Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

ỤLỌ NCHE MACH 2015

Ajụjụ Ndị Baịbụl Zara

Ajụjụ Ndị Baịbụl Zara

Gịnị mere anyị kwesịrị iji na-echeta ọnwụ Jizọs?

Olee ihe ọma ndị ga-emere anyị n’ihi ọnwụ Jizọs?Aịzaya 25:8; 33:24

N’ihe niile merela n’ụwa a, ọ bụ ọnwụ Jizọs kacha mkpa. Jizọs nwụrụ ka ụmụ mmadụ nwee ike ịdịghachi otú Chineke chọrọ ka ha dịrị. Chineke ekeghị anyị ka anyị na-eme ihe ọjọọ, na-arịa ọrịa, ma na-anwụ anwụ. (Jenesis 1:31) Ma, mmehie si n’aka nwoke mbụ bụ́ Adam bata n’ụwa. Jizọs ji ndụ ya chụọ àjà maka ịgbapụta anyị ná mmehie na ọnwụ.—Gụọ Matiu 20:28; Ndị Rom 6:23.

Otú kachanụ Chineke si gosi na ọ hụrụ anyị n’anya bụ izite Ọkpara ya ka ọ nwụọ maka anyị. (1 Jọn 4:9, 10) Jizọs gwara ndị na-eso ụzọ ya ka ha jiri achịcha na mmanya na-eme ncheta ọnwụ ya. Ọ bụrụ na anyị ana-eme ya kwa afọ, anyị ga-esi otú ahụ gosi na anyị na-ekele Chineke na Jizọs maka ihe ọma ha meere anyị.—Gụọ Luk 22:19, 20.

Ole ndị kwesịrị ịta achịcha ma ṅụọ mmanya ahụ e ji echeta ọnwụ Jizọs?

Mgbe mbụ Jizọs gwara ndịozi ya ka ha na-echeta ọnwụ ya, o kwuru banyere ọgbụgba ndụ ya na ha na-agba. (Matiu 26:26-28) Ọgbụgba ndụ a mere ka ndịozi Jizọs nakwa ndị ọzọ ga-emecha soro n’ọgbụgba ndụ a nwee olileanya iso Jizọs bụrụ ndị eze na ndị nchụàjà n’eluigwe. N’agbanyeghị na ọtụtụ nde mmadụ na-echeta ọnwụ Jizọs taa, ọ bụ naanị ndị nọ n’ọgbụgba ndụ ahụ na-ata achịcha ma na-aṅụ mmanya e ji echeta ọnwụ Jizọs.—Gụọ Mkpughe 5:10.

Kemgbe ihe fọrọ obere ka ọ bụrụ puku afọ abụọ ugbu a, Jehova na-ahọrọ ndị ga-eso Jizọs chịa n’eluigwe. (Luk 12:32) Ha adịghị ọtụtụ ma e jiri ha tụnyere ndị ga-adị ndụ ebighị ebi n’ụwa.—Gụọ Mkpughe 7:4, 9, 17.

 

GỤKWUO GBASARA YA

Nri Anyasị nke Onyenwe Anyị

N’afọ ọ bụla, nde kwuru nde ndị mmadụ na-abịa soro anyị n’oge nri anyasị nke Onyenwe anyị. Bịa ka ị chọpụta otú o si gbasa gị.

Jizọs Ọ̀ Nwụrụ n’Elu Obe?

Ọtụtụ ndị weere obe ka ihe e ji mara Ndị Kraịst. Ànyị kwesịrị iji ya efe Chineke?