Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

ỤLỌ NCHE DISEMBA 2014

A Chọpụtala Ihe Mere E Ji Wuo Timgad Bụ́ Obodo Ájá Kpuchirila

A Chọpụtala Ihe Mere E Ji Wuo Timgad Bụ́ Obodo Ájá Kpuchirila

IHE Jems Bruz, bụ́ nwoke Skọtland na-eme nchọpụta, hụrụ enyeghị ya ọnụ okwu. Ọ hụrụ nnukwu ọnụ ụzọ ámá ndị Rom rụrụ n’oge ochie. Ma, ájá si n’ọzara Ọljirịa ka kpuchitụrụ ya. Ọ bụ n’afọ 1765 ka ọ hụrụ ya, ma ọ maghị na ebe o guzo mgbe ahụ bụ n’elu nnukwu obodo dakpọrọla adakpọ. Ọ bụ obodo kacha ukwuu ndị Rom rụrụ n’ebe ugwu Afrịka n’oge ochie. Aha ya bụ Tamugadi. Ma, a na-akpọzi ya Timgad.

N’afọ 1881, mgbe ihe karịrị otu narị afọ gachara, ndị Frans na-amụ banyere ihe ndị mgbe ochie bidoro igwu ala ka ha hụ obodo Timgad ahụ dakpọrọ adakpọ ájá kpuchiri. Ha chọpụtara na n’agbanyeghị na obodo ahụ dị n’ọzara, ndị biri na ya bara ọgaranya, ha kporikwara ndụ n’obodo ahụ. Ma, gịnị mere ndị Rom ji wuo ọmarịcha obodo n’ime ọzara a kpọrọ nkụ? Oleekwa ihe akụkọ obodo a e wuru n’oge ochie na akụkọ ndị biri na ya na-akụziri anyị?

IHE MERE E JI WUO OBODO AHỤ

Mgbe ndị Rom bịara ka ha chịwa mba ndị dị n’ebe ugwu Afrịka n’ihe dị ka puku afọ abụọ gara aga, e nwere agbụrụ ụfọdụ na-esi otu ebe akwaga ebe ọzọ na-ekweghị ha chịwa ebe ndị ahụ. Olee ihe ndị Rom ga-eme ka ha na ụmụ amaala obodo ndị ahụ mee udo? Ihe mbụ ìgwè ndị agha Ọgọstọs mere bụ iwu ọtụtụ ebe ndị agha ha ga-ebi na ebe ha ga–anọ na-eche nche n’ebe a na-akpọzi Ọljirịa, n’ebe ugwu Afrịka. Ha wusiri ebe ndị ahụ ike. Ha mechara wuo obodo Timgad. Ma, ihe ha bu n’obi wuo ya dị iche.

Ndị Rom kwuru na ọ bụ ndị agha ha lara ezumike nká ka ha wuuru Timgad, ma ihe ha bu n’obi wuo ya bụ ka ha jiri obodo ahụ mee ka agbụrụ ndị ahụ na-agba ha mgba okpuru kwụsị inye ha nsogbu. Ndị Rom nwetara ihe ha chọrọ. Ọ na-abụ ụmụ amaala obodo ndị dị nso na Timgad bịa ire ngwá ahịa ha na Timgad ma hụ otú ndị bi na ya si ekpori ndụ, ya adọwa ha akpịrị. Ebe ọ bụ naanị ụmụ afọ Rom ka a na-ekwe ka ha biri na Timgad, ọtụtụ ụmụ amaala obodo ndị dị nso na Timgad kwetaziri isoro ìgwè ndị agha Rom ahụ rụọ ọrụ afọ iri abụọ na ise. Afọ iri abụọ na ise gafee, ha na ụmụ ha ndị nwoke aghọzie ụmụ afọ Rom.

Ihe ụfọdụ ndị Afrịka chọrọ abụghịdị naanị ka ha bụrụ ụmụ afọ Rom. Ụfọdụ n’ime ha mechara nweta ọkwá dị elu n’obodo Timgad nakwa n’obodo ndị ọzọ ndị Rom wuru. Ihe ndị Rom bu n’obi wuo Timgad gaziiri ha, nke na naanị afọ iri ise e wuchara ya, ọtụtụ ndị bi na ya bụzi ndị si n’ebe ugwu Afrịka.

IHE ỌZỌ NDỊ ROM MERE KA HA NWETA NDỊ BI N’EBE UGWU AFRỊKA

Ọma ahịa nke nwere veranda mara mma na ebe ndị mmadụ na-akpọsa ngwá ahịa

Gịnị ka ndị Rom mere nke mere ha ji nweta ndị bi n’ebe ugwu Afrịka ngwa ngwa? Nke mbụ bụ na ha sooro ihe otu onye ọnụ na-eru n’okwu na Rom aha ya bụ Sisero kụziri. Nwoke a kụziri na ụmụ amaala Rom  niile hà, o nweghị onye ka ibe ya. Ala e kenyere ndị agha Rom lara ezumike nká na nke e kenyere ụmụ amaala Afrịka bi na Timgad hà. Ala e kenyere onye nke ọ bụla dị mita iri abụọ n’ogologo na mita iri abụọ n’uhie. A haziri otú e si rụọ ụlọ niile dị na Timgad ahazi. E nwekwara obere okporo ámá n’agbata ụlọ ọ bụla. O doro anya na otú a e si hazie ihe niile ahazi, a ghara inwe onye ka ibe ya masịrị ndị bi na Timgad.

Ihe ọzọ a rụrụ na Timgad bụ ọma ahịa ebe ndị mmadụ nwere ike izukọ n’ụbọchị ahịa nụrụ akụkọ ihe na-eme n’obodo ha nakwa n’obodo ndị ọzọ ma ọ bụkwanụ mee egwuregwu. Ọ bụ ihe a na-eme n’ọtụtụ obodo ndị Rom rụrụ. O doro anya na ụmụ amaala Afrịka bi n’ala ndị kpọrọ nkụ dị nso na Timgad ga na-eche n’obi ha na ụwa gaara adịrị ha mma ma a sị na ha bi na Timgad ka ha nwee ike ịna-aga ije na veranda ndị e kpuchiri elu ha ekpuchi n’ụbọchị anwụ na-achasi ike ma ọ bụkwanụ ka ha nọrọ n’otu n’ime ebe ndị bi na Timgad na-aga asa ahụ́ n’akwụghị ụgwọ. O nwekwara ike ịna-adị ha ka ya bụrụ na ha na ndị enyi ha nọ ọdụ n’akụkụ iyi ndị dị na Timgad na-akparịta ụka. O doro anya na ọ ga na-adị ha ka o nweghị otú ihe ọma niile a ga-esi eru ha aka.

A kpụnyere chi atọ n’ime otu n’elu elu ihe a a kpụrụ n’ili

Ihe ọzọkwa mere ka ndị Rom nweta ụmụ amaala Afrịka ahụ bụ ọgbọ egwuregwu ha rụrụ na Timgad. O nwere ike ịba puku mmadụ atọ na narị ise, ma ndị si na Timgad ma ndị si n’obodo ndị dị ya nso bịa. Ọ bụ n’ebe ahụ ka a na-anọ emere ha ụdị egwuregwu ndị Rom na-eme, ya bụ, ndị na-egosikarị ebe a na-eme ihe ike na omume rụrụ arụ.

Ndị Rom jikwa okpukpe ha nweta ụmụ amaala Afrịka ahụ. N’ahụ́ ájá nakwa n’ala ebe ndị ahụ a na-asa ahụ́, e sere chi dị iche iche ndị na-ekpere arụsị na-efe. Ebe ọ bụ na ndị mmadụ na-asa ahụ́ kwa ụbọchị, ndị bi na Timgad jizi nke nta nke nta matachaa banyere okpukpe ndị Rom na chi dị iche iche ha na-efe. Ihe gosiri na ndị Rom mere ka ndị Afrịka mewe omenala ha bụ na a kpụnyere ma chi atọ n’ime otu ndị Rom ma nke ndị Afrịka ahụ n’ọtụtụ ili dị na Timgad.

OTÚ E SI CHEFUO ỌMARỊCHA OBODO AHỤ

Ọ bụ eze Rom aha ya bụ Trajan wuru Timgad n’afọ 100. Ndị Rom mere ka a kụwa ọka na mkpụrụ ndị yiri ya n’ebe niile n’ebe ugwu Afrịka, meekwa ka e mepụtawa mmanụ oliv na mmanya n’ebe ndị ahụ. Mgbe obere oge gachara, ọ bụzi n’ebe ugwu Afrịka ka e si enweta ọka, mmanụ oliv, na mmanya a na-ebuga Rom. N’oge ndị Rom na-achị Timgad, ihe nọ na-agazi agazi n’obodo a otú ọ na-agazi n’obodo ndị ọzọ Rom na-achị mgbe ahụ. Ọtụtụ ndị mechara biri na Timgad. Mgbe ndị mmadụ karịziri akarị, ndị mmadụ biweziri n’azụ mgbidi obodo a e wusiri ike, nke mere ka obodo a bukwuo ibu.

Ndị bi na Timgad na ndị nwe ala n’ebe ugwu Afrịka bara ọgaranya n’ihi ahịa ha na ndị Rom na-azụkọrịta. Ma, o nwechaghị uru ndị ọrụ ugbo na-erite. Mgbe naanị ihe karịrị otu narị afọ gachara, mmegbu na nnukwu ụtụ a na-ana ndị mmadụ mere ka ụfọdụ ndị ọrụ ugbo nupụwezie isi. N’oge ahụ, ụfọdụ n’ime ha aghọọla ndị Katọlik, ma ha hapụrụ Chọọchị Katọlik ghọzie ndị òtù Donatus. Ndị òtù Donatus sịrị na ha anabataghị nrụrụ aka a na-arụrụ na Chọọchị Katọlik.—Gụọ Igbe isiokwu ya bụ “ Ndị Òtù Donatus Abụghị Ezigbo Chọọchị.

Okwu okpukpe dị iche iche nọ na-ese, agha a nọ na-alụ n’obodo, na otú ndị si ná mba ndị ọzọ si na-abịa  alụso ndị bi n’ebe ugwu Afrịka ọgụ mere ka o siweziere ndị Rom ike ịchị ebe ugwu Afrịka. N’ihe dị ka afọ 550, ndị Arab bi n’ebe ugwu Afrịka gbara Timgad ọkụ nke mere ka e chefuo obodo a ruo ihe karịrị otu puku afọ.

“Ọ BỤ IHE NDỊ A BỤ NA MMADỤ DỊ NDỤ”

Ihe e dere n’asụsụ Latịn n’ọma ahịa, nke kwuru, sị: “Ịchụ nta, ịsa ahụ́, igwuri egwu, ịchị ọchị, ọ bụ ihe ndị a bụ na mmadụ dị ndụ.”

Mgbe ndị na-amụ banyere ihe ndị mgbe ochie nọ na-egwu ala ka ha hụ obodo Timgad, o nwere otu ihe tọrọ ha ọchị ha hụrụ e dere n’asụsụ Latịn n’ọma ahịa obodo a. Ihe ahụ e dere bụ: “Ịchụ nta, ịsa ahụ́, igwuri egwu, ịchị ọchị, ọ bụ ihe ndị a bụ na mmadụ dị ndụ.” Otu onye Frans na-akọ akụkọ ihe mere eme sịrị na o nwere ike ịbụ na ihe a e dere n’ọma ahịa “bụ ụdị echiche ndị umengwụ na-eche, ma ụfọdụ ndị chere na ọ bụ ya bụ na mmadụ ma ihe.”

N’eziokwu, ọ bụ ya bụ ụdị ndụ ndị Rom nọ na-ebi. N’akwụkwọ Pọl onyeozi dere, o kwuru na e nwere ndị ihe ha na-eche bụ “Ka anyị rie ma ṅụọ, n’ihi na echi ka anyị ga-anwụ.” Ọ bụ eziokwu na ndị Rom ji okpukpe ha kpọrọ ihe, ihe kacha ha mkpa bụ ikpori ndụ. Ha anaghị eche gbasara ndụ ha na ihe mere ha ji dị ndụ. Pọl dọrọ Ndị Kraịst ibe ya aka ná ntị ka ha kpachara anya maka ndị dị otú ahụ. Ọ sịrị ha: “Unu ekwela ka e duhie unu. Mkpakọrịta ọjọọ na-emebi àgwà ọma.”—1 Ndị Kọrịnt 15:32, 33.

Ọ bụ eziokwu na otu puku afọ na narị afọ ise agafeela kemgbe ndị mmadụ biri n’obodo Timgad, ma otú ndị mmadụ si ele ndụ anya ka yiri otú ndị biri n’obodo ahụ si lee ya anya. Ọtụtụ ndị taa ka na-ebi ndụ ka à ga-asị na ha enweghị olileanya ịdị ndụ echi. Ha chere na otú ahụ ndị Rom si bie ndụ bụ otú kacha mma mmadụ kwesịrị isi ebi ndụ, ihe ọ sọkwara ya mee. Ma, Baịbụl kwuru ihe bụ́ eziokwu banyere ụwa anyị a. Ọ sịrị: “Ọnọdụ ụwa a na-agbanwe agbanwe.” Ọ bụ ya mere o ji gwa anyị ka anyị ghara ‘iji ụwa eme ihe n’uju’ ma ọ bụ gafee ókè.—1 Ndị Kọrịnt 7:31.

Obodo Timgad ahụ dakpọrọ adakpọ dị n’ebe ugwu Afrịka na-egosi anyị na ihe ga-eme ka mmadụ nwee obi ụtọ ná ndụ ma ọ bụ ka ndụ ya nwee isi abụghị ihe ahụ e dere n’ọma ahịa obodo ahụ. Kama ọ bụ ime ihe a Baịbụl kwuru: “Ụwa na-agabiga, ọchịchọ ya na-agabigakwa, ma onye na-eme uche Chineke ga-anọgide ruo mgbe ebighị ebi.”—1 Jọn 2:17.