Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

ỤLỌ NCHE NỌVEMBA 2015

 ṄOMIE OKWUKWE HA | TIMOTI

“Nwa M M Hụrụ n’Anya nke Kwesịrị Ntụkwasị Obi n’Ime Onyenwe Anyị”

“Nwa M M Hụrụ n’Anya nke Kwesịrị Ntụkwasị Obi n’Ime Onyenwe Anyị”

WERE ya na ị na-ahụ Timoti n’ụtụtụ otu ụbọchị ka o si n’ụlọ ha na-apụ. Uche ya niile dị n’ihe ọ na-aga ime n’ebe ọ na-aga. E nwere ndị ya na ha so na-aga. Ndị ahụ nọ ya n’ihu, ya ana-eso ha n’azụ. Ụzọ ha si aga bụ ụzọ Timoti maara nke ọma. Obodo ha si na ya na-apụ bụ Listra. Obodo a dị na ndagwurugwu. Timoti nọ na-amụmụ ọnụ ọchị ka ọ na-eche otú mama ya na nne nne ya si na-ele ya, obi abụrụ ha sọ aṅụrị n’agbanyeghị na ọ na-ewutekwa ha na ọ na-ahapụ ha. Ya adị ya ka ya tụgharịa, feere ha aka ọzọ.

Pọl onyeozi so ná ndị ya na ha so na-apụ. Ka ha na-aga, Pọl gụrụ gụrụ, ya atụgharịa, lee Timoti anya, mụmụọrọ ya ọnụ ọchị. Ọ ma na Timoti ka na-emetụ ihere, ma obi dị ya ụtọ na Timoti dị nnọọ njikere iso ya jee ozi. Timoti ka bụ nwa okorobịa. Ọ ga-abụ na ọ nọ n’agbata afọ iri na asaa na afọ iri abụọ na atọ. Ọ hụrụ Pọl n’anya, na-asọpụrụkwa ya. Ugbu a, Timoti ji obi ya niile sí n’ụlọ ha soro Pọl na-aga ebe dị ezigbo anya. Ha ga-eji ụkwụ na ụgbọ mmiri gaa ma ebe ndị dị mma ma ebe ndị nwere ike ịta isi ha. Timoti amaghị ma ọ̀ ga-akpakwa ụkwụ n’ụlọ ha ọzọ.

Gịnị mere Timoti ji chọọ iso Pọl jewe ozi? Olee uru ọ ga-abara ya? Oleekwa otú anyị ga-esi nwee ụdị okwukwe Timoti nwere?

“MALITE N’OGE Ị BỤ NWA ỌHỤRỤ”

Ka anyị lebagodị anya ugbu a n’ihe mere ihe dị ka afọ abụọ ma ọ bụ atọ tupu Timoti esi na Listra pụwa. O yikarịrị ka Timoti ọ̀ bụ onye Listra. Listra bụ obere obodo dịpụrụ adịpụ. Ọ dịkwa na ndagwurugwu mmiri na-ede nke ọma. Ọ ga-abụ na ndị Listra ma asụsụ Grik, ma, ha na-asụkwa asụsụ ha bụ́ Likeonian. Otu ụbọchị, oké mkpọtụ bidoro ime n’obodo a n’ihi otu ọrụ ebube Pọl onyeozi rụrụ. Ya na Banabas onyeozi ibe ya bịarutere Aịkoniọm, bụ́ nnukwu obodo dị́ nso na Listra, ma bido ikwusa ozi ọma. Ka ha nọ na-ekwusa ozi ọma, Pọl hụrụ otu nwoke dara ngwọrọ, mee ka ọ malite ịga ije, n’ihi na ọ chọpụtara na o nwere okwukwe.—Ọrụ Ndịozi 14:5-10.

N’otu akụkọ mgbe ochie a na-akọ na Listra, e kwuru na n’oge ochie, e nwere chi ndị na-enwogha dịrị ka ụmụ mmadụ. Ọtụtụ ndị Listra kwekwaara na ọ bụ eziokwu. Ọ bụ ya mere na mgbe ha hụrụ ihe Pọl mere, ha bidoro ịkpọ ya chi ha bụ́ Hemis, na-akpọkwa Banabas Zus. O siri ike tupu Ndị Kraịst a dị́ umeala n’obi egbochie ìgwè mmadụ ahụ ịchụrụ ha àjà.—Ọrụ Ndịozi 14:11-18.

Ma e nwere ụfọdụ ndị nọ na Listra ma na ndị a abụghị chi ndị bịara ileta ha. Ha ma na ha bụ ndị mmadụ nkịtị. Ihe ahụ ha mere tọkwara ha ụtọ. Mmadụ abụọ n’ime ha bụ Yunis na mama ya bụ́ Lọịs. Yunis bụ nwaanyị onye Juu, ma di ya bụ onye Grik. * Ya na mama ya ji obi ụtọ gee Pọl na Banabas ntị nke ọma. Ha nụrụ ihe onye Juu ọ bụla na-atụ anya ịnụ kemgbe, ya bụ, na Mesaya abịala nakwa na o mezuola ọtụtụ amụma ndị e dere n’Akwụkwọ Nsọ na ọ ga-emezu.

Chegodị otú obi dị Timoti maka ọbịbịa a Pọl bịara n’ebe ha. E si n’oge Timoti “bụ nwa ọhụrụ” kụziwere ya inwe mmasị n’ihe ndị dị́ nsọ dị́  n’Akwụkwọ Nsọ Hibru. (2 Timoti 3:15) Timoti chọpụtara na ihe Pọl na Banabas kwuru gbasara Mesaya bụ eziokwu otú nne ya na nne nne ya chọpụtakwara. Chegodị gbasara nwoke ahụ dara ngwọrọ Pọl mere ka ọ gawa ije. Ọ ga-abụ na kemgbe Timoti dị obere, ọ na-ahụ nwoke ahụ ọtụtụ ugboro ka ọ nọ n’okporo ámá na Listra. Ma ugbu a, ọ hụla ka nwoke a bidoro gawa ije. Ka a sịkwa ihe mere Yunis na Lọịs nakwa Timoti ji ghọọ Ndị Kraịst. Ọ bụrụ na ị bụ nne, nna, mama ukwu ma ọ bụ papa ukwu, e nwere ọtụtụ ihe ị ga-amụta n’aka Lọịs na Yunis. Ò nwere ihe ọma ụmụaka gị nwere ike ịmụta n’aka gị?

“SITE N’ỌTỤTỤ MKPAGBU”

Ọ ga-abụ na obi tọrọ ndị ghọrọ Ndị Kraịst na Listra ụtọ mgbe ha matara uru ha ga-erite n’ihi na ha na-eso ụzọ Kraịst. Ma, ha matakwara na ihe agaghị adịchara ha mfe. Ụfọdụ ndị okpukpe ndị Juu na-agba ara si Aịkoniọm na Antiọk bịa mee ka ndị Listra bido imegide Pọl na Banabas. Obere oge, ìgwè mmadụ iwe ji tụgidere Pọl nkume ya adaa n’ala. Ha dọkpụụrụ Pọl gaa n’azụ obodo, tọgbọ ya ebe ahụ, na-eche na ọ nwụọla.—Ọrụ Ndịozi 14:19.

Ma Ndị Kraịst nọ́ na Listra gara ebe ahụ Pọl tọgbọ, gbaa ya gburugburu. Obi dị ha ụtọ mgbe Pọl megharịrị ahụ́, bilie ma jiri obi ike laghachi Listra. N’echi ya, Pọl na Banabas gawara Dabe ikwusa ozi ọma. Mgbe ha mechara ka ọtụtụ ndị ghọọ ndị na-eso ụzọ Jizọs n’ebe ahụ, ha ji obi ike laghachi Listra n’agbanyeghị na e nwere ike igbu ha ebe ahụ. Gịnị meziri? Baịbụl kwuru na ha laghachiri “na-ewusi mkpụrụ obi nke ndị na-eso ụzọ Jizọs ike, na-agba ha ume ka ha nọgide n’okwukwe Ndị Kraịst.” Weregodị ya na ị na-ahụ ka Timoti kporopụrụ anya na-ege ntị ka Pọl na Banabas na-agwa Ndị Kraịst ahụ na o nweghị ihe ahụhụ ahụ ha na-ata bụ ma e jiri ya tụnyere olileanya dị́ ebube ha nwere. Ha kwuru, sị: “Anyị aghaghị ịbanye n’alaeze Chineke site n’ọtụtụ mkpagbu.”—Ọrụ Ndịozi 14:20-22.

Timoti gere ezigbo ntị mgbe Pọl onyeozi na-akụzi ihe

Timoti ejirila anya ya hụ ka Pọl na-edi ahụhụ a na-ata ya n’ihi ozi ọma ọ na-ekwusara ndị mmadụ. Timoti ma na ya sowe Pọl na-eje ozi, ndị Listra ga-emegide ya, nna ya nwekwara ike imegide ya. Ma, Timoti ekweghị ka ihe ndị ahụ gbanwee mkpebi o mere gbasara otú ọ chọrọ isi na-ejere Chineke ozi. E nwere ọtụtụ ndị na-eto eto na-emekwa ka Timoti taa. Ha na-akpachapụ anya họrọ ndị enyi okwukwe ha siri ike, ndị ga na-agba ha ume ime uche Chineke. Ha anaghị ekwe ka ndị mmegide mee ka ha kwụsị ife Chineke.

 ‘ỤMỤNNA KỌRỌ AKỤKỌ ỌMA BANYERE YA’

Dị ka anyị kwuburu, o nwere ike ịbụ mgbe ihe dị ka afọ abụọ ma ọ bụ atọ gachara ka Pọl bịaghachiri Listra. Ya na Saịlas so na nke ugbu a. Weregodị ya na ị na-ahụ ka obi na-atọ ndị ezinụlọ Timoti hà ụtọ mgbe Pọl hà rutere. O doro anya na obi na-atọkwa Pọl ezigbo ụtọ. O jirila anya ya hụ na ozi ọma o ziri na Listra arụpụtala ezigbo ihe. Obi dị ya ụtọ na Lọịs na nwa ya nwaanyị, bụ́ Yunis, bụzi ezigbo Ndị Kraịst nwere okwukwe “nke na-abụghị nke ihu abụọ ọ bụla.” (2 Timoti 1:5) Gịnịkwanụ ka ọ chọpụtara gbasara Timoti?

Pọl chọpụtara na kemgbe ikpeazụ ahụ ọ bịara Listra, Timoti aghọọla ezigbo Onye Kraịst. Ma ụmụnna nọ́ na Listra ma ndị nke nọ́ n’Aịkoniọm ‘kọrọ akụkọ ọma banyere Timoti.’ Obodo Aịkoniọm dị ihe dị ka kilomita iri atọ na abụọ ma e si ebe ugwu Listra gawa ya. (Ọrụ Ndịozi 16:2) Olee otú Timoti si bụrụ onye a na-akọ akụkọ ọma banyere ya otú a?

E nwere ndụmọdụ ndị ga-abara ndị na-eto eto ezigbo uru dị́ ‘n’ihe odide ndị ahụ dị nsọ’ nne Timoti na nne nne ya ji kụziere ya ihe ‘malite n’oge ọ bụ nwa ọhụrụ.’ (2 Timoti 3:15) Otu n’ime ha bụ: “Cheta Onye Okike Ukwu gị n’oge ị bụ okorobịa.” (Ekliziastis 12:1) Timoti ghọtakwuru ihe mmadụ icheta Onye kere ya pụtara mgbe ọ ghọrọ Onye Kraịst. Ọ ghọtara na otu n’ime ụzọ kacha mma ọ ga-esi echeta Onye kere ya bụ ịna-ezi ndị mmadụ ozi ọma banyere Ọkpara Chineke, bụ́ Kraịst. Timoti ji nwayọọ nwayọọ kwụsị ime ihere, jirizie obi ike na-ezi ndị mmadụ ozi ọma banyere Jizọs Kraịst.

Ụmụnna ndị na-elekọta ọgbakọ dị iche iche hụrụ otú Timoti si na-eme nke ọma. O doro anya na obi tọrọ ha ụtọ mgbe ha hụrụ otú o si na-agba ụmụnna ibe ya ume ma na-enyere ha aka. Ma, nke ka nke bụ na Jehova hụkwara na ọ na-eme nke ọma. O mere ka e buo amụma ụfọdụ ga-emezu n’isi Timoti. O nwere ike ịbụ na amụma ndị ahụ bụ na Timoti ga-emecha rụọ ọrụ ga-abara ọtụtụ ọgbakọ uru. Mgbe Pọl gara na nke Timoti hà, ọ chọpụtara na Timoti ga-abara ya ezigbo uru ma o soro ya gaa ziwe ozi ọma ná mba ọzọ. Pọl gwaziri ụmụnna nọ́ na Listra ka Timoti soro ya, ha ekweta. Ha bikwasịrị Timoti aka n’isi iji gosi na a họpụtala ya ka o jewere Jehova ozi pụrụ iche.—1 Timoti 1:18; 4:14.

O doro anya na ozi a pụrụ iche a họpụtara Timoti ka o jewe tụrụ ya n’anya, ọ dịkwa njikere ịga. * Ma, olee ihe nna ya na-abụghị Onye Kraịst mere mgbe ọ nụrụ na a họpụtala nwa ya ịga mba ọzọ na-ezisa ozi ọma? Ọ ga-abụ na ọ bụghị ụdị ọrụ a ka o bu n’obi ka nwa ya rụọ. Oleekwanụ otú obi dị nne Timoti na nne nne ya? Hà gosiri na obi dị ha ụtọ, ma, n’ime ime obi ha ha ana-eche banyere nsogbu ndị nwere ike ịbịara nwa ha? O nweghị ihe o mere ma ha chee ụdị ihe a, n’ihi na ọ bụ otú ahụ ka ọ na-adị ndị mụrụ ụmụ.

Otu ihe doro anya bụ na Timoti so Pọl na Saịlas gawa. Ọ bụ n’ụtụtụ ụbọchị ahụ anyị kwuru gbasara ya ná mbido isiokwu a ka Timoti bidoro iso Pọl onyeozi aga ozi ọma ná mba dị iche iche. Ha ji nwayọọ nwayọọ pụọ na Listra. Ha atọ gagidere ije sí n’ụtụtụ ruo ná mgbede tupu ha erute Aịkoniọm. Timoti hụziri otú Pọl na Saịlas si na-agwa ọgbakọ dị ebe ahụ ihe ọhụrụ òtù na-achị isi nọ́ na Jeruselem chọrọ ka ha na-eme, hụkwa otú ha si na-agba mbọ eme ka okwukwe Ndị Kraịst nọ́ ebe ahụ sie ike. (Ọrụ Ndịozi 16:4, 5) Ma, nke a ka bụ mbido.

Mgbe Pọl, Saịlas na Timoti letachara ọgbakọ Aịkoniọm na ọgbakọ ndị ọzọ dị́ na Galeshia, ha ji ụkwụ sí n’okporo ụzọ ndị Rom a wụrụ awụ gaa ọtụtụ narị kilomita rute Frijia. Ha bu ụzọ gaa ebe ugwu Frijia, mechaa gaa ebe ọdịda anyanwụ ya. Ha na-aga ebe ọ bụla mmụọ nsọ Chineke gwara ha. Ha gara Troas, sizie ebe ahụ banye ụgbọ mmiri gawa Masedonia. (Ọrụ Ndịozi 16:6-12) Ka ha nọ na-aga ebe ndị a, Pọl chọpụtara na Timoti baara ha uru. Ọ bụ ya mere obi ji sie Pọl ike ịhapụ naanị Timoti na Saịlas n’obodo Beria gawa ebe ọzọ. (Ọrụ Ndịozi 17:14) O mechadịrị ziga naanị Timoti ka ọ gaa Tesalonaịka. Mgbe Timoti gara ebe ahụ, o ji ihe niile ọ mụtara n’aka Pọl na Saịlas mee ka okwukwe Ndị Kraịst ibe ya nọ́ n’ebe ahụ sikwuo ike.—1 Ndị Tesalonaịka 3:1-3.

 Pọl mechara dee gbasara Timoti, sị: “Enweghị m onye ọzọ nke nwere ụdị obi o nwere, bụ́ onye ihe banyere unu ga-emetụ n’obi n’ezie.” (Ndị Filipaị 2:20) Ndị mmadụ anọkataghị kwuwe okwu ọma banyere Timoti. Ha hụrụ otú o si arụsi ọrụ ike, dịrị umeala n’obi ma tachie obi mgbe ọ na-ata ahụhụ n’ihi ozi ọ na-ejere Chineke. Ị bụrụ onye na-eto eto, i nwere ike ịmụta ihe n’aka ya. Echefukwala na i nwere ike ime ka ndị mmadụ na-akọ akụkọ ọma banyere gị. Ọ bụrụ na i jiri ife Jehova Chineke kpọrọ ihe, na-akwanyere ndị ọzọ ùgwù ma na-enyere ha aka, ndị mmadụ ga na-ekwukwa okwu ọma banyere gị.

“GBALỊSIE IKE KA Ị BỊAKWUTE M”

Timoti si na nwata malite iji oge ya niile na-ekwusa ozi ọma

Timoti so Pọl jee ozi ruo ihe dị ka afọ iri na anọ. O so ya taa ahụhụ ndị ọ tara, sorokwa ya ṅụrịa ọṅụ mgbe ọ na-aṅụrị ọṅụ. (2 Ndị Kọrịnt 11:24-27) E nwedịrị mgbe a tụrụ Timoti mkpọrọ n’ihi ozi ọma ọ na-ekwusa. (Ndị Hibru 13:23) Timoti hụkwara ụmụnna ya ndị nwoke na ndị nwaanyị n’anya ma na-echebakwara ha echiche ka Pọl. Pọl degaara Timoti akwụkwọ ozi ma sị ya: “M na-echeta anya mmiri gị.” (2 Timoti 1:4) Timoti mụtara ime ka Pọl. Ọ dị ka ọ̀ mụtara ‘iso ndị na-akwa ákwá kwaa ákwá,’ ihe na-ewute ndị ọzọ ana-ewutekwa ya, nke mere ka o nwee ike ịgba ha ume ma kasie ha obi. (Ndị Rom 12:15) Onye ọ bụla n’ime anyị kwesịrị ịgbalị na-eme ka ya.

Timoti mechara ghọọ onye nlekọta e ji ama atụ n’ọgbakọ Ndị Kraịst. Pọl gwadịrị Timoti ka ọ na-ahọpụta ndị nwoke ruru eru ịbụ ndị okenye na ndị ohu na-eje ozi nakwa ka ọ na-eleta ọgbakọ dị iche iche ma na-agba ha ume.—1 Timoti 5:22.

Pọl hụrụ Timoti n’anya. O weere ya dị ka nwa ya, na-enyekwa ya ndụmọdụ ga-abara ya uru dị ka nwa okorobịa. Ọ gwara Timoti ka ọ na-echebara ihe ndị ọ mụtara echiche nakwa ka ọ na-eme ka ọganihu ya pụta ìhè. (1 Timoti 4:15, 16) Pọl gwakwara Timoti ka ọ ghara ikwe ka ihere ma ọ bụ ịsọ ndị tọrọ ya anya mee ka ọ ghara ime ihe dị́ mma o kwesịrị ime. (1 Timoti 1:3; 4:6, 7, 11, 12) Pọl gwadịrị ya ihe o nwere ike ime maka ọrịa ọ na-arịakarị, nke nwere ike ịbụ afọ na-enye ya nsogbu.—1 Timoti 5:23.

Mgbe Pọl hụrụ na oge ọnwụ ya eruwela, nke nwere ike ịbụ oge a ga-egbu ya, o si n’ike mmụọ nsọ degara Timoti akwụkwọ ozi ikpeazụ o degaara ya. Ọ gwara ya okwu na-emetụ n’ahụ́. Ọ gwara ya, sị: “Gbalịsie ike ka ị bịakwute m n’oge na-adịghị anya.” (2 Timoti 4:9) Pọl hụrụ Timoti n’anya nke na ọ kpọrọ ya “nwa m m hụrụ n’anya nke kwesịrị ntụkwasị obi n’ime Onyenwe anyị.” (1 Ndị Kọrịnt 4:17) Ka a sịkwa ihe mere o ji chọọ ka enyi ya a nọrọ ya nso mgbe oge ọnwụ ya ruwere. Onye ọ bụla n’ime anyị kwesịrị ịjụ onwe ya, sị: ‘Ndị mmadụ hà na-achọ ka m bịa kasie ha obi ma ha nwee nsogbu?’

Timoti ọ̀ garuru hụ Pọl tupu Pọl anwụọ? Anyị amaghị. Ma anyị ma na Timoti gbalịrị ike ya ịkasi Pọl na ndị ọzọ obi nakwa ịgba ha ume. Aha ya bụ́ Timoti pụtara “Onye Na-asọpụrụ Chineke.” Ọ sọpụkwaara Chineke n’eziokwu. Anyị niile, ma ndị na-eto eto ma ndị agadi, kwesịrị iṅomi okwukwe Timoti.

^ para. 9 Gụọ isiokwu bụ́ “Ị̀ Maara?” nke dị́ n’Ụlọ Nche a.

^ para. 20 Mgbe Pọl gwara Timoti na ya chọrọ ibi ya úgwù, Timoti kwetara. Ihe mere o ji kweta abụghị maka na ọ bụ ihe Onye Kraịst ga-emerịrị, kama, ebe ọ bụ na nna ya bụ onye Jentaịl, Pọl achọghị ka ndị Juu jiri maka Timoti jụ ige ntị n’ozi ọma ha ga-ezi ha.—Ọrụ Ndịozi 16:3.