Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

ỤLỌ NCHE EPREL 2015

Ihe Dị Oké Ọnụ Ahịa A Chọtara n’Ebe A Na-ekpofu Ihe

Ihe Dị Oké Ọnụ Ahịa A Chọtara n’Ebe A Na-ekpofu Ihe

GỊNỊ na-agbata gị n’obi ma e kwuwe okwu kwute ebe a na-ekpofu ihe? O nwere ike ịbụ ebe e kpokọjuru ihe ndị na-adịghị mma na ebe na-esi ísì. Ọ ga-esi ike ka ihe ga-agbata gị n’obi bụrụ ebe e nwere ike inweta ihe bara uru, ma ya fọdụzie inweta ihe dị oké ọnụ ahịa.

Ma, otu narị afọ gara aga, a chọtara otu ihe dị oké ọnụ ahịa n’ebe a na-ekpofu ihe. Ihe a abụghị ọlaedo ma ọ bụ ọlaọcha. Ọ bụ ụdị ihe ọzọ. Gịnị bụ ihe ahụ? Oleekwa uru ọ baara anyị taa?

IHE A CHỌTARA EBE A NA-ATỤGHỊ ANYA YA

E nwere ndị ọkà mmụta abụọ aha ha bụ Bernard P. Grenfell na Arthur S. Hunt. Ha na-akụzi na Mahadum Oxford. N’ihe dị ka n’afọ 1902, ha gawara Ijipt. Mgbe ha ruru, o nwere ihe ha chọtara n’otu ebe a na-ekpofu ihe n’akụkụ Osimiri Naịl. Ihe ahụ bụ ụfọdụ iberibe akwụkwọ papaịrọs. N’afọ 1920, ka ha abụọ nọ na-ahazi iberibe akwụkwọ papaịrọs ndị ahụ, Grenfell zụtara iberibe akwụkwọ ndị ọzọ e gwupụtara n’ala Ijipt. Ọ zụtara ha ka e dowe ha n’ọ́bá akwụkwọ a na-akpọ John Rylands Library nke dị na Manchesta dị n’Ịngland. Ma, Grenfell na Arthur nwụrụ tupu ha ahazichaa iberibe akwụkwọ ndị ahụ.

Ọ bụzi ọkà mmụta ọzọ aha ya bụ Colin H. Roberts, onye na-akụzikwa na mahadum Oxford, hazichara iberibe akwụkwọ ndị ahụ. Ka ọ nọ na-ahazi ha, ọ hụrụ iberibe akwụkwọ papaịrọs dị inch atọ na ọkara n’ogologo na ihe dị ka inch abụọ na ọkara n’obosara. E ji asụsụ Grik dee ihe ndị e dere na ya. O juru ya anya na okwu ụfọdụ e dere na ya bụ okwu ndị ọ ma ama. Ihe e dere n’ihu ya bụ ihe ụfọdụ dị na Jọn 18:31-33, ihe e dere n’azụ ya abụrụ ihe ụfọdụ dị na Jọn 18:37, 38. Ọ bụ mgbe ahụ ka Roberts matara na ya achọtala ihe dị oké ọnụ ahịa.

OTÚ E SI MATA MGBE E DERE IHE DỊ NA YA

Obi Roberts gwara ya na o teela e dere ihe dị n’iberibe akwụkwọ papaịrọs ahụ. Ma, olee mgbe e dere ya? O nwere ihe Roberts mere iji mata mgbe ọ ga-abụ na e dere ya. O lere aka akwụkwọ e ji dee ihe na ya, lezie aka akwụkwọ ya na ya yiri n’akwụkwọ ndị mgbe ochie ndị ọzọ a ma mgbe e dere ha. * Ihe a o mere nyeere ya aka ịmata mgbe ọ ga-abụ na e dere ya. Ma, ọ chọrọ ịmata kpọmkwem mgbe e dere ya. N’ihi ya, o sere iberibe akwụkwọ ndị ahụ foto ma zigara ya mmadụ atọ bụ́ ọkà n’ihe gbasara akwụkwọ papaịrọs ma gwa ha ka ha chọpụta afọ e dere ya. Gịnị ka mmadụ atọ a chọpụtara?

Ha leruru anya n’aka akwụkwọ e ji dee ihe n’iberibe akwụkwọ ahụ. Ha atọ kwuru na e dere ihe dị n’iberibe akwụkwọ papaịrọs ahụ ihe dị ka n’afọ 125, ya bụ, ihe dị ka afọ iri abụọ na ise Jọn onyeozi nwụchara. Ma, ọ pụtaghị na otú a ha si mata oge e dere ihe dị n’iberibe akwụkwọ ahụ bụ otú kacha mma isi mata oge e dere akwụkwọ. Ọkà mmụta ọzọ kwudịrị na ọ ga-abụ na e dere ihe ndị ahụ n’oge ọ bụla n’agbata afọ 101 na afọ 200. Ma, otu ihe doro anyị anya bụ na iberibe akwụkwọ papaịrọs a bụ nke kacha ochie n’ime akwụkwọ mgbe ochie niile dị ugbu a e dere ihe dị n’Agba Ọhụrụ.

IHE IBERIBE AKWỤKWỌ PAPAỊRỌS AHỤ MERE KA A MATA

Ò nwere uru iberibe akwụkwọ papaịrọs a e dere ihe dị n’Oziọma Jọn baara ndị na-agụ Baịbụl taa? Ma ọ́ dịghị ihe ọzọ, o nwere uru abụọ ọ baara ha. Otu bụ na ihe ụfọdụ a chọpụtara banyere iberibe akwụkwọ a gosiri na Ndị Kraịst oge gboo ji Akwụkwọ Nsọ kpọrọ ihe.

Ò nwere uru iberibe akwụkwọ papaịrọs a e dere ihe dị n’Oziọma Jọn baara ndị na-agụ Baịbụl taa?

N’agbata afọ 101 na afọ 200, e nwere ụdị akwụkwọ abụọ a na-eji ede ihe. Nke mbụ bụ akwụkwọ mpịakọta, nke abụọ abụrụ nke a na-akpọ kodeks. Ihe a na-eji eme akwụkwọ mpịakọta bụ iberibe  akwụkwọ papaịrọs a dụkọtara ọnụ, ha etoo ogologo. E nweziri ike ịfụkọta ya afụkọta. A naghị edekarị akwụkwọ mpịakọta ihe ihu na azụ.

Ma, e dere iberibe akwụkwọ papaịrọs ahụ Roberts chọtara ihe ihu na azụ. Nke a gosiri na ọ ga-abụ na o si n’ụdị akwụkwọ nke ahụ a na-akpọ kodeks. A na-eji ibe akwụkwọ papaịrọs eme kodeks. A na-adụkọta ibe akwụkwọ ndị ahụ ha adị ka akwụkwọ ndị e nwere n’oge a.

Olee otú kodeks si kara akwụkwọ mpịakọta mma? Anyị manụ na Ndị Kraịst oge gboo zisara ozi ọma. (Matiu 24:14; 28:19, 20) Ha na-aga ebe ọ bụla ha nwere ike ịhụ ndị mmadụ na-akọrọ ha ihe Baịbụl kwuru. Ha na-aga ma n’ụlọ ndị mmadụ ma n’ahịa ma n’okporo ámá. (Ọrụ Ndịozi 5:42; 17:17; 20:20) N’ihi ya, ọ kaara ha mma inwe Akwụkwọ Nsọ e mere otú ọ ga-adị mfe iji ya na-aga ozi ọma.

Ebe ọ bụ na nke kodeks ahụ dị ntakịrị, o mere ka ọ dịrị ọgbakọ dị iche iche na ndị ọzọ chọrọ inweta Akwụkwọ Nsọ mfe iji aka ha depụta Akwụkwọ Nsọ nke ha. O meziri ka e nwee ike idepụtaghachi akwụkwọ Matiu, Mak, Luk, na Jọn ọtụtụ ugboro. O nyekwara aka mee ka ọtụtụ ndị ghọọ Ndị Kraịst.

Ihe a bụ iberibe akwụkwọ papaịrọs ahụ Ihu ya na azụ ya

Uru ọzọ iberibe akwụkwọ papaịrọs ahụ baara anyị bụ na o mere ka obi sie anyị ike na ihe dị na Baịbụl mbụ ndị e nwere bụ kpọmkwem ihe dị na nke anyị na-agụ taa. Ọ bụ eziokwu na e dere naanị amaokwu ole na ole si n’Oziọma Jọn n’iberibe akwụkwọ papaịrọs ahụ, e nwechaghị ihe dị iche n’ihe e dere na ya na ihe e dere na Baịbụl anyị na-agụ taa. O gosiri na a gbanwebeghị ihe ọ bụla na Baịbụl n’agbanyeghị na e depụtaghachila ya ọtụtụ ugboro.

Ma, iberibe akwụkwọ papaịrọs ahụ e dere ihe ụfọdụ dị n’Oziọma Jọn bụ naanị otu n’ime ọtụtụ puku iberibe akwụkwọ na akwụkwọ ndị gosiri na ihe dị na Baịbụl mbụ na ihe dị na nke anyị nwere taa bụ otu. E nwere ihe otu nwoke aha ya bụ Werner Keller kwuru n’akwụkwọ ya a na-akpọ The Bible as History. Ọ sịrị: “Akwụkwọ ndị mgbe ochie ndị a bụ ihe ndị kacha egosi na ihe e dere na Baịbụl ndị anyị nwere ugbu a bụ otú ha dị na Baịbụl ndị mbụ e dere.”

Ma, ọ bụghị n’ihi iberibe akwụkwọ ndị a a chọtara mere ezigbo Ndị Kraịst ji kwere na ihe e dere na Baịbụl bụ eziokwu. Ihe mere ha ji kwere bụ na Baịbụl n’onwe ya kwuru na “Akwụkwọ Nsọ dum si n’ike mmụọ nsọ Chineke.” (2 Timoti 3:16) Ma, obi dị anyị ụtọ na ihe ndị mgbe ochie a na-achọta taa na-egosi na otu ihe Baịbụl kwuru kemgbe bụ eziokwu, ya bụ, na “okwu Jehova na-adịru mgbe ebighị ebi.”—1 Pita 1:25.

^ para. 8 N’oge ochie, ọ na-abụ e dekata otu aka akwụkwọ, a gbanwee dewe aka akwụkwọ ọzọ. N’ihi ya, e nwere ike ịmata afọ e dere akwụkwọ ma ọ bụrụ na aka akwụkwọ e ji dee ya yiri aka akwụkwọ e ji dee akwụkwọ ndị mgbe ochie nke bu ụbọchị e dere ha.

GỤKWUO GBASARA YA

Ihe Ndị A Kọrọ na Baịbụl Gbasara Jizọs Hà Bụ Eziokwu?

Chọpụta ma ihe Matiu, Mak, Luk, na Jọn kọrọ hà bụ eziokwu. Leekwa ihe a chọpụtara ná mpempe akwụkwọ kacha mee ochie e nwere.

Baịbụl—Akụkọ Dị Ịtụnanya nke Otú O Si Dịruo n’Oge Anyị

Ị ga-ahụ otú ndị mmadụ si nwaa ibibi Baịbụl. Ma, ha enwelighị ike ibibi ya kpamkpam iji gosi na ọ bụ akwụkwọ si n’aka Chineke.