Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

ỤLỌ NCHE MEE 2015

 ISIOKWU ỤLỌ NCHE A

Ọgwụgwụ Ụwa Ọ̀ Dịla Nso?

Ọgwụgwụ Ụwa Ọ̀ Dịla Nso?

Chineke ọ̀ ga-anọgide na-agba nkịtị ka ụmụ mmadụ na-emegbu ibe ha ma na-eme ihe ndị nwere ike ikpochapụ mmadụ niile? Mba. Ebe ndị anyị gụrụla na Baịbụl gosiri na ọ gaghị agbachi nkịtị, kama ọ ga-akwụsị mmegbu na nsogbu niile dịwara kemgbe. Chineke chọrọ ka ị mara na oge eruwela ka o mee ka nsogbu anyị niile kwụsị. Olee otú o si eme ka ị mara?

Ka e were ya na ị chọrọ ịga otu obodo ị na-amaghị, gị ajụọ ndị ma ebe ahụ otú ị ga-esi aga. Ha nwere ike ịgwa gị ihe ndị ị ga-eji ama mgbe i rutewere ebe ahụ. Ị hụwa ihe ndị ahụ ka ị na-aga, obi ga-esi gị ike na i ruwela ebe ị na-aga. Ọ bụkwa otu ihe ahụ ka Chineke mere. O nyere anyị Baịbụl nke na-agwa anyị ihe ndị anyị ga-eji ama na ọgwụgwụ ụwa eruwela. Ka anyị na-ahụ ka ihe ndị ahụ na-eme, anyị na-amata na ọgwụgwụ eruwela.

Baịbụl kwuru na a ga-enwe oge pụrụ iche nke ga-adịgide ruo mgbe ọgwụgwụ ga-abịa. E nwere ọtụtụ ihe ga na-emekọta ọnụ n’oge ahụ. Ihe ndị ahụ emekọtatụbeghị ọnụ kemgbe ụwa malitere. Ka anyị lee ụfọdụ n’ime ha Baịbụl kwuru gbasara ha.

1. ỌGBA AGHARA ZURU ỤWA ỌNỤ Amụma dị na Matiu isi 24 kwuru ọtụtụ ihe ga na-emekọta ọnụ n’oge ikpeazụ. Ihe ndị ahụ ga-eme ka anyị mata na anyị nọ n’oge “ọgwụgwụ usoro ihe a.” Ha ga-emegidezi ruo mgbe “ọgwụgwụ ga-abịa.” (Matiu 24:3, 14) Ụfọdụ n’ime ihe ndị ahụ bụ agha, ụkọ nri, ala ọma jijiji a ga na-enwe n’ebe dị iche iche, ịba ụba nke mmebi iwu, ịhụnanya nke ndị mmadụ ịjụ oyi, nakwa ndị isi okpukpe ụgha iji aghụghọ na-eduhie ọtụtụ ndị. (Matiu 24:6-26) Ọ bụ eziokwu na ihe ndị ahụ na-eme kemgbe ọtụtụ afọ. Ma, n’oge ọgwụgwụ, ha niile ga na-emekọta ọnụ. Ha na ihe atọ anyị na-aga ikwu banyere ha ugbu a ga na-emekọtakwa ọnụ.

2. OMUME NDỊ MMADỤ Baịbụl kwuru na “n’oge ikpeazụ,” omume ụmụ mmadụ ga-ajọgbu onwe ya. Baịbụl kwuru, sị: “Ndị mmadụ ga-abụ ndị hụrụ naanị onwe ha n’anya, ndị hụrụ ego n’anya, ndị na-anya isi, ndị mpako, ndị nkwulu, ndị na-enupụrụ ndị mụrụ ha isi, ndị na-enweghị ekele, ndị na-adịghị eguzosi ike n’ihe, ndị na-enweghị obi mmadụ, ndị na-adịghị achọ inwe nkwekọrịta ọ bụla, ndị nkwutọ, ndị na-adịghị ejide onwe ha, ndị na-eme ihe ike, ndị na-adịghị ahụ ezi ihe n’anya, ndị na-arara mmadụ nye, ndị isi ike, ndị nganga fụliri elu, ndị hụrụ ihe ụtọ n’anya kama ịbụ ndị hụrụ Chineke n’anya.” (2 Timoti 3:1-4) Ọ bụ eziokwu na o teela ndị mmadụ kpawara àgwà ọjọọ ndị a, ma ọ bụ “n’oge ikpeazụ” ka àgwà ọjọọ ha ga-aka njọ nke na a ga-akpọ oge ikpeazụ a “oge dị oké egwu, nke tara akpụ.” Ị̀ chọpụtala na àgwà ndị mmadụ na-akazi njọ kwa ụbọchị?

3. A NA-EBIBI ỤWA Baịbụl kwuru na Chineke ‘ga-ebibi ndị na-ebibi ụwa.’ (Mkpughe 11:18) Olee otú ndị mmadụ si na-ebibi ụwa? Otú e si na-ebibi ụwa taa yikwara otú ndị mmadụ si na-ebibi ụwa n’oge Noa. Baịbụl kwuru, sị: “Ụwa wee bụrụ ihe e bibiri ebibi n’anya ezi Chineke, ụwa wee jupụta n’ime ihe ike. Chineke wee hụ ụwa, ma, lee! e bibiri ya ebibi.” N’ihi ihe a ndị mmadụ mere n’oge ahụ, Chineke kwuru na ya ‘ga-ebibi ha.’ (Jenesis 6:11-13) Ị̀ chọpụtala na ime ihe ike juziri ebe niile ugbu a? Ihe ọzọ bụkwa na ndị mmadụ arụpụtala ngwá agha ndị ha nwere ike iji kpochapụ mmadụ niile nọ n’ụwa a. O nwekwara otú ọzọ ndị mmadụ si na-emebi ụwa. Ha na-emebi ikuku na mmiri, na-egbukpọkwa oké ọhịa na ụmụ anụmanụ ndị nọ n’ime ha.

Jụgodị onwe gị, sị: ‘Otu narị afọ gara aga, ndị mmadụ hà arụpụtala ngwá agha ndị ha nwere ike iji kpochapụ mmadụ niile bi n’ụwa? Ma  ugbu a, ụmụ mmadụ na-arụpụtazi ngwá agha ndị bụ́ ọkpọka, na-emebikwa ikuku, mmiri na ihe ndị ọzọ Chineke kere. Ọtụtụ ihe ụmụ mmadụ na-arụpụtakwu emeela ka ha gharazie inwe ike ịghọtacha nsogbu ihe ndị ahụ nwere ike ịkpata ma ọ bụkwanụ ihe ha ga-eme ma ihe ndị ahụ kpatawa nsogbu. Ma, ụmụ mmadụ agaghị ebibili ụwa a kpamkpam. Tupu ha enwee ike ime ya, Chineke ga-abịa bibie ndị na-ebibi ụwa. Ihe a bụ nkwa Chineke kwere.

4. OZI ỌMA A GA NA-EKWUSA N’ỤWA NIILE Baịbụl kwukwara na ihe ọzọ a ga-eji ama oge ọgwụgwụ bụ na a ga-ebido kwusawa ozi ọma otú a na-ekwusatụbeghị ya mbụ. Ọ sịrị: “A ga-ekwusakwa ozi ọma nke a nke alaeze n’elu ụwa dum mmadụ bi ka ọ bụrụ àmà nye mba niile; mgbe ahụkwa ka ọgwụgwụ ga-abịa.” (Matiu 24:14) Ihe a ga na-ekwusa n’ozi ọma a ga-adị iche n’ihe ndị okpukpe dị iche iche na-ekwusa kemgbe ọtụtụ afọ. N’oge ọgwụgwụ, a ga na-ekwusa “ozi ọma nke a nke alaeze.” Ò nwere okpukpe ị ma na-ekwusakarị gbasara Alaeze Chineke? Ọ bụrụ na o nwere nke ị ma, okpukpe ahụ ọ̀ na-ekwusa ya naanị n’otu ebe, ka ọ̀ na-ekwusa ya “n’elu ụwa dum mmadụ bi ka ọ bụrụ àmà nye mba niile”?

A na-ekwusa banyere Alaeze Chineke n’ọtụtụ narị asụsụ n’ebe niile n’ụwa

Ihe bụ́ isi adres Ịntanet anyị bụ́ www.jw.org na-ekwu gbasara ya bụ “ozi ọma nke a nke alaeze.” N’adres Ịntanet a, anyị nwere akwụkwọ ndị na-ekwu gbasara Alaeze Chineke n’ihe karịrị narị asụsụ asaa. Ò nwere ndị ọzọ ị ma na-ekwusa banyere Alaeze Chineke n’ụwa niile otú a? Tupudị Ịntanet apụta, a ma Ndịàmà Jehova ama na ha ejighị ikwusa ozi ọma Alaeze Chineke egwu egwu. Kemgbe afọ 1939, ihe a na-ede n’ihu magazin anyị a na-akpọ Ụlọ Nche bụ “Ụlọ Nche nke Na-ekwusa Alaeze Jehova.” Otu akwụkwọ kọrọ gbasara okpukpe dị iche iche kwuru na ‘e nwere ike ikwu na o nweghị ndị ọzọ na-ekwusa ozi ọma n’ebe niile ma na-ekwusasi ya ike ka Ndịàmà Jehova.’ Ndịàmà Jehova na-ekwusasi ike na n’oge na-adịghị anya, Alaeze Chineke ga-eme ka ‘ọgwụgwụ bịa.’

OGE PỤRỤ ICHE

Ị̀ chọpụtala na ihe anọ a Baịbụl kwuru na ha ga na-eme n’oge ọgwụgwụ na-eme taa? Kemgbe ihe karịrị otu narị afọ ugbu a, akwụkwọ a a na-akpọ Ụlọ Nche na-akọrọ ndị mmadụ ihe ndị na-eme n’ụwa a, ka ha jiri ya mata na ọgwụgwụ ụwa eruwela. Ma, o nwere ndị na-ekweghị na anyị bi na mgbe ọgwụgwụ. Ha na-ekwudị na onye ọ bụla nwere ike ikwu ihe o chere mere  ihe ndị a ji eme, nakwa na ndị mmadụ na-etinye ihe ụfọdụ na-emenụ nnu na ose ma ha kọwa ha. Ha na-ekwukwa na ihe mere o ji dị ka ihe ọjọọ ndị na-emenụ hà buru ibu bụ n’ihi ọganihu e nwerela n’usoro mgbasa ozi, ndị mmadụ ana-anụzi banyere ihe ọjọọ na-eme n’ebe dị iche iche n’ụwa. N’agbanyeghị ihe ndị a ha na-ekwu, e nwere ọtụtụ ihe na-egosi na anyị bi na mgbe ọgwụgwụ.

Ụfọdụ ndị ọkachamara na-ekwu na o ruwela mgbe ihe ndị dị oké egwu ga-eme n’ụwa a. N’afọ 2014, ụfọdụ ndị sayensị gwara Ngalaba Òtù Mba Ụwa nke Na-ahụ Maka Udo banyere ihe ndị nwere ike ikpochapụ ndị mmadụ n’oge na-adịghị anya. Ha kwuru, sị: “Mgbe anyị lebachara anya n’ihe ndị a, anyị chọpụtara na e nweela ọtụtụ ihe ndị nwere ike ikpochapụ mmadụ niile bi n’ụwa.” Ọtụtụ ndị kweere na o ruola mgbe ihe ndị dị oké egwu ga-eme n’ụwa. Ndị dere akwụkwọ a ị na-agụ na ọtụtụ ndị na-agụ ya kweere na anyị bi n’oge ọgwụgwụ nakwa na ọgwụgwụ ụwa adịla nso. Ma, i kwesịghị ịtụwa ụjọ maka ihe ga-eme n’ọdịnihu. I kwesịrị ịna-enwe obi ụtọ. Gịnị mere anyị ji kwuo otú ahụ? Ọ bụ n’ihi na i nwere ike iso ná ndị a na-agaghị ebibi mgbe ọgwụgwụ ụwa ga-abịa.