Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

ỤLỌ NCHE MACH 2015

 ISIOKWU ỤLỌ NCHE A | GỊNỊ KA JIZỌS GBAPỤTARA ANYỊ NA YA?

Olee Uru Ọnwụ Jizọs na Mbilite n’Ọnwụ Ya Ga-abara Gị?

Olee Uru Ọnwụ Jizọs na Mbilite n’Ọnwụ Ya Ga-abara Gị?

“Kwere n’Onyenwe anyị Jizọs, a ga-azọpụtakwa gị.”—Ọrụ Ndịozi 16:31.

Ihe a ka Pọl na Saịlas gwara onye na-elekọta ụlọ mkpọrọ ha nọ na ya na Filipaị dị na Masedonia. Ma, olee ihe jikọtara ikwere na Jizọs na ịzọpụta mmadụ? Ihe ga-enyere anyị aka ịma ihe jikọtara ha bụ ịmata ihe mere anyị ji anwụ anwụ. Ka anyị lee ihe Baịbụl kwuru.

E keghị ụmụ mmadụ ka ha na-anwụ anwụ

“Jehova bụ́ Chineke wee kpọrọ mmadụ ahụ mee ka o biri n’ogige Iden ka ọ na-akọ ihe na ya ma na-elekọta ya. Jehova bụ́ Chineke nyekwara mmadụ ahụ iwu, sị: ‘I nwere ike iri mkpụrụ nke osisi ọ bụla dị n’ubi a rijuo afọ. Ma erila mkpụrụ si n’osisi ịma ihe ọma na ihe ọjọọ, n’ihi na n’ụbọchị i riri mkpụrụ si na ya, ị ga-anwụrịrị.’”—Jenesis 2:15-17.

Mgbe Chineke kere nwoke mbụ bụ́ Adam, o tinyere ya n’ogige Iden. Ụmụ anụmanụ na osisi ndị mara mma jukwara ebe ahụ. E nwere ọtụtụ osisi ndị Adam nwere ike ịghọrọ mkpụrụ ha rie. Ma, Jehova Chineke gosiri ya otu osisi dị n’ubi ahụ ma gwa ya erikwala mkpụrụ si na ya, na o rie ya na ọ ga-anwụ.

Ihe ahụ Jehova gwara Adam ò doro ya anya? Adam ma ihe ọnwụ bụ n’ihi na ọ hụla ka ụmụ anụmanụ na-anwụ. Ọ bụrụ na Chineke kere Adam ka ọ dịtụ ndụ ma mechaa nwụọ, o nweghịzinụ uru ọ bara ịgwa ya na ọ ga-anwụ ma o rie mkpụrụ osisi ahụ. Ma, Adam ghọtara na ya hapụ iri mkpụrụ osisi ahụ otú Chineke gwara ya, na ya ga-adịrị ndụ na-aga n’anwụghị anwụ.

Ụfọdụ ndị na-ekwu na osisi ahụ a gwara Adam ka ọ ghara iri mkpụrụ si na ya bụ mmekọ nwoke na nwaanyị. Ma, ọ bụghị eziokwu. Ihe mere anyị ji kwuo otú ahụ bụ na Jehova gwara Adam na Iv nwunye ya ka ha ‘mụọ ọmụmụ, baa ụba, ma jupụta ụwa, meekwa ka ọ dịrị n’okpuru ha.’ (Jenesis 1:28) Osisi ahụ ọ gwara ha erila mkpụrụ si na ya bụ osisi nkịtị. Jehova kpọrọ ya “osisi ịma ihe ọma na ihe ọjọọ” n’ihi na ọ na-egosi na ọ bụ Jehova kwesịrị ikpebiri ụmụ mmadụ ihe bụ ihe ọma ma ọ bụ ihe ọjọọ. Ọ bụrụ na Adam ahapụ iri mkpụrụ si n’osisi ahụ, ọ ga-egosi na ọ na-erubere Onye kere ya isi, nakwa na obi dị ya ụtọ maka ihe ọma niile Chineke meere ya.

 Adam nwụrụ n’ihi na o nupụụrụ Chineke isi

‘Chineke sịkwara Adam: Ebe ọ bụ na i riri mkpụrụ si n’osisi ahụ nke m nyere gị iwu a banyere ya, ọsụsọ ga-agba gị n’ihu tupu gị erie ihe oriri ruo mgbe ị laghachiri n’ala, n’ihi na e si na ya wepụta gị. N’ihi na ájá ka ị bụ, ọ bụkwa n’ájá ka ị ga-alaghachi.’—Jenesis 3:17, 19.

Adam riri mkpụrụ osisi ahụ Chineke sịrị ya erila. Isi a o nupụụrụ Chineke abụghị obere ihe. O gosiri na o nweghị ihe o ji ihe ọma niile Jehova meere ya kpọrọ, gosikwa na ọ jụla Jehova. Otú a ọ chọziri ịna-eji aka ya agwa onwe ya ihe ọ ga na-eme ga-akpatara ya ezigbo nsogbu.

Adam mechara nwụọ dị ka Jehova gwara ya. Chineke ji “ájá si n’ala” kpụọ Adam, ọ gwakwara ya na ọ ‘ga-alaghachi n’ájá.’ Adam aghọghị mmụọ mgbe ọ nwụrụ, ọ gaghịkwa ebe ọzọ dịrị ndụ na-aga. Mgbe ọ nwụrụ, ọ ghọghachiri ájá ahụ e ji kpụọ ya.—Jenesis 2:7; Ekliziastis 9:5, 10.

Ihe mere anyị ji anwụ anwụ bụ na anyị bụ ụmụ Adam

“Dị nnọọ ka mmehie si n’aka otu mmadụ bata n’ụwa, ọnwụ esikwa ná mmehie bata, ọnwụ wee si otú ahụ gbasaa ruo mmadụ niile n’ihi na ha niile mehiere.”—Ndị Rom 5:12.

Isi Adam nupụụrụ Jehova mebiri ọtụtụ ihe. O mere ka ọ gharazie ịdị ndụ ebighị ebi, meekwa ka ọ bụrụzie onye na-ezughị okè. Ihe ọ ga-ebufekwara ụmụ ya niile bụ ezughị okè.

Anyị niile bụ ụmụ Adam. Anyị si n’aka ya keta ezughị okè. Ọ bụ ya mere anyị ji eme mmehie ma na-anwụkwa anwụ. Pọl kwuru ụdị nsogbu ihe a Adam mere kpataara ya, bụ́kwa otu nsogbu ahụ anyịnwa nọ na ya. Ọ sịrị: “Abụ m anụ ahụ́, onye e rere ịnọ n’okpuru mmehie. Lee nhụsianya m nọ na ya! Ònye ga-anapụta m n’ahụ́ nke na-eduga m n’ịnwụ ụdị ọnwụ a? Pọl zakwara ajụjụ a ọ jụrụ. Ọ sịrị: “Ekele dịrị Chineke site n’aka Jizọs Kraịst Onyenwe anyị!”—Ndị Rom 7:14, 24, 25.

 Jizọs ji ndụ ya chụọ àjà ka anyị nwee ike ịdị ndụ ebighị ebi

“Nna ahụ zitere Ọkpara ya ka ọ bụrụ Onye Nzọpụta nke ụwa.”—1 Jọn 4:14.

Jehova ahaziela otú a ga-esi wepụ mmehie na ọnwụ ya na ya so. Olee otú o si mee ya? O si n’eluigwe zite Ọkpara ya ka a mụọ ya n’ụwa ka ọ bụrụ onye zuru okè ka Adam. Ma, Jizọs emeghị ka Adam. “Ọ dịghị mmehie o mere.” (1 Pita 2:22) Ebe ọ bụ na o mehieghị, o kwesịghị ịnwụ, o kwesịrị ịdịrị ndụ n’ụwa na-aga.

Ma, Jehova gbara nkịtị ka ndị iro Jizọs gbuo Jizọs. Mgbe abalị atọ gachara, Jehova kpọlitere ya n’ọnwụ, ya abụrụ mmụọ ka o nwee ike ịlaghachi eluigwe. Mgbe Jizọs ruru n’eluigwe, o nyere Chineke ndụ ahụ́ zuru okè ọ gaara adịrị gawa n’ụwa ka o jiri ya gbapụta ụmụ Adam. Jehova nabatara àjà ahụ Jizọs ji ndụ ya chụọ. Ọ bụ ya mere onye ọ bụla kweere na Jizọs ga-eji enweta ndụ ebighị ebi.—Ndị Rom 3:23, 24; 1 Jọn 2:2.

Jizọs si otú a nye anyị ihe ahụ Adam tụfuru. Jizọs nwụrụ ka anyị nwee ike ịdị ndụ ebighị ebi. Baịbụl sịrị: ‘Jizọs nwụrụ ka o wee site n’obiọma Chineke nke na-erughịrị mmadụ detụ ọnwụ ire maka mmadụ niile.’—Ndị Hibru 2:9.

Ihe a Jehova meere anyị na-akụziri anyị ọtụtụ ihe gbasara Jehova. Ọ na-akụziri anyị na Jehova na-ekpe ikpe ziri ezi. Ọ chọrọ ka ọ bụrụ ihe ruru ihe ahụ Adam tụfuru ka a ga-eji gbapụta ụmụ mmadụ. N’ihi ya, ụmụ mmadụ na-ezughị okè agaghị agbapụtali onwe ha. Ma, ebe ọ bụ na Jehova hụrụ anyị n’anya, o meere anyị ihe furu ya nnukwu ihe. O ziteere anyị Ọkpara ya ka ọ gbapụta anyị.—Ndị Rom 5:6-8.

A kpọlitere Jizọs n’ọnwụ, a ga-akpọlitekwa ndị ọzọ nwụrụ anwụ n’ọnwụ

“E siwo ná ndị nwụrụ anwụ kpọlite Kraịst, bụ́ mkpụrụ mbụ nke ndị dara n’ụra ọnwụ. N’ihi na ebe ọnwụ si n’aka otu onye, mbilite n’ọnwụ nke ndị nwụrụ anwụ sikwa n’aka otu onye. N’ihi na dị nnọọ ka mmadụ niile na-anwụ n’ime Adam, otú ahụkwa ka a ga-eme ka mmadụ niile dị ndụ n’ime Kraịst.”—1 Ndị Kọrịnt 15:20-22.

Onye ukwu na onye nta ma na Jizọs dịrị ndụ n’ụwa mechaakwa nwụọ. Ma, olee ihe gosiri na a kpọlitere ya n’ọnwụ? Otu ihe kacha gosi na a kpọlitere ya n’ọnwụ bụ na mgbe a kpọlitechara ya, ọ pụtara n’ihu ndị mmadụ n’oge dị iche iche nakwa n’ebe dị iche iche. O nwedịrị mgbe ọ pụtara n’ihu ihe karịrị narị mmadụ ise. Pọl onyeozi kwuru gbasara mbilite n’ọnwụ Jizọs n’akwụkwọ ozi o degaara ụmụnna nọ na Kọrịnt. O kwuru na ụfọdụ n’ime ndị hụrụ Jizọs mgbe a kpọlitechara ya n’ọnwụ ka nọ ndụ, nakwa na ha nwere ike iji ọnụ ha kọọ ihe ha hụrụ.—1 Ndị Kọrịnt 15:3-8.

Pọl kwuru na Kraịst bụ “mkpụrụ mbụ” nke ndị a kpọlitere n’ọnwụ. Ihe a o kwuru gosiri na e nwere ndị ọzọ a ga-akpọlite n’ọnwụ. Jizọs n’onwe ya kwukwara na oge na-abịa mgbe ‘ndị niile nọ n’ili ncheta ga-apụta.’—Jọn 5:28, 29.

 Ọ bụrụ na anyị chọrọ ịdị ndụ ebighị ebi, anyị ga-enwerịrị okwukwe na Jizọs

“Chineke hụrụ ụwa n’anya nke ukwuu nke na o nyere Ọkpara ọ mụrụ naanị ya, ka e wee ghara ibibi onye ọ bụla nke nwere okwukwe na ya, kama ka o nwee ndụ ebighị ebi.”—Jọn 3:16.

Na Jenesis, Baịbụl kọọrọ anyị otú ọnwụ si malite na ihe mere ụwa abụghịzi Paradaịs. N’akwụkwọ Mkpughe, Baịbụl gwara anyị otú Chineke ga-esi wepụ ọnwụ na otú ọ ga-esi mee ka ụwa ghọghachi Paradaịs. N’oge ahụ, ndị mmadụ ga-enwe ike ịdị ndụ ebighị ebi, na-enwe obi ụtọ ma jirikwa ndụ ha na-eme ihe bara uru. Mkpughe 21:4 sịrị na “ọnwụ agaghị adị ọzọ.” Iji gosi na ihe a ga-emerịrị, amaokwu nke ise sịrị na “okwu ndị a kwesịrị ntụkwasị obi, bụrụkwa eziokwu.” O nweghị ihe Jehova kwuru na ọ ga-eme, ọ na-agaghị emeli.

Ì kweere na “okwu ndị a kwesịrị ntụkwasị obi, bụrụkwa eziokwu”? Ọ bụrụ na i kweere, na-amụkwu banyere Jizọs Kraịst ma nwee okwukwe na ya. I mee otú ahụ, gị na Jehova ga-adị ná mma, ọ ga-agọzikwa gị. Ị ga-enwekwa olileanya ịdị ndụ ebighị ebi na Paradaịs n’ụwa a mgbe ‘ọnwụ na-agaghị adị ọzọ, iru uju ma ọ bụ mkpu ákwá ma ọ bụ ihe mgbu agaghịkwa adị.’