Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

ỤLỌ NCHE ỌKTOBA 2014

 IHE ONYEÀMÀ JEHOVA NA ONYE AGBATA OBI YA KPARỊTARA

Olee Mgbe Alaeze Chineke Malitere Ịchị? (Agba nke Mbụ)

Olee Mgbe Alaeze Chineke Malitere Ịchị? (Agba nke Mbụ)

N’ebe a, e dere ihe Onyeàmà Jehova na onye agbata obi ya nwere ike ịkparịta. Ka anyị were ya na Onyeàmà Jehova aha ya bụ Kelvin gara n’ụlọ otu nwoke aha ya bụ Jon.

“NA-ACHỌ” NGHỌTA

Kelvin: Jon, obi dị m ụtọ na mụ na gị na-amụ Baịbụl. * N’oge gara aga anyị kwurịtara okwu, ị jụrụ m ihe mere Ndịàmà Jehova ji kwere na Alaeze Chineke malitere ịchị n’afọ 1914.

Jon: Ọọ eziokwu. E nwere otu akwụkwọ unu m gụrụ kwuru na Alaeze Chineke malitere ịchị n’afọ 1914. Achọrọ m ịma ihe mere unu ji kwuo ya, ebe ọ bụ na unu sị na ihe niile unu na-akụzi si na Baịbụl.

Kelvin: Ihe i kwuru bụ eziokwu. Ihe niile anyị na-akụzi si na Baịbụl.

Jon: Agụchaala m Baịbụl dum. Ma e nweghị ebe m hụrụ afọ 1914. M chọkwara ya na Baịbụl dị n’Ịntanet, ma ahụghị m ya.

Kelvin: Jon, ị gbalịala. E nwere ihe abụọ mere m ji aja gị mma. Nke mbụ bụ na ị gụchaala Baịbụl dum. Ihe a i mere gosiri na i ji Baịbụl kpọrọ ihe.

Jon: Eheenụ! O nweghị akwụkwọ dị ka Baịbụl.

Kelvin: Ihe i kwuru bụ eziokwu. Ihe ọzọ mere m ji aja gị mma bụ na ị gụrụ Baịbụl ka i nwee ike chọta azịza ajụjụ ndị i nwere. Ihe i mere bụ ihe Baịbụl sịrị ka anyị na-eme. Baịbụl gwara anyị ka anyị “na-achọ” nghọta. * Ọ dị mma na ị na-agba mbọ ka ị mata ihe Baịbụl kwuru.

Jon: I meela. M chọrọ ka m na-amụtakwu ihe. M mekwuru nchọnchọ ma chọpụta ihe ụfọdụ gbasara afọ 1914 n’akwụkwọ a anyị na-amụ. M gụtara nrọ otu Eze rọrọ. Ná nrọ ahụ, e gbuturu otu nnukwu osisi, osisi ahụ emechaakwa too.

Kelvin: Ee. Ihe a ị na-akọ dị na Daniel isi 4. Ọ bụ nrọ Nebukadneza Eze Babịlọn rọrọ.

Jon: I ji ya. Agụrụ m ya ugboro ugboro. Ma ịgwa gị eziokwu, ahụghị m otú ihe ahụ si gbasa Alaeze Chineke ma ọ bụ gbasa afọ 1914.

Kelvin: Ọ naghị adị mfe ịghọta ya. Daniel onye mmụọ nsọ nyeere aka ide amụma a aghọtachadịghị ihe ihe o dere pụtara.

Jon: Ị̀ sị na Daniel aghọtachaghị ihe o dere?

Kelvin: Ee. Leenụ ihe o kwuru na Daniel 12:8. Ọ sịrị: “Mụ onwe m nụrụ ma aghọtaghị m.”

Jon: Ọ pụtara na ọ bụghịdị naanị m ka ihe a gbagwojuru anya. Ahụ́ eruola m ala ugbu a m matara na ọ bụghị naanị m bụ onye na-aghọtaghị ya.

Kelvin: Ihe mere Daniel aghọtaghị ihe ndị dị n’amụma ahụ o dere bụ na oge erubeghị mgbe Chineke chọrọ ka ndị mmadụ ghọtachaa amụma niile dị n’akwụkwọ Daniel. Ọ bụ n’oge anyị a ka Chineke chọrọ ka anyị ghọta ha, ọ bụ ya mere anyị ji aghọta ha nke ọma.

 Jon: Gịnị mere i ji kwuo ihe a i kwuru?

Kelvin: Ka anyị gụọ ihe e kwuru na Daniel 12:9. Ọ sịrị: “E zochiwo okwu ndị a, mechiekwa ya ruo n’oge ikpeazụ.” Ihe e kwuru n’ebe a gosiri na ọ bụ “n’oge ikpeazụ” ka a ga-aghọta ihe amụma a pụtara. Ihe mụ na gị ka ga-amụ na Baịbụl ga-eme ka ị mata na e nwere ọtụtụ ihe gosiri na anyị bi n’oge ikpeazụ ugbu a. *

Jon: Ngwanụ, kọwaziere m ihe amụma Daniel ahụ pụtara.

Kelvin: Ka m gbalịanụ.

NRỌ NEBUKADNEZA

Kelvin: Ka m burugodị ụzọ kọọrọ gị ihe Nebukadneza rọrọ ná nrọ ahụ tupu anyị ekwuwe ihe ọ pụtara.

Jon: M na-ege ntị.

Kelvin: Ná nrọ ahụ, Nebukadneza hụrụ otu nnukwu osisi toruru n’eluigwe. Ọ nụkwara mgbe otu mmụọ ozi Chineke nyere iwu ka e gbutuo osisi ahụ ma hapụ úkwù ya. O kwukwara na osisi ahụ ga-epulite ọzọ mgbe “oge asaa” gachara. * Amụma a bu ụzọ mezuo n’isi Eze Nebukadneza. A ma eze a ama nke na e nwere ike iji ya tụnyere osisi ogo ya ruru eluigwe. Ma e gbuturu ya, ya anọọ “oge asaa.” Ì chetara ihe mere mgbe ahụ?

Jon: Mba, echetaghị m.

Kelvin: Nsogbu adịghị. Baịbụl gosiri na ara gbara Nebukadneza ruo afọ asaa zuru ezu. N’oge ahụ, o nweghịzi ike ịchị Babịlọn. Ma, mgbe oge asaa gachara, Nebukadneza matara onwe ya, malitekwa ịchị Babịlọn. *

Jon: M ghọtara ihe i kwuru. Ma, oleekwanụ ihe jikọrọ nrọ ahụ Nebukadneza rọrọ na Alaeze Chineke nakwa afọ 1914?

Kelvin: Amụma a ga-emezu ugboro abụọ. O bu ụzọ mezuo mgbe ahụ ọchịchị Nebukadneza kwụsịtụrụ. O mezuru nke ugboro abụọ ya mgbe ọchịchị Chineke kwụsịtụrụ ịchị n’ụwa. Ọ bụ mmezu ya nke abụọ gbasara Alaeze Chineke.

Jon: Olee otú i si mara na amụma a ga-emezu ugboro abụọ nakwa na nke abụọ ya gbasara Alaeze Chineke?

Kelvin: Ọ bụ ihe e kwuru na Daniel 4:17 mere anyị ji mata. Ebe ahụ sịrị: “ka ndị dị ndụ wee mara na Onye Kasị Elu bụ Onye Na-achị Achị n’alaeze ụmụ mmadụ, ọ bụkwa onye ọ chọrọ inye ya ka ọ na-enye ya.” Ị̀ hụrụ na ebe a kwuru “alaeze ụmụ mmadụ”?

Jon: Ọọ eziokwu. Ọ sịrị na “Onye Kasị Elu bụ Onye Na-achị Achị n’alaeze ụmụ mmadụ.”

Kelvin: I kwutere ya. Ònye ka i chere bụ́ “Onye Kasị Elu”?

Jon: Echere m na ọ bụ Chineke.

Kelvin: Gbam! Nke a gosiri na ọ bụghị naanị Nebukadneza ka amụma a gbasara. Kama, ọ gbasakwara “alaeze ụmụ mmadụ,” ya bụ, ọchịchị Chineke nke na-achị ụmụ mmadụ. Ị gụọ ihe e dere n’amaokwu ndị ọzọ dị n’akwụkwọ Daniel, ị ga-ahụ na ọ bụ eziokwu.

Jon: Aghọtachaghị m ihe ị na-ekwu.

ISIOKWU AKWỤKWỌ DANIEL

Kelvin: Ọ bụ otu isiokwu ka e kwuru ọtụtụ ugboro n’akwụkwọ Daniel. Isiokwu ahụ bụ otú Alaeze Chineke nke Jizọs ga-abụ eze ya ga-esi malite ịchị. Dị ka ihe atụ, ka anyị gụọ ihe e dere na Daniel isi nke 2. Biko, gụọ amaokwu nke 44.

Jon: Ebe ahụ sịrị: “Ma n’ụbọchị ndị eze ahụ, Chineke nke eluigwe ga-eme ka otu alaeze nke a na-agaghị ebibi ebibi malite ịchị. A gaghịkwa enyefe ndị ọ bụla ọzọ alaeze ahụ. Ọ ga-egwepịa alaeze ndị a niile, mee ka ha ghara ịdịkwa, ma ya onwe ya ga-adịru mgbe ebighị ebi.”

Kelvin: I meela. Ì chere na amaokwu a na-ekwu banyere Alaeze Chineke?

Jon: Amaghị m.

 Kelvin: Ị̀ hụrụ na amaokwu a kwuru na Alaeze Chineke “ga-adịru mgbe ebighị ebi”? Ọ bụ naanị Alaeze Chineke ka anyị nwere ike ikwu na ọ ga-adịru mgbe ebighị ebi. Ka ànyị ga-asịnụ na ọchịchị ụmụ mmadụ ga-adịru mgbe ebighị ebi?

Jon: Mbanụ!

Kelvin: E nwere amụma ọzọ e dere n’akwụkwọ Daniel nke kwuru banyere Alaeze Chineke. E dere ya na Daniel 7:13, 14. Ebe ahụ kwuru gbasara eze ga-achị n’Alaeze Chineke n’ọdịnihu, sị: “E wee nye ya ọchịchị na ùgwù na alaeze, ka ndị dị iche iche, mba dị iche iche na ndị na-asụ asụsụ dị iche iche na-ejere ya ozi. Ọchịchị ya bụ ọchịchị na-adịru mgbe ebighị ebi nke na-agaghị agabiga agabiga, alaeze ya bụkwa nke a na-agaghị ebibi ebibi.” Olee ihe e kwuru n’amụma a nke anyị kwutụrụla okwu ya?

Jon: Ọọ alaeze.

Kelvin: Ọọ ya. Ma, ọ bụghị alaeze ọ bụla ka ọ na-ekwu. Leenụ ihe ebe ahụ kwuru. Ọ sịrị na Alaeze ahụ ga-achị “ndị dị iche iche, mba dị iche iche na ndị na-asụ asụsụ dị iche iche.” Ihe ọ pụtara bụ na Alaeze ahụ ga-achị ụwa niile.

Jon: Amaghị m na ọọ ihe ebe a na-ekwu. Ma, ihe i kwuru bụ eziokwu.

Kelvin: Leekwa ihe ọzọ amụma ahụ kwuru: “Ọchịchị ya bụ ọchịchị na-adịru mgbe ebighị ebi nke na-agaghị agabiga agabiga, alaeze ya bụkwa nke a na-agaghị ebibi ebibi.” Ị̀ chọpụtara na ihe e kwuru ebe a na ihe e kwuru na Daniel 2:44 bụ otu?

Jon: Ee, ha bụ otu.

Kelvin: Ka anyị lebagharịa anya n’ihe ndị anyị kwurula. Ihe mere e ji buo amụma ahụ e dere na Daniel isi 4 bụ ka ndị mmadụ mata na “Onye Kasị Elu bụ Onye Na-achị Achị n’alaeze ụmụ mmadụ.” Nke a gosiri na amụma ahụ ga-emezu ọzọ. Otú ọ ga-esi emezu na nke ugboro abụọ ya ga-akarị otú o si mezuo n’isi Nebukadneza. N’akwụkwọ Daniel, e kwuru otú Alaeze Chineke nke Jizọs ga-abụ eze ya ga-esi malite ịchị. Ugbu a, ọ bụrụ na anyị ekwuo na e nwere ihe gbasara amụma a e dere na Daniel isi 4 na Alaeze Chineke, í cheghị na anyị kwutere ya?

Jon: Echere m otú ahụ. Ma, aghọtabeghị m otú o si gbasa afọ 1914.

“KA OGE ASAA GABIGA”

Kelvin: Nsogbu adịghị. Ma, ì chetara ihe anyị kwuburu banyere Eze Nebukadneza? Ọ bụ ya ka osisi ahụ e gbuturu nọchiri anya ya mgbe amụma ahụ mezuru na nke mbụ ya. Osisi ahụ e gbuturu ma hapụ ya ka oge asaa gafee nọchiri anya ọchịchị ya nke kwụsịtụrụ mgbe ara gbara ya ruo oge asaa. Oge asaa ahụ gwụrụ mgbe anya doro Nebukadneza, ya amalitekwa ịchị. Otú amụma a ga-esi emezu na nke ugboro abụọ ya bụ na a ga-enwe mgbe ọchịchị Chineke ga-akwụsịtụ ịchị. Ma, ihe mere ọ ga-eji akwụsịtụ ịchị abụghị na ike ụmụ mmadụ akarịala nke Chineke.

Jon: Olee ihe mere i ji kwuo otú ahụ?

Kelvin: E nwere ike ikwu na ndị eze nọ na Jeruselem chịa Izrel n’oge ochie nọ “n’ocheeze Jehova.” * Ha nọchitere anya Chineke mgbe ha na-achị ụmụ Izrel. N’ihi ya, e nwere ike ikwu na ọchịchị ndị eze ahụ bụ ọchịchị Chineke. Ma, ọtụtụ n’ime ndị eze ahụ mechara na-enupụrụ  Chineke isi. Ndị ha na-achị sokwa ha na-enupụrụ ya isi. Nnupụisi ha mere ka Chineke kwe ka ndị Babịlọn merie ha n’agha n’afọ 607 Tupu Oge Ndị Kraịst. Malite mgbe ahụ gawa, e nweghịzi eze nọ na Jeruselem na-anọchite anya Jehova. Ọ bụ otú a ka ọchịchị Chineke si kwụsịtụ n’oge ahụ. Ihe ndị a m kọwara hà doro gị anya?

Jon: Ee, ha doro m anya.

Kelvin: Ọ bụ n’afọ 607 Tupu Oge Ndị Kraịst ka oge asaa ahụ bidoro, ọ bụkwa mgbe ahụ ka ọchịchị Chineke kwụsịtụrụ. Mgbe oge asaa ahụ gachara, Chineke họpụtara eze ọhụrụ ga-anọchi anya ya, ma eze ahụ ga-esi n’eluigwe na-achị. Ọ bụ mgbe ọ ga-achịwa ka amụma ndị ọzọ anyị gụrụ n’akwụkwọ Daniel ga-emezu. Ajụjụ bụzi: Olee mgbe oge asaa ahụ gwụrụ? Azịza ajụjụ a ga-eme ka anyị mata mgbe Alaeze Chineke bidoro ịchị.

Jon: Èee? Ya bụ na ọ bụ n’afọ 1914 ka oge asaa ahụ gwụrụ?

Kelvin: Ọọ ya. I kwutere ya.

Jon: Ma, oleekwanụ otú o si bụrụ 1914?

Kelvin: Mgbe Jizọs na-ekwusa ozi ọma n’ụwa, ihe o kwuru gosiri na oge asaa ahụ agwụbeghị. * Ọ bụ ya mere o ji bụrụ na oge ahụ dị ogologo. Oge asaa ahụ bidoro ọtụtụ narị afọ tupu Jizọs abịa n’ụwa, ọ gwụghịkwa ozugbo ọ laghachiri n’eluigwe. Cheta na amụma dị iche iche dị n’akwụkwọ Daniel agaghị edocha ndị mmadụ anya ruo “n’oge ikpeazụ.” * Malite n’afọ 1879, ndị ji obi ha niile na-amụ Baịbụl bidoro ịmụsi Baịbụl ike ka ha ghọta amụma a na amụma ndị ọzọ e buru n’akwụkwọ Daniel. Ha bidoro ịghọta na oge asaa ahụ ga-agwụ n’afọ 1914. Ihe ndị merela n’ụwa kemgbe afọ 1914 gosiri na ọ bụ n’afọ ahụ ka Alaeze Chineke malitere ịchị n’eluigwe. Ọ bụkwa n’afọ ahụ ka oge ikpeazụ bidoro. Ama m na ihe niile a agaghị edocha gị anya otu mgbe.

Jon: Ọọ eziokwu. Ahụla m na m kwesịrị ịgụgharị ihe ndị a ọzọ ka m ghọta ha nke ọma.

Kelvin: Nsogbu adịghị. O wekwara m ezigbo oge tupu mụ amata ihe amụma ndị a pụtara na mgbe ha mezuru. Ma, ama m na ụka a anyị kpara emeela ka i kweta na ihe niile Ndịàmà Jehova na-akụzi gbasara Alaeze Chineke si na Baịbụl.

Jon: Ekwetala m. Obi dị m ụtọ na ihe niile unu na-akụzi si na Baịbụl.

Kelvin: Achọpụtara m na ọ na-agụkwa gị agụụ ime ihe Baịbụl kwuru. Dị ka m kwuru, ihe a bụ ihe ọhụrụ i kwesịrị iji nwayọọ mụọ. O nwekwara ike ịbụ na e nwere ajụjụ ndị ọzọ ị ka chọrọ ịjụ. Dị ka ihe atụ, anyị kwuru na oge asaa ahụ gbasara Alaeze Chineke nakwa na o bidoro n’afọ 607 Tupu Oge Ndị Kraịst. Ma, olee otú anyị si mara na oge asaa ahụ gwụrụ n’afọ 1914? *

Jon: Ọ dị ka ị ma na ọọ ihe m chọrọ ịjụ gị.

Kelvin: Ọ bụ Baịbụl ga-eme ka anyị mata otú oge asaa ahụ hà n’ogologo. Ị̀ ga-achọ ka anyị kpaa ya ma m bịaghachi? *

Jon: Nsogbu adịghị.

È nwere ihe Baịbụl kwuru na-edoghị gị anya? Ka è nwere ihe Ndịàmà Jehova kweere ma ọ bụ ihe ha na-eme nke ị na-aghọtaghị? Ọ bụrụ na e nwere, jụọ ya Onyeàmà Jehova ọ bụla ị hụrụ. Obi ga-atọ Onyeàmà Jehova ahụ ụtọ ka gị na ya kpaa ya.

^ para. 5 Ndịàmà Jehova na-akụziri ndị agbata obi ha Baịbụl n’anaghị ha ego. Ha na ndị agbata obi ha na-ekwurịta isiokwu dị iche iche si na Baịbụl.

^ para. 21 Gụọ isi nke 9 n’akwụkwọ bụ́ Gịnị n’Ezie Ka Bible Na-akụzi? Ọ bụ Ndịàmà Jehova bipụtara ya.

^ para. 63 Jizọs buru amụma gbasara oge ikpeazụ, sị: “Ndị mba ọzọ ga-azọ Jeruselem [nke nọchiri anya ọchịchị Chineke] ụkwụ, ruo mgbe oge a kara aka nke ndị mba ọzọ ga-ezu.” (Luk 21:24) Ihe ọ pụtara bụ na oge asaa ahụ ọchịchị Chineke kwụsịtụrụ ịchị agwụbeghị n’oge Jizọs nọ n’ụwa, ọ ga-adịgidekwa ruo n’oge ikpeazụ.

^ para. 67 Gụọ Ihe Odide Ntụkwasị “1914—Afọ Dị Ịrịba Ama n’Amụma Bible” n’akwụkwọ bụ́ Gịnị n’Ezie Ka Bible Na-akụzi?

^ para. 69 N’isiokwu ọzọ, anyị ga-ekwu otú ihe e dere na Baịbụl ga-esi eme ka anyị mata otú oge asaa ahụ hà n’ogologo.

GỤKWUO GBASARA YA

Olee Mgbe Alaeze Chineke Malitere Ịchị? (Agba nke Abụọ)

Amụma e dere na Baịbụl na nrọ Chineke mere ka eze Babịlọn rọọ mere ka anyị mata afọ ọ malitere ịchị.

Ajụjụ Ndị A Na-ajụkarị Gbasara Ndịàmà Jehova

Chọpụta otú e si zaa ajụjụ ụfọdụ ndị mmadụ na-ajụkarị gbasara anyị.