Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

ỤLỌ NCHE DISEMBA 2014

“Nghọta Mmadụ Nwere Na-eme Ka Ọ Ghara Iwe Iwe Ọsọ Ọsọ”

“Nghọta Mmadụ Nwere Na-eme Ka Ọ Ghara Iwe Iwe Ọsọ Ọsọ”

A chụrụ otu onye na-akụziri ụmụ akwụkwọ kọleji otú e si atụ basketbọl n’ọrụ n’ihi iwe ọkụ ọ na-ewe.

Nwatakịrị wewere iwe iberiibe maka na e mereghị ya ihe ọ chọrọ.

Otu nwaanyị iwe ji n’ihi otú nwa ya nwoke si tụsasịa ihe aghara aghara n’ụlọ ya bawaara nwa ya mba, nwa ya abagwakwara ya.

ONYE ọ bụla n’ime anyị ahụtụla ebe mmadụ were iwe. O dokwara anya na e nweela mgbe anyịnwa were iwe. Ọ bụ eziokwu na anyị nwere ike iwere iwe iwe ka ihe na-adịghị mma, ma ọtụtụ mgbe ọ na-abụ anyị wee iwe, anyị echee na e nwere ezigbo ihe mere anyị ji kwesị iwe ya, karịchaa ma ọ bụrụ na anyị chere na e mejọrọ anyị. Otu isiokwu òtù na-amụ gbasara akparamàgwà ndị mmadụ n’Amerịka dere kwudịrị na mmadụ “kwesịrị ịna-ewe iwe, ọtụtụ mgbe, iwe iwe na-abara mmadụ uru.”

Anyị nwere ike iche na ihe a ha kwuru bụ eziokwu ma anyị cheta ihe Pọl onyeozi dere n’ike mmụọ nsọ. Pọl ma na mmadụ nwere ike iwe iwe. Ọ bụ ya mere o ji, sị: “Weenụ iwe, ma unu emehiela; unu anọkwala na-ewe iwe ruo mgbe anyanwụ dara.” (Ndị Efesọs 4:26) Ihe a Baịbụl kwuru ọ̀ pụtara na anyị kwesịrị ịna-ewe iwe, ka ànyị kwesịrị ime ihe niile anyị nwere ike ime ka anyị ghara iwe iwe?

Ì KWESỊRỊ IWE IWE?

Ọ ga-abụ na Pọl bu ihe otu ọbụ abụ kwuru n’obi mgbe o dere ihe ahụ dị ná Ndị Efesọs 4:26. Ọbụ abụ ahụ dere, sị: “Weenụ iwe, ma unu emehiela.” (Abụ Ọma 4:4) Ma, gịnị ka ihe a Pọl dere n’ike mmụọ nsọ pụtara? O kwuziri, sị: “Wepụnụ obi ilu niile na iwe na ọnụma na iti mkpu na okwu mkparị, tinyere ihe ọjọọ niile, n’etiti unu.” (Ndị Efesọs 4:31) Pọl na-agwa Ndị Kraịst ka ha ghara ịna-ewe iwe. Isiokwu ahụ òtù na-amụ gbasara akparamàgwà ndị mmadụ n’Amerịka dere kwukwara na “nchọpụta ndị e mere gosiri na mmadụ iwe iwe ọkụ na-eme ka ọsụkọsụ na-asụgbu ya, iwe ahụ agaghị enyere ya aka . . . ka nsogbu ya kwụsị.”

Ma, olee otú anyị nwere ike isi ‘wepụ’ iwe na nsogbu ndị o nwere ike ịkpatara anyị? Sọlọmọn, bụ́ eze maara ihe chịrị Izrel n’oge ochie, dere, sị: “Nghọta mmadụ nwere na-eme ka ọ ghara iwe iwe ọsọ ọsọ, ileghara mmejọ anya bụkwaara ya ịma mma.” (Ilu 19:11) Olee otú “nghọta mmadụ nwere” ga-esi enyere ya aka ma a kpasuo ya iwe?

OTÚ NGHỌTA SI EME KA MMADỤ GHARA IWE IWE ỌSỌ ỌSỌ

A sị na mmadụ nwere nghọta, ọ pụtara na onye ahụ na-eleru anya ala mata ihe mere ihe ji mee ma  ọ bụ ihe mere mmadụ ji mee ihe o mere. Olee otú inwe nghọta ga-esi enyere anyị aka ma a kpasuo anyị iwe?

Ọ bụrụ na anyị ahụ ebe a na-emegbu mmadụ, iwe nwere ike iwe anyị. Ma, ọ bụrụ na anyị ejiri otú obi dị anyị mee ihe ozugbo, anyị nwere ike imebiri onwe anyị ma ọ bụ onye ọzọ ihe. Otú ahụ obere ọkụ a hapụrụ ka ọ na-ere nwere ike irechapụ ụlọ, iwe nwekwara ike ime ka anyị kpaa àgwà ga-eme ka ndị mmadụ lewe anyị anya ọjọọ, meekwa ka anyị na ndị mmadụ nakwa Chineke ghara ịdịkwa ná mma. N’ihi ya, iwe bido iwe anyị, ọ bụ mgbe ahụ ka anyị kwesịrị ileru anya chọpụta ihe niile mere iwe ji na-ewe anyị. Ọ bụrụ na anyị amata ihe niile merenụ na ihe niile kpatara ya, anyị ga-enwe ike ijide onwe anyị.

O nwere mgbe ọ fọrọ obere ka nna Sọlọmọn, bụ́ Eze Devid, gbuo ọchụ mgbe otu nwoke aha ya bụ Nebal kparịrị ya. Ihe mere ka Devid ghara igbu ọchụ mgbe ahụ bụ na o nwere onye mere ka ọ ghọta ihe niile mere e ji kparịa ya. Tupu ihe a emee, Devid na ụmụ nwoke na-ejere ya ozi chebere ìgwè atụrụ Nebal mgbe ha nọ n’ọzara Juda. Mgbe oge e ji akpacha atụrụ ajị ruru, Devid zigara ndị na-ejere ya ozi ka ha gaa rịọ Nebal ka o nyetụ ha ihe oriri. Ma, Nebal ekweghị. Kama ọ gwara ha, sị: “M̀ ga-ewere achịcha m na mmiri m na anụ m gbuuru ndị na-akpachara m ajị anụ nye ndị ikom m na-amadịghị ebe ha si?” N’eziokwu, ọ kparịrị Devid akparị. Ozugbo a gwara Devid ihe Nebal kwuru, Devid kpọọrọ ihe dị ka narị ụmụ nwoke anọ gawa ka ha gbuo Nebal na ndị ezinụlọ ya.—1 Samuel 25:4-13.

Mgbe nwunye Nebal, bụ́ Abigel, nụrụ ihe niile merenụ, ọ gawara ịhụ Devid. Mgbe ọ hụrụ Devid na ụmụ nwoke ha na ya so, ọ dara n’ala n’ụkwụ Devid, sị: “Biko, ka ohu gị nwaanyị kwuo okwu ná ntị gị, geekwa ntị n’okwu ohu gị nwaanyị.” Abigel kọwaara Devid otú di ya bụ́ Nebal si dị nzuzu ma rịọ ya ka ọ ghara ịbọrọ onwe ya ọbọ na ịkwafu ọbara n’ihi na ọ ga-emecha kwaa mmakwaara ma o mee otú ahụ.—1 Samuel 25:24-31.

Olee ihe Devid ghọtara n’ihe a Abigel gwara ya nke mere ka iwe ya dajụọ? Nke mbụ bụ na ọ ghọtara na ihe mere Nebal ji kparịa ya bụ na Nebal bụ onye nzuzu kemgbe ụwa ya. Nke abụọ abụrụ na ọ bụrụ na Devid abọọrọ onwe ya ọbọ, ikpe ọbara nwere ike ịma ya. Mmadụ nwekwara ike ịkpasu gị iwe otú ahụ a kpasuru Devid. A kpasuo gị iwe, olee ihe i kwesịrị ime? Akwụkwọ otu ụlọ ọgwụ dị n’Amerịka bipụtara kwuru, sị: “Kuru ume, kuda, ma gụọ otu, abụọ, ruo iri.” Tupu gị emee ihe ọ bụla, burugodị ụzọ chee echiche ka ị ghọta ihe kpatara nsogbu ahụ nakwa ihe nwere ike isi n’ihe ị chọrọ ime pụta. Gbalịa ka ihe ị ghọtara mee ka iwe gị dajụọ ma ọ bụkwanụ ka ị ghara iwekwa iwe.—1 Samuel 25:32-35.

Taa, nghọta emeela ka ọtụtụ ndị na-ejide onwe ha ma a kpasuo ha iwe. E nwere otu nwoke dị afọ iri abụọ na atọ aha ya bụ Sebastian. Ọ nọ n’ụlọ mkpọrọ dị na Poland. Ma, o kwuru na ịmụ Baịbụl emeela ka ọ mụta ijide onwe ya ma a kpasuo ya iwe. O kwuru, sị: “Ihe mbụ m na-eme bụ ichebara ihe kpatara iwe ji na-ewe m echiche. Ana m agbalịzi eme ihe Baịbụl kwuru. Ahụla m na ọ bụ Baịbụl bụ akwụkwọ kacha enyere mmadụ aka.”

Setsuo mekwara ihe yiri ihe ahụ Sebastian na-eme. Ọ sịrị: “M na-abakasị ndị mụ na ha na-arụkọ ọrụ ahụ́ ma ha kpasuo m iwe. Ma, ugbu a m mụwara Baịbụl, kama ịbawa mba, m na-ajụzi onwe m, sị: ‘Ònyedị kpatara ihe a merenụ? Ọ́ bụghị mụnwa kpatara ya?’” Ichebara ajụjụ ndị a echiche mere ka Setsuo kwụsị iwe iwe ọkụ, o mekwara ka ọsụkọsụ na-asụ ya n’obi kwụsị ịsụ ya.

Ime ihe Baịbụl kwuru ga-enyere gị aka ijide onwe gị ma a kpasuo gị iwe

Mgbe ụfọdụ, iwe nwere ike ju anyị obi, ma ihe Baịbụl kwuru ga-enyere anyị aka ka ọ dajụọ. Ọ bụrụ na ị na-eme ihe Baịbụl kwuru ma na-arịọ Chineke ka o nyere gị aka, nghọta ga-emekwa ka ị ghara ịna-ewe iwe ọsọ ọsọ ma ọ bụ ka ị na-ejide onwe gị ma a kpasuo gị iwe.

GỤKWUO GBASARA YA

Otú Di na Nwunye Ga-esi Kwụsị Ịna-agwa Ibe Ha Okwu Ọjọọ

Gịnị ka ị ga-eme ma ọ bụrụ na gị na di gị ma ọ bụ gị na nwunye gị na-agwakarị ibe unu okwu ọjọọ?

Olee Otú Iwu Chineke Si Abara Anyị Uru?

Jizọs kọwara ihe mere o ji dị mma ka Chineke na-eduzi anyị, kwuokwa banyere iwu abụọ kacha mkpa.