Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

ỤLỌ NCHE SEPTEMBA 2015

Baịbụl Bedel Mere Ka Ndị Mmadụ Ghọtakwuo Okwu Chineke

Baịbụl Bedel Mere Ka Ndị Mmadụ Ghọtakwuo Okwu Chineke

MGBE otu onye Bekee, bụ́ onye ụkọchukwu, aha ya bụ Wiliam Bedel gara Ayaland n’afọ 1627, ọ hụrụ ihe gbara ya gharịị. Ọtụtụ ndị Ayaland bụ ndị Katọlik, ma, ọ bụ ndị Briten, bụ́ ndị Protestant, na-achị ha. Ndị Protestant asụgharịala Baịbụl n’ọtụtụ asụsụ a na-asụ na Yurop. Ma, ọ dị ka o nweghị onye chọrọ ka Baịbụl dịrị n’asụsụ Aịrish.

Obi adịghị Bedel mma na e leghaara ndị Ayaland anya naanị n’ihi na ha amaghị Bekee. Ọ malitere ịgba mbọ ka e nwee Baịbụl n’asụsụ Aịrish. Ma, ọtụtụ ndị megidere ya, karịchaa, ndị Protestant. Maka gịnị?

MGBA A GBARA KA A KWỤSỊ ỊNA-ASỤ ASỤSỤ AỊRISH

Bedel bidoro mụwa asụsụ Aịrish. Mgbe ọ ghọrọ onyeisi ụlọ akwụkwọ a na-akpọ Trinity College dị́ na Dọblịn nakwa mgbe o mechara bụrụ bishọp ndị Kilmọ, ọ gbara ụmụ akwụkwọ ya ume ka ha na-asụ ma na-ede asụsụ Aịrish. Ihe medịrị Eze Nwaanyị Elizabet nke Mbụ nke Ịngland ji hiwe ụlọ akwụkwọ Trinity College bụ ka a zụpụta ndị ụkọchukwu ga-eji asụsụ Aịrish na-akụzirị ndị ọ na-achị Baịbụl. Bedel gbara mbọ ka ihe a mee.

Ọtụtụ ndị nọ́ na dayọsis Kilmọ na-asụ Aịrish. Ọ bụ ya mere Bedel ji sie ọnwụ na ndị ga-abụ ndị ụkọchukwu na dayọsis ahụ kwesịrị ịbụ ndị ma asụsụ Aịrish. Ebe ọ gbakwasịrị ụkwụ kwuo ihe a o kwuru bụ n’ihe Pọl onyeozi kwuru ná 1 Ndị Kọrịnt 14:19. Ebe ahụ sịrị: “N’ime ọgbakọ, m ga-ahọrọ iji obi m kwuo mkpụrụ okwu ise, ka m wee jirikwa ọnụ kụziere ndị ọzọ ihe, kama ikwu puku okwu iri n’asụsụ dị iche,” ya bụ, n’asụsụ ọtụtụ ndị na-amaghị.

Ma, ndị ọnụ na-eru n’okwu mere ihe niile ha nwere ike ime iji mee ka ihe a ọ chọrọ ime ghara inwe isi. Ụfọdụ ndị na-akọ akụkọ ihe mere eme kwuru na e nwere ndị na-asị na ọ bụrụ na ndị mmadụ ana-asụ asụsụ Aịrish “ọ ga-emebiri ndị ọchịchị ihe” nakwa na “ọ gaghị abara ndị ọchịchị uru.” Ụfọdụ chere na ọ bụrụ na e mee ka ndị Ayaland ghara ịma nke a na-akọ, ọ ga-abara ndị Ịngland uru. E nwedịrị iwu ndị e tiri ka ndị Ayaland hapụ asụsụ ha na omenala ha ma mụwa asụsụ Bekee, mewekwa ihe otú ndị Bekee si eme.

BEDEL EBIDO ỊSỤGHARỊ BAỊBỤL N’ASỤSỤ AỊRISH

Bedel ekweghị ka ndị mmegide kụda ya aka. N’ihe dị ka n’afọ 1634, o si na Baịbụl Bekee e bipụtara n’afọ 1611 (ya bụ, King James Version) sụgharịwa Baịbụl n’asụsụ Aịrish. Ọ chọrọ iwepụta Baịbụl ga-adịrị ọtụtụ ndị Ayaland mfe ịghọta. O doro ya anya na ndị na-amaghị Bekee agaghị amụtali ihe ga-eme ka ha nweta ndụ ebighị ebi ma ọ bụrụ na a sụgharịghị Baịbụl n’asụsụ ha ga-aghọta nke ọma.—Jọn 17:3.

Ọ bụghị naanị Bedel gbara mbọ ịsụgharị Baịbụl n’asụsụ Aịrish. Ihe dị ka afọ iri atọ tupu Bedel ebido ịsụgharị Baịbụl ahụ, otu bishọp aha ya bụ Wiliam Daniel chọpụtara na ọ ga-esiri ndị mmadụ ezigbo  ike ịghọta Baịbụl ma ọ bụrụ na e dere ya “n’asụsụ ha na-amaghị.” Ọ bụ ya mere o ji sụgharịa Akwụkwọ Nsọ Grik nke Ndị Kraịst n’asụsụ Aịrish. Bedel bidoziri ịsụgharị Akwụkwọ Nsọ Hibru. Baịbụl a na-akpọ Baịbụl Bedel bụ Akwụkwọ Nsọ Hibru Bedel sụgharịrị na Akwụkwọ Nsọ Grik Wiliam Daniel sụgharịrị. Baịbụl a bụ Baịbụl mbụ zuru ezu a sụgharịrị n’asụsụ Aịrish, bụrụkwa naanị Baịbụl e nwere n’asụsụ Aịrish ruo narị afọ atọ sochirinụ.

Bedel ma asụsụ Hibru nke ọma, ma ọ chọtara ụmụ amaala Ayaland abụọ ma asụsụ Aịrish ka ha nyere ya aka sụgharịa Baịbụl ahụ. Ha ga-esi n’asụsụ Bekee sụgharịa ya n’asụsụ Aịrish. Ka ha na-asụgharị Baịbụl ahụ, Bedel na otu onye ọzọ ma ọ bụ mmadụ abụọ ọzọ ọ tụkwasịrị obi na-eleru amaokwu nke ọ bụla a sụgharịrị anya ma dezigharịa ihe ndị e kwesịrị idezigharị. O nwekwara akwụkwọ ndị ha leere anya mgbe ha na-asụgharị ya. Otu n’ime ha bụ Baịbụl otu ụkọchukwu onye Swizaland aha ya bụ Giovani Diodati sụgharịrị n’asụsụ Ịtali. Ọzọ abụrụ Septuagint bụ́ Baịbụl a sụgharịrị n’asụsụ Grik nakwa Baịbụl ochie e dere n’asụsụ Hibru.

Ndị sụgharịrị Baịbụl Bedel mere ihe ndị sụgharịrị Baịbụl King James Version mekwara. Ha dere aha Chineke n’ebe ụfọdụ na Baịbụl a. Dị ka ihe atụ, ha dere aha Chineke n’Ọpụpụ 6:3. Otú ha si dee ya bụ “Iehovah.” O nwere ike ịbụ na Bedel ma ọtụtụ n’ime ndị sụgharịrị Baịbụl King James Version. Baịbụl Bedel na ndị òtù ya sụgharịrị dị n’ọ́bá akwụkwọ Mash, nke dị́ na Dọblin, n’Ayaland.—Gụọ igbe isiokwu ya bụ, “E Chetara Bedel na Mbọ Ọ Gbara.”

E MECHARA BIPỤTA YA

Bedel sụgharịchara Baịbụl ahụ n’afọ 1640. Ma o bipụtalighị ya ozugbo ahụ. Gịnị kpatara ya? Otu ihe kpatara ya bụ na ọtụtụ ndị ka na-emegide ya. Ndị  na-emegide ya dere ihe na-abụghị eziokwu gbasara onye nsụgharị ya kacha mara nke a na-akọ. Ihe mere ha ji mee ya bụ ka ndị mmadụ ghara inwe mmasị na Baịbụl ahụ ha na-asụgharị. Ha medịrị ka e jide nwoke ahụ ma tụọ ya mkpọrọ. Nke ka njọ mechara mee. N’afọ 1641, ndị Ayaland bidoro ịgba ndị Bekee na-achị ha mgba okpuru, bidokwa igbu ha. Ụfọdụ ndị Ayaland gbara mbọ zoo Bedel n’agbanyeghị na ọ bụ onye Bekee n’ihi na ha ma na ọ hụrụ ha n’anya. Ma, ndị agha nnupụisi obodo ahụ mechara jide ya ma tụọ ya mkpọrọ. Ọ gaara adịtekwu ndụ aka. Ma, otú ebe ha tụkpuru ya si jọọ njọ mere ka ọ nwụọ n’afọ 1642. Ọ dịghịzi ndụ hụ mgbe e mechara bipụta Baịbụl ahụ.

Ihe e dere ná mbido peeji Baịbụl Bedel na ndị òtù ya sụgharịrị n’ihe dị ka afọ 1640, na Baịbụl ya ahụ e bipụtara n’afọ 1685

Ọ fọrọ obere ka e bibie Baịbụl Bedel ahụ mgbe ndị iro ya gara n’ụlọ ya chọgharịchaa ebe niile ma ò nwere ihe ha ga-enweta, mechaakwa gbaa ụlọ ya ọkụ. Ma, otu enyi ya ebula ụzọ gaa n’ụlọ ya wepụ akwụkwọ niile ahụ ha sụgharịrị. Otu nwoke aha ya bụ Nasisọs Mash, onye mechara ghọọ achịbishọp obodo Amaa, bụrụkwa ụkọchukwu ọnụ na-eru n’okwu na Chọọchị Ayaland, mechara nweta akwụkwọ ndị ahụ. Otu onye sayensị aha ya bụ Rọbọt Bọil nyere ya ego ọ ga-eji ebipụta Baịbụl ahụ. Ọ katara obi bipụta Baịbụl Bedel ahụ n’afọ 1685.

BAỊBỤL BEDEL NYEERE NDỊ MMADỤ AKA ỊGHỌTAKWU BAỊBỤL

Ọ bụ eziokwu na ọtụtụ ndị enweghị mmasị na Baịbụl ahụ Bedel sụgharịrị, ma, o nyeere ndị mmadụ aka ịghọtakwu Okwu Chineke. Ndị ọ kacha nyere aka bụ ndị na-asụ Aịrish, ma ndị nke bí na Ayaland ma ndị nke bí na Skọtland nakwa n’ọtụtụ ebe ndị ọzọ. Ha na Chineke nweziri ike ịdị ná mma n’ihi na ha na-aghọtazi Okwu Chineke n’asụsụ ala ha.—Matiu 5:3, 6.

“Mgbe mụ na ezinụlọ m bidoro ịgụ Baịbụl Bedel, anyị nụwara Okwu Chineke n’asụsụ anyị. O so n’ihe nyeere anyị aka ịghọta eziokwu dị́ n’Akwụkwọ Nsọ”

Baịbụl Bedel ka na-enyere ọtụtụ ndị chọrọ ịmụta eziokwu aka. Otu nwoke na-asụ asụsụ Aịrish mụtara ihe Baịbụl na-akụzi n’oge na-adịchabeghị anya. O kwuru, sị: “Mgbe mụ na ezinụlọ m bidoro ịgụ Baịbụl Bedel, anyị nụwara Okwu Chineke n’asụsụ anyị. O so n’ihe nyeere anyị aka ịghọta eziokwu dị́ n’Akwụkwọ Nsọ.”

GỤKWUO GBASARA YA

Ndị E Nyere Ọrụ Ịsụgharị “Okwu Dị Nsọ nke Chineke”—Ndị Rom 3:2

Kemgbe ọtụtụ afọ gara aga, Ndịàmà Jehova ejirila Baịbụl dị iche iche zie ndị mmadụ ozi ọma. Ma, gịnị mere ha ji jiri aka ha sụgharịa Baịbụl n’asụsụ Bekee a na-asụ ugbu a?