Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

ỤLỌ NCHE ỌKTOBA 2014

 BAỊBỤL NA-AGBANWE NDỤ NDỊ MMADỤ

Ihe M Na-eche Mgbe Niile Bụ Gbasara Onwe M

Ihe M Na-eche Mgbe Niile Bụ Gbasara Onwe M
  • A MỤRỤ M N’AFỌ: 1951

  • ABỤ M ONYE: JAMANỊ

  • NDỤ M BIRI: ABỤ M EZE ONYE AGWALA M

NDỤ M BIRI NA MBỤ:

Mgbe m bụ nwata, ndị ezinụlọ anyị bi n’ebe dị nso n’obodo Laịpsig, nke dị na Ist Jamanị. Ebe ahụ dị nso n’ókè mba Chek na mba Poland. Mgbe m dị afọ isii, ọrụ papa m na-arụ mere ka ọ kpọrọ ezinụlọ anyị gaa biri na Brazil. Anyị mechara si na Brazil kwaga Ekwedọ.

N’oge m dị afọ iri na anọ, e tinyere m n’ụlọ akwụkwọ a na-ebi ebi nke dị na Jamanị. Ebe ọ bụ na papa m na mama m ebighị nso, ọ bụzi m na-elekọta onwe m. Ihe a mere ka ọ bụrụ m na-atụrụ onwe m ụka. Anaghịkwa m achọ ịma ma ihe m na-eme ọ̀ dịkwa ndị ọzọ mma.

Mgbe m dị afọ iri na asaa, ndị mụrụ m lọtara Jamanị. Mgbe ha lọtara, mụ na ha bitụrụ. Ma ebe ọ bụ na mụ aghọọla eze onye agwala m, ọ dịghịrị m mfe ịnọ n’okpuru ha. N’ihi ya, m kwapụrụ n’ụlọ anyị mgbe m dị afọ iri na asatọ.

Ahụ́ na-agbakasị m mgbe niile n’ihi na amaghị m ihe m ga-eji ndụ m mee emee. Mgbe m lechara ihe ndị mmadụ ji ndụ ha na-eme na ihe òtù dị iche iche na-eme, obi m gwara m na ihe kacha mma m ga-eji ndụ m mee bụ ịga ebe dị iche iche n’ụwa na-ekiri ihe ndị mara mma dị na ya tupu ndị mmadụ ebibie ya.

M hapụrụ Jamanị, zụta ọgba tum tum, ma buru ya gawa Afrịka. O teghị aka mụ alaghachi Yurop ka m nwee ike rụzie ọgba tum tum ahụ. Obere oge m laghachiri Yurop, m gara n’akụkụ otu osimiri dị na Pọtugal. M kpebiri na m ga-ahapụ ọgba tum tum ahụ chọta ụgbọ mmiri m ga na-eji aga ebe ọ bụla m chọrọ ịga.

Ahụrụ m ụmụ okoro na agbọghọ chọrọ iji ụgbọ mmiri gafee Oké Osimiri Atlantik, mụ esoro ha. Aha otu n’ime ha bụ Laurie. Ọ bụ ya ka m mechara lụọ. Ebe ndị anyị bu ụzọ gaa bụ obodo ndị osimiri Karịbian gbara gburugburu. Mgbe anyị nọrọ obere oge na Puweto Riko, anyị laghachiri Yurop. Anyị bu n’obi na anyị ga-enweta ụgbọ mmiri anyị ga-arụgharị ma jiri ya mere ụlọ. Ma mgbe anyị chọrọ ụgbọ mmiri ọnwa atọ, anyị kwụsịziri ịchọ n’ihi na gọọmenti Jamanị kpọrọ m mgbe ahụ ka m ghọọ onye amị.

M so ndị agha ụgbọ mmiri Jamanị rụọ ọrụ otu afọ na ọnwa atọ. N’oge ahụ, mụ na Laurie lụrụ, anyị kpebikwara na ihe anyị ga-eji ndụ anyị mee bụ ịga ebe dị iche iche n’ụwa na-elegharị  anya. Mụ na ya zụrụ otu okpokoro ụgbọ mmiri obere oge tupu mụ aghọọ onye amị. N’oge ahụ m bụ onye amị, anyị ji nke nta nke nta rụzigharịa ụgbọ mmiri ahụ. Anyị bu n’obi na anyị ga-ebi na ya ma jiri ya na-aga elegharị anya n’ebe dị iche iche n’ọmarịcha ụwa anyị a. Ọ bụ mgbe m si amị pụta ka anyị na Ndịàmà Jehova hụrụ, ha ebido ịkụziri anyị Baịbụl. Anyị arụzichabeghị ụgbọ mmiri ahụ mgbe ahụ.

OTÚ BAỊBỤL SI GBANWEE NDỤ M:

E nwetụdịghị mgbe m chere na o nwere oké ihe m kwesịrị ịgbanwe ná ndụ m. Alụrụ m nwaanyị mụ na ya bi alụ, akwụsịkwala m ịṅụ sịga. (Ndị Efesọs 5:5) Echere m na o nweghị ihe ka mma mụ na nwunye m ga-eji ndụ anyị mee ma ọ́ bụghị ịna-aga ebe dị iche iche na-ekiri ọmarịcha ihe ndị Chineke kere.

Ma n’eziokwu, e nwere ihe ndị m kwesịrị ịgbanwe ná ndụ m, karịchaa otú m si akpa àgwà. Ebe m dị mpako ma bụrụ eze onye agwala m, ebe uche m na-adị mgbe niile bụ n’ihe ndị m merela ná ndụ na ihe ndị m ga-emeli. Ihe m na-eche mgbe niile bụ gbasara onwe m.

Otu ụbọchị, agụrụ m ihe Jizọs kụziri mgbe ọ nọ n’elu ugwu. (Matiu, isi nke 5-7) Ná mmalite, ihe Jizọs kwuru ga-eme ka mmadụ na-enwe obi ụtọ gbagwojuru m anya. Dị ka ihe atụ, ọ sịrị na obi ụtọ na-adịrị ndị agụụ na-agụ na ndị akpịrị na-akpọ nkụ. (Matiu 5:6) O juru m anya otú onye ihe siiri ike ga-esi na-enwe obi ụtọ. Ka m nọ na-amụkwu Baịbụl, m ghọtara na mmadụ niile kwesịrị ife Chineke. Ma, tupu anyị efewe ya, anyị kwesịrị iwetu onwe anyị ala ma kweta na ọ bụ ihe anyị kwesịrị ime. Ọ bụ ya mere Jizọs ji sị: “Obi ụtọ na-adịrị ndị maara mkpa ime mmụọ ha.”—Matiu 5:3.

Obere oge mụ na nwunye m Laurie bidoro ịmụ Baịbụl na Jamanị, anyị kwagara Frans, mechaakwa kwaga Ịtali. Ebe ọ bụla anyị kwagara, anyị na-ahụ Ndịàmà Jehova. Otú ha si hụ ibe ha n’anya na otú ha si dịrị n’otu masịrị m. Achọpụtakwara m na Ndịàmà Jehova nọ n’ebe niile n’ụwa. (Jọn 13:34, 35) E mechara mee mụ na nwunye m baptizim, anyị abụrụ Ndịàmà Jehova.

Mgbe e mechara anyị baptizim, m ka nọ na-agbalị ka m gbanwee àgwà m. Mụ na nwunye m kpebiri na anyị ga-eji ụgbọ mmiri anyị gaa Afrịka, si n’Afrịka banye n’Oké Osimiri Atlantik, sizie ya banye n’Amerịka. Ọ bụ mgbe anyị abụọ nọ n’obere ụgbọ anyị ahụ na-agba n’oké osimiri ka m ghọtara na o nweghịdị ihe m bụ ma e jiri m tụnyere Onye kere ụwa. Ebe ọ na-enweghị oké ihe m na-eme mgbe ahụ, eji m ohere ahụ gụwa Baịbụl. N’ihe niile m gụrụ, ihe kacha ruo m n’obi bụ otú Jizọs si bie ndụ n’ụwa. Ọ bụ nwoke zuru okè, nke mere ọtụtụ ihe dị ịtụnanya. Ma, o bulighị onwe ya elu. O jighịkwa ndụ ya mee ihe dị ya mma, kama o ji ya mee ihe dị Nna ya nke eluigwe mma.

M ghọtara na ọ bụ ịchọ Alaeze Chineke kwesịrị ịbụ ihe mbụ ná ndụ m

Ka m nọ na-echebara otú Jizọs si bie ndụ echiche, m ghọtara na ọ bụ ịchọ Alaeze Chineke kwesịrị ịbụ ihe mbụ ná ndụ m, ọ bụghị ime ihe ọ bụla masịrị m. (Matiu 6:33) Mgbe mụ na nwunye m rutere Amerịka, anyị kpebiri ịnọrọzi ebe ahụ na-efe Jehova.

URU NDỊ M RITERELA:

Mgbe ahụ m bụ eze onye agwala m, ọ na-abụ m kpebie ihe m chọrọ ime, obi anaghị esi m ike ma ihe m kpebiri ime ọ̀ dịkwa mma. Ma ugbu a, enwetala m ihe na-enyere m aka ime mkpebi dị mma. (Aịzaya 48:17, 18) Ndụ m enweela isi ugbu a karịa otú ọ dị na mbụ n’ihi na ana m efe Chineke ma na-enyere ndị ọzọ aka ka ha mụta banyere ya.

Ime ihe Baịbụl kwuru emeela ka mụ na nwunye m Laurie na-ebi n’udo. Jehova jikwa otu ọmarịcha nwa nwaanyị gọzie anyị. Ọ matala onye Jehova bụ, ọ hụkwara ya n’anya.

N’eziokwu, ihe anaghị agara anyị siriri werere mgbe niile. Ma ebe ọ bụ na Jehova na-enyere anyị aka, anyị agaghị akwụsị ife ya na ịtụkwasị ya obi.—Ilu 3:5, 6.

GỤKWUO GBASARA YA

Gịnị Ga-eme Ka Obi Na-adị Ezinụlọ Ụtọ?

Jehova bụ onye obi ụtọ. Ọ chọrọ ka ezinụlọ na-enwe obi ụtọ. Gụọ ihe Baịbụl gwara ndị bụ́ di, ndị bụ́ nwunye, ndị nne na nna na ụmụaka.