Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

ỤLỌ NCHE MEE 2015

 ISIOKWU ỤLỌ NCHE A | ỌGWỤGWỤ ỤWA Ọ̀ DỊLA NSO?

A Ga-azọpụta Ọtụtụ Ndị Mgbe Ọgwụgwụ Ụwa Ga-abịa—Gịnwa Nwekwara Ike Iso na Ha

A Ga-azọpụta Ọtụtụ Ndị Mgbe Ọgwụgwụ Ụwa Ga-abịa—Gịnwa Nwekwara Ike Iso na Ha

Ihe Baịbụl kwuru gosiri na o nwere ndị ga-anwụ mgbe ọgwụgwụ ụwa ga-abịa. Ọ sịrị: “A ga-enwe oké mkpagbu nke a na-enwetụbeghị ụdị ya kemgbe ụwa malitere ruo ugbu a . . . ọ bụrụ na e meghị ka ụbọchị ndị ahụ dị mkpirikpi, a gaghị azọpụta anụ ahụ́ ọ bụla.” (Matiu 24:21, 22) Ma, Chineke kwere anyị nkwa na a ga-azọpụta ọtụtụ ndị. Ọ sịrị: “Ụwa na-agabiga, . . .  ma onye na-eme uche Chineke ga-anọgide ruo mgbe ebighị ebi.”—1 Jọn 2:17.

Ọ bụrụ na ị chọrọ iso ná ndị a ga-azọpụta mgbe ọgwụgwụ ụwa ga-abịa, sorokwa ná ndị “ga-anọgidekwa ruo mgbe ebighị ebi,” gịnị ka ị ga-eme? Ihe ị ga-eme ọ̀ bụ ịkwakọtawa ihe oriri na imewe ihe ndị ọzọ iji kwadebe maka ọgwụgwụ ụwa? Mba. Baịbụl dụrụ anyị ọdụ ka anyị bute ihe ndị ka mkpa ụzọ. Ọ sịrị: “Ebe a ga-esi otú a gbazee ihe ndị a niile, chebaranụ ụdị mmadụ unu kwesịrị ịbụ echiche n’ihe banyere àgwà dị nsọ na omume ịsọpụrụ Chineke, na-echere ma na-eburu ọbịbịa nke ụbọchị Jehova n’uche.” (2 Pita 3:10-12) Ihe e kwuru ebe a gosiri na ihe ndị so ‘n’ihe ndị a niile’ a ga-ebibi bụ ndị ọchịchị ụwa ọjọọ a na ndị niile nabatara ọchịchị ha ma jụ ọchịchị Chineke. Nke bụ́ eziokwu bụ na ihe oriri na ihe ndị ọzọ anyị nwere ike ịkwakọta agaghị azọpụtali anyị mgbe ọgwụgwụ ụwa ga-abịa.

Ihe ga-azọpụta anyị bụ iji ife Jehova kpọrọ ihe na ịna-amụta otú ọ chọrọ ka anyị si na-akpa àgwà. (Zefanaya 2:3) Anyị ekwesịghị iso ọtụtụ ndị taa na-achọghị ịma na ihe ndị na-eme n’ụwa ugbu a na-egosi na anyị bi n’oge ọgwụgwụ. Kama, anyị kwesịrị ‘ịna-eburu ọbịbịa nke ụbọchị Jehova n’uche.’ Ndịàmà Jehova ga-ejili Baịbụl gosi gị ihe ị ga-eme ka ị ghara iso ná ndị a ga-ebibi mgbe ọgwụgwụ ga-abịa.

GỤKWUO GBASARA YA

Gịnị Bụ Ozi Ọma Ahụ?

Gụọ banyere ozi ọma si n’aka Chineke, ihe mere ozi ahụ ji dị mkpa na ihe i kwesịrị ime.

Olee Ihe Ndị Ga-enyere Gị Aka Ịghọta Ihe Ị Na-agụ na Baịbụl?

Ma ị̀ gụrụ akwụkwọ ma ị́ gụghị, ị ga-aghọtali ihe Chineke na-agwa anyị n’Akwụkwọ Nsọ.