Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

ỤLỌ NCHE NỌVEMBA 2015

 ISIOKWU ỤLỌ NCHE A | OLEE OTÚ CHINEKE SI ELE ỊLỤ AGHA ANYA?

Otú Chineke Si Ele Ịlụ Agha Anya n’Oge Anyị A

Otú Chineke Si Ele Ịlụ Agha Anya n’Oge Anyị A

A na-emegbu ndị mmadụ taa. Ọtụtụ n’ime ha kwa na-etiku Chineke ọtụtụ ugboro ka ọ napụta ha. Ha amaghị ma è nwere mgbe ha ga-emecha nwere onwe ha. Chineke ọ̀ na-anụ mkpu a ha na-etiku ya ka o nyere ha aka? Oleekwanụ maka ndị nke na-aga agha iji kwụsị mmegbu a na-emegbu ha? Chineke ọ̀ na-akwado ha, sị na o nwere ezigbo ihe mere ha ji alụ agha ahụ?

Amagedọn bụ agha Chineke ga-eji akwụsị agha niile

E nwere otu ihe kwesịrị ịkasi gị obi. Ihe ahụ bụ na Chineke na-ahụ ahụhụ ndị mmadụ na-ata taa, ọ chọkwara ime ka ọ kwụsị. (Abụ Ọma 72:13, 14) Chineke kwere nkwa na Baịbụl na ọ ga-eme ka “ndị a na-akpagbu nwere onwe” ha. Olee mgbe ọ ga-eme ya? “Mgbe a ga-ekpughe Onyenwe anyị Jizọs site n’eluigwe, ya na ndị mmụọ ozi ya dị ike . . . mgbe ọ na-abọ ọbọ n’ahụ́ ndị na-amaghị Chineke, na ndị na-adịghị erube isi n’ozi ọma banyere Onyenwe anyị Jizọs.” (2 Ndị Tesalonaịka 1:7, 8) A ga-ekpughe Jizọs n’ọdịnihu n’agha Baịbụl kpọrọ “agha nke oké ụbọchị nke Chineke, Onye Pụrụ Ime Ihe Niile.” A na-akpọkwa agha a Amagedọn.—Mkpughe 16:14, 16.

Chineke agaghị eji ụmụ mmadụ lụọ agha a, kama, ọ ga-eji Ọkpara ya, bụ́ Jizọs Kraịst, na ndị mmụọ ndị ọzọ dị́ ike bibie ndị ọjọọ niile. Ha ga-eme ka mmegbu niile kwụsị.—Aịzaya 11:4; Mkpughe 19:11-16.

Chineke agbanwebeghị otú o si ele ịlụ agha anya. Ọ ka na-ele ya anya ka otú kwesịrị ekwesị isi kwụsị mmegbu na ihe ọjọọ niile. Ma, dị ka ọ dị kemgbe ụwa, ọ bụ Chineke n’onwe ya ga-ekpebi mgbe a ga-alụ agha ọ kwadoro na ndị ga-alụ ya. Anyị ahụla na Chineke ekpebiela na ọ bụ n’ọdịnihu ka a ga-alụ agha ọ ga-eji kwụsị ihe ọjọọ na mmegbu kpamkpam, nakwa na ọ bụ Ọkpara ya, bụ́ Jizọs Kraịst, ga-alụ agha a. Ihe ọ pụtara bụ na Chineke anaghị akwado agha  ndị a na-alụ n’ụwa taa, ọ sọkwa ya ya bụrụ na e bu ezigbo ihe n’obi na-alụ ya.

Ka e were ya na o nwere ihe na-esere ụmụnne abụọ mgbe papa ha na-anọghị n’ụlọ. Ha esekata okwu ahụ kpọọ papa ha n’ekwentị ka o kpeziere ha. Otu agwa papa ha na ọ bụ nwanne ya bu ụzọ chọọ ya okwu, nwanne ya asị na ọ bụghị eziokwu na ọ bụ onye nke ahụ bu ụzọ chọọ ya okwu. Onye nke ọ bụla ana-achọ ka papa ha kwado ya. Ma, mgbe ha kwuchara, papa ha asị ha esezila okwu, na ya ga-edoziri ha okwu ha ma ya lọta. Ha echetụ papa ha, bido lụwa ọgụ. Papa ha emechaa lọta, hụ ka ha na-alụ ọgụ, ezigbo iwe ewee ya, ya ataa ha abụọ ahụhụ.

Mba ndị na-alụ agha taa na-arịọkarị Chineke ka o nyere ha aka ka ha merie. Ma e nweghị ndị Chineke na-akwado n’agha ndị a na-alụ taa. Kama nke ahụ, ọ gwara anyị n’Okwu ya, bụ́ Baịbụl, sị: “Unu ejila ihe ọjọọ akwụ onye ọ bụla ụgwọ ihe ọjọọ.” Ọ sịkwara: “Unu abọrọla onwe unu ọbọ.” (Ndị Rom 12:17, 19) O meekwala ka o doo ụmụ mmadụ anya na ha kwesịrị ‘icheresi ya ike’ ruo mgbe ọ ga-eji agha Amagedọn bọọrọ ndị ya ọbọ. (Abụ Ọma 37:7) Ọ bụrụ na mba dị iche iche ajụ ichere Chineke ma gaa lụwa agha, ọ na-ewere ya na ha dị mpako, ọ na-ewekwa ya iwe. Ọ bụ ya mere Chineke ga-eji weso mba niile iwe ma jiri agha Amagedọn doziere mba niile okwu ha ma mee “ka agha kwụsị ruo na nsọtụ ụwa.” (Abụ Ọma 46:9; Aịzaya 34:2) N’eziokwu, Amagedọn bụ agha Chineke ga-eji akwụsị agha niile.

Otu n’ime ihe ọma Alaeze Chineke ga-emere ụmụ mmadụ bụ ime ka agha kwụsị. Jizọs kwuru gbasara Alaeze a n’otu ekpere a ma ama. Ọ sịrị: “Ka alaeze gị bịa. Ka uche gị meekwa n’ụwa, dị ka ọ na-eme n’eluigwe.” (Matiu 6:10) Ọ bụghị naanị agha ka Alaeze Chineke ga-ewepụ. Ọ ga-ewepụkwa ihe niile na-akpata agha. * (Abụ Ọma 37:9, 10, 14, 15) Ka a sịkwa ihe mere o ji na-agụsi ndị na-eso ụzọ Jizọs agụụ ike ka Alaeze Chineke bịa.—2 Pita 3:13.

Ruo ole mgbe ka anyị ga na-eche ka Alaeze Chineke bịa mee ka ahụhụ, mmegbu na ihe ọjọọ ndị na-eme n’ụwa kwụsị? Amụma Baịbụl ndị na-emezu ugbu a na-egosi na anyị bi “n’oge ikpeazụ.” (2 Timoti 3:1-5) * N’oge na-adịghị anya, Alaeze Chineke ga-eji agha Amagedọn mee ka nsogbu ndị anyị na ha na-alụ n’oge ikpeazụ a kwụsị.

Dị ka anyị kwurula, ndị a ga-egbu n’agha ikpeazụ a ga-abụ “ndị na-adịghị erube isi n’ozi ọma banyere Onyenwe anyị Jizọs.” (2 Ndị Tesalonaịka 1:8) Cheta na ọnwụ ndị mmadụ, ma nke ndị ajọ omume, anaghị atọ Chineke ụtọ. (Ezikiel 33:11) Ebe ọ bụ na “ọ chọghị ka e bibie onye ọ bụla” n’agha ikpeazụ a, ọ na-ahụ ugbu a na e kwusara ozi ọma banyere Onyenwe anyị Jizọs “n’elu ụwa dum mmadụ bi ka ọ bụrụ àmà nye mba niile” tupu ọgwụgwụ abịa. (2 Pita 3:8, 9; Matiu 24:14; 1 Timoti 2:3, 4) N’eziokwu, ozi ọma Ndịàmà Jehova na-ekwusa n’ụwa niile na-enyere ndị mmadụ aka ịmata onye Chineke bụ, rube isi n’ozi ọma banyere Jizọs, ma nwee olileanya ịnọ ndụ hụ mgbe agha na-agaghịzi adị.

^ para. 9 Alaeze Chineke ga-emekwa ka ọnwụ, bụ́ onye iro ụmụ mmadụ, gharazie ịdị. Ihe e kwuru na peeji nke iri na isii n’akwụkwọ a gosiri na Chineke ga-akpọlite imirikiti ndị nwụrụ anwụ n’ọnwụ, ma ọtụtụ ndị agha gburula kemgbe ụwa.

^ para. 10 Ọ bụrụ na ị chọrọ ịmatakwu ihe Baịbụl kwuru banyere oge ikpeazụ, gụọ isi nke 9 n’akwụkwọ Gịnị n’Ezie Ka Bible Na-akụzi? Ọ bụ Ndịàmà Jehova bipụtara ya.

GỤKWUO GBASARA YA

Onye Na-akpata Agha na Ahụhụ

Olee ihe Baịbụl kwuru nke gosiri na o nwere ihe gbasara agha a lụrụ n’eluigwe na agha a lụrụ n’ebe niile n’ụwa nakwa nsogbu ndị juru n’ụwa?

Gịnị Mere Ndịàmà Jehova Anaghị Aga Agha?

A ma Ndịàmà Jehova ama n’ụwa niile na ha anaghị ekwe aga agha. Gụọ ihe a ka ị hụ ihe kpatara ya.