Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

ỤLỌ NCHE DISEMBA 2014

 ISIOKWU ỤLỌ NCHE A | GỊ NA CHINEKE NWERE IKE ỊDỊ NÁ MMA

Gị na Chineke Ùnu Na-ekwurịta Okwu?

Gị na Chineke Ùnu Na-ekwurịta Okwu?

Enyi na enyi na-ekwurịta okwu ugboro ugboro. Ha nwere ike ikwurịta okwu ihu na ihu ma ọ bụ ha ejiri fon, akwụkwọ ozi ma ọ bụ ụzọ ndị ọzọ na-agwa ibe ha okwu. Ọ bụrụkwa na anyị chọrọ ka anyị na Chineke dịrị ná mma, anyị na ya ga na-ekwurịta okwu mgbe niile. Ma, olee otú anyị na Chineke ga-esi na-ekwurịta okwu?

Otú anyị si agwa Jehova Chineke okwu bụ ikpegara ya ekpere. Ma, ekpere dị iche n’okwu nkịtị mmadụ na ibe ya na-ekwurịta. Anyị kwesịrị ịghọta na onye anyị na-agwa okwu mgbe anyị na-ekpe ekpere bụ Onye kere anyị, Onye Kasi Elu n’eluigwe na n’ụwa. Ịghọta ụdị onye ọ bụ ga-eme ka anyị na-akwanyere ya ezigbo ùgwù mgbe anyị na-ekpegara ya ekpere. E nwekwara ihe ụfọdụ anyị kwesịrị ịna-eme ma anyị chọọ ka Chineke na-anụ ekpere anyị. Ka anyị leba atọ n’ime ha anya.

Nke mbụ bụ na ọ bụ naanị Jehova Chineke ka anyị ga na-ekpegara ekpere, ọ bụghị Jizọs, ndị sent ma ọ bụkwanụ ihe a kpụrụ akpụ. (Ọpụpụ 20:4, 5) Baịbụl kwuru hoo haa, sị: “N’ihe niile, jirinụ ekpere na ịrịọsi arịrịọ ike na inye ekele mee ka Chineke mara ihe unu na-arịọ.” (Ndị Filipaị 4:6) Nke abụọ bụ na anyị ga na-ekpe ekpere n’aha Ọkpara Chineke, bụ́ Jizọs Kraịst. Jizọs kwuru, sị: “Ọ dịghị onye na-abịakwute Nna m ma ọ́ bụghị site na mụ.” (Jọn 14:6) Nke atọ bụ na ihe anyị na-ekpe n’ekpere kwesịrị ịbụ ihe bụ́ uche Chineke. Baịbụl kwuru, sị: “Ihe ọ bụla nke anyị rịọrọ ya dị ka uche ya si dị, ọ na-anụ olu anyị.” *1 Jọn 5:14.

Enyi na enyi na-agwa ibe ha otú obi dị ha ugboro ugboro

Mmadụ abụọ agaghị anọgide na-abụ enyi ma ọ bụrụ otu onye n’ime ha na-agwa ibe ya okwu, onye nke ọzọ anaghị atụpụ ọnụ. Ebe ọ bụ na enyi na enyi na-agwa ibe ha otú obi dị ha, anyị kwesịkwara ikwe ka Chineke na-agwa anyị okwu. Ya gwawa anyị okwu, anyị egee ya ntị. Ị̀ ma otú Chineke si agwa anyị okwu?

Jehova Chineke na-esi n’Okwu ya e dere ede, bụ́ Baịbụl, agwa anyị okwu n’oge a. (2 Timoti 3:16, 17) Gịnị mere anyị ji kwuo otú ahụ? Ka e were ya na ezigbo enyi gị detaara gị akwụkwọ ozi. Mgbe ị gụchara ya, gị ejiri obi ụtọ na-agwa ndị mmadụ na o nwere ihe enyi gị gwara gị. Ma, enyi gị agwaghị gị ihe ahụ n’ọnụ, kama o dere ya ede. Otú ahụ ka ọ dịkwa mgbe ị na-agụ Baịbụl. Jehova na-agwa gị okwu mgbe ị na-agụ ya. Gina, bụ́ onye anyị dere ihe o kwuru n’isiokwu mbụ gbara n’Ụlọ Nche a, sịrị: “Echere m na ọ bụrụ na m chọrọ ka Chineke bụrụ enyi m, m kwesịrị ileba anya n’akwụkwọ ozi o deteere anyị, ya bụ, Baịbụl.” O kwukwara, sị: “Ịgụ Baịbụl kwa ụbọchị emeela ka mụ na Chineke dịkwuo ná mma.” Ị̀ na-agụ Baịbụl ụbọchị niile ka Jehova nwee ike ịna-agwa gị okwu kwa ụbọchị? Ime otú ahụ ga-eme ka gị na Chineke dịkwuo ná mma.

^ para. 5 Ọ bụrụ na ị chọrọ ịmatakwu otú ikpe ekpere ga-esi eme ka gị na Chineke dịrị ná mma, gụọ isi nke 17 n’akwụkwọ bụ́ Gịnị n’Ezie Ka Bible Na-akụzi? Ọ bụ Ndịàmà Jehova bipụtara ya.

GỤKWUO GBASARA YA

Chineke Ọ̀ Ga-enyere M Aka Ma M Kpee Ekpere?

Nsogbu anyị hà na-emetụ Chineke n’obi?