Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

ỤLỌ NCHE JUN 2015

Ihe Ga-enyere Gị Aka Ịna-enwe Obi Ụtọ Ma Ị Kawa Nká

Ihe Ga-enyere Gị Aka Ịna-enwe Obi Ụtọ Ma Ị Kawa Nká

OLEE otú obi na-adị gị ma i cheta na ị ga-emecha kaa nká? E nwere ọtụtụ ndị ọ na-echu ụra, ma ọ bụdị na-amapụ obi. Ihe mere o ji adị ha otú a bụ na o nwere ọtụtụ nsogbu nká na-akpata. Dị ka ihe atụ, ọ na-abụ mmadụ kawa nká, ahụ́ ya esewe alịghịlị, ọ gaghịzi adị gara gara, ọ gaghị na-echetacha ihe, o nwekwara ike na-arịa ọrịa na-anaghị ala ala.

Ma, nke bụ́ eziokwu bụ na ihe na-eme ndị mmadụ ma ha kawa nká anaghị abụ otu. O nwere ndị nke ahụ́ na-agbasitụ ike, ha ana-agbalịkwa echeta ihe. Ọkpọka ọgwụ Bekee ndị e nwere ugbu a enyekwarala ụfọdụ n’ime ha aka ịgwọ ọrịa siri ike ha na-arịa. Ọ bụ ya mere na n’obodo ụfọdụ, ahụ́ na-esikwuzi ọtụtụ ndị ike, ha ana-adịtekwukwa ndụ aka.

Ma, ọtụtụ ndị karala nká, ma ndị nke ahụ́ na-enye ezigbo nsogbu ma ndị nke ahụ́ na-anaghị enyecha nsogbu, na-achọ ka ha na-enwe obi ụtọ. Ma, olee ihe ga-enyere ha aka ịna-enwe obi ụtọ? Otu ihe ga-enyere ha aka ịna-enwe obi ụtọ bụ otú ha si were ụwa ha ugbu a ha kawarala nká. Ka anyị leba anya n’ihe ụfọdụ Baịbụl kwuru ga-enyere ha aka.

NA-ADỊ OBI UMEALA: “Ndị dị obi umeala nwere amamihe.” (Ilu 11:2) Otu ụzọ ndị agadi ga-esi dịrị “obi umeala” bụ ịghọta ihe ndị ha ga-emeli na ihe ndị ha na-agaghị emeli, ghara isi ọnwụ na-eme ihe ndị ha na-agaghị emeli. Otu agadi nwoke onye Brazil aha ya bụ Charles, onye dị afọ iri itoolu na atọ, kwuru, sị: “Onye ọ bụla dịtere ndụ aka ga-akarịrị nká. Onye ahụ agaghị emeli onwe ya ka ọ bụrụghachi okoro ma ọ bụ agbọghọ.”

Ma, onye agadi ịghọta na o nwere ihe ndị ya na-agaghị emeli ekwesịghị ime ka o chewe na o nweghịzi ihe ya dị mma ya. Ichewe ụdị ihe a nwere ike ime ka ike ihe niile gwụ mmadụ. Ọ bụ ya mere Ilu 24:10 ji sị: “Ì nwewo obi ịda mbà n’ụbọchị ahụhụ? Ike gị ga-adị ntakịrị.” Ma, onye dị obi umeala na-eme ihe otú ike kwere ya, si otú ahụ gosi na ọ ma ihe.

Otu nwoke onye Ịtali aha ya bụ Corrado, onye dị afọ iri asaa na asaa, kwuru, sị: “Onye mewe agadi, onye ahụ kwesịrị iji nwayọọ na-eme ihe ndị ọ na-eme.” Ihe nwoke a kwuru bụ eziokwu. Onye agadi kwesịrị ịgbanwe otú o si eme ihe. Nwoke a na nwunye ya hazigharịrị otú ha na-esi arụ ọrụ ndị dịịrị ha n’ụlọ. Ha na-eji nwayọọ arụ ha ka ike ghara ịgwụru ha n’ọkpụkpụ ma ha rụchaa ọrụ n’ụbọchị. Otu nwaanyị onye Brazil aha ya bụ Marian, onye dị afọ iri asatọ  na otu, na-eme ihe gosiri na ọ ma otú ike ya hà. Ọ sịrị: “Ọ na-abụ m rụtụ ọrụ, mụ ezurutụ ike. M na-anọrọ ọdụ ma ọ bụ dinara ala gụọ akwụkwọ ma ọ bụ gere egwú. Ama m na enweghịzi m ike ịna-eme ihe niile m na-emebu.”

Na-eji ejiji otú dị mma

NA-EJI EJIJI OTÚ DỊ MMA: “Ka ụmụ nwaanyị jiri uwe dị mma n’anya na-achọ onwe ha mma n’imeru ihe n’ókè na uche zuru okè.” (1 Timoti 2:9) Mmadụ iyi “uwe dị mma n’anya” pụtara onye ahụ iji ejiji dị mma n’anya na nke kwesịrị ekwesị. Otu nwaanyị onye Kanada aha ya bụ Barbara, onye dị afọ iri asaa na anọ, kwuru, sị: “M na-agbalị iyi uwe dị ọcha ma dị mma n’anya. Achọghị m iji maka na mụ emeela agadi na-adị mkpakara n’anya.” Nwaanyị ọzọ bụ́ onye Brazil aha ya bụ Fern, onye dị afọ iri itoolu na otu, kwuru, sị: “Ọ na-abụ m gụrụ gụrụ, mụ agaa zụrụ efe ọhụrụ iji na-eme onwe m obi ụtọ.” Ndị agadi nwoke kwanụ? Otu agadi nwoke onye Brazil aha ya bụ Antônio, onye dị afọ iri asaa na atọ, kwuru, sị: “M na-agbalị ịdị mma n’anya, m na-eyikwa efe ndị dị ọcha ma dị mma.” O kwukwara na ụbọchị ọ bụla, na ya na-asa ahụ́ ma na-akpụ afụ ọnụ ya.

Ma, anyị kwesịrị ịkpachara anya ka ejiji anyị gharazie ibido na-echu anyị ụra nke na anyị agaghịzi na-egosi na anyị nwere “uche zuru okè.” Otu nwaanyị onye Saụt Koria aha ya bụ Bok-im, onye dị afọ iri isii na itoolu, bụ onye e ji ama atụ ma a bịa n’iji ejiji kwesịrị ekwesị. Ọ sịrị: “Ama m na ekwesịghịzi m ịna-eyi ụfọdụ efe ndị m na-eyi mgbe m ka bụ agbọghọ.”

Na-eme onwe gị obi ụtọ

NA-EME ONWE GỊ OBI ỤTỌ: “Ụbọchị niile nke onye nọ n’ahụhụ jọrọ njọ; ma onye obi dị mma na-eri oriri mgbe niile.” (Ilu 15:15) Ị kawa nká, obi nwere ike ịna-ajọ gị njọ ma i cheta ihe ndị ị na-emebu mgbe ị bụ okoro ma ọ bụ agbọghọ. Ọ bụghị ihe ọjọọ ma ihe ndị ahụ ị na-emebu bata gị n’obi. Ma, ekwela ka iche gbasara ha mee ka ike ihe niile gwụ gị. Ọ bụrụ na uche gị niile adịrị n’ihe ndị ahụ, ọ ga-eme ka ike gwụzie gị ime ihe ndị ị ka nwere ike ime. Otu nwoke onye Kanada aha ya bụ Joseph, onye dị afọ iri asaa na itoolu, kwuru, sị: “M na-agbalị eme ihe ndị m ka nwere ike ime, anaghịkwa m echegbu onwe m maka ihe ndị m na-enweghịzi ike ime.”

Ịgụ akwụkwọ na ịmụta ihe ndị ọhụrụ ga-emekwa ka obi na-atọ gị ụtọ. N’ihi ya, na-ewepụta oge na-eme ha. Otu nwoke onye Filipinz aha ya bụ Ernesto, onye dị afọ iri asaa na anọ, na-aga n’ebe e nwere ọ́bá akwụkwọ na-agụ akwụkwọ ndị masịrị ya. Ọ sịrị: “Ọ ka na-atọ m ụtọ ịgụ akwụkwọ ndị na-akọ gbasara ihe ndị na-eme n’ebe dị iche iche n’ụwa.” Otu nwoke onye Swidin aha ya bụ Lennart, onye dị afọ iri asaa na ise, malitedịrị mụwa asụsụ ọhụrụ n’agbanyeghị na ọ dịghị mfe.

Na-enye ndị ọzọ ihe

NA-ENYE NDỊ ỌZỌ IHE: “Na-enyenụ ihe, ndị mmadụ ga-enyekwa unu ihe.” (Luk 6:38) Gbaa mbọ na-ewepụta oge ka gị na ndị ọzọ na-anọrị, na-enyekwa ndị ọzọ ihe. Ọ ga-eme ka ị mara na ị bara uru, meekwa gị obi ụtọ. Otu nwaanyị onye Brazil aha ya bụ Hosa, onye dị afọ iri asatọ na ise, na-agbalịsi ike enyere ndị ọzọ aka  n’agbanyeghị na ọ kaala nká. Ọ sịrị: “M na-akpọ ndị enyi m na-ejighị ahụ́ ma ọ bụ ndị nke dara mbà n’obi n’ekwentị ma ọ bụkwanụ mụ edegara ha akwụkwọ ozi. Mgbe ụfọdụkwa, m na-ezigara ha onyinye. M na-esitekwara ndị ahụ́ na-adịghị nri, ma ọ bụkwanụ meere ha ihe ratụ ratụ.”

Ọ bụrụ na ị na-enye ndị ọzọ ihe, ndị ọzọ ga na-enyekwa gị ihe. Otu nwoke onye Swidin aha ya bụ Jan, onye dị afọ iri isii na isii, kwuru, sị: “I meere ndị ọzọ ihe gosiri na ị hụrụ ha n’anya, hanwa ga-egosikwa gị na ha hụrụ gị n’anya.” Nke bụ́ eziokwu bụ na ị na-emere ndị ọzọ ihe ọma, ndị mmadụ ga-ahụ gị n’anya, gị na ha ga na-enwekwa obi ụtọ.

NA-AKPA NDỊ ỌZỌ NSO: “Onye na-akpa iche ga-achọ ihe na-agụ naanị onwe ya; ọ bụ ezi amamihe niile ka ọ ga-agbaso mgba.” (Ilu 18:1) Ọ bụ eziokwu na o nwere oge ụfọdụ ị ga-achọ ịnọ naanị gị, ma, ọ gaghị adị mma ka ị na-akpapụ onwe gị iche. Otu nwoke onye Naịjirịa aha ya bụ Innocent, onye dị afọ iri asaa na abụọ kwuru, sị: “Obi na-atọ m ụtọ iso ma ndị agadi ibe m ma ndị na-eto eto na-anọrị.” Otu nwoke onye Swidin aha ya bụ Börje, onye dị afọ iri asatọ na ise kwuru, sị: “M na-achọsi ike ka mụ na ndị na-eto eto na-anọ. Ọ na-abụ m na-ele otú ha si awụ gara gara, mụ ana-enwe obi ụtọ.” Na-akpọ ndị ọzọ mgbe ụfọdụ ka gị na ha nọrịa. Otu nwoke onye Saụt Koria aha ya bụ Han-sik, onye dị afọ iri asaa na abụọ kwuru, sị: “Mụ na nwunye m na-akpọ ma ndị agadi ma ndị na-eto eto oriri.”

Na-akpa ndị ọzọ nso

Gị na ndị enyi gị kwesịrị ịna-akparịta ụka. Ma, unu kparịtawa ụka, na-ege ha ntị ma ha kwuwe ihe ha chere. Gosi ha na ihe gbasara ha na-emetụ gị n’obi. Otu nwaanyị onye Mozambik aha ya bụ Helena, onye dị afọ iri asaa na otu, kwuru, sị: “M na-achọ ka mụ na ndị ọzọ dịrị ná mma, m na-akwanyekwara ha ùgwù. M na-ege ha ntị ka m nwee ike ịmata ihe dị ha n’obi na ihe na-amasị ha.” Otu nwoke onye Brazil aha ya bụ José, onye dị afọ iri asaa na atọ, kwuru, sị: “Ọ na-amasị ndị mmadụ ịkpa ndị na-ege ha ntị nso, ya bụ, ndị na-echebara ndị ha na ha na-ekwurịta okwu echiche, ndị na-akpa mmadụ ọchị, nakwa ndị na-aja mmadụ mma mgbe ha kwesịrị ime otú ahụ.”

I kwuwe otú obi dị gị, gbalịa ka okwu gị bụrụ “ihe e ji nnu mee ka ọ dị ụtọ.” (Ndị Kọlọsi 4:6) Na-echebara ndị ọzọ echiche, na-agbakwa ha ume.

NA-EKELE NDỊ MEERE GỊ IHE ỌMA: “Gosikwanụ na unu bụ ndị nwere ekele.” (Ndị Kọlọsi 3:15) Mmadụ meere gị ihe ọma, kelee ya. Ọ ga-eme ka gị na onye ahụ dịrịkwuo ná mma. Otu nwaanyị onye Kanada aha ya bụ Marie-Paule, onye dị afọ iri asaa na anọ, kwuru, sị: “Mụ na di m si n’ebe anyị bi kwaga ebe ọzọ na nso nso a. Ọtụtụ ndị enyi anyị nyeere anyị aka kwaa ngwongwo. Ihe a ha meere anyị tọgburu anyị atọgbu. Anyị zigaara onye nke ọ bụla n’ime ha kaadị ndị anyị ji sị ha na ha emeela, anyị kpọkwara ụfọdụ n’ime ha ka ha bịa ka anyị nọrịa ma rikọọ nri.” Otu nwaanyị onye Saụt Koria aha ya bụ Jae-won, onye dị afọ iri asaa na isii, nwere ezigbo obi ụtọ maka na o nwere ndị na-ebu ya aga ọmụmụ ihe. O kwuru, sị: “Obi bụ m sọ aṅụrị maka ihe a ha na-emere m. M kpebidịrị ịna-enye ha ego ka ha were tinye aka na-azụta mmanụ ụgbọala. Mgbe ụfọdụ, m na-enye ha obere onyinye, deekwa obere ozi ekele tinye n’onyinye ahụ.”

Ihe kwesịrị ịkacha na-eme ndị agadi obi ụtọ bụ na ha dị ndụ. Eze Sọlọmọn, bụ́ nwoke maara ihe, kwuru na “nkịta dị ndụ ka ọdụm nwụrụ anwụ mma.” (Ekliziastis 9:4) N’eziokwu, ọ bụrụ na onye agadi ewere ụwa ya otú o si hụ ya, na-emekwa naanị ihe ndị ọ ga-emeli, ọ ga na-enwe obi ụtọ.

Na-ekele ndị meere gị ihe ọma

GỤKWUO GBASARA YA

Mmadụ Ò Nwere Ike Ịdị Ndụ Ebighị Ebi?

Ndị mmadụ emeela ọtụtụ ihe ka ha ghara ịka nká. Ma, o nwebeghị mmadụ ọ bụla gbanahụrụla ọnwụ. Gịnị kpatara ya?