40, 41) Jizọs na-eme nnọọ ka Nna ya. Otú ahụ ọ chọrọ inyere ndị ụwa na-ara ahụ́ aka ka Nna ya chọkwara.—Jọn 14:9.

    Ọ bụ ya mere obi ji kwesị isi anyị ike na Jehova na Jizọs chọrọ ime ka ihe dịrị anyị mma n’ọdịnihu.—Abụ Ọma 72:12-14; 145:16; 2 Pita 3:9.

 IHE Ị GA-ECHEBARA ECHICHE

Olee otú Chineke ga-esi eme ka ụwa anyị a ka mma?

Ị gụọ MATIU 6:9, 10 na DANIEL 2:44, ị ga-amata azịza ya.

GỤKWUO GBASARA YA

OZI ỌMA SI N’AKA CHINEKE!

Gịnị Ka Chineke Bu n’Obi Kee Ụwa Anyị A?

Baịbụl kwuru ihe mere Chineke ji kee ụwa, mgbe nsogbu ga-akwụsị, otú ụwa ga-esi ghọọ paradaịs na ndị ga-ebi na ya.

OZI ỌMA SI N’AKA CHINEKE!

Gịnị Bụ Alaeze Chineke?

Onye bụ Eze Alaeze Chineke, gịnị ka Alaeze Chineke ga-emere ụmụ mmadụ?