Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

ỤLỌ NCHE JUN 2015

 AKỤKỌ NDỤ

Otú Ọgbọ Asaa n’Ezinụlọ Anyị Sirila Fee Jehova

Otú Ọgbọ Asaa n’Ezinụlọ Anyị Sirila Fee Jehova

Ndị mmadụ na-agwakarị m na m yiri nnọọ papa m. M na-aga ije ka ya, na-eme ihe ọchị ka ya, anya mụ na ya yikwara. Ma, o nwekwara ebe ọzọ mụ na ya yiri. Ọ na-efe Jehova, mụnwa na-efekwa Jehova. Ka m kọọrọ gị otú papa m na ndị nna nna m hà si fee Jehova. Ha niile dị ọgbọ asaa.

Ebe mụ na papa m na-ele foto ndị ezinụlọ anyị niile ferela Jehova

N’abalị iri abụọ n’ọnwa Jenụwarị, afọ 1815, a mụrụ nna m ochie bụ́ Thomas (1) * Williams n’obodo Họnkasụl dị n’Ịngland. Mama ya nwụrụ mgbe ọ dị afọ abụọ. Ọ bụzi papa ya bụ́ John Williams zụrụ ya na ụmụnne ya atọ. Papa ya kụziiri ya ọrụ kapịnta, ma ọ bụghị ọrụ kapịnta ka ọ chọrọ ịrụ.

N’oge ahụ, onye ozi ọma aha ya bụ John Wesley si na Chọọchị Ịngland pụọ ma malite chọọchị Metọdist n’Ịngland. Ndị chọọchị a na-agba ndị òtù ha ume ka ha na-amụ Baịbụl ma na-ekwusa ozi ọma. Ihe Wesley na-akụzi gbasara ebe niile, nna nna m ochie bụ́ John Williams na ndị ezinụlọ ya nabatakwara nkụzi ya. Thomas Williams mechara ghọọ onye òtù Wesley. Ozugbo ahụ kwa, o wepụtara onwe ya ịga kwusawa ozi ọma n’Ebe Ndịda Pasifik. O mechara lụọ nwaanyị. Ya na Mary (2) nwunye ya akwagazie agwaetiti Lakeba, * dị n’obodo Fiji na Julaị afọ 1840. Ndị bi n’agwaetiti a n’oge ahụ na-eri anụ mmadụ.

OTÚ HA SI BIE N’EBE A NA-ERI ANỤ MMADỤ

Ihe siiri Thomas na nwunye ya ezigbo ike mgbe ha kwagara Fiji ọhụrụ. Ha na-arụ ọrụ ọtụtụ awa iji nwee ike ịna-akpa afọ ha. Anwụ na-acha ebe ahụ enweghị atụ, ebe ahụ bụkwa ime ime obodo. E nwere ihe ndị na-awụ akpata oyi ha hụrụ n’obodo ahụ. Ha hụrụ ka ndị ebe ahụ na-anyagbu ụmụ nwaanyị di ha nwụrụ, na-egbu ụmụaka, na-eri anụ mmadụ, ha na ndị agbụrụ ọzọ ana-alụkwa agha. Ha anaghịkwa ege ntị n’ozi ọma. O nwere mgbe nwunye Thomas na ọkpara ha aha ya bụ John dara ọrịa, ya afọkwa obere ka ha nwụọ. N’afọ 1843, Thomas dere, sị: “Ihe a niile nyere m ezigbo nsogbu n’obi. . . . Ọ fọrọ ntakịrị ka ike ihe niile gwụ m.” Ma, ya na nwunye ya diri nsogbu a niile. Okwukwe ha nwere n’ebe Jehova Chineke nọ nyeere ha aka idi ya.

Ọrụ kapịnta Thomas mụtara n’aka nna ya nyeere ya aka ịrụ ụlọ ndị Yurop n’obodo Fiji. Ọ bụ ya bụ onye mbụ rụrụ ụdị ụlọ a na Fiji. Ụlọ a nwere oghere n’okpuru ya ebe ikuku na-esi abata. Ndị Fiji na-abịakwa ekiri ụlọ a n’ihi na ha ahụtụbeghị ụdị ya mbụ. Tupu Thomas arụchaa ụlọ ahụ, nwunye ya mụrụ nwa ha nwoke nke abụọ aha ya bụ Thomas Whitton (3) Williams. O sokwa ná ndị nna m ochie.

N’afọ 1843, Thomas Williams nyere aka sụgharịa akwụkwọ Oziọma Jọn n’asụsụ Fijian, n’agbanyeghị na o siiri ya ezigbo ike. * Ma, ọ naghị ara ya ahụ́ ịmụta omenala ndị mmadụ na njirimara ha. Ọ sara anya ná mmiri dee ihe ndị ọ chọpụtara gbasara ndị Fiji n’akwụkwọ ọ kpọrọ Fiji and the Fijians (1858). N’akwụkwọ a, o dere otú ndị Fiji si bie ndụ n’agbata afọ 1801 na 1858.

 N’ihi ọtụtụ ahụhụ Thomas Williams tara na Fiji ruo afọ iri na atọ, ezigbo ahụ́ bidoro nyewe ya nsogbu nke mere na ya na ndị ezinụlọ ya kwagara Ọstrelia. O ziri ozi ọma ruo ọtụtụ afọ ma mechaa nwụọ n’afọ 1891 n’ebe a na-akpọ Balarat dị na Viktoria dị n’Ọstrelia.

O NWETARA IHE KA ỌLAEDO MMA N’EBE A NA-EGWUTE ỌLAEDO

N’afọ 1883, Thomas Whitton Williams na Phoebe, (4) nwunye ya kwagara n’ebe a na-akpọ Pet dị n’Ebe Ọdịda Anyanwụ Ọstrelia. Nwa ha nwoke nke abụọ aha ya bụ Arthur Bakewell (5) Williams, dị afọ itoolu mgbe ahụ.

Mgbe Arthur Bakewell dị afọ iri abụọ na abụọ, ọ gara rụwa ọrụ n’ebe a na-egwute ọlaedo n’obodo Kalguli. Ọ na-ewe ihe dị ka narị kilomita isii iji si n’ebe ọwụwa anyanwụ Pet rute Kalguli. Ebe a ka Arthur nọ gụọ ụfọdụ akwụkwọ Ndị Mmụta Baịbụl bipụtara. Ihe a na-akpọ Ndịàmà Jehova n’oge ahụ bụ Ndị Mmụta Baịbụl. Arthur tụkwara ọda ka a na-ezitere ya Ụlọ Nche. Ihe ọ gụtara n’akwụkwọ ndị ahụ masịrị ya nke na o bidoro ịkọrọ ya ndị ọzọ, ya na ndị mmadụ ana-ezukọkwa amụ Baịbụl. Otú a ka Ndịàmà Jehova si malite n’Ebe Ọdịda Anyanwụ Ọstrelia.

Arthur Bakewell na-akọkwara ndị ezinụlọ ya ihe ndị ọ na-amụta. Papa ya bụ́ Thomas Whitton kwadokwara ka ọ bụrụ Onye Mmụta Baịbụl. Ma o teghị aka, papa ya ahụ anwụọ. Mama ya bụ́ Phoebe, na Violet na Mary, bụ́ ụmụnne ya ndị nwaanyị, ghọkwara Ndị Mmụta Baịbụl. Violet ghọrọ onye ọsụ ụzọ, ya bụ, onye ozi ọma oge niile. Arthur Bakewell kwuru na Violet bụ “ọsụ ụzọ kacha anụ ọkụ n’obi e nwetụrụla n’Ebe Ọdịda Anyanwụ Ọstrelia.” O nwere ike ịbụ na o kwuru banyere ya otú a n’ihi na ọ bụ nwanne ya nwaanyị. Ma n’eziokwu, Violet bụ onye e ji ama atụ n’izi ozi ọma, ndị sochiri ya n’ezinụlọ Williams mụtakwara ihe n’otú o si nụọ ọkụ n’obi.

Obere oge, Arthur lụrụ nwaanyị ma kwaga Dọnịbruk, bụ́ ebe a na-akụ mkpụrụ osisi n’Ebe Ọdịda Anyanwụ Ọstrelia. Ndị mmadụ bidoro kpọwa ya “Onye Ara 1914!” n’ihi otú o si jiri ịnụ ọkụ n’obi na-akọrọ ndị mmadụ ihe Baịbụl kwuru ga-eme n’afọ ahụ. * Ma, mgbe Agha Ụwa Mbụ bidoro n’afọ 1914, o nweghịzi onye nwere ọnụ ịkpọ ya aha ahụ. Arthur na-ezikarị ndị na-abịa azụ ya ahịa ozi ọma. Ọ na-edosa ụfọdụ akwụkwọ ndị e ji amụ Baịbụl na windo ya otú onye ọ bụla ga-ahụ ya. O nwekwara ihe o dere konye na windo ahụ. O dere na ya ga-enye onye ọ bụla ga-egosili ya Atọ n’Ime Otu na Baịbụl otu narị paụnd. Atọ n’Ime Otu bụ ozizi na-esighị n’Akwụkwọ Nsọ. Arthur ekweghịkwa na ya. O nweghịkwa onye nweliri ike igosi ya na Atọ n’Ime Otu dị na Baịbụl ma were ego ahụ.

Ọ bụ n’ụlọ Arthur Williams dị na Dọnịbruk ka ndị mmadụ na-ezukọ amụ Baịbụl, ọgbakọ dị n’ebe ahụ na-anọkwa n’ụlọ ha amụ ihe. Ma, Arthur mechara rụọ otu Ụlọ Nzukọ Alaeze ha maliteziri ịnọ na-amụ ihe n’obodo ahụ. Ụlọ Nzukọ Alaeze a so ná ndị mbụ a rụrụ n’Ebe Ọdịda Anyanwụ Ọstrelia. Mgbe ọ fọrọ obere ka Arthur ruo afọ iri asatọ, ọ ka na-eyiri kootu  ya, kpọọ taị, nọkwasị n’ịnyịnya ya ọ na-akpọ Doll, na-aga ebe dị iche iche na Dọnịbruk ezi ozi ọma.

Arthur bụ nwoke dị nwayọọ, onye na-anụ ọkụ n’obi, na onye a na-akwanyere ùgwù. Ụmụ ya mụtakwara ihe n’aka ya. Nwa ya nwaanyị aha ya bụ Florence (6) mechara kwusawa ozi ọma n’India. Ụmụ ya ndị nwoke aha ha bụ Arthur Lindsay (7) na Thomas, ghọkwara ndị okenye n’ọgbakọ dị ka nna ha.

APỤL A NA-AKPỌ LADY WILLIAMS

Ndị mmadụ ma papa papa nnukwu m bụ́ Arthur Lindsay Williams ama dị ka nwoke nwere obiọma, ha hụkwara ya n’anya. Ọ naghị eji ndị mmadụ egwu egwu, ọ na-akwanyekwara ha ùgwù. Ọ bụkwa ọkaibe n’iji anyụike awa osisi. N’ime afọ iri na abụọ o so mee asọmpi ịwa nkụ, ọ gbara onye nke mbụ ugboro iri na asatọ.

Ma, obi adịghị Arthur Lindsay mma mgbe nwa ya nwoke dị afọ abụọ aha ya bụ Ronald (8) (ya bụ, nna nna m), weere anyụike gbubie obere osisi apụl dị n’akụkụ ụlọ ha. Ma, mama ya ji ihe kekọta osisi apụl ahụ. Apụl ahụ mechakwara mịa, apụl si na ya na-atọkwa ụtọ pụrụ iche. A malitere ịkpọ apụl a Lady Williams. Ọ bụkwa na ya ka e si nweta ụdị apụl a na-akpọ Cripps Pink, bụ́ otu n’ime apụl a kacha mara amara n’ụwa taa.

Ihe m na-akpọ nna nna m Ronald bụ Gramp. O mechara rụwa ọtụtụ ihe ndị bara uru. Ya na nne nne m wepụtara onwe ha na-aga arụ Ụlọ Nzukọ Alaeze na ụlọ dị iche iche Ndịàmà Jehova ji efe ofufe n’Ọstrelia nakwa n’Agwaetiti Sọlọmọn. Ọ fọrọ obere ka Gramp ruo afọ iri asatọ ugbu a, ma, ọ ka bụ okenye n’ọgbakọ, na-enye aka arụ Ụlọ Nzukọ Alaeze n’Ebe Ọdịda Anyanwụ Ọstrelia, na-enyekwa aka arụzigharị ndị nke mebiri emebi.

O NWEGHỊ IHE DỊ M KA IFE CHINEKE OTÚ NDỊ NNA NNA M HÀ FERE

Papa m Geoffrey (9) na Mama m Janice (10) Williams, gbara ezigbo mbọ nyere mụ na nwanne m nwaanyị aha ya bụ Katharine aka iji ife Chineke kpọrọ ihe. Mgbe m dị afọ iri na atọ, m kpebiri ife Jehova. N’otu mgbakọ anyị nwere n’afọ ahụ, Nwanna John E. Barr, onye so n’Òtù Na-achị Isi nke Ndịàmà Jehova n’oge ahụ, gbara ndị na-eto eto bịara mgbakọ ahụ ume. Ọ gwara ha, sị: “Unu ejikwala ihe kacha ọnụ ahịa unu nwere ugbu a egwu egwu, ya bụ, ohere ọma unu nwere ịmata Jehova na ịhụ ya n’anya.” N’abalị ahụ, enyefere m Jehova onwe m. Mgbe afọ abụọ gachara, m bidoro ikwusa ozi ọma oge niile.

Ugbu a, mụ (12) na nwunye m bụ́ Chloe (11) na-ekwusa ozi ọma oge niile n’obodo Tọm Praịs, bụ́ ebe a na-egwute ihe e ji emepụta ígwè n’Ebe Ọdịda Anyanwụ Ọstrelia. Anyị na-arụ ọrụ na-enyere anyị aka igbo mkpa anyị, ma, ọ naghị ewekọrọ oge anyị niile. Papa m na mama m nakwa Katharine nwanne m nwaanyị na Andrew di ya na-ekwusakwa ozi ọma oge niile n’obodo Pọt Hedland. Isi ebe a gawa Tọm Praịs dị ihe dị ka narị kilomita anọ na iri abụọ. Mụ na papa m bụkwa ndị okenye n’ọgbakọ.

Ọgbọ asaa agaala ugbu a kemgbe nna m ochie bụ́ Thomas Williams kpebiri ife Jehova Chineke. Ndị ezinụlọ anyị niile ji ife Chineke kpọrọ ihe, esikwa m n’aka ha mụta iji ife Chineke kpọrọ ihe. Obi dị m ezigbo ụtọ n’ihe ọma a pụrụ iche m si n’aka ndị nna nna m hà nweta.

^ para. 5 Nọmba ndị a dị n’akụkụ aha ndị mmadụ ga-enyere gị aka ịmata foto ha na peeji nke iri na abụọ na nke iri na atọ.

^ para. 6 Ihe a na-akpọbu agwaetiti a bụ Lakemba. O so n’agwaetiti ndị dị n’ebe ọwụwa anyanwụ obodo Fiji.

^ para. 10 Ọ bụ onye ozi ọma aha ya bụ John Hunt sụgharịrị ọtụtụ akwụkwọ dị n’Agba Ọhụrụ n’asụsụ Fijian. E bipụtakwara Agba Ọhụrụ a n’afọ 1847. Otu ihe pụrụ iche n’ihe a ọ sụgharịrị bụ na o dere ezigbo aha Chineke n’asụsụ Fijian, ya bụ, “Jiova,” na Mak 12:36, Luk 20:42, nakwa n’Ọrụ Ndịozi 2:34.

^ para. 16 Ị chọọ ịmatakwu banyere afọ 1914, gụọ isiokwu bụ́ “1914—Afọ Dị Ịrịba Ama n’Amụma Bible.” Ọ dị n’Ihe Odide Ntụkwasị n’akwụkwọ Gịnị n’Ezie Ka Bible Na-akụzi? Ọ bụ Ndịàmà Jehova bipụtara ya. Ọ dịkwa n’adres Ịntanet anyị bụ́ www.jw.org/ig.

GỤKWUO GBASARA YA

Olee Otú Iwu Chineke Si Abara Anyị Uru?

Jizọs kọwara ihe mere o ji dị mma ka Chineke na-eduzi anyị, kwuokwa banyere iwu abụọ kacha mkpa.

Ṅomie Okwukwe Ha

Olee otú ịmụ gbasara ụmụ nwoke na ụmụ nwaanyị ndị nwere okwukwe a kọrọ akụkọ ha na Baịbụl nwere ike isi baara anyị uru?