Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

ỤLỌ NCHE DISEMBA 2014

 NDỊ NA-AGỤ AKWỤKWỌ ANYỊ NA-AJỤ, SỊ . . .

Olee Ihe Ndị I Kwesịrị Ịma Banyere Krismas?

Olee Ihe Ndị I Kwesịrị Ịma Banyere Krismas?

N’ebe niile n’ụwa, ọtụtụ nde mmadụ na-agba Krismas. Ndị nke ọ bụla nwere ihe mere ha ji agba ya. Ụfọdụ ndị na-eji oge ememme a aga ka ha na ndị enyi ha na ndị ezinụlọ ha nọrịa. Ndị ọzọ na-eji oge a eche echiche banyere Chineke ma ọ bụ jiri ya na-enyere ndị ọ na-enweghị ka ọ hà ha aka. N’eziokwu, mmadụ na ndị enyi ya na ndị ezinụlọ ya ịnọrị adịghị njọ. Iche echiche banyere Chineke na inyere ndị ọzọ aka adịghịkwa njọ. Ma, e nwere ihe mere o ji bụrụ na ime ememme a adịghị mma.

Nke mbụ bụ na ọtụtụ ndị na-agba Krismas kweere na Krismas bụ ememme e ji echeta ụbọchị a mụrụ Jizọs. Ma, ndị ọkọ akụkọ ihe mere eme kwetara na o nweghị mmadụ ọ bụla ma ụbọchị a mụrụ Jizọs. Akwụkwọ bụ́ The Christian Book of Why kwuru na “o nweghị ụbọchị Ndị Kraịst oge mbụ wepụtara ha ji echeta ọmụmụ Jizọs” n’ihi na ha “achọghị ime ihe ọ bụla ndị na-ekpere arụsị na-eme.” Ihe ọzọ bụ na o nweghị ebe Baịbụl kwuru na Jizọs mere ememme ncheta ọmụmụ nke ya ma ọ bụ nke onye ọzọ. Ma, o nyere ndị na-eso ụzọ ya iwu ka ha na-echeta ọnwụ ya.—Luk 22:19.

Nke abụọ bụ na ọtụtụ ndị ọkà mmụta kwetara na ọtụtụ ihe a na-eme n’oge Krismas si n’omenala ndị na-ekpere arụsị nakwa n’omenala ndị na-abụghị Ndị Kraịst. Ụfọdụ omenala ndị ahụ bụ: Fada Krismas inye ndị mmadụ onyinye, iji ahịhịa a na-akpọ mịsụlto na osisi Krismas na ahịhịa ndụ a kpara okirikiri achọ ụlọ mma, ndị mmadụ inyerịta ibe ha onyinye, ịmụ kandụl, isonye nnukwu okpiri nkụ n’ekwú ọkụ, na ịbụ abụ Krismas. Akwụkwọ bụ́ The Externals of the Catholic Church kwuru banyere ụfọdụ omenala ndị ahụ, sị: “Mgbe anyị na-enye ndị mmadụ onyinye ma ọ bụ na-anata ha onyinye n’oge Krismas, werekwa ahịhịa ndụ a kpara okirikiri na-achọ ụlọ anyị na chọọchị anyị mma, mmadụ ole n’ime anyị ma na ọ ga-abụ omenala ndị na-ekpere arụsị ka anyị na-eme?”

“Mgbe anyị na-enye ndị mmadụ onyinye ma ọ bụ na-anata ha onyinye n’oge Krismas, werekwa ahịhịa ndụ a kpara okirikiri na-achọ ụlọ anyị na chọọchị anyị mma, mmadụ ole n’ime anyị ma na ọ ga-abụ omenala ndị na-ekpere arụsị ka anyị na-eme?”—Akwụkwọ bụ́ The Externals of the Catholic Church

Ma, i nwere ike ịna-eche ma mmadụ ime ememme ndị a yiri ka o nwechaghị ihe ha mere ọ̀ dị njọ. Lee ihe nke atọ mere o ji bụrụ na ime ha adịghị mma. Chineke achọghị ka ndị na-efe ya mewe omenala ndị na-ekpere arụsị na-eme. Jehova Chineke si n’ọnụ onye amụma ya bụ́ Emọs gwa ụmụ Izrel oge ochie hapụrụ ife ya otú ọ chọrọ, sị: “Akpọwo m ememme unu niile asị, ajụwo m ha. . . .  Bụrụnụ abụ unu ji na-eme mkpọtụ si n’ebe m nọ pụọ.”—Emọs 5:21, 23.

Gịnị mere Chineke ji gwa ha na ya kpọrọ ememme ha asị? Ka anyị leba anya n’ihe ndị bi n’ebe ugwu alaeze Izrel oge ochie nọ na-eme. Jeroboam, bụ́ eze mbụ chịrị ha, ji ọlaedo kpụọ nwa ehi abụọ, debe otu na Dan, debekwa nke ọzọ na Betel. O mekwara ka ndị Izrel na-efe nwa ehi ndị ahụ kama ife Jehova Chineke otú kwesịrị ekwesị n’ụlọ nsọ ya dị na Jeruselem. O nwekwara ememme ndị Jeroboam malitere, ọ họpụtakwara ndị nchụàjà ga-enyere ndị Izrel aka ka ha na-eme ememme ndị ahụ.—1 Ndị Eze 12:26-33.

O nwere ike iyi ka ihe ahụ ndị Izrel mere adịghị njọ. A sị ka e kwuwe, ihe ha bu n’obi mee ihe niile ahụ ha mere ọ́ bụghị na ha chọrọ ife Chineke na ime ihe dị ya mma? Ihe Chineke si n’ọnụ Emọs na ndị amụma ya ndị ọzọ gwa ụmụ Izrel mere ka o doo anya na ememme ndị ahụ na otú ahụ ha si na-efe Chineke adịghị Chineke mma. Chineke sikwa n’ọnụ Malakaị onye amụma ya sị: “Abụ m Jehova; adịghị m agbanwe agbanwe.” (Malakaị 3:6) Ihe a Chineke kwuru ọ́ naghị akụziri anyị otú o si were ememme Krismas ndị mmadụ na-eme taa?

Ọtụtụ nde mmadụ echebarala ihe ndị a anyị lebara anya echiche ma kpebie na ha agaghị agba Krismas. Kama ịgba Krismas, ha na ndị enyi na ndị ezinụlọ ha nwere ike ịnọrị mgbe ọ bụla n’afọ, ha na-enyekwara ndị ogbenye na ndị ọ na-enweghị ka ọ hà ha aka n’oge ọ bụla n’afọ. Ọ bụ ya mere obi ji adị ha ezigbo ụtọ mgbe niile.

 

GỤKWUO GBASARA YA

Gịnị Mere Ndịàmà Jehova Anaghị Agba Krismas?

Ọtụtụ ndị na-agba Krismas n’agbanyeghị na ha ma otú o si malite. Gụọ ihe a ka ị mata ihe mere Ndịàmà Jehova anaghị agba Krismas.