Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

ỤLỌ NCHE MACH 2015

Ị̀ Maara?

Ị̀ Maara?

Olee otú ọbụbụ Pọl onyeozi bụ nwa amaala Rom si baara ya uru?

Pọl tiri mkpu, sị: “Ana m akpọku Siza!”

Iwu ndị Rom kwuru na o nwere ikike ụfọdụ nwa amaala Rom ọ bụla nọ n’ebe ndị Rom na-achị nwere, nakwa na o nwere ihe ụfọdụ a na-agaghị eme onye ahụ. Dị ka ihe atụ, iwu ejighị nwa amaala Rom idebe iwu obodo ọzọ ndị Rom na-achị. Ma, iwu ji ya idebe iwu ndị Rom. Ọ bụrụ na e kwuru na o nwere iwu ọ dara, o nwere ike ikwe ka e jiri iwu ndị obodo ọ nọ na ya kpee ya ikpe. Ma, ọ ka nwekwara ikike ikwu ka e kpee ya ikpe n’ụlọikpe ndị Rom. Ma, a maa ya ikpe ọnwụ, o nwere ikike ikwu ka e kpegharịa ikpe ya n’ihu eze ukwu Rom.

O nwere otu onye ọchịchị biri ndụ n’oge ndịozi Jizọs aha ya bụ Sisero. Mgbe ọ na-ekwu gbasara ikike a ụmụ amaala Rom nwere, ọ sịrị: “E weere ya na onye kere nwa amaala Rom eriri adaala iwu. E wekwaara ya na obi tara onye pịara ya ụtarị mmiri, nakwa na onye gburu ya egbu dị ka onye gburu nne ya ma ọ bụ nna ya ma ọ bụkwanụ onye ikwu ya.”

Pọl onyeozi kwusara ozi ọma nke ọma n’ebe niile ndị Rom na-achị. Baịbụl kwuru ugboro atọ ọbụbụ ọ bụ nwa amaala Rom baara ya uru. Nke mbụ bụ mgbe ọ gwara ndị ọkàikpe Filipaị na ụtarị ha pịara ya megidere iwu n’ihi na ya bụ nwa amaala Rom. Nke abụọ bụ mgbe ọ gwara ndị chọrọ ịpịa ya ụtarị na Jeruselem na ha ekwesịghị ịpịa ya ụtarị n’ihi na ya bụ nwa amaala Rom. Nke atọ bụzi mgbe o kwuru na ya ga-achọ ka e wega ikpe ya n’ihu Siza, bụ́ eze ukwu Rom.—Ọrụ Ndịozi 16:37-39; 22:25-28; 25:10-12.

Olee otú e si akwụ ndị ọzụzụ atụrụ ụgwọ n’oge ochie?

Nkume e dere ihe onye ọzụzụ atụrụ na mmadụ kwekọrịtara tupu onye ahụ enye ya atụrụ ya na ewu ya. e dere ya n’ihe dị ka afọ 2050 Tupu Oge Ndị Nraịst

Jekọb zụrụ atụrụ Leban nwanne mama ya ruo afọ iri abụọ. Ọ zụụrụ ya atụrụ afọ iri na anọ, ya akpọnye ya ụmụ ya ndị nwaanyị abụọ ka ọ lụwa. Ọ zụkwaara ya atụrụ afọ isii ọzọ, ya ejiri anụ ụlọ kwụọ ya ụgwọ. (Jenesis 30:25-33) Otu akwụkwọ aha ya bụ Biblical Archaeology Review sịrị na “ọ ga-abụ na ndị dere Baịbụl na ndị gụrụ Baịbụl n’oge ochie maara na a na-eji ihe ndị ahụ Leban ji kwụọ Jekọb ụgwọ akwụ ndị ọzụzụ atụrụ ụgwọ.”

Ihe e dere n’ihe ndị e gwutere n’ala na Nuzi, Lasa, nakwa n’ebe ndị ọzọ n’Ịrak gosiri na a na-eji ihe ndị ahụ Leban ji kwụọ Jekọb ụgwọ akwụ ndị ọzụzụ atụrụ ụgwọ. Ndị ọzụzụ atụrụ na-ebidokarị mgbe a na-akpacha atụrụ ajị n’afọ zụwara ndị mmadụ atụrụ ha ruo mgbe a ga-akpacha ya ajị n’afọ ọzọ. Ndị ọzụzụ atụrụ na ndị nwe atụrụ na-ekwu atụrụ ole ha ga-azụrụ ha. A ga-ekwu oké ole ga-adị na ya, nne ole ga-adị na ya, ndị obere ole na ndị nnukwu ole ga-adị na ya. Otu afọ gaa, onye ọzụzụ atụrụ ahụ ga-enye onye nwe atụrụ ahụ ihe niile ha kwekọrịtara na ọ ga-enye ya. Ihe ndị ahụ nwere ike ịbụ ajị atụrụ, mmiri ara atụrụ, ụmụ atụrụ, na ihe ndị ọzọ. Ihe ọ bụla mafọrọnụ bụzi nke onye ọzụzụ atụrụ ahụ.

Ihe ga-ekpebi otú atụrụ e nyere onye ọzụzụ atụrụ ga-amụbaru bụ nne atụrụ ole dị n’ìgwè atụrụ ahụ. Ọ bụrụ na e nyere onye ọzụzụ atụrụ otu narị nne atụrụ, a na-atụ anya na ha ga-amụta atụrụ iri asatọ. Ọ bụrụ na e nwetarughị atụrụ ole a tụrụ anya ya, ọ bụ onye ọzụzụ atụrụ ahụ ka ọ dị n’isi. Ọ bụ ya mere ndị ọzụzụ atụrụ ji agbalị ike ha niile elekọta atụrụ e nyere ha anya nke ọma.