Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

ỤLỌ NCHE EPREL 2015

 BAỊBỤL NA-AGBANWE NDỤ NDỊ MMADỤ

Ajụjụ Atọ Gbanwere Ndụ M

Ajụjụ Atọ Gbanwere Ndụ M
  • A MỤRỤ M N’AFỌ: 1949

  • ABỤ M ONYE: AMERỊKA

  • NDỤ M BIRI: Ọ NA-AGỤSI M IKE ỊMA EZIGBO IHE MMADỤ KWESỊRỊ IJI NDỤ YA MEE

NDỤ M BIRI NA MBỤ:

Etoro m n’Ankram bụ́ otu obere obodo dị n’ebe ugwu Niu Yọk dị n’Amerịka. Ọtụtụ ndị obodo a na-akpa ehi. Ehi dị n’obodo a karịdịrị mmadụ ole bi na ya.

E nwere naanị otu chọọchị n’obodo a. Ọ bụ ya ka ndị ezinụlọ anyị niile na-ekpe. N’ụtụtụ Sọnde ọ bụla, papa nnukwu m na-ehichara m akpụkpọ ụkwụ m ga-eyi aga Sọnde Skul. M na-eyirizi ya ma were obere Baịbụl mama nnukwu m nyere m gawa. Mụ na ụmụnne m si na nwata mụta ịna-arụsị ọrụ ike, ịna-asọpụrụ ndị ọzọ, ịna-enyere ndị ọzọ aka na ịna-ekele onye meere anyị ihe ọma.

Mgbe m tolitere, agara m biri ebe ọzọ ma mechaa na-akụzi nkụzi ebe ahụ. O nwere ọtụtụ ihe na-agbagwoju m anya gbasara Chineke nakwa gbasara ndụ a anyị dị. Ụbụrụ na-aghọ ụfọdụ n’ime ụmụ akwụkwọ m nkọ. Ma, e nwekwara ndị nke ụbụrụ na-anaghị aghọcha nkọ n’agbanyeghị na ha na-agụsi akwụkwọ ike. E nwere ndị nke nwere nkwarụ, nwee ndị na-enweghị. Ọ nọ na-adị m ka ihe a ọ̀ bụ mmegbu. Mgbe ụfọdụ, ndị mụrụ ụmụ akwụkwọ ndị ahụ ụbụrụ na-anaghị aghọcha nkọ na ndị nke mụrụ ndị nwere nkwarụ na-ekwu na “Ọ bụ otú Chukwu si chọọ ya.” Ọ na-eju m anya otú Chineke si kwe ka ụmụaka ụfọdụ buru ụdị nsogbu ndị a pụta ụwa. A sịdị kwuwe, ụmụaka ndị a enweghị ihe ọjọọ ha mere.

Ihe ọzọ na-echekwa m uche bụ ezigbo ihe m ga-eji ndụ m mee. Ọ na-adị m ka o nwebeghị ezigbo ihe m jirila ndụ m mee. A mụrụ m n’ezinụlọ e ji ama atụ, agara m ụlọ akwụkwọ ndị bụ́ ịgbà, ana m arụkwa ọrụ na-atọ m ezigbo ụtọ. Ma ọ ka dịkwa m ka ọ dịbeghị ezigbo ihe m ji ndụ m mee. M sịdị ka m metụkwuo, ihe ọzọ m nwere ike ime bụ ịlụ di, mụọ ụmụ, na-arụ ọrụ m ruo mgbe m ga-ala ezumike nká, ụmụ m akpọgazie m n’ebe a na-elekọta ndị agadi. M nọ na-eche ma ò nwere ihe ọzọ ka mma m kwesịrị iji ndụ m mee.

OTÚ BAỊBỤL SI GBANWEE NDỤ M:

E nwere otu afọ mụ na ụfọdụ ndị nkụzi ibe m gara njem nlere anya na Yurop n’oge ọkọchị. Anyị gara hụ nnukwu chọọchị a na-akpọ Westminsta  Abi, na nke a na-akpọ Nọtrọ-Dam de Pari, gaakwa na Vatikan bụ́ ebe poopu bi. Anyị gakwara hụ ọtụtụ obere chọọchị ndị ọzọ dị na Yurop. Ebe nke ọ bụla anyị rutere, m na-ajụ ndị anyị hụrụ ajụjụ ndị na-echu m ụra. Mgbe m lọtara ebe m bi na Slotsbọg dị na Niu Yọk, m gara n’ọtụtụ chọọchị jụọkwa ha ajụjụ ndị ahụ na-echu m ụra. Ma, o nweghị ndị nke zara m ihe juru m afọ.

Otu ụbọchị, otu nwa akwụkwọ m dị afọ iri na abụọ bịakwutere m jụọ m ma m̀ ma na ya bụ Onyeàmà Jehova, mụ asị ya ee. Ya ajụọ m ma m̀ ga-achọ ịmatakwu gbasara Ndịàmà Jehova, mụ asịkwa ya ee. Ya ajụzie m ebe m bi, mụ agwa ya. Ọ bụ mgbe ahụ ka mụ na ya matara na anyị gbara agbata obi. Amaghị m na ajụjụ atọ ahụ ọ jụrụ m ga-agbanwe ndụ m ruo mgbe ebighị ebi.

Abalị ole na ole mụ na ya kwurịtachara ihe ahụ, ọ gbaara ígwè ya bịa n’ụlọ m, mụ na ya ebido ịmụ Baịbụl. Ajụrụ m ya ajụjụ ndị ahụ m jụrụla ọtụtụ ndị isi okpukpe. O meghị ka ha. O gosiri m azịza ajụjụ ndị ahụ na Baịbụl m.

Ihe ndị a m mụtara na Baịbụl mere m ezigbo obi ụtọ, meekwa ka afọ ju m. Ihe m gụtara na 1 Jọn 5:19 metụrụ m n’ahụ́. Ebe ahụ sị na “ụwa dum dị n’aka ajọ onye ahụ.” Ahụ́ bịara ruo m ala mgbe m matara na ọ bụghị Chineke na-akpata ihe ọjọọ ndị na-eme taa, kama na ọ bụ Setan, nakwa na Chineke ga-emezi ihe niile n’ọdịnihu. (Mkpughe 21:3, 4) M bịara chọpụta na a kọwaara mmadụ ihe dị na Baịbụl nke ọma, onye ahụ ga-aghọta na Baịbụl na-ekwu eziokwu. Ihe mere m ji kwe ka mụ na nwa ahụ dị afọ iri na abụọ na-amụ Baịbụl bụ na ama m na ihe m na-amụta bụ eziokwu.

Ma, ihe ọzọ m chọrọ ịmata bụ ma Ndịàmà Jehova hà na-emekwa ihe ndị ha na-akụzi. Dị ka ihe atụ, nwatakịrị nwaanyị ahụ gwara m na ezigbo Ndị Kraịst na-enwere ndị ọzọ ndidi, na-enwekwa obiọma. (Ndị Galeshia 5:22, 23) M kpebiri na m ga-ele ma nwa a ọ̀ na-emekwa ihe ndị a ọ sị na ha na-eme. Otu ụbọchị, m kpachaara anya lọta mgbe oge mụ na ya kwesịrị iji ebido ịmụ ihe gaferela ka m mara ma ọ̀ ka ga na-eche m, nakwa ma ọ̀ ga-ewewe iwe na mụ abịaghị n’oge. Mgbe m nyaara ụgbọala m bata, m hụrụ ya ka ọ nọ n’ihu ụlọ m na-eche m. Ọ gbaara ọsọ ozugbo bịa, sị m: “Achọọdịla m ịlawa gaa gwa mama m ka anyị kpọọ ndị ụlọ ọgwụ na ndị uwe ojii ka anyị mara ma ò nwere ihe mere gị n’ihi na ị na-abịakarị n’oge. Ụjọ tụwara m.”

O nwekwara ụbọchị m jụrụ ya ajụjụ m ma na ọ ga-esiri obere nwa ha ka ya ike ịza. Achọrọ m ịma ma ọ̀ ga-aza m ihe ọ bụla batara ya n’isi. Mgbe m jụrụ ya ajụjụ ahụ, o lere m anya, sị m na ajụjụ ahụ siri ike, mana ya ga-edetu ya n’akwụkwọ ma jụọ ya ndị mụrụ ya. Ụbọchị ọzọ ọ bịara ka anyị mụọ ihe, o wetaara m Ụlọ Nche zara ajụjụ ahụ m jụrụ ya. Akwụkwọ Ndịàmà Jehova bipụtara e ji amụ Baịbụl zakwara m ajụjụ ndị ọzọ niile m nọ na-ajụ kemgbe. Ọ bụ ihe a mere m ji bido nwewe mmasị n’ebe Ndịàmà Jehova nọ. Mụ na nwata nwaanyị ahụ nọgidere na-amụ ihe. Mgbe otu afọ gara, emere m baptizim ma ghọọ Onyeàmà Jehova. *

URU NDỊ M RITERELA:

Mgbe m mechara mata azịza ajụjụ ndị ahụ na-echu m ụra, ọ bịara na-agụsi m ike ịkọrọ ya ndị ọzọ. (Matiu 12:35) Ná mmalite, ndị ụlọ anyị achọghị ịnụ ozi ọma m na-ezi ha. Ma, ka oge na-aga, ha gbanwere. Obere oge tupu mama m anwụọ, o bidoro mụwa Baịbụl. O meghị baptizim tupu ya anwụọ. Ma, ama m na o kpebiela ife Jehova.

N’afọ 1978, alụrụ m di. Aha di m bụ Elias Kazan, ọ bụkwa Onyeàmà Jehova. N’afọ 1981, a kpọrọ anyị ka anyị bịa jewe ozi na Betel dị n’Amerịka. * Ọ dị mwute na naanị afọ anọ anyị jere ozi n’ebe ahụ, di m nwụrụ. N’agbanyeghị ọnwụ di m, anọgidere m na-eje ozi na Betel. O nyeere m aka ịna-ewepụtụ obi n’ọnwụ di m, nyekwara m aka idi ya.

N’afọ 2006, alụrụ m di ọzọ. Aha onye nke a bụ Richard Eldred. Ọ na-ejekwa ozi na Betel. Anyị abụọ ka na-eje ozi na Betel. Ịmata eziokwu banyere Chineke emeela ka m nwee ezigbo ihe m ji ndụ m eme. Obi dịkwa m ụtọ na amatala m azịza ajụjụ ndị ahụ na-echu m ụra. Ma, ihe mere ka ihe a niile kwe omume bụ ajụjụ atọ ahụ nwata nwaanyị ahụ jụrụ m.

^ para. 16 Nwata nwaanyị a na ụmụnne ya mụụrụ ndị nkụzi ha ise Baịbụl, ha ebido fewe Jehova.

^ para. 18 “Betel” pụtara “Ụlọ Chineke.” Ọ bụ ihe Ndịàmà Jehova na-akpọ alaka ụlọ ọrụ ha dị iche iche. (Jenesis 28:17, 19) Ndị na-eje ozi na Betel na-arụ ọrụ dị iche iche iji na-akwado ozi ọma Ndịàmà Jehova na-agbasa n’ụwa niile.

GỤKWUO GBASARA YA

Oleedị Ihe Chineke Bu n’Obi Kee Anyị?

Ò nwetụla mgbe ị jụrụ onwe gị ihe Chineke kere anyị ka anyị jiri ndụ anyị mee? Lee ihe Baịbụl zara.