Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

ỤLỌ NCHE JULAỊ 2015

 ISIOKWU ỤLỌ NCHE A | OLEE IHE Ị GA-EME KA Ị KWỤSỊ ỊNA-ECHEGBU ONWE GỊ?

Nchegbu Gbasara Ọdachi

Nchegbu Gbasara Ọdachi

Otu nwaanyị aha ya bụ Alona kwuru, sị: “Mgbe m nụrụ ụda opi na-egosi na a na-aga ịtụ bọmbụ, obi malitere ịkụ m kpum kpum, mụ agbaba ebe a na-anọ eze mgbọ. Ma, obi ka ga-anọ na-akụ m kpum kpum n’ebe ahụ. Ọ na-aka njọ ma ọ bụrụ na ahụghị m ebe m ga-anọ eze mgbọ. O nwedịrị otu ụbọchị m nọ na-aga n’okporo ụzọ, opi ahụ egbuwe, mụ ebewe ákwá, begide ákwá tụbọọ. Ọtụtụ awa gafere tupu mụ enweta onwe m. Obere oge, opi ahụ ebidokwa gbuwe ọzọ.”

Alona

E wezụga agha, e nwere ọtụtụ ihe ndị ọzọ na-akpata ọdachi ndị na-eme ka anyị na-echegbu onwe anyị. Dị ka ihe atụ, i nwere ike ibido chegbuwe onwe gị ma ị chọpụta na ị na-arịa ọrịa nwere ike igbu gị ma ọ bụkwanụ ma ị mata na onye ị hụrụ n’anya na-arịa ọrịa nwere ike igbu ya. E nwekwara ndị ihe na-echegbu ha bụ ma nsogbu ndị dị ka agha, mpụ, mmetọ ikuku na mmiri, oké okpomọkụ, oké mmiri ozuzo, na ajọ ọrịa na-efe efe ọ̀ ga-akpa ụmụ ha aka ọjọọ ma ha too. Olee otú anyị ga-esi kwụsị ịna-echegbu onwe anyị gbasara ihe ndị a?

Baịbụl kwuru na “onye maara ihe nke hụrụ ọdachi agawo zoo.” (Ilu 27:12) Otú ahụ anyị na-agba mbọ ka ahụ́ na-agbasi anyị ike, anyị nwekwara ike ime ihe ụfọdụ ga-eme ka anyị ghara ịna-echegbu onwe anyị. Akụkọ ụwa na fim ndị a na-egosi ndị na-eme ihe ike so eme ka anyị na ụmụaka anyị na-echegbu onwe anyị. Anyị kwụsị ile ihe ndị dị otú ahụ, ọ pụtaghị na anyị  achọghịzi ịma ihe ndị na-eme n’ụwa. Chineke ekeghị anyị ka anyị na-eche gbasara ihe ọjọọ. Kama, o kere anyị ka anyị na-eche gbasara “ihe ọ bụla nke bụ́ eziokwu, . . . nke ziri ezi, . . . nke dị ọcha, . . . nke na-akpali ịhụnanya.” Ọ bụrụ na anyị ana-eche ihe ndị a, “Chineke nke udo” ga-eme ka obi ruo anyị ala, meekwa ka anyị ghara ịna-echegbu onwe anyị.—Ndị Filipaị 4:8, 9.

URU EKPERE BARA

Ọ bụrụ na anyị enwee okwukwe siri ike, ọ ga-enyere anyị aka ka anyị ghara ịna-echegbu onwe anyị. Baịbụl gwara anyị ka anyị ‘mụrụ anya ka anyị wee na-ekpe ekpere.’ (1 Pita 4:7) Nsogbu bịara anyị, anyị kwesịrị ịrịọ Chineke ka o nyere anyị aka, nye anyị amamihe na obi anyị ga-eji die nsogbu ahụ. Obi kwesịkwara isi anyị ike na “ọ na-anụ olu anyị n’ihe ọ bụla anyị na-arịọ.”—1 Jọn 5:15.

Ya na di ya bụ́ Avi

Baịbụl kwuru ihe gosiri na “onye na-achị ụwa a” bụ Setan, ọ bụghị Chineke. O kwukwara na “ụwa dum dị n’aka ajọ onye ahụ.” (Jọn 12:31; 1 Jọn 5:19) Ọ bụ ya mere Jizọs ji sị ka anyị na-arịọ Chineke ka ọ “napụta anyị n’aka ajọ onye ahụ.” (Matiu 6:13) Alona kwuru, sị: “Mgbe ọ bụla opi na-egosi na a na-aga ịtụ bọmbụ gbuwere, m na-arịọ Jehova ka o nyere m aka ka m jide onwe m. Di m na-akpọ m n’ekwentị anyị ekpekọọ ekpere ọnụ. Ekpere na-enyere m ezigbo aka.” Baịbụl kwuru, sị: “Jehova nọ ndị niile na-akpọku ya nso, bụ́ ndị niile na-akpọku ya n’eziokwu.”—Abụ Ọma 145:18.

MGBE IHE NDỊ NA-AKPATA NCHEGBU NA-AGAGHỊZI ADỊ

Mgbe Jizọs nọ n’elu ugwu na-akụziri ndị mmadụ ihe, ọ gwara ndị na-eso ụzọ ya ka ha na-arịọ Chineke, sị: “Ka alaeze gị bịa.” (Matiu 6:10) Alaeze Chineke ga-eme ka ihe niile na-eme ka ụmụ mmadụ na-echegbu onwe ha kwụsị ruo mgbe ebighị ebi. Chineke ga-esi n’aka Jizọs, bụ́ “Onyeisi Udo,” mee “ka agha kwụsị ruo na nsọtụ ụwa.” (Aịzaya 9:6; Abụ Ọma 46:9) Chineke “ga-ekpe ikpe n’etiti ọtụtụ ndị . . . Mba agaghị ebuli mma agha buso mba ọzọ agha, ha agaghị amụkwa otú e si alụ agha. . . . Ọ dịghịkwa onye ga-eme ka ha maa jijiji.” (Maịka 4:3, 4) Ezinụlọ niile ga na-enwe obi ụtọ. Ha “ga-ewu ụlọ, biri n’ime ha; ha ga-akọkwa ubi vaịn, rie mkpụrụ ha.” (Aịzaya 65:21) “Ọ dịghị onye bi na ya nke ga-asị: ‘Ana m arịa ọrịa.’”—Aịzaya 33:24.

O nweghị ihe anyị ga-emeli taa ka “ọdachi na ihe a na-atụghị anya ya” kwụsị ma ọ bụkwanụ ka anyị gharazie ịnọ n’ebe na-ekwesịghị ekwesị n’oge na-ekwesịghị ekwesị. (Ekliziastis 9:11) Kemgbe ọtụtụ narị afọ ruo taa, agha, ime ihe ike, na ọrịa egbuola ọtụtụ ndị ezigbo mmadụ. Ndị a niile aka ha dị ọcha hà ga-adị ndụ ọzọ?

Ọtụtụ nde ndị nwụrụ anwụ ga-adị ndụ ọzọ. Ma, ọ bụ naanị Chineke ma ole ha dị. Ka ọ dịgodị, ha na-ehi ụra, Chineke ga na-echetakwa ha, ruo ụbọchị “ndị niile nọ n’ili ncheta” ga-apụta. (Jọn 5:28, 29) O nwere ihe Baịbụl kwuru gbasara mbilite n’ọnwụ mere ka obi sie anyị ike. Ọ sịrị: “Anyị nwere olileanya a dị ka arịlịka maka mkpụrụ obi. Ọ bụ nke e ji n’aka, nke guzosikwara ike.” (Ndị Hibru 6:19) Chineke ‘enyewokwa mmadụ niile ihe ga-emesi ha obi ike, ebe ọ bụ na o mere ka Jizọs si ná ndị nwụrụ anwụ bilie.’—Ọrụ Ndịozi 17:31.

Ma tupu mgbe ahụ, ihe ndị nwere ike ime ka anyị chegbuwe onwe anyị ga-abịara anyị, ọ bụrụgodị na anyị na-eme uche Chineke. Ihe na-enyere Paul, Janet, na Alona aka ka ha ghara ịna-echegbu onwe ha bụ ịrịọ Chineke ka o nyere ha aka, inwe okwukwe siri ike na nkwa Chineke kwere anyị ga-emezu, nakwa ime ihe ha nwere ike ime ka ha ghara ịna-echegbu onwe ha. Chineke meere ha ihe ha rịọrọ ya. ‘Ka Chineke onye na-enye olileanya meekwa ka i jupụta n’ọṅụ niile na udo niile n’ihi na i kwere ekwe.’—Ndị Rom 15:13.

GỤKWUO GBASARA YA

Onye Na-akpata Agha na Ahụhụ

Olee ihe Baịbụl kwuru nke gosiri na o nwere ihe gbasara agha a lụrụ n’eluigwe na agha a lụrụ n’ebe niile n’ụwa nakwa nsogbu ndị juru n’ụwa?

Gịnị Ga-eme Ka Udo Dịrị n’Ụwa?

Chọpụta otú Chineke ga-esi eme ka Alaeze ya weta udo n’ụwa.