Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

ỤLỌ NCHE SEPTEMBA 2015

 ISIOKWU ỤLỌ NCHE A | OLE NDỊ BỤ NDỊÀMÀ JEHOVA?

Gịnị Ka Ndịàmà Jehova Kweere?

Gịnị Ka Ndịàmà Jehova Kweere?

Ndịàmà Jehova kweere na “Akwụkwọ Nsọ dum si n’ike mmụọ nsọ Chineke” nakwa na “ọ bara uru.” (2 Timoti 3:16) Ọ bụ na Baịbụl ka anyị na-amụta gbasara Onye kere anyị na otú anyị ga-esi na-ebi ndụ bara uru.

Baịbụl kwuru, sị: “Ka ndị mmadụ wee mara na gị onwe gị, onye aha gị bụ Jehova, ọ bụ naanị gị bụ Onye Kasị Elu n’ụwa niile.” (Abụ Ọma 83:18) Ọ bụ ya mere anyị ji efe naanị Jehova Chineke ma na-agba mbọ eme ka ndị ọzọ mara aha ya n’ihi na anyị bụ Ndịàmà ya.—Aịzaya 43:10-12.

Ebe anyị bụ Ndị Kraịst, anyị kweere na Jizọs, bụ́ “Ọkpara Chineke,” * bịara n’ụwa, mechaakwa bụrụ Mesaya. (Jọn 1:34, 41; 4:25, 26) Mgbe ọ nwụrụ, a kpọlitere ya, ya alaghachi n’eluigwe. (1 Ndị Kọrịnt 15:3, 4) O mechakwara bụrụ Eze nke Alaeze Chineke. (Mkpughe 11:15) Alaeze Chineke bụ ọchịchị ga-eme ka ụwa a ghọọ Paradaịs. (Daniel 2:44) Baịbụl kwuru na “ndị dị umeala n’obi ga-enweta ụwa, ha ga-enwekwa obi ụtọ dị ukwuu n’ihi udo nke zuru ebe niile.”—Abụ Ọma 37:11, 29.

“Ha gụwa Baịbụl, ha na-ewere na Chineke na-agwa ha okwu. Ha nwee nsogbu, ha na-agụ Okwu Chineke iji mata ihe ha ga-eme ka nsogbu ahụ bie. . . . Ha kweere na Okwu Chineke ka dị ndụ.”—Ọ bụ ụkọchukwu Katọlik aha ya bụ Benjamin Cherayath kwuru ihe a. E bipụtara ya n’akwụkwọ akụkọ ndị Jamanị a na-akpọ Münsterländische Volkszeitung

Ndịàmà Jehova kweere na ihe Baịbụl kwuru ga-abara mmadụ uru taa ma ọ na-eme ya. (Aịzaya 48:17, 18) Ọ bụ ya mere anyị ji agbasi mbọ ike eme ihe Baịbụl kwuru. Dị ka ihe atụ, anyị anaghị aṅụ sịga, anwụrụ ike ma ọ bụ ọgwụ ike n’ihi na Baịbụl gwara anyị ka anyị ghara imerụ uche anyị na ahụ́ anyị. (2 Ndị Kọrịnt 7:1) Anyị anaghịkwa aṅụ oké mmanya, akwa iko ma ọ bụ ezu ohi n’ihi na Baịbụl kwuru na àgwà ndị dị otú ahụ adịghị mma.—1 Ndị Kọrịnt 6:9-11.

^ para. 5 Baịbụl kwukwara na Jizọs bụ “Ọkpara Chineke mụrụ naanị ya” n’ihi na ọ bụ onye mbụ Jehova kere, ọ bụkwa naanị ya ka Jehova ji aka ya kee.—Jọn 3:18; Ndị Kọlọsi 1:13-15.

GỤKWUO GBASARA YA

Gịnị Ka Ndịàmà Jehova Kweere?

Chọpụta ihe ụfọdụ banyere ihe iri na ise só n’ihe bụ́ isi anyị kweere.

Ndịàmà Jehova Hà Chere na Ọ Bụ Naanị Ha Na-ekpere Chineke Otú Ọ Chọrọ?

Jizọs ò kwuru na a ga-azọpụta onye si ụzọ ọ bụla masịrị ya na-efe Chineke?