Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

ỤLỌ NCHE DISEMBA 2014

M̀ Kwesịrị Ịga Gbaziri Ego?

M̀ Kwesịrị Ịga Gbaziri Ego?

“Ịgbaziri ego dị ka ebe mmadụ gara oriri agbamakwụkwọ. Ma, ịkwụ ya akwụ dị ka ebe mmadụ gara ebe a na-eru uju.”—Ilu ndị Swahili.

ỌTỤTỤ ndị bi ná mpaghara ọwụwa anyanwụ Afrịka ma ilu a. O dokwara anya na ọ bụ otú a ka ọtụtụ ndị bi n’ebe dị iche iche n’ụwa si ele ịgbaziri ego anya. Gịnwa kwanụ? Ì chere na mmadụ ịga na nke enyi ya ma ọ bụ n’ebe ọzọ biri ego dị mma? Ọ bụ eziokwu na mmadụ nwere ike iche na ọ bụrụ na ọ gaa gbazite ego, ọ ga-enwe ike igbo mkpa ya, ma ajụjụ bụ: Mmadụ ime otú ahụ ọ̀ dị mma? Olee nsogbu mmadụ ibiri ego nwere ike ịkpatara ya?

Ilu ọzọ ndị Swahili na-atụ kwuru nsogbu mmadụ ibiri ego nwere ike ịkpatara ya. Ilu ahụ sịrị na “ibiri ego ma ọ bụ ibinye mmadụ ego na-eme ka enyi na enyi see okwu.” N’eziokwu, ụgwọ mmadụ ji nwere ike ime ka ya na ndị ya na ha dị ná mma ghọọ ndị iro. N’agbanyeghị ihe ọma mmadụ bu n’obi na otú o si hazie ọ ga-esi akwụ ego o bitere, ọ bụghị mgbe niile ka ihe na-aga otú mmadụ tụrụ anya ya. Dị ka ihe atụ, ọ bụrụ na onye mmadụ binyere ego akwụghị ya mgbe o kwesịrị ịkwụ ya, iwe nwere ike iwe onye binyere ya ego. Ha nwere ike malite iburu ibe ha ihe ọjọọ n’obi. Nke a nwekwara ike ime ka ndị ezinụlọ mmadụ abụọ ahụ kwụsị ịdị ná mma. Ebe ọ bụ na ibiri ego ma ọ bụ ibinye mmadụ ego nwere ike ịkpatara ndị mmadụ na ibe ha esemokwu, anyị ekwesịghị iwere ịgbaziri ego ka ihe mbụ anyị ga-eme mgbe ego dị anyị mkpa, kama anyị kwesịrị iwere ya ka ihe anyị nwere ike ime mgbe ọ na-enweghịzi ihe ọzọ anyị ga-eme.

Ibiri ego nwere ike ime ka mmadụ na Chineke ghara ịdịkwa ná mma. Gịnị mere anyị ji kwuo otú ahụ? Nke mbụ bụ na Baịbụl kwuru na ọ bụ onye ajọ omume na-agbaziri ego ma kpachara anya ghara ịkwụ ya. (Abụ Ọma 37:21) Baịbụl kwukwara na “onye gbaziiri ihe bụkwa ohu onye gbazinyere ya ihe.” (Ilu 22:7) Onye gbaziiri ego kwesịrị ịmata na ọ nọ n’okpuru onye gbazinyere ya ego ruo mgbe ọ kwụrụ ụgwọ o ji. Ilu ọzọ ndị Afrịka na-atụ kwukwara otu ihe ahụ. Ilu ahụ sịrị: “Ọ bụrụ na mmadụ agbaziri ụkwụ onye ọzọ, ọ bụ ebe onye nwe ụkwụ ahụ gara ka ọ ga-aga.” Ihe ilu a pụtara bụ na onye ji nnukwu ego n’ụgwọ enwereghị onwe ya ime ihe ọ bụla ọ chọrọ.

Ọ bụ ya mere mmadụ ji kwesị ime ihe ọ bụla o nwere ike ime ka ọ kwụọ ụgwọ o ji. Ma ọ́ bụghị ya, ụgwọ ahụ nwere ike ịkpatara ya ọtụtụ nsogbu. O nwere ike ime ka ahụ́ na-agbakasị ya, ka ụra ghara ịna-aga ya n’anya n’abalị, ka ọ na-arụgbu onwe ya  n’ọrụ, ka ya na di ya ma ọ bụ nwunye ya na-esekarị okwu ma ọ bụdị mee ka ezinụlọ ha tisaa. O nwekwara ike ime ka a gbaa onye ahụ akwụkwọ n’ụlọikpe ma ọ bụ tụọ ya mkpọrọ. Anyị kwesịrị ime ihe e dere ná Ndị Rom 13:8. Ebe ahụ sịrị: “Unu ejila onye ọ bụla ụgwọ ihe ọ bụla, ma e wezụga ịhụ ibe unu n’anya.”

Ọ̀ DỊ MKPA KA M GBAZIRI EGO?

Ihe ndị a anyị kwurula gosiri na mmadụ kwesịrị iche echiche nke ọma tupu ya ebiri ego. Mmadụ kwesịrị ịjụ onwe ya, sị: È nwere ihe ji m n’olu mere m ga-eji gbaziri ego? Ihe mere m ji chọọ ịgbaziri ego ọ̀ bụ ka m nwee ike ilekọta ezinụlọ m? Ka ọ̀ bụ anyaukwu chọrọ ime ka m konye akpa m n’ebe aka m na-agaghị eru? Nke ọ bụla ọ bụ, ọ kacha mma ka afọ ju mmadụ n’obere ihe o nwere kama ịga koro ụgwọ.

N’eziokwu, e nwere mgbe ọ na-enweghị ihe ọzọ mmadụ ga-eme ma ọ́ bụghị ịga biri ego, dị ka mgbe ihe gbata gbata mere. Ya bụrụgodị na ụdị ihe ahụ emee, mmadụ ekpebie ibiri ego, onye ahụ kwesịrị ịgbalị kwụwa aka ya ọtọ. Olee otú mmadụ ga-esi egosi na ọ na-akwụwa aka ya ọtọ?

Nke mbụ: a nwala anwa rigbuo mmadụ maka na i chere na onye ahụ nwere ego. Anyị ekwesịghị ichewe na ọ bụrụ na ọ dị anyị ka mmadụ ọ̀ bụ ọgaranya na ọ bụ iwu na ọ ga-enyere anyị aka. Anyị ekwesịghịkwa iche na iwu ejighị anyị ịkwụghachi ya ego ọ gbazinyere anyị. Anyị ekwesịghị ịna-emere ndị nwere ego karịa anyị anyaụfụ.—Ilu 28:22.

Nke abụọ: gbalịa kwụghachi ego ị gbazitere n’oge unu kwuru na ị ga-akwụ ya. Ya bụrụgodị na onye binyere gị ego ekwughị mgbe ọ chọrọ ka ị kwụọ ya, i kwesịrị ịgwa ya mgbe ị ga-akwụ ya, kwụọkwa ya mgbe ahụ. Ọ kacha mma ka unu dee ego ole o binyere gị ede nakwa oge ị ga-akwụ ya ka ego ahụ ghara ịkpatara unu esemokwu. (Jeremaya 32:9, 10) O kwe gị omume, gaa n’onwe gị nyeghachi ya ego ahụ o binyere gị ma kelee ya. Ị gbalịa kwụọ ụgwọ i ji mgbe i kwesịrị ịkwụ ya, gị na onye binyere gị ego agaghị ese okwu. Mgbe Jizọs na-akụzi ihe n’elu ugwu, ọ sịrị: “Naanị ka Ee unu kwuru bụrụ Ee, ka Ee e unu kwuru bụrụ Ee e.” (Matiu 5:37) Na-echetakwa ihe Jizọs kwuru ga-eme ka mmadụ na ibe ya na-adị ná mma. Ọ sịrị: “Ihe niile unu chọrọ ka ndị mmadụ na-emere unu, unu onwe unu aghaghị imere ha otú ahụ.”—Matiu 7:12.

IHE NDỊ BAỊBỤL KWURU GA-ENYERE GỊ AKA

Baịbụl gwara anyị ihe ga-enyere anyị aka ka anyị ghara ịna-achọ ịgbaziri ego. O kwuru, sị: “N’ezie, nsọpụrụ Chineke a, ya na inwe afọ ojuju, bụ ụzọ isi rite uru dị ukwuu.” (1 Timoti 6:6) Nke a pụtara na ihe ga-eme ka mmadụ zere nsogbu ibiri ego na-akpata bụ ihe o nwere iju ya afọ. Ma, o siri ike ịhụ onye ihe niile o nwere zuuru n’ụwa a ndị mmadụ na-achọ ka ha nweta ihe ha chọrọ ọkụ ọkụ. Ọ bụ ya mere “nsọpụrụ Chineke” ji baa ezigbo uru. Olee otú nsọpụrụ Chineke ga-esi enyere anyị aka?

Dị ka ihe atụ, e nwere otu di na nwunye bụ́ Ndị Kraịst bi n’Eshia. Mgbe ha ka lụrụ ọhụrụ, ọ na-abụ ha hụ ndị nwere ụlọ nke ha, ya agụwa ha agụụ inwe nke ha. Ha kpebiziri na ha ga-eji ego ha dewere kemgbe nakwa nke ha gbazitere ndị ụlọ akụ̀ na ndị ikwu ha zụọ ụlọ. Ma, obere oge ha zụchara ụlọ ahụ, ego ha na-akwụ kwa ọnwa bịaziri karịa akarị. Ha rụwara ọtụtụ ọrụ. Nke a mere na ha anaghị enwechazi oge ha na ụmụ ha ji anọrị. Nwoke ahụ mechara kwuo, sị: “Isi dị m ka onye e boro nnukwu okwute n’ihi na ahụ́ anaghị eru m ala, m na-echegbu onwe m mgbe niile, ụra anaghịkwa atụ m. Ọ dị m ka m̀ na-anwụ anwụ.”

“Mmadụ iwere akụnụba otú Chineke si were ya na-echebe mmadụ”

Di na nwunye a mechara cheta ihe e dere na 1 Timoti 6:6 ma kpebizie na ha ga-ere ụlọ ahụ. O were ha afọ abụọ tupu ha akwụchaa ụgwọ ha ji. Gịnị ka di na nwunye a mụtara n’ihe ahụ mere ha? Ha kwuru, sị: “Mmadụ iwere akụnụba otú Chineke si were ya na-echebe mmadụ.”

Ọtụtụ ndị ma ilu ndị Swahili ahụ anyị kwuru okwu ya ná mbido isiokwu a. Ma, o mebeghị ka ndị mmadụ kwụsị ịgbaziri ego. Í cheghị na ihe ndị a Baịbụl kwuru anyị lebara anya kwesịrị ime ka onye ọ bụla n’ime anyị chee echiche ma jụọ onwe ya, sị: M̀ kwesịrị ịga gbaziri ego?

GỤKWUO GBASARA YA

Baịbụl Ọ̀ Ga-enyeliri Ndị Ihe Na-esiri Ike na Ndị Ji Ụgwọ Aka?

Ego agaghị azụtali obi ụtọ, ma o nwere ihe anọ Baịbụl kwuru ga-enyere gị aka ná mkpata na mmefu gị.

Ihe Atọ Ego Na-agaghị Azụtali

Anyị na-eji ego azụ ihe ndị dị anyị mkpa ma ego anaghị azụtali ihe ndị kacha mkpa ná ndụ.