Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

ỤLỌ NCHE NỌVEMBA 2014

 ṄOMIE OKWUKWE HA | JOSEF

“Olee Otú M Ga-esi Mee Oké Ihe Ọjọọ A?”

“Olee Otú M Ga-esi Mee Oké Ihe Ọjọọ A?”

MGBE Josef na ndị ahịa du ya rutewere n’ebe dị nso n’osimiri Naịl, o kuuru ume nụ ísì okooko ahịhịa lotọs na ahịhịa ndị ọzọ na-eto na mmiri. Were ya na ị na-ahụ ndị ahịa ahụ na-aga n’ahịrị n’ahịrị ka ha du kamel ha soro okpo mmiri dị n’ebe ahụ gawa obodo ọzọ dị n’Ijipt. Ka ha na-aga, mkpọtụ ha na-eme na-eme ka nnụnụ ndị nọ na mmiri dị n’ebe ahụ na-efepụ. Josef chetakwara ụlọ nna ya nke dị na Hibrọn. Ụlọ nna ya dị ezigbo anya n’ebe ọ nọ ugbu a, ọ dịkwa ya ka ọ̀ nọ n’ụwa ọzọ.

Were ya na ị na-ahụ ka enwe na-amagharị n’elu nkwụ a na-akpọ det nakwa n’elu osisi fig, na-eme mkpọtụ ka Josef na ndị ahịa ahụ nọ na-aga. Josef aghọtaghị ihe ndị ha na-agafe n’ụzọ na-ekwu. O nwere ike ịbụ na ọ gbalịrị ka ọ ghọtatụ ihe ole na ole ha nọ na-ekwu ebe ọ ma na ebe a ga-aghọzi obodo ya. O doola ya anya na ụkwụ ya emekataghị maa n’ụlọ ha ọzọ.

Josef ka bụ obere nwa. Ọ ga-abụ na ọ dị afọ iri na asaa ma ọ bụ iri na asatọ. Ma, ọtụtụ ndị dimkpa agaghị edili nsogbu ọ nọ na ya. Ụmụnne ya nọ na-enwere ya anyaụfụ maka na nna ha hụrụ ya n’anya karịa otú ọ hụrụ ha. Ọ fọdịrị obere ka ha gbuo ya. Ma ha resịziri ya ndị ahịa a kpọ ya na-aga Ijipt. (Jenesis 37:2, 5, 18-28) Ugbu a ha garala ije ọtụtụ izu, ọ ga-abụ na obi bụzi ndị ahịa ahụ sọ aṅụrị maka na ha erutewela nnukwu obodo ebe ha ga-erete Josef na ngwá ahịa dị oké ọnụ ha bu ezigbo ego. Gịnị nyeere Josef aka ka ike ụwa ghara ịgwụ ya, obi agharakwa ịda ya mbà? Oleekwa ihe ndị anyị ga-eme ka nsogbu ndị na-abịara anyị taa ghara ime ka okwukwe anyị nyụọ ka ọkụ? Anyị nwere ọtụtụ ihe anyị ga-amụta n’ihe mere Josef.

“JEHOVA NỌNYEERE JOSEF”

Baịbụl kwuru, sị: “A kpọọrọ Josef gbadata n’Ijipt, Pọtịfa, onye na-eje ozi n’obí Fero, onyeisi ndị nche, bụ́ onye Ijipt, wee zụrụ ya n’aka ndị Ishmel bụ́ ndị kpọ ya gbadata n’ebe ahụ.” (Jenesis 39:1) Ihe ole na ole a Baịbụl kwuru mere ka anyị ghọta otú imi na anya dị Josef mgbe e jizi ya na-atụ mgbere ahịa. Were ya na ị na-ahụ Josef ka o so nna ya ukwu ọhụrụ, bụ́ onye na-arụ ọrụ n’obí eze ndị Ijipt, na-ala n’ụlọ ya bụ́ ebe Josef ga-ebizi. Ka ha na-aga, ha gafere okporo ụzọ ndị na-ekwo ekwo. Ndị mmadụ kpọsachara ngwá ahịa n’akụkụ ụzọ ndị ahụ.

Ebe a Josef ga-ebizi adịtụdịghị ka ụlọ nna ya. Kemgbe ndụ ya, ndị ezinụlọ ya na-akwagharị akwagharị, ọ bụkwa n’ụlọikwuu ka ha bi, ha na-azụkwa atụrụ. Ma n’Ijipt ebe a, Pọtịfa na ndị Ijipt ndị ọzọ bụ́ aka ji akụ̀ bi n’ọmarịcha ụlọ ndị e tere ágbá na-egbuke egbuke. Ndị na-amụ banyere ihe ndị mgbe ochie kwuru na n’oge ochie, ọ na-amasị ndị Ijipt inwe ubi a gbara ogige bụ́ ebe ha ga-akụ osisi ndị ga na-enye ha ndo ma nwee ọdọ mmiri ha ga-akụ osisi papaịrọs, ahịhịa lotọs na ahịhịa ndị ọzọ. Ụfọdụ ụlọ ndị Ijipt na-adị n’ime ubi ndị ahụ a gbara ogige, ha na-enwekwa ọtụtụ ọnụ ụlọ nakwa veranda ebe ndị mmadụ na-anọ anara ikuku. Ọnụ ụlọ ebe ha na-anọ eri nri na-asakwa mbara. Windo a na-etinye n’ụlọ ndị ahụ na-ebu ibu ka ikuku na-abata nke ọma. A na-arụkwara ndị ohu ebe ha na-ebi.

Ọmarịcha ụlọ ndị ahụ hà mere ka Josef chefuo ụwa ya? Ọ dịghị ka hà mere ka o chefuo ụwa ya. Ọ ga-abụ na ha medịrị ka owu na-amasi ya ike. Ihe niile ndị Ijipt na-eme gbara Josef gharịị. Asụsụ ha  dị iche na nke ya, uwe na ejiji ha nakwa okpukpe ha dị iche na nke Josef. Ha na-atụ ndị nwụrụ anwụ ụjọ, ha kwekwaara na e nwere ebe ndị mmadụ na-aga dịrị ndụ ma ha nwụọ. Ma, e nwere otu ihe mere ka owu ghara ịmagbu Josef. Baịbụl gwara anyị na “Jehova nọnyeere Josef.” (Jenesis 39:2) O doro anya na Josef kpere ekpere gwa Chineke otú obi dị ya. Baịbụl sịrị na “Jehova nọ ndị niile na-akpọku ya nso.” (Abụ Ọma 145:18) Olee ihe ọzọ Josef mere ka ya na Chineke dịrị ná mma?

Josef ekweghị ka ike ụwa gwụ ya, ọ gbara mbọ na-arụ ọrụ niile e nyere ya otú ike kwere ya. Otú o si na-arụsi ọrụ ike mere ka Jehova gọzie ya, meekwa ka nna ya ukwu hụ ya n’anya. Pọtịfa hụrụ na Jehova, bụ́ Chi ndị ezinụlọ Josef na-efe, na-agọzi Josef. Otú Jehova si na-agọzi ya mekwara ka ezinụlọ Pọtịfa bakwuo ọgaranya. Pọtịfa ejighị Josef egwu egwu. O jikwa nwayọọ nwayọọ nyefee ihe niile dị n’ụlọ ya n’aka Josef maka na Josef zuru ka e mee.—Jenesis 39:3-6.

E nwere ọtụtụ ihe ndị na-eto eto na-efe Chineke taa ga-amụta n’aka Josef. Dị ka ihe atụ, o nwere ike ahụ́ agaghị na-eru ha ala mgbe ụfọdụ n’ụlọ akwụkwọ ma ọ bụ ya adị ha ka hà bụ ndị mbịarambịa n’ihi otú ụmụ akwụkwọ ibe ha si enwe mmasị n’ime mgbaasị ma ọ bụ n’ihi otú ha si ebi ndụ ka ndị na-enweghị olileanya. Mgbe ọ bụla ọ dị gị otú ahụ, cheta na Jehova agbanwebeghị. (Jems 1:17) Jehova ka na-anọnyere ndị niile na-efe ya na ndị na-agbasi mbọ ike ka ha na-eme ihe dị ya mma. Ọ na-agọzi ha mmaji kwuru mmaji, ọ ga-agọzikwa gị.

Baịbụl gwara anyị na Josef ji nke nta nke nta na-aghọ dimkpa. Baịbụl sịrị na mgbe ọ ghọrọ dimkpa, ọ mara “mma n’ahụ́, maakwa mma ile anya.” Ihe a Baịbụl kwuru gosiri na agwọ nọzi n’akịrịka n’ihi na mmadụ ịma mma elu ahụ́ na-emekarị ka ndị mmadụ na-enwe mmasị n’ebe ọ nọ, ma ọ̀ chọrọ ya ma ọ bụ na ọ chọghị ya.

Nwunye Pọtịfa bidoro ịnwụrụ Josef

“Ọ DỊGHỊ MGBE O GERE YA NTỊ”

Josef ma na nwaanyị lụrụ di ekwesịghị ịgba n’èzí, ma nwunye Pọtịfa achọdịghị ịma. Baịbụl gwara anyị na ‘nwunye nna ukwu Josef malitere ile Josef anya wee na-asị: “Ka mụ na gị dinaa.”’ (Jenesis 39:7) Josef ò kwetara ka ya na nwunye nna ya ukwu, bụ́ nwaanyị na-ekpere arụsị, dinaa? E nweghị ihe Baịbụl kwuru mere anyị ga-eji chewe na o nwetụghị mgbe agụụ mmekọahụ na-agụ ụmụ okorobịa gụrụ Josef ma ọ bụkwanụ na nwunye Pọtịfa, bụ́ nwaanyị di ya na-eleta anya ọfụma, abụghị asampete. Josef ọ̀ malitere iche na nna ya ukwu agaghị amata ma ọ bụrụ na ya na nwunye ya edinaa? Ò chewere ihe ndị ọ ga na-enweta ma ọ bụrụ na o kweta ihe nwaanyị ahụ kwuru?

N’eziokwu, anyị enweghị ike ịmatacha ihe niile Josef chere n’obi ya. Ma, ihe ọ zara nwaanyị ahụ  mere ka anyị mata ihe dị ya n’obi. Ọ zara ya, sị: “Lee, nna m ukwu amaghị ihe dị n’aka m n’ụlọ a, o nyefewokwa m ihe niile o nwere. Ọ dịghị onye dị ukwuu n’ụlọ a karịa m, ọ dịghịkwa ihe ọ bụla o gbochiri m inweta ma e wezụga gị, n’ihi na ị bụ nwunye ya. Olee otú m ga-esi mee oké ihe ọjọọ a wee mehie Chineke?” (Jenesis 39:8, 9) Were ya na ị na-ahụ Josef ka ọ katara obi na-agwa nwaanyị ahụ ihe a. Ọ chọdịghị iji ntị anụ ihe a nwaanyị a chọrọ ka o mee ma ya fọdụzie ime ya eme. Gịnị kpatara ya?

Ihe kpatara ya bụ na Pọtịfa nna ya ukwu tụkwasịrị ya obi. Ọ bụ ya mere o ji nyefee ihe niile dị n’ezinụlọ ya n’aka Josef, ma e wezụga nwunye ya. Josef ọ̀ ga-anwa anwa ghọọ nwoke a tụkwasịrị ya obi aghụghọ? Tụfịakwa! Ime ụdị ihe ahụ adịtụdịghị ya mma. Ma, ihe mere ọ na-agaghị anwa anwa mee ya bụ na ime ihe ahụ bụ imehie megide Chineke ya, bụ́ Jehova. Josef mụtara ọtụtụ ihe n’aka nne na nna ya banyere otú Chineke chọrọ ka di na nwunye si na-ebi, mụtakwa na Chineke achọghị ka di ma ọ bụ nwunye ghọọ ibe ya aghụghọ. Ọ bụ Jehova jikọtara di na nwunye mbụ. O kwukwara otú ọ chọrọ ka di na nwunye si na-ebi. Ọ chọrọ ka di na nwunye rapara n’ahụ́ ibe ha ma ghọọ “otu anụ ahụ́.” (Jenesis 2:24) Chineke na-ewesa ndị mmadụ iwe ma ha nwaa itisa di na nwunye. Dị ka ihe atụ, e nwere mgbe otu nwoke chọwara idina nwunye Ebreham, bụ́ nne ochie Josef, nweekwa mgbe otu nwoke ọzọ chọrọ idina nwunye Aịzik, bụ́ nne nne Josef. Ọ fọrọ obere ka Chineke mee ka nnukwu nsogbu dakwasị ụmụ nwoke ndị ahụ. (Jenesis 20:1-3; 26:7-11) Josef mụtara ihe n’ihe ahụ merenụ, ọ chọghịkwa ime ihe ahụ ụmụ nwoke ahụ nwara ime.

Obi adịghị nwunye Pọtịfa mma mgbe ọ nụrụ ihe ahụ Josef gwara ya. Ọ ga-abụ na ọ nọ na-ekwu n’obi ya na oleekwanụ otú ohu na-enweghị uru ọ bara ga-eji sị ya mba, nọrọkwa n’elu ya kwuo na ihe ọ chọrọ ka ya na ya mee bụ “oké ihe ọjọọ.” Ma, ike agwụghị nwunye Pọtịfa. O nwere ike ịbụ na o chere na ọ ga-abụrụ ya mkparị ma ọ bụrụ na o nwetaghị Josef. N’ihi ya, o kpebisiri ike na ọ ga-enweta ya. Nwaanyị ahụ kpaziri àgwà otú Setan mechara kpaa mgbe ọ nwara Jizọs. Mgbe Setan nwachara Jizọs ma kụọ afọ n’ala, kama ịhapụchazi Jizọs, o cheere “oge ọzọ ga-adaba adaba.” (Luk 4:13) Ọ bụ ya mere ndị na-efe Chineke ji kwesị ịgbasi ụkwụ n’ala ike ma kpebisie ike na ha agaghị eme ihe na-adịghị Chineke mma. Ọ bụkwa otú ahụ ka Josef mere. Ọ bụ eziokwu na nwaanyị ahụ nọ na-enye ya nsogbu “site n’ụbọchị ruo n’ụbọchị,” Josef achọdịghị ịma. Baịbụl kwuru na “ọ dịghị mgbe o gere ya ntị.” (Jenesis 39:10) Ma, nwunye Pọtịfa fooro ntutu taa na ya ga-enwetarịrị Josef.

Ọ chọtara oge ọ ma na ndị niile na-eje ozi n’ụlọ ha agaghị anọ. Ma, ọ ma na Josef ga-abata n’ụlọ ka ọ rụọ ọrụ ya. Mgbe Josef batara, nwunye Pọtịfa gbalịrị ka o nweta ya. O jidere Josef n’uwe ma rịọ ya ọzọ ‘ka ya na ya dinaa.’ Josef zọwara isi onwe ya ozugbo. Ma, nwaanyị ahụ jidesiri uwe ya ike. Josef jisiri ike gbụrụ onwe ya ma hapụrụ ya uwe ya rie mbọ mbọ.—Jenesis 39:11, 12.

Ihe a Josef mere chetaara anyị ndụmọdụ Pọl onyeozi si n’ike mmụọ nsọ nye Ndị Kraịst. Ọ sịrị: “Gbaaranụ ịkwa iko ọsọ.” (1 Ndị Kọrịnt 6:18) Ihe a Josef mere bụ ihe Ndị Kraịst niile kwesịrị ịna-eme. O nwere ike ịdabara anyị na anyị na ndị na-ejighị iwu Chineke kpọrọ ihe ga-anọ nso mgbe ụfọdụ. Ma nke a apụtaghị na anyị kwesịrị ikwe ka ha mee ka anyị mebie iwu Chineke. Ihe ọ sọkwara ndị mmadụ mee anyị, anyị kwesịrị ịgbara mmehie ọsọ.

Ọsọ ahụ Josef gbara kpataara ya nsogbu. Nwunye Pọtịfa kpebiri na ya ga-emesi Josef ike. Ozugbo Josef gbapụrụ, nwaanyị ahụ bidoro iti mkpu, nke mere ka ndị ọzọ na-eje ozi gbakọta. Ọ gwara ha na Josef chọrọ idina ya n’ike, ma mgbe ya tiri mkpu, Josef hapụrụ ya gbapụ. Nwunye Pọtịfa dowere uwe Josef, chere mgbe di ya ga-alọta. Mgbe di ya lọtara, ọ ghaara ya ụgha otú ọ ghaara ndị na-eje ozi n’ụlọ ahụ. Otú o si ghaa ụgha ahụ mere ka di ya chee na ọ bụ yanwa bụ́ Pọtịfa kpatara nsogbu ahụ ebe ọ bụ ya kpọbatara onye mba ọzọ n’ụlọ ha. Gịnị ka Pọtịfa mere? Baịbụl kwuru, sị: “Iwe ya wee dị ọkụ.” Ọ kpọọrọ Josef tụba n’ụlọ mkpọrọ.—Jenesis 39:13-20.

“HA TỤRỤ YA ỊGÀ N’ỤKWỤ”

Anyị amachaghị otú ụlọ mkpọrọ ndị Ijipt na-adị n’oge ahụ. Ndị na-amụ banyere ihe ndị mgbe ochie hụrụ nnukwu ụlọ ndị dakasịrịla adakasị bụ́ ndị ụlọ mkpọrọ na olulu ndị a na-atụba ndị mkpọrọ dị na ha. Mgbe Josef mechara na-akọwa ihe mere e ji tụọ ya mkpọrọ, ihe ọ kpọrọ ebe ahụ a tụbara ya pụtara  “olulu.” Nke a gosiri na ụlọ mkpọrọ ahụ gbara ọchịchịrị, onye a tụbara na ya agaghịkwa enwe olileanya na ya ga-apụta. (Jenesis 40:15) Akwụkwọ Abụ Ọma mere ka anyị mata na a takwuru Josef ahụhụ. Ọ sịrị: “Ha tụrụ ya ịgà n’ụkwụ, keekwa mkpụrụ obi ya agbụ ígwè.” (Abụ Ọma 105:17, 18) Mgbe ụfọdụ, ndị Ijipt na-achịfe ndị mkpọrọ aka n’azụ ma were ihe kegide ha n’aka. E nwekwara ndị nke na-ekegide ndị ha tụrụ mkpọrọ agbụ ígwè n’olu. O doro anya na Josef tara ezigbo ahụhụ n’ụlọ mkpọrọ ahụ n’agbanyeghị na aka ya dị ọcha.

Ihe ọzọ bụ na ahụhụ Josef tara n’ụlọ mkpọrọ ahụ ebighị ngwa ngwa. Baịbụl kwuru, sị: “O wee nọrọ n’ebe ahụ, n’ụlọ mkpọrọ.” Josef nọrọ ọtụtụ afọ n’ụlọ mkpọrọ ahụ. * Ọ maghịdị ma ọ̀ ga-emecha si n’ebe ahụ pụta. Mgbe ọ nọrọla ọtụtụ ọnwa n’ụlọ mkpọrọ ahụ, olee ihe nyeere ya aka ka obi ghara ịda ya mba ma ọ bụ ka ike ụwa ghara ịgwụ ya?

Baịbụl sịrị na “Jehova nọnyeere Josef wee na-egosi ya obiọma.” (Jenesis 39:21) E nweghị mgbidi dị n’ụlọ mkpọrọ, agbụ ígwè, ma ọ bụ olulu gbara ọchịchịrị nke nwere ike ime ka Jehova ghara igosi ndị na-efe ya na ọ hụrụ ha n’anya. (Ndị Rom 8:38, 39) Weregodị ya na ị na-ahụ Josef ka ọ na-ekpegara Nna ya nke bi n’eluigwe ekpere na-agwa ya otú obi dị ya, gị ahụzie otú obi dị ya mgbe “Chineke nke nkasi obi niile” mere ka ahụ́ ruo ya ala. (2 Ndị Kọrịnt 1:3, 4; Ndị Filipaị 4:6, 7) Olee ihe ọzọ Jehova meere Josef? Baịbụl gwakwara anyị na o mere ‘ka ihe Josef na-amasị onyeisi na-elekọta ụlọ mkpọrọ ahụ.’

Ọ ga-abụ na e nwere ọrụ a na-enye ndị mkpọrọ ka ha na-arụ. Josef rụkwara ọrụ e nyere ya otú ga-eme ka Jehova gọzie ya. O jighị ọrụ ya egwu egwu, kama ọ na-eji obi ya niile arụ ọrụ ọ bụla e nyere ya ma hapụzie Jehova ka ọ gọzie mbọ niile ọ na-agba. Jehova gọzikwara Josef, nke mere ka onyeisi ụlọ mkpọrọ ahụ jiri ya kpọrọ ihe ma tụkwasị ya obi. Baịbụl kwuru, sị: “Onyeisi na-elekọta ụlọ mkpọrọ ahụ wee nyefee ndị mkpọrọ niile nọ n’ụlọ mkpọrọ ahụ n’aka Josef; ọ bụkwa ya na-ahụ na ha mere ihe niile ha nwere ime n’ebe ahụ. Ọ dịghị ihe ọ bụla ma ọlị dị n’aka onyeisi na-elekọta ụlọ mkpọrọ ahụ nke ya onwe ya na-ahụ maka ya, n’ihi na Jehova nọnyeere Josef, Jehova na-emekwa ka ihe ọ na-eme na-aga nke ọma.” (Jenesis 39:22, 23) N’eziokwu, obi tọrọ Josef ụtọ mgbe ọ hụrụ otú Jehova si na-anọnyere ya.

Josef rụsiri ọrụ ike n’ụlọ mkpọrọ, Jehova gọzikwara ya

Mgbe ụfọdụ, nsogbu nwere ike si n’elu si n’ala na-abịara anyị. Ndị mmadụ nwekwara ike ịna-emegbu anyị. Ọ bụrụ na ụdị ihe a emee anyị, okwukwe Josef nwere ike ịkụziri anyị ihe. Ọ bụrụ na anyị ana-ekpegara Jehova ekpere, na-erubere iwu ya isi ma gbalịsie ike na-eme ihe dị ya mma, ọ ga na-agọzi anyị. N’isiokwu ndị ọzọ anyị ga-ebipụta gbasara Josef, anyị ga-ahụ otú Jehova si gọzikwuo Josef.

^ para. 23 Ihe Baịbụl kwuru gosiri na Josef dị afọ iri na asaa ma ọ bụ iri na asatọ mgbe ọ malitere ịgbara Pọtịfa ohu, ọ ga-abụkwa na ọ nọrọ afọ ole na ole n’ụlọ Pọtịfa ruo mgbe o tojuru okorobịa. Ọ bụzi mgbe ọ gbara afọ iri atọ ka e si n’ụlọ mkpọrọ kpọpụta ya.—Jenesis 37:2; 39:6; 41:46.

GỤKWUO GBASARA YA

Ị̀ Ga-atụkwasị Chineke Obi?

Ị ga-ahụ otú obi ga-esi adị gị ụtọ ma ị mata na Chineke bụ ezigbo enyi ị ga-atụkwasịli obi.