Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

ỤLỌ NCHE MEE 2015

 ISIOKWU ỤLỌ NCHE A | ỌGWỤGWỤ ỤWA Ọ̀ DỊLA NSO?

Gịnị Ka “Ọgwụgwụ Ụwa” Pụtara?

Gịnị Ka “Ọgwụgwụ Ụwa” Pụtara?

Gịnị na-agbata gị n’obi ma ị nụ “Chegharịanụ! Ọgwụgwụ ụwa adịla nso”? O nwere ike ịbụ onye nọ n’ọlta jiri Baịbụl n’aka na-ekwu Okwuchukwu, ma ọ bụkwanụ onye yi ákwà ọcha, kee eriri n’úkwù, na-aga n’ụzọ na-akụ mgbịrịgba. E nwere ụfọdụ ndị okwu gbasara ọgwụgwụ na-echegbu, nwee ndị na-enweghị ihe ha ji ya kpọrọ, nweekwa ndị nke ọ na-atọ ọchị.

Ma, Baịbụl kwuru, sị: “Ọgwụgwụ ga-abịa.” (Matiu 24:14) Baịbụl kpọkwara ọgwụgwụ a “oké ụbọchị nke Chineke,” kpọọkwa ya “Amagedọn.” (Mkpughe 16:14, 16) Ma, okpukpe niile enweghị otu olu n’okwu a, ihe ọtụtụ n’ime ha na-ekwukwa banyere ya edoghị anya. Mana Baịbụl kwuru ihe doro anya gbasara ya. Ọ gwara anyị ihe ọ bụ na ihe ọ na-abụghị, gwakwa anyị ihe ga-enyere anyị aka ịma ma ọgwụgwụ ọ̀ dịla nso. Ma, ihe ga-akacha abara anyị uru ọ gwara anyị bụ ihe anyị ga-eme ka ọgwụgwụ ahụ ghara ịta isi anyị. Ka anyị burugodị ụzọ kọwaa ihe ọgwụgwụ ụwa pụtara na ihe ọ na-apụtaghị. Gịnịdị ka Baịbụl kwuru na “ọgwụgwụ” pụtara?

 IHE ỌGWỤGWỤ NA-ABỤGHỊ

  1. ỌGWỤGWỤ ỤWA ABỤGHỊ IJI ỌKỤ EBIBI ỤWA.

    Baịbụl kwuru, sị: “[Chineke] tọrọ ntọala ụwa mee ka o sie ike; ọ gaghị ama jijiji ruo mgbe ebighị ebi, ma ọ bụ ruo mgbe niile ebighị ebi.” (Abụ Ọma 104:5) Amaokwu Baịbụl a na amaokwu Baịbụl ndị ọzọ na-eme ka obi sie anyị ike na Chineke agaghị ebibi ụwa anyị a, ọ gaghịkwa ekwe ka onye ọ bụla bibie ya.—Ekliziastis 1:4; Aịzaya 45:18.

  2. ỌGWỤGWỤ ỤWA ABỤGHỊ IHE GA-ANỌKATA MEERE ONWE YA.

    Baịbụl kwuru na o nwere oge Chineke kapịrị ọnụ ọgwụgwụ ga-abịa. Baịbụl sịrị: “Ọ dịghị onye maara ụbọchị ahụ ma ọ bụ oge awa ahụ, ndị mmụọ ozi nọ n’eluigwe amaghị, Ọkpara ahụ amaghịkwa, kama naanị Nna m maara. Na-elenụ anya, mụrụnụ anya, n’ihi na unu amaghị mgbe oge ahụ a kara aka bụ.” (Mak 13:32, 33) Ihe a Baịbụl kwuru gosiri na Chineke (ya bụ, “Nna” Jizọs) nwere ‘oge a kara aka’ ọ ga-eme ka ọgwụgwụ bịa.

  3. Ọ BỤGHỊ ỤMỤ MMADỤ MA Ọ BỤ IHE NDỊ SI NA MBARA IGWE GA-EWETA ỌGWỤGWỤ ỤWA.

    Olee otú ọgwụgwụ ga-esi abịa? Mkpughe 19:11 sịrị: “M wee hụ ka e meghere eluigwe, ma, lee! otu ịnyịnya ọcha. A na-akpọkwa onye nọ n’elu ya Onye Kwesịrị Ntụkwasị Obi na Onye Eziokwu.” Amaokwu nke 19 kwukwara, sị: “M wee hụ anụ ọhịa ahụ na ndị eze nke ụwa na ụsụụ ndị agha ha ka ha zukọtara ibuso onye ahụ nke nọ n’elu ịnyịnya ahụ na ụsụụ ndị agha ya agha.” (Mkpughe 19:11-21) Anyị ma na ọtụtụ ihe a kpọrọ aha ebe a nwechara ihe ha nọchiri anya ha. Ma, o nwere otu ihe anyị ghọtara ozugbo. Ihe ahụ bụ na Chineke ga-ezite ndị mmụọ ozi ya ka ha bịa kpochapụ ndị iro ya.

Ihe Baịbụl na-ekwu banyere ọgwụgwụ bụ ozi ọma, ọ bụghị ozi ọjọọ

IHE ỌGWỤGWỤ ỤWA BỤ

  1. ỌGWỤGWỤ ỤWA BỤ ỌGWỤGWỤ ỌCHỊCHỊ ỤMỤ MMADỤ.

    Baịbụl gwara anyị, sị: “Chineke nke eluigwe ga-eme ka otu alaeze nke a na-agaghị ebibi ebibi malite  ịchị. A gaghịkwa enyefe ndị ọ bụla ọzọ alaeze ahụ. Ọ ga-egwepịa alaeze ndị a niile, mee ka ha ghara ịdịkwa, ma ya onwe ya ga-adịru mgbe ebighị ebi.” (Daniel 2:44) Dị ka anyị kwuburula, a ga-ekpochapụ “ndị eze nke ụwa na ụsụụ ndị agha ha,” ndị “zukọtara ibuso onye ahụ nke nọ n’elu ịnyịnya ahụ na ụsụụ ndị agha ya agha.”—Mkpughe 19:19.

  2. ỌGWỤGWỤ ỤWA BỤ ỌGWỤGWỤ NKE AGHA, IME IHE IKE, NA MMEGBU.

    Baịbụl kwuru, sị: “[Chineke] na-eme ka agha kwụsị ruo na nsọtụ ụwa.” (Abụ Ọma 46:9) O kwukwara na “ọ bụ ndị ziri ezi ga-ebi n’ụwa, ọ bụkwa ndị na-enweghị ihe a ga-eji taa ha ụta ka a ga-ahapụ n’ime ya. Ma a ga-ebipụ ndị ajọ omume n’ụwa; a ga-efopụkwa ndị na-aghọ aghụghọ na ya.” (Ilu 2:21, 22) O kwukwara, sị: “Lee! Ana m eme ihe niile ka ha dị ọhụrụ.”—Mkpughe 21:4, 5.

  3. ỌGWỤGWỤ ỤWA BỤ ỌGWỤGWỤ OKPUKPE ỤGHA.

    Baịbụl kwuru, sị: “Ndị amụma na-ebu amụma ụgha; ndị nchụàjà na-eji ike ha emegbu ndị mmadụ. . . . Gịnị ka unu ga-eme n’ikpeazụ?” (Jeremaya 5:31) O kwukwara, sị: “Ọtụtụ mmadụ ga-asị m n’ụbọchị ahụ, ‘Onyenwe anyị, Onyenwe anyị, ọ̀ bụ na anyị ebughị amụma n’aha gị, chụpụkwa ndị mmụọ ọjọọ n’aha gị, rụọkwa ọtụtụ ọrụ dị ike n’aha gị?’ Ma mgbe ahụ, m ga-ekwupụtara ha, sị: Ọ dịghị mgbe m maara unu! Sinụ n’ebe m nọ pụọ, unu ndị ọrụ mmebi iwu.’”—Matiu 7:21-23.

  4. ỌGWỤGWỤ ỤWA BỤ ỌGWỤGWỤ NKE NDỊ NIILE NA-ENUPỤRỤ CHINEKE ISI.

    Jizọs Kraịst kwuru, sị: “Nke a bụ ihe a ga-eji kpee ikpe, na ìhè ahụ abịawo n’ụwa ma ụmụ mmadụ hụrụ ọchịchịrị n’anya kama ìhè, n’ihi na ọrụ ha dị njọ.” (Jọn 3:19) O nwere ihe Baịbụl kwuru gbasara mgbe mbụ e bibiri ụwa n’oge Noa bụ́ nwoke fere Chineke. Ọ sịrị: “E jikwa ihe ndị ahụ bibie ụwa nke oge ahụ mgbe e mere ka iju mmiri rikpuo ya. Ma site n’otu okwu ahụ, eluigwe na ụwa dị ugbu a ka e debeere ọkụ, a na-edebekwa ha ruo ụbọchị ikpe na ụbọchị mbibi nke ndị na-adịghị asọpụrụ Chineke.”—2 Pita 3:5-7.

Ị̀ chọpụtara na e ji “ụbọchị ikpe na ụbọchị mbibi” na-abịanụ tụnyere mbibi e bibiri ụwa n’oge Noa? Gịnị bụ ụwa ahụ e bibiri n’oge ahụ? Ọ bụghị ụwa nkịtị, kama ọ bụ “ndị na-adịghị asọpụrụ Chineke,” ya bụ, ndị iro Chineke e bibiri n’iju mmiri ahụ. Mgbe “ụbọchị ikpe” ga-abịa, a ga-ebibikwa ndị niile bụ́ ndị iro Chineke. Ma, Chineke ga-echebe ndị enyi ya otú ahụ o chebere Noa na ndị ezinụlọ ya.—Matiu 24:37-42.

Chegodị otú ụwa ga-adị mgbe Chineke bibichara ndị iro ya ma kwụsị ihe ọjọọ niile na-eme n’ụwa. O doro anya na ihe Baịbụl na-ekwu banyere ọgwụgwụ bụ ozi ọma, ọ bụghị ozi ọjọọ. Ma, mmadụ nwere ike ịna-eche, sị: ‘Baịbụl ọ̀ gwara anyị mgbe ọgwụgwụ ga-abịa? Ọ̀ dịla nso? Olee ihe m ga-eme ka a ghara ibibi m?’