Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

ỤLỌ NCHE ỌKTOBA 2015

 ISIOKWU ỤLỌ NCHE A | Ọ̀ BADỊRỊ URU IKPE EKPERE?

È Nwere Onye Na-ege Ntị n’Ekpere Anyị?

È Nwere Onye Na-ege Ntị n’Ekpere Anyị?

Ụfọdụ ndị chere na mmadụ ikpe ekpere bụ igbu oge, na e nweghị onye na-ege ntị n’ekpere anyị. E nweela ndị gbalịrịnụ kpee ekpere, ma ya adị ha ka a zaghị ekpere ha. Otu onye na-ekweghị na Chineke dị nọkatara sị ka ya gwagodị onye o chere ndị mmadụ na-asị na ọ bụ Chineke okwu. O kpeziri ekpere sị ka Chineke takwunyere ya obere ihe ka ọ nụ, ma, Chineke ekwughị ihe ọ bụla.

Ma, Baịbụl gwara anyị na Chineke dị nakwa na ọ na-anụ ekpere. Ọtụtụ afọ gara aga, Baịbụl kwuru, sị: ‘Chineke aghaghị imere gị amara mgbe ọ nụrụ mkpu ákwá gị; ọ ga-aza gị ozugbo ọ nụrụ ya.’ (Aịzaya 30:19) Ebe ọzọ na Baịbụl kwuru na “ekpere ndị ziri ezi bụ ihe na-atọ ya ụtọ.”—Ilu 15:8.

Jizọs kpegaara Nna ya ekpere, “a nụkwara olu ya.”Ndị Hibru 5:7

Baịbụl kwukwara gbasara ụfọdụ ndị a zara ekpere ha. Otu amaokwu Baịbụl kwuru na Jizọs kpesiri ekpere ike ma “rịọ Onye ahụ nke nwere ike ịzọpụta ya n’ọnwụ arịrịọ, a nụkwara olu ya.” (Ndị Hibru 5:7) Na Daniel 9:21 na 2 Ihe E Mere 7:1, e dekwara ekpere ndị ọzọ Chineke zara.

Oleezi ihe mere o ji adị ụfọdụ ka a naghị aza ekpere ha? Ọ bụrụ na anyị chọrọ ka a za ekpere anyị, anyị kwesịrị ikpegara naanị Chineke, onye aha ya bụ Jehova, * ekpere, ọ bụghị chi ọ bụla ọzọ ma ọ bụ ndị nna ochie. Chineke chọrọ ka anyị na-arịọ ya ihe “dị ka uche ya si dị.” Ọ bụrụ na ihe anyị na-arịọ bụ dị ka uche Chineke si dị, Chineke kwuru na ya ‘ga-anụ olu anyị.’ (1 Jọn 5:14) N’ihi ya, ọ bụrụ na anyị chọrọ ka a za ekpere anyị, anyị kwesịrị ịmata onye Chineke ahụ e kwuru okwu ya na Baịbụl bụ, matakwa ihe bụ́ uche ya.

Ọtụtụ ndị kweere na ekpere abụghị naanị ihe e ji ama ndị na-aga chọọchị. Kama, na Chineke na-anụ ekpere ma na-azakwa ya. Otu nwoke onye Kenya aha ya bụ Isaac, kwuru, sị: “M kpere ekpere ka Chineke nyere m aka ịghọta Baịbụl. Obere oge m kpechara ekpere ahụ, otu onye abịakwute m bido kụziwere m Baịbụl.” Otu nwaanyị Filipinz aha ya bụ Hilda chọrọ ịkwụsị ịṅụ sịga. Mgbe ọ gbalịchara ike ya ka ọ kwụsị ịṅụ sịga, ma o nweghị isi, di ya gwara ya, sị: “Rịọnụ Chineke ka o nyere gị aka.” O mere ihe a di ya gwara ya. O mechara kwuo, sị: “Otú Chineke si nyere m aka tụrụ m n’anya. O mere ka ịṅụ sịga kwụsị ịna-agụ m agụụ. M mechara kwụsị ịṅụ sịga.”

Chineke ọ̀ ga-emere gị ihe ị chọrọ ka o meere gị, nke dị ka uche ya si dị?

^ para. 6 Baịbụl kwuru na aha Chineke bụ Jehova.