Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

ỤLỌ NCHE ỌKTOBA 2014

 ISIOKWU ỤLỌ NCHE A | OLEE URU ALAEZE CHINEKE GA-ABARA GỊ?

Ihe Mere Jizọs Ji Jiri Alaeze Chineke Kpọrọ Ihe

Ihe Mere Jizọs Ji Jiri Alaeze Chineke Kpọrọ Ihe

Mgbe Jizọs nọ n’ụwa, ọ kụziiri ndị mmadụ ọtụtụ ihe. Dị ka ihe atụ, ọ kụziiri ndị na-eso ụzọ ya otú ha ga-esi na-ekpe ekpere, ihe ha ga-eme ka obi dị Chineke mma, nakwa ihe ha ga-eme ka ha na-enwe obi ụtọ. (Matiu 6:5-13; Mak 12:17; Luk 11:28) Ma, ihe Jizọs kacha kụziere ndị mmadụ bụ gbasara Alaeze Chineke n’ihi na ikwu gbasara Alaeze ahụ na-atọ ya ezigbo ụtọ.—Luk 6:45.

Isiokwu bu nke a ụzọ gosiri na mgbe Jizọs nọ n’ụwa, ọ nọ “na-ekwusa ma na-ezisa ozi ọma alaeze Chineke.” Ọ bụ ọrụ a kacha mkpa ná ndụ ya. (Luk 8:1) O ji ụkwụ gaa ebe dị iche iche n’ala Izrel ka o nwee ike ịkụziri ndị mmadụ gbasara Alaeze Chineke. E dere otú Jizọs si gaa ozi ọma n’ụwa n’akwụkwọ Matiu, Mak, Luk, na Jọn. E dekwara okwu bụ́ Alaeze ihe karịrị otu narị ugboro n’akwụkwọ anọ ahụ. Ọ bụ Jizọs kwuru gbasara Alaeze n’ọtụtụ ebe e dere ya n’akwụkwọ ndị ahụ. Ma, o doro anya na ọ bụghị naanị ugboro ole ahụ e dere Alaeze Chineke n’akwụkwọ Matiu, Mak, Luk, na Jọn ka o kwuru gbasara ya.—Jọn 21:25.

Gịnị mere Jizọs ji jiri Alaeze ahụ kpọrọ ihe mgbe ọ nọ n’ụwa? Otu ihe kpatara ya bụ na Jizọs ma na Chineke ahọpụtala ya ka ọ bụrụ Eze n’Alaeze ahụ. (Aịzaya 9:6; Luk 22:28-30) Ma, ihe dị Jizọs mkpa abụghị ka e mee ya eze ma ọ bụ ka ọ ghọọ onye ukwu. (Matiu 11:29; Mak 10:17, 18) Ihe mere Jizọs ji jiri Alaeze ahụ kpọrọ ihe abụghị na o nwere ihe ọ chọrọ inweta. Isi ihe kpatara ya bụ ihe Alaeze * ahụ ga-emere ndị ọ hụrụ n’anya, ya bụ, Nna ya nke eluigwe na ezigbo ndị na-eso ụzọ ya.

IHE ALAEZE AHỤ GA-EMERE NNA JIZỌS

Jizọs hụrụ Nna ya nke eluigwe n’anya nke ukwuu. (Ilu 8:30; Jọn 14:31) Àgwà ọma ndị Nna ya nwere, ndị dị ka ịhụnanya, ọmịiko, na ikpe ziri ezi, masịrị ya. (Diuterọnọmi 32:4; Aịzaya 49:15; 1 Jọn 4:8) Nke a gosiri na ebubo ndị mmadụ na-ebo Chineke na-ewute Jizọs. Dị ka ihe atụ, ụfọdụ na-ekwu na ahụhụ ndị mmadụ na-ata anaghị ewute Chineke nakwa na Chineke chọrọ ka anyị na-atagbu onwe anyị n’ahụhụ. Ihe a so n’ihe mere Jizọs ji ‘kwusasie ozi ọma Alaeze ahụ’ ike. Ọ ma na ọ bụ Alaeze ahụ ga-eme ka o doo onye ọ bụla anya na ebubo ndị a na-ebo Nna ya bụ ụgha. (Matiu 4:23; 6:9, 10) Olee otú Alaeze ahụ ga-esi eme ya?

Jehova ga-eji Alaeze ahụ gbanwee ọtụtụ ihe n’ụwa. Ihe ndị ọ ga-agbanwe ga-abara ụmụ mmadụ uru. ‘Ọ ga-ehichapụ anya mmiri niile’ n’anya ndị ezi omume. Jehova ga-ewepụ ihe niile na-akpatara ha anya mmiri, ọ ga-emekwa ka ‘ọnwụ gharazie ịdị, iru uju ma ọ bụ mkpu ákwá ma ọ bụ ihe mgbu agaghịkwa adị ọzọ.’ (Mkpughe 21:3, 4) Chineke ga-eji Alaeze ahụ wepụ ahụhụ niile ụmụ mmadụ na-ata. *

 Ka a sịkwa ihe mere Jizọs ji jiri obi ya niile na-akọrọ ndị mmadụ banyere Alaeze ahụ. Ọ ma na Alaeze ahụ ga-eme ka ndị mmadụ mata na Nna ya dị ike ma nwee ọmịiko otú na-enweghị atụ. (Jems 5:11) Jizọs makwa na Alaeze ahụ ga-abara ndị mmadụ uru, ya bụ, ndị na-erubere Chineke isi.

IHE ALAEZE AHỤ GA-EMERE NDỊ EZI OMUME

Jizọs na Nna ya biri n’eluigwe ogologo oge tupu Jizọs abịa n’ụwa. Jehova si n’aka Ọkpara ya kee ihe niile dị adị, ma eluigwe ma ụyọkọ kpakpando a na-enweghị ike ịgụta ọnụ. O sikwa n’aka ya kee ụwa anyị a mara mma na ụmụ anụmanụ na nnụnụ ndị dị n’ime ya. (Ndị Kọlọsi 1:15, 16) N’ime ihe niile a e kere eke, ihe kacha eme Jizọs “obi ụtọ” bụ ụmụ mmadụ.—Ilu 8:31.

Otú Jizọs si kwusaa ozi ọma gosiri na ọ hụrụ ụmụ mmadụ n’anya. Mgbe ọ malitere ozi ya, o kwuru hoo haa na ihe mere o ji bịa n’ụwa bụ ka o ‘zie ndị mmadụ ozi ọma.’ (Luk 4:18) Ma ọ bụghị naanị ozi ọma ka Jizọs ziri ndị mmadụ. O mere ọtụtụ ihe gosiri na ọ hụrụ ụmụ mmadụ n’anya. Dị ka ihe atụ, mgbe oké ìgwè mmadụ zukọrọ na-ege ya ntị, Jizọs nwere “ọmịiko n’ebe ha nọ, o wee gwọọ ndị ha na-arịa ọrịa.” (Matiu 14:14) Mgbe otu nwoke na-arịa ajọ ọrịa gosiri na ya nwere okwukwe na Jizọs ga-agwọli ya ma ọ bụrụhaala na Jizọs chọrọ ịgwọ ya, ọnọdụ ya metụrụ Jizọs n’ahụ́. Jizọs gwara ya, sị: “Achọrọ m. Dị ọcha,” ọ gwọkwara ya. (Luk 5:12, 13) Mgbe Jizọs hụrụ Meri enyi ya ka ọ na-eru uju n’ihi ọnwụ nwanne ya nwoke bụ́ Lazarọs, Jizọs “sụrụ ude n’ime mmụọ ya, o nyekwara ya nsogbu.” Baịbụl kwukwara na “anya mmiri gbara” Jizọs. (Jọn 11:32-36) Jizọs meziri ihe ndị mmadụ na-atụdịghị anya ya. O mere ka Lazarọs si n’ọnwụ bilie n’agbanyeghị na o ruola abalị anọ ọ nwụrụ.—Jọn 11:38-44.

Ma, Jizọs ma na ihe ọma ndị ahụ o meere ndị mmadụ agaghị adịte aka. Ọ makwa na ndị niile ọ gwọrọ na ndị niile ọ kpọlitere n’ọnwụ ga-emecha rịawa ọrịa ma nwụọ. Ma, o doro Jizọs anya na Alaeze Chineke ga-eme ka nsogbu niile ahụ kwụsị. Ọ bụ ya mere na ọ bụghị naanị ọrụ ebube ka ọ rụrụ, kama o ji obi ya niile kwusaa “ozi ọma alaeze ahụ.” (Matiu 9:35) Ọrụ ebube ndị ahụ gosiri anyị ihe Alaeze Chineke ga-eme n’ụwa niile n’oge na-adịghị anya. Ka anyị leba anya n’ihe Baịbụl kwuru ga-eme n’oge ahụ.

  •  Ọrịa agaghịzi adị.

    “Mgbe ahụ ka a ga-emeghe anya ndị ìsì, a ga-emeghekwa ntị nke ndị ntị chiri. Mgbe ahụ ka onye ngwọrọ ga-awụli elu dị ka oké ele, ire onye ogbi ga-etikwa mkpu ọṅụ.” Ihe ọzọ bụ na ọ dịghị onye bi n’ụwa n’oge ahụ “nke ga-asị: ‘Ana m arịa ọrịa.’”—Aịzaya 33:24; 35:5, 6.

  • Ọnwụ agaghịzi adị.

    “Ndị ezi omume ga-enweta ụwa, ha ga-ebikwa n’elu ya ruo mgbe ebighị ebi.”Abụ Ọma 37:29.

    “Ọ ga-eloda ọnwụ ruo mgbe ebighị ebi, Ọkaakaa Onyenwe anyị Jehova ga-ehichapụkwa anya mmiri n’ihu niile.”—Aịzaya 25:8.

  • A ga-akpọlite ndị nwụrụ anwụ n’ọnwụ.

    “Ndị niile nọ n’ili ncheta ga-anụ olu ya wee pụta.”—Jọn 5:28, 29.

    “A gaje inwe mbilite n’ọnwụ.”—Ọrụ Ndịozi 24:15.

  • Onye ọ bụla ga-enwe ụlọ nke ya, nweekwa ọrụ ọ ga na-arụ.

    “Ha ga-ewu ụlọ, biri n’ime ha; ha ga-akọkwa ubi vaịn, rie mkpụrụ ha. Ha agaghị ewu ụlọ, onye ọzọ ebichie ya; ha agaghị akụ mkpụrụ, onye ọzọ erie ya. . . . Ndị m họọrọ ga-eji ihe aka ha rụpụtara mee ihe n’uju.”—Aịzaya 65:21, 22.

  •  Agha agaghịzi adị.

    “Ọ na-eme ka agha kwụsị ruo na nsọtụ ụwa.”—Abụ Ọma 46:9.

    “Mba agaghị ebuli mma agha buso mba ọzọ agha, ha agaghị amụkwa otú e si alụ agha.”—Aịzaya 2:4.

  • Ụkọ nri agaghịzi adị.

    “Ala ga-emepụta ihe nke ọma; Chineke bụ́ Chineke anyị ga-agọzi anyị.”—Abụ Ọma 67:6.

    “Ọka ga-ejupụta n’elu ụwa; ọ ga-ejubiga ókè n’elu ugwu dị iche iche.”—Abụ Ọma 72:16.

  • Ndị mmadụ agaghịzi ada ogbenye.

    “Ọ bụghị mgbe niile ka a ga-echefu ogbenye.”—Abụ Ọma 9:18.

    “Ọ ga-anapụta ogbenye nke na-eti mkpu enyemaka, nakwa onye nọ n’ahụhụ na onye ọ bụla na-enweghị onye na-enyere ya aka. Ọ ga-emere onye ọ na-enweghị ka ọ hà ya na ogbenye ebere, ọ ga-azọpụtakwa mkpụrụ obi ndị ogbenye.”—Abụ Ọma 72:12, 13.

Mgbe ị na-echebara ihe ọma ndị a Alaeze Chineke ga-emere ụmụ mmadụ echiche, ị̀ chọpụtara ihe mere Jizọs ji jiri Alaeze ahụ kpọrọ ihe? Mgbe ọ nọ n’ụwa, ọ na-eji obi ya niile agwa onye ọ bụla chọrọ ige ya ntị banyere Alaeze ahụ n’ihi na ọ ma na ọ bụ Alaeze ahụ ga-eme ka nsogbu niile anyị nwere taa kwụsị.

Ihe ọma ndị a Baịbụl kwuru na Alaeze Chineke ga-emere ụmụ mmadụ hà dị gị mma? Ya bụrụ otú ahụ, olee otú ị ga-esi mụtakwuo banyere Alaeze ahụ? Oleekwa ihe ị ga-eme ka Alaeze ahụ baara gị uru? Isiokwu na-eso nke a ga-aza ajụjụ ndị a.

^ para. 5 Jizọs nọzi n’eluigwe. O doro anya na kemgbe ọ laghachiri n’eluigwe, ọ ka ji Alaeze ahụ kpọrọ ihe.—Luk 24:51.

^ para. 8 Ị chọọ ịmatakwu ihe mere Chineke ji hapụgodị ụmụ mmadụ ka ha na-ata ahụhụ, gụọ isi nke 11 n’akwụkwọ bụ́ Gịnị n’Ezie Ka Bible Na-akụzi? Ọ bụ Ndịàmà Jehova bipụtara ya.

GỤKWUO GBASARA YA

Gịnị Mere Chineke Ji Kwe Ka Ihe Ọjọọ na Ahụhụ Dịrị?

Olee otú ihe ọjọọ si malite, gịnị mere Chineke ji gbachi nkịtị ka ụmụ mmadụ na-ata ahụhụ ruo ugbu a? È nwere mgbe ahụhụ ga-akwụsị?