Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

ỤLỌ NCHE SEPTEMBA 2015

Ọ̀ Na-adị Gị Ka Chineke Emechuola Gị Ihu?

Ọ̀ Na-adị Gị Ka Chineke Emechuola Gị Ihu?

OTU nwoke onye Brazil aha ya bụ Sidnei nwere ihe mberede otu ụbọchị ọ na-egwu egwuregwu na mmiri. Ọ dị afọ iri abụọ na anọ mgbe ihe a mere. Ihe mberede ahụ kwarụrụ ya ahụ́ nke na o nweghịzi ebe o nwere ike ịga ma ó jighị ígwè ndị ngwọrọ. Ọ nọ na-ajụ onwe ya, sị: “Gịnị ka m mere? Gịnị mere Chineke ji kwe ka ihe a mee m?”

Anyị nwere ike iche na Chineke emechuola anyị ihu ma agha ma ọ bụ ọdachi kpatara anyị nsogbu, ma ọ bụ ma anyị rịawa ọrịa ma ọ bụ nwee ihe mberede, ma ọ bụkwanụ ma e nwee onye nwụnahụrụ anyị. O nweela ndị chere otú ahụ n’oge ochie. E nwere oge ọtụtụ nsogbu bịaara Job bụ́ otu nwoke dịrị ndụ n’oge ochie. O chere na ọ bụ Chineke ka ihe na-eme ya si n’aka. Ọ gwara Chineke, sị: “M na-etiku gị maka enyemaka, ma ị dịghị aza m; eguzorowo m ọtọ, ka i wee ṅaa m ntị. Ị na-agbanwe wee na-emeso m ihe n’obi ọjọọ; i ji ike gị dum na-ebuso m iro.”—Job 30:20, 21.

Job amaghị ebe nsogbu ya si, ọ maghịkwa ihe mere nsogbu ahụ ji bịara ya, ma ọ bụ ihe mere Chineke ji kwe ka ọ bịara ya. Ma, obi dị anyị ụtọ na Baịbụl agwala anyị ihe mere ụdị nsogbu ndị ahụ ji abịara anyị nakwa ihe anyị kwesịrị ime ma ọ bịara anyị.

CHINEKE Ọ̀ CHỌRỌ KA ANYỊ NA-ATA AHỤHỤ?

O nwere otu ihe Baịbụl gwara anyị gbasara Chineke. Ọ sịrị: “Ihe zuru okè ka ọrụ ya bụ, n’ihi na ụzọ ya niile bụ ikpe ziri ezi. Chineke nke kwesịrị ntụkwasị obi, onye ikpe na-ezighị ezi na-adịghị n’ebe ọ nọ; onye ezi omume na onye ziri ezi ka ọ bụ.” (Diuterọnọmi 32:4) Ọ bụrụ na Chineke bụ “onye ezi omume na onye ziri ezi,” ọ̀ ga-achọ ka ụmụ mmadụ na-ata ahụhụ? Ọ̀ ga-eme ka ọdachi dakwasị ha iji gbazie ha?

O doro anya na ọ gaghị eme otú ahụ. Baịbụl gwadịrị anyị, sị: “N’oge ọnwụnwa, ka onye ọ bụla ghara ịsị: ‘Ọ bụ Chineke na-anwa m.’ N’ihi na a pụghị iji ihe ọjọọ nwaa Chineke, ya onwe ya adịghịkwa anwa onye ọ bụla.” (Jems 1:13) Baịbụl gwakwara anyị na ụmụ mmadụ enweghị nsogbu ọ bụla mgbe Chineke kere ha. Mgbe o kere Adam na Iv, bụ́ nwoke mbụ na nwaanyị mbụ, ọ rụụrụ ha ebe mara mma ha ga-ebi, tinyere ha ihe niile dị ha mkpa, nyekwa ha ọrụ ga na-eme ha obi ụtọ. Chineke gwara ha, sị: “Mụọnụ ọmụmụ, baanụ ụba ma jupụta ụwa.” O doro anya na o nweghị ihe kwesịrị ime ka Adam na Iv chewe na Chineke emechuola ha ihu.—Jenesis 1:28.

Ma, nsogbu zuziri ụmụ mmadụ ahụ́ taa. Kemgbe ụwa, nsogbu na-abịara anyị na-aka njọ n’ike n’ike. Ihe a Baịbụl kwuru gbasara anyị bụ eziokwu: “Ihe niile e kere eke na-asụkọ ude ma na-anọkọ n’ihe mgbu ruo ugbu a.” (Ndị Rom 8:22) Gịnị kpataziri nsogbu anyị?

GỊNỊ MERE ANYỊ JI ATA AHỤHỤ?

Tupu anyị aghọta ihe mere anyị ji ata ahụhụ, anyị ga-ebugodị ụzọ mata otú ihe si gaa n’oge ahụ Chineke kere Adam na Iv. Chineke gwara ha ka ha ghara iri “mkpụrụ si n’osisi ịma ihe ọma na ihe ọjọọ.” O nyere ha iwu a iji gosi na ọ bụ yanwa kwesịrị ịgwa ha ihe bụ́ ihe ọma na ihe bụ́ ihe ọjọọ. Ma, otu mmụọ ozi nupụụrụ Chineke isi, onye e mechara kpọwa Ekwensu na Setan, mere ka Adam na Iv nupụrụ Chineke isi. Ekwensu gwara Iv na ha agaghị anwụ ma ha rie mkpụrụ osisi ahụ Chineke sịrị ha erila. Ihe ọ na-ekwu bụ na Chineke ghaara ha ụgha. Setan gwakwara Iv na Chineke achọghị ka ha nweta ikike ikpebi ihe bụ́ ihe ọma na ihe bụ́ ihe ọjọọ. (Jenesis 2:17; 3:1-6) Ihe ihe a Setan kwuru pụtara bụ na ihe ga-aka adịrị ụmụ mmadụ mma ma ọ bụrụ na ọ bụghị Chineke na-achị ha. Ihe a niile mere ka ọ dị mkpa ka a chọpụta otu ihe dị ezigbo mkpa, ya bụ, ọ̀ bụ Chineke kwesịrị ịchị ụmụ mmadụ?

O nwekwara ihe ọzọ Ekwensu kwuru. O kwuru na ihe mere ụmụ mmadụ ji efe Chineke bụ maka ihe ọma Chineke na-emere ha. Ekwensu gwara Chineke gbasara Job, sị: “Ọ̀ bụ na ị gbaghị ya ogige gburugburu, gbaakwa ụlọ ya na ihe niile o nwere ogige gburugburu? . . . Ma, iji nwee ihe dị iche, biko, matịa aka gị, metụ ihe niile o nwere, lee ma ọ́ gaghị akọcha gị n’ihu gị.” (Job 1:10, 11) Ihe a Setan kwuru gbasara Job gbasakwara mmadụ niile. Ọ na-ekwu na o nweghị mmadụ ọ bụla ji obi ya niile efe Chineke.

OLEE OTÚ CHINEKE GA-ESI DOZIE OKWU A?

Olee otú kacha mma Chineke ga-esi edozi okwu ahụ, ya ebie kpamkpam? Chineke maara ihe niile.  Ọ ma otú kacha mma isi dozie ya, anyị aghara iche na o mechuola anyị ihu. (Ndị Rom 11:33) Ọ hapụrụ ka ụmụ mmadụ chịa onwe ha ruo oge ụfọdụ ka o doo ewu na ọkụkọ anya onye ọchịchị ya kacha mma.

Nsogbu ndị na-echi ụmụ mmadụ ọnụ n’ala taa emeela ka o doo anya na ọchịchị ụmụ mmadụ akụọla afọ n’ala. Ha enwebeghị ike ime ka udo dịrị. Ha enwebeghị ike ime ka obi ruo ndị mmadụ ala. Ha enwebeghịkwa ike ime ka ụmụ mmadụ na-enwe obi ụtọ. Ha emeekwala ka ụwa retọọ. Nke a na-emekwu ka o doo anya na ihe a Baịbụl kwuru bụ eziokwu: “Ọ dịrịghị mmadụ nke na-eje ije ọbụna iduzi nzọụkwụ ya.” (Jeremaya 10:23) Ọ bụ naanị ọchịchị Chineke ga-enweli ike ime ka ụmụ mmadụ nwee udo, obi ụtọ, na ọganihu ruo mgbe ebighị ebi n’ihi na ọ bụ ihe Chineke zubere ime.—Aịzaya 45:18.

Oleezi otú Chineke ga-esi mee ka ihe dịrị ụmụ mmadụ otú o bu n’obi kee ha? Jizọs gwara ndị na-eso ụzọ ya ka ha na-ekpe ekpere, sị: “Ka alaeze gị bịa. Ka uche gị meekwa n’ụwa, dị ka ọ na-eme n’eluigwe.” (Matiu 6:10) N’oge na-adịghị anya, mgbe Alaeze Chineke ga-achịwa ụwa, Chineke ga-eme ka ihe niile na-eme ka ụmụ mmadụ na-ata ahụhụ kwụsị. (Daniel 2:44) O nweghịzi onye ga-ada ogbenye, ọrịa na ọnwụ agaghịkwa adị. Baịbụl kwuru na Chineke “ga-anapụta ogbenye nke na-eti mkpu enyemaka.” (Abụ Ọma 72:12-14) Baịbụl kwukwara na n’oge ahụ, “ọ dịghị onye bi na ya nke ga-asị: ‘Ana m arịa ọrịa.’” (Aịzaya 33:24) Jizọs kwudịrị na “oge awa na-abịa mgbe ndị niile nọ n’ili ncheta ga-anụ olu ya wee pụta.” (Jọn 5:28, 29) Nkwa ndị a Chineke kwere anyị na-atọgbu anyị atọgbu.

Inwe okwukwe na Chineke ga-emezu nkwa ndị o kwere ga-enyere anyị aka ka anyị ghara iche na o mechuola anyị ihu

IHE GA-ENYERE GỊ AKA KA Ị GHARA ICHE NA CHINEKE EMECHUOLA GỊ IHU

Mgbe ihe dị ka afọ iri na asaa gachara Sidnei nwechara ihe mberede ahụ anyị kọrọ gbasara ya ná mbido, ọ sịrị: “O nweghị mgbe ọ bụla m chere na ọ bụ Jehova Chineke kpatara ihe mberede ahụ. Ma, mgbe ihe ahụ mere m, eweere m na o mechuola m ihu. O nwere ụbọchị ndị ọ na-abụ m cheta na m daziri ngwọrọ, obi ana-ajọ m njọ, mụ ana-ebe ákwá. Ma, amụtala m na Baịbụl na ihe mberede ahụ m nwere abụghị ihe Chineke ji taa m ahụhụ. Baịbụl kwuru na ‘oge ọdachi na ihe a na-atụghị anya ya na-abịakwasị anyị niile.’ Ekpere m na-ekpegara Jehova na amaokwu ụfọdụ m na-agụta na Baịbụl na-eme ka m ghara ịna-echegbu onwe m, na-enyekwara m aka ka mụ na Chineke na-adịkwu ná mma.”—Ekliziastis 9:11; Abụ Ọma 145:18; 2 Ndị Kọrịnt 4:8, 9, 16.

Ọ bụrụ na anyị amata ihe mere Chineke ji kwe ka anyị na-ata ahụhụ, matakwa na ọ ga-eme ka anyị kwụsị ịta ahụhụ n’oge na-adịghị anya, ọ ga-enyere anyị aka ịkwụsị ịna-eche na Chineke emechuola anyị ihu. Baịbụl gwara anyị na Chineke “na-akwụ ndị na-achọsi ya ike ụgwọ ọrụ.” Ọ dịghị onye nwere okwukwe na ya na Ọkpara ya nke a ga-emechu ihu.—Ndị Hibru 11:6; Ndị Rom 10:11.

GỤKWUO GBASARA YA

Olee Uru Ịmụ Baịbụl Ga-abara Gị?

Baịbụl na-enyere ọtụtụ ndị aka ịmata azịza ajụjụ ndị dị ezigbo mkpa. Ị̀ ga-achọ ka Baịbụl nyere gị aka?