Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

ỤLỌ NCHE SEPTEMBA 2015

 AKỤKỌ NDỤ

Enwetara M Ihe Karịrị Ịbụ Onye A Ma Ama

Enwetara M Ihe Karịrị Ịbụ Onye A Ma Ama

N’otu abalị n’afọ 1984, mgbe m ka bụ nwa agbọghọ na-eto eto, m ghọrọ onye a ma ama n’otu ntabi anya. E chiri m nwaada kacha mma na Họng Kọng. Foto m gbawaziri n’ihu magazin na n’ihu akwụkwọ akụkọ dị iche iche. E mewe ememme pụrụ iche, a na-akpọ m, mụ agaa gụọ egwú, gbaa egwú ma ọ bụkwanụ gwa ọhaneze okwu. M na-eduzikwa ụfọdụ ihe omume ndị a na-eme na tiivi. M na-eyi efe ndị mara mma, mụ na ndị ukwu, dị ka onyeisi ala ndị Họng Kọng, na-esokwa aga ebe ụfọdụ ha na-aga.

Amalitere m ime fim n’afọ 1985. Ọ bụ m ka a na-akacha egosi n’ụfọdụ fim ndị m mere. Ndị nta akụkọ na-achọsi akụkọ gbasara m ike, ndị na-ese foto na-abịakwa sere foto m ha ga-akpọsara ọhaneze. E nwee fim ọhụrụ a na-achọ igosi ndị mmadụ, a na-akpọ m ka m soro ná ndị mbụ ga-ele ya. E nwee ebe a na-agbape ụlọ ma ọ bụ ihe ọzọ, a na-akpọ m ka m bịa gbapee ya. Ndị mmadụ na-achọ ka mụ na ha rikọọ nri ehihie ma ọ bụ nri abalị. M ghọziri e jewe a kpọtụrụ.

Mgbe m na-eme fim

Ma, emechara m chọpụta na ihe ndị a niile anaghị emecha m obi ụtọ otú m chere ha ga-eme m. Fim ndị m na-esokarị eme bụ ndị a na-eme ihe nwere ike ịta isi mmadụ na ya. Ndị na-eme fim n’Amerịka na-akpọtakarị ndị mụrụ otú e si egwu egwuregwu ike ka ha meere ha ihe ndị nwere ike ịta isi mmadụ. Ma, ndị na-eme fim na Họng Kọng na-eji aka ha eme nke ha. N’ihi ya, na fim ndị m mere, ọ bụ m ji aka m mee ndị nke m. O nwere nke m ji ọgba tum tum fefee n’elu ụgbọala. N’ọtụtụ fim ndị m so mee, e nwere ebe ndị e mere omume rụrụ arụ na ihe ike na ha, nweekwa ndị nke e mere anwansi na ha.

N’afọ 1995, m lụrụ onye na-emepụta fim. N’agbanyeghị na m bụzi onye a ma ama, nwee ezigbo ego, di m ahụkwa m n’anya, enweghị m obi ụtọ. M kwụsịrị ime fim.

M CHETARA OKPUKPE M NA-EKPE MGBE M DỊ OBERE

Okpukpe m na-ekpe mgbe m dị obere bịara gụwa m agụụ. N’oge ahụ, n’ụtụtụ Satọdee ọ bụla, mụ na nwanne m nwaanyị na-aga n’ezinụlọ otu nwoke Onyeàmà Jehova aha ya bụ Joe McGrath. Ọ na-eji Baịbụl akụziri mụ na nwanne m nwaanyị na ụmụ ya ndị nwaanyị atọ ihe. Ezinụlọ a hụrụ ibe ha n’anya, na-enwekwa obi ụtọ. “Dee Joe” na-akwanyere nwunye ya na ụmụ ya ùgwù. Mụ na ha na-esokwa aga ọmụmụ ihe Ndịàmà Jehova. O nwekwara oge ndị m so ha gaa mgbakọ ukwu ha. M na-enwe obi ụtọ n’oge ahụ. Obi na-eru m ala ma mụ na Ndịàmà Jehova nọrọ.

 Ma, ihe na-eme n’ụlọ anyị dị iche. Otú papa m si akpa àgwà kpataara mama m obi mgbawa. Mgbe m dị ihe dị ka afọ iri, mama m kwụsịrị ịga ọmụmụ ihe Ndịàmà Jehova. M gbalịrị na-aga, ma ejighị m obi m niile na-aga ya. M mechara mee baptizim mgbe m dị afọ iri na asaa. Ma o teghị aka, mụ akpawa àgwà ọjọọ, kwụsịzie iso Ndịàmà Jehova.

EKPEBIRI M ỊLỌGHACHI

Obere oge mụ na di m gbachara akwụkwọ, ụmụ nwoke abụọ só ná ndị na-elekọta ọgbakọ m nọbu na ya bịara na nke anyị. Ha gwara m otú m ga-esi lọghachikwute Jehova Chineke. Ha gwakwara otu nwaanyị aha ya bụ Cindy, onye sí n’obodo ọzọ bịa izi ozi ọma na Họng Kọng, ka ọ bịa nyere m aka. N’oge a, ekwetachazighị m ọtụtụ ihe a kụziiri m na Baịbụl. M gwara Cindy ka o gosi m na Baịbụl bụ Okwu Chineke n’eziokwu. O gosiri m amụma ndị e buru na Baịbụl, ndị mezurulanụ. Nwayọọ, nwayọọ, mụ na ya bịara bụrụ ezigbo enyi. Ọ gwara m ka anyị mụọ ihe ndị na-ataghị akpụ Baịbụl na-akụzi, mụ ekweta. Ọ bụ mgbe ahụ ka ọ bịara doo m anya na Jehova, bụ́ Chineke anyị, hụrụ anyị n’anya nakwa na ọ chọrọ ka m na-enwe obi ụtọ.

Mgbe m bidoghachiri gawa ọmụmụ ihe Ndịàmà Jehova, m chọpụtara na obi bịara na-adị m ụtọ karịa mgbe ahụ m na-eme fim. Ma, ihe ndị mere n’ezinụlọ anyị mgbe m dị obere mere ka m na-enyo onye ọ bụla enyo, obi ana-ajọkwa m njọ. Otu Onyeàmà Jehova ji Baịbụl nyere m aka ịkwụsị inyo ndị mmadụ enyo ma na-enwe obi ụtọ. O mekwara ka m nweta ezigbo ndị enyi.

IHE KARỊRỊ ỊBỤ ONYE A MA AMA

N’afọ 1997, mụ na di m kwagara Họliwud dị́ na Kalịfọnịa, n’Amerịka. M bidoro na-ejikwu oge m enyere ndị mmadụ aka ịghọta na Baịbụl bara ezigbo uru. Ịkụziri ndị mmadụ Baịbụl na-eme m obi ụtọ karịa mgbe ahụ a na-anụ aha m n’ihi na m na-eme fim. Dị ka ihe atụ, n’afọ 2002, m hụrụ otu enyi m nwaanyị aha ya bụ Cheri. Mụ na ya matara na Họng Kọng. E nwere ọtụtụ ụzọ ndụ mụ na ya si yie. Ọ bụ ya bụ nwaada kacha mma na Họng Kọng n’afọ 1983. Ọ bụdị yanwa kpuwere m okpu mgbe e chiri m nwa agbọghọ kacha mma n’afọ 1984. O mechakwara na-eme fim, mechaakwa na-emepụta fim, ya na ndị a ma ama na-ahazi otú e si eme fim rụkọkwara ọrụ. O mechakwara kwafeta na Họliwud.

O wutere m mgbe Cheri gwara m na obi kụchiri onye chọrọ ịlụ ya, ya anwụọ. Ndị okpukpe Buda ọ na-ekpe akasilighị ya obi. N’agbanyeghị na ọ bụ onye a ma ama otú mụnwa bụ́bu, ọ naghị enwe obi ụtọ, o nweghịkwa onye ọ tụkwasịrị obi. M bidoro ịkọrọ ya ihe ndị m mụtara na Baịbụl. Ma, ihe ndị a kụziiri ya n’okpukpe Buda mere ka o siere ya ike ikweta na ihe m na-agwa ya bụ eziokwu.

Foto Cheri mgbe ọ na-eme fim

Otu ụbọchị n’afọ 2003, Cheri si ebe ọ nọ na-eme fim na Vankuva dị́ na Kanada kpọọ m na fon. Aṅụrị nọ na-akpa ya ka ọ nọ na-akọrọ m na ya ji ụgbọala na-agbagharị, na-ele otú obodo ahụ si maa mma, nọkatazie kpewe ekpere, na-ekpepụta ya ekpepụta, na-asị: “Chineke gwa m onye ị bụ. Ọ̀ bụ gịnwa bụ ezi Chineke? Gịnị bụ aha gị?” Ozugbo ahụkwa, ya agbafee otu Ụlọ Nzukọ Alaeze, hụ ebe e dere Jehova. Ọ sịrị na ọ dị ya ka Chineke ò si otú ahụ za ya ekpere nakwa na ya chọrọ ka ya na Ndịàmà Jehova hụ ozugbo. M haziri ka ya na ha hụ. N’ime ụbọchị ole na ole kwa, ọ gara ọmụmụ ihe n’ọgbakọ na-eji asụsụ Chaịniiz amụ ihe na Vankuva.

 Cheri mechara gwa m, sị: “Ndị a hụrụ m n’anya. Enwere m ike ịkọrọ ha otú obi dị m.” Ihe a ọ gwara m tọrọ m ụtọ n’ihi na mgbe ọ na-eme fim, o nweghị onye ọ na-emete enyi. Bido mgbe ahụ Cheri gara ọmụmụ ihe ahụ, ọ kwụsịghị ịna-aga ọmụmụ ihe. Ma n’afọ 2005, ọ naara ọrụ imepụta ọkpọka fim abụọ na Chaịna, nke mere ka ọ laghachi Họng Kọng. Obi dị m ụtọ na n’afọ 2006, o nyefere Jehova onwe ya, e mee ya baptizim n’otu n’ime mgbakọ Ndịàmà Jehova nwere na Họng Kọng. Ọ chọrọ iji oge ya jekwuoro Jehova ozi. Ma, fim ọ na-eme ekweghị ya, ọ naghịkwa eme ya obi ụtọ.

INYERE NDỊ ỌZỌ AKA NA-ENYE M ỌṄỤ

N’afọ 2009, ndụ Cheri gbanwere kpamkpam. Ọ kwụsịrị ime fim ka o nwee ike ijikwu oge ya jeere Jehova ozi. O metere ọtụtụ ndị nọ n’ọgbakọ enyi. Ọ ghọrọ onye na-ezisa ozi ọma oge niile, na-aga ezi ndị mmadụ ozi ọma Alaeze Chineke, na-enyekwara ha aka ịmata otú ha ga-esi na-ebi ndụ bara uru.—Matiu 24:14.

Cheri mechara mụọ asụsụ Nepali ka o nwee ike iso Ndịàmà Jehova ole na ole na-eji asụsụ a amụ ihe na Họng Kọng na-aga ezi ndị na-asụ asụsụ ahụ ozi ọma. A na-eledakarị ndị Nepal nọ na Họng Kọng anya, na-akparịkwa ha, maka na ha amachaghị Bekee ma ọ bụ Chaịniiz nakwa maka na omenala ha dị iche. Cheri gwara m na ịkụziri ndị Nepal Baịbụl na-eme ya ezigbo obi ụtọ. Dị ka ihe atụ, o kwuru na otu ụbọchị ya na-aga ozi ọma n’ụlọ n’ụlọ, na ya hụrụ otu nwaanyị na-asụ Nepali. Ọ sịrị na nwaanyị ahụ matụ gbasara Jizọs ma ọ maghị ihe ọ bụla gbasara ezi Chineke bụ́ Jehova. Cheri ji Baịbụl gosi ya na Jizọs kpegaara Nna ya nke eluigwe ekpere. Mgbe nwaanyị ahụ ghọtara na ya nwere ike ikpegara Chineke, onye aha ya bụ Jehova, ekpere, Baịbụl ya na ya na-amụ bịara tọwakwuo ya ụtọ. O teghị aka, di ya na nwa ha nwaanyị amụwakwa Baịbụl.—Abụ Ọma 83:18; Luk 22:41, 42.

Foto Cheri taa

Otú ozi ọma oge niile Cheri na-aga si atọ ya ụtọ mere ka m jụwa onwe m ihe mere na ebidobeghị m ziwe ozi ọma oge niile. N’oge a m na-ajụ onwe m ihe a, akwaghachila m Họng Kọng. Ahazigharịrị m ihe ndị m na-eme ka m nwekwuo ohere na-akụziri ndị mmadụ eziokwu dị́ na Baịbụl. Achọpụtara m na ige ntị mgbe ndị m na-ezi ozi ọma na-ekwu obi ha na inyere ha aka ịghọta Okwu Chineke nke ọma na-eme m ezigbo obi ụtọ.

Achọpụtara m na inyere ndị mmadụ aka ịghọta Okwu Chineke nke ọma na-eme m ezigbo obi ụtọ

Dị ka ihe atụ, e nwere otu nwaanyị onye Vietnam mụ na ya na-amụ Baịbụl. Tupu mụ na ya amụwa Baịbụl, obi na-ajọkarị ya njọ, ya ana-ebekwa ákwà mgbe niile. Ma ugbu a, obi na-abụ ya sọ aṅụrị, ọ naghịkwa eji ịga ọmụmụ ihe egwu egwu.

Mụ na Cheri nwetara ihe karịrị ịbụ onye a ma ama. Ọ bụ eziokwu na ime fim na-atọ ụtọ, na-emekwa ka a mara mmadụ amara, ma, ịkụziri ndị ọzọ gbasara Jehova Chineke na-aka eme obi ụtọ n’ihi na ọ na-eme ka e too Chineke. Anyị ahụla na ihe Jizọs kwuru n’Ọrụ Ndịozi 20:35 bụ eziokwu. Ọ sịrị: “A na-enweta obi ụtọ ka ukwuu n’inye ihe karịa ka a na-enweta n’ịnara ihe.”