Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

ỤLỌ NCHE SEPTEMBA 2014

Peshitta Siriak Mere Ka A Ghọtakwuo Baịbụl Ndị A Sụgharịrị n’Oge Gboo

Peshitta Siriak Mere Ka A Ghọtakwuo Baịbụl Ndị A Sụgharịrị n’Oge Gboo

N’afọ 1892, ụmụ ejima aha ha bụ Agnes Smit Lewis na Magaret Dọnlọp Gibsin ji kamel gaa njem abalị itoolu n’ọzara tupu ha erute n’ụlọ ndị mọnk a na-akpọ Sent Katrịn, nke dị n’ala ala Ugwu Saịnaị. Gịnị mere ụmụ nwaanyị a ruwerela afọ iri ise ji gawa ebe ahụ ebe ọ bụ na ịga ebe ahụ n’oge ahụ dị ize ndụ? Azịza ajụjụ a nwere ike ime ka obi sikwuo gị ike na ihe ndị dị na Baịbụl bụ eziokwu.

Agnes Smit Lewis na ụlọ ndị mọnk a na-akpọ Sent Katrịn

OBERE oge tupu Jizọs alaghachi n’eluigwe, ọ gwara ndị na-eso ụzọ ya ka ha gbaa àmà banyere ya “ma na Jeruselem ma na Judia dum nakwa na Sameria, ruokwa n’ebe kasị anya n’ụwa.” (Ọrụ Ndịozi 1:8) Ndị na-eso ụzọ Jizọs ji obi ha niile rụọ ọrụ a. Obi sikwara ha ike mgbe ha na-arụ ya. Ma ọrụ a kpataara ha nsogbu na Jeruselem, meekwa ka e gbuo Stivin. Ọtụtụ ndị na-eso ụzọ Jizọs gbagara n’Antiọk nke Siria. Antiọk so n’obodo ndị kacha buo ibu n’Alaeze Ukwu Rom. Isi na Jeruselem gaa Antiọk dị narị kilomita ise na iri ise.—Ọrụ Ndịozi 11:19.

Mgbe ndị na-eso ụzọ Jizọs gbagara n’Antiọk, ha akwụsịghị izi ndị mmadụ “ozi ọma” banyere Jizọs. Ọtụtụ ndị na-abụghị ndị Juu ghọkwara Ndị Kraịst. (Ọrụ Ndịozi 11:20, 21) Ọ bụ Grik ka ọtụtụ ndị na-asụ n’Antiọk. Ma n’obodo ndị ọzọ gbara Antiọk gburugburu, ndị mmadụ na-asụ Siriak.

A SỤGHARỊRỊ ỤFỌDỤ AKWỤKWỌ DỊ N’AKWỤKWỌ NSỌ GRIK N’ASỤSỤ SIRIAK

Mgbe ndịozi Jizọs nwụchara, e nwekwuru ọtụtụ Ndị Kraịst na-asụ Siriak. Ọ bụ ya mere e ji kwesị ịsụgharị Baịbụl n’asụsụ Siriak. N’ihi ya, ọ dị ka ọ̀ bụ Siriak bụ asụsụ mbụ a sụgharịrị ụfọdụ akwụkwọ dị n’Akwụkwọ Nsọ Grik, ọ bụghị Latịn.

 N’ihe dị ka afọ 170, onye Siria na-ede akwụkwọ aha ya bụ Teshan (ọ dịrị ndụ malite n’afọ 120 ruo 173) wekọtara Oziọma Matiu, Mak, Luk, na Jọn ma bipụta ha n’asụsụ Grik ma ọ bụ Siriak ka ha bụrụ otu akwụkwọ. Ọ kpọrọ akwụkwọ ahụ aha Grik bụ́ Diatessaron. Diatessaron pụtara “o si n’Ozioma anọ.” Mgbe e mechara, otu onye Siria aha ya bụ Ifrem (ọ dịrị ndụ malite n’ihe dị ka afọ 310 ruo 373) dere akwụkwọ o ji kọwaa ihe e dere na Diatessaron. Akwụkwọ ahụ o dere gosiri na ọtụtụ Ndị Kraịst na-asụ Siriak gụrụ Diatessaron.

Diatessaron baara anyị ezigbo uru taa. N’ihi gịnị? Ọ bụ n’ihi na n’agbata afọ 1801 na 1900, ụfọdụ ndị ọkà mmụta kwuru na ọ bụ n’agbata afọ 130 na 170 ka e dere akwụkwọ Matiu, Mak, Luk, na Jọn, n’ihi ya, na ihe Oziọma anọ a kwuru gbasara Jizọs abụghị eziokwu. Ma ibé akwụkwọ Diatessaron ochie ndị a hụrụ gosiri na ndị bi n’ebe dị iche iche nwetara akwụkwọ Matiu, Mak, Luk, na Jọn tupu afọ 150. Nke a gosiri na ọ ga-abụ na e deela akwụkwọ anọ a tupu oge ahụ ndị ọkà mmụta kwuru. Ihe ọzọ bụ na Teshan leere anya n’akwụkwọ Matiu, Mak, Luk, na Jọn dee ihe ndị o dere na Diatessaron. Ọ bụ naanị ihe ole na ole o dere si n’akwụkwọ apọkrịfa ndị kọrọ gbasara Jizọs. Nke a gosiri na e wereghị akwụkwọ apọkrịfa ndị ahụ ka akwụkwọ ndị so na Baịbụl.

Peshitta Siriak nke nwere akwụkwọ ise mbụ dị na Baịbụl. E dere ya n’afọ 464. Ọ bụ ya bụ Baịbụl nke abụọ kacha ochie bu afọ e dere ya

N’agbata afọ 400 na afọ 500, Baịbụl ọtụtụ ndị na-agụ n’ebe ugwu Mesopotemia bụ Baịbụl e dere n’asụsụ Siriak. Ọ ga-abụ na a sụgharịrị ya n’agbata afọ 100 na afọ 300. Akwụkwọ niile e nwere na Baịbụl dị na ya ma e wepụ Pita nke Abụọ, Jọn nke Abụọ, Jọn nke Atọ, Jud, na Mkpughe. Aha Baịbụl ahụ a sụgharịrị n’asụsụ Siriak bụ Peshitta. Peshitta pụtara “Ọ Dị Mfe” ma ọ bụ “O Doro Anya.” Peshitta so na Baịbụl ndị kacha ochie gosiri na ọtụtụ ndị nwetara Baịbụl n’oge ochie.

Otu n’ime Baịbụl Peshitta ochie bu oge e dere ya. Oge ahụ dabara n’afọ 459 na 460. Ọ bụ ya kacha ochie na Baịbụl ndị bu afọ e dere ha. N’ihe dị ka afọ 508, e dezigharịrị ihe na Peshitta, tinyekwa akwụkwọ ise ahụ na-adịghị na ya. A kpọwaziri ya Philoxenian Version.

A CHỌTARA BAỊBỤL SIRIAK NDỊ ỌZỌ

Tupu afọ 1900, ọ fọrọ obere ka ọ bụrụ na Akwụkwọ Nsọ Grik niile e nwere bụ ndị e dere n’agbata afọ 400 na afọ 500 ma ọ bụ mgbe afọ ndị a gachara. Ọ bụ ya mere na ndị ọkà mmụta anaghị eji Baịbụl ndị merela ezigbo ochie egwu egwu, dị ka nke Latịn a na-akpọ Vulgate na nke Siriak a na-akpọ Peshitta. N’oge ahụ, ụfọdụ ndị chere na Baịbụl Peshitta bụ Baịbụl Siriak ochie e dezigharịrị edezigharị. Ma e nweghị Baịbụl Siriak a hụrụ bu Peshitta ụzọ. Ebe ọ bụ na e bidoro inwe Baịbụl n’asụsụ Siriak n’agbata afọ 100 na afọ 200, ọ pụtara na a hụ Baịbụl Siriak e dere n’oge ahụ, ọ ga-eme ka a ghọta ihe ndị dị na Baịbụl n’oge gboo. Ọ ga-abakwara ndị ọkà mmụta Baịbụl ezigbo uru. Ma, Baịbụl Siriak ahụ ọ̀ dịnụ? À ga-ahụ ya?

Ihe a bụ Baịbụl Siriak Saịnaị. Ihe e dere n’akụkụ ya bụ ihe si n’akwụkwọ Matiu, Mak, Luk, na Jọn. Ma e hichara ya dee ya ihe ọzọ

Eenụ! A hụdịrị Baịbụl Siriak abụọ. Nke mbụ a hụrụ malitere ịdị n’agbata afọ 400 na afọ 500. O so n’ọtụtụ akwụkwọ Siriak ndị na-arụ n’Ebe A Na-edebe Ihe Ochie na Briten nwetara n’afọ 1842. Ha si n’ụlọ ndị mọnk dị n’otu ọzara dị n’Ijipt nweta ha. Ihe a kpọrọ ya bụ Siriak Kuretọn n’ihi na ọ bụ Wiliam Kuretọn chọtara ya ma bipụta ya. William Kuretọn bụ osote onye na-elekọta Ebe A Na-edebe Ihe Ochie na Briten. Otú Oziọma anọ ahụ si gbaa na Siriak Kuretọn bụ: Matiu, Mak, Jọn, na Luk.

A na-akpọ Baịbụl Siriak nke abụọ a hụrụ Siriak Saịnaị. Ọ bụ otu n’ime ụmụ ejima ahụ a kọrọ akụkọ ha ná mmalite isiokwu a chọtara ya. Ọ bụ eziokwu na Agnes agaghị mahadum, ọ mụtara asụsụ asatọ na-abụghị asụsụ obodo ya. Otu n’ime ha bụ Siriak. N’afọ 1892, Agnes chọtara Baịbụl Siriak Saịnaị n’ụlọ ndị mọnk dị na Sent Katrịn, n’Ijipt.

 Agnes chọtara ya n’otu kọbọd gbara itiri. O kwuru, sị: ‘Ọ dịtụdịghị mma n’anya, o ruru unyi, ọ fọkwara obere ka ọ bụrụ na ibé akwụkwọ ya niile nyakọtara anyakọta maka na ọ nọọla ọtụtụ narị afọ n’enweghị onye meghere ya.’ E deburu ihe n’ibé akwụkwọ ndị ahụ, hichasịa ha ma jirizie asụsụ Siriak dee gbasara ụmụ nwaanyị ndị Sent na ha. Agnes hụrụ ihe ụfọdụ e deburu na ya, hụkwa na e dere n’elu ya, “nke Matiu,” “nke Mak,” ma ọ bụ “nke Luk.” Ọ fọrọ obere ka ọ bụrụ na Baịbụl Siriak ahụ ọ hụrụ nwere Matiu, Mak, Luk, na Jọn zuru ezu na ya. Ndị ọkà mmụta kwuru na e dere akwụkwọ ahụ n’agbata afọ 360 na afọ 400.

Siriak Saịnaị so na Baịbụl ndị kacha mkpa a hụtụrụla. Ndị nke ọzọ yiri ya e nwere n’asụsụ Grik bụ Codex Sinaiticus na Codex Vaticanus. Ọtụtụ ndị kweere ugbu a na ọ bụ n’Oziọma Matiu, Mak, Luk, na Jọn ochie ahụ a sụgharịrị n’asụsụ Siriak n’ihe dị ka n’agbata afọ 160 na afọ 230 ka e si lere anya dee Baịbụl ahụ a kpọrọ Siriak Kuretọn na nke a kpọrọ Siriak Saịnaị.

“OKWU CHINEKE ANYỊ GA-ADỊGIDE RUO MGBE EBIGHỊ EBI”

Akwụkwọ Baịbụl ndị a anyị kwuru okwu ha hà ga-abara ndị na-amụ Baịbụl n’oge a uru? Ee. Ka anyị jiri ihe ahụ a sịrị bụ́ mmechi dị ogologo dị n’Oziọma Mak maa atụ. Na Baịbụl ụfọdụ, ọ malitere na Mak 16:9. Ọ dị na Codex Alexandrinus nke asụsụ Grik e bipụtara n’agbata afọ 400 na 500, dịrịkwa na nke Latịn, bụ́ Vulgate, nakwa ná ndị ọzọ. Ma, akwụkwọ Baịbụl Grik ndị malitere ịdị n’agbata afọ 300 na afọ 400, ndị bụkwa e jewe a kpọtụrụ, ya bụ, Codex Sinaiticus na Codex Vaticanus kwụsịchara na Mak 16:8. Baịbụl Siriak Saịnaị ebughịkwa mmechi ahụ dị ogologo. Ihe ndị a gosiri na ọ dịbughị n’Oziọma Mak, kama na e tinyere ya ka oge na-aga.

Ihe atụ ọzọ bụ na n’ihe dị ka narị afọ abụọ gara aga, ọ fọrọ obere ka ọ bụrụ na Baịbụl niile e nwere tinyere ihe na-abụghị eziokwu na 1 Jọn 5:7. Ndị tinyere ya chọrọ igosi na nkụzi Atọ n’Ime Otu bụ eziokwu. Ma ihe ahụ e tinyere adịghị na Baịbụl Grik ndị kacha ochie. Ọ dịghịkwa na Peshitta. Nke a gosiri na ihe ahụ e tinyere na 1 Jọn 5:7 gwagburu ihe dị na Baịbụl.

O doro anya na Jehova Chineke mezuru ihe o kwere ná nkwa nke bụ́ na ya agaghị ekwe ka ihe ọ bụla mee Okwu ya dị nsọ. Baịbụl sịrị: “Ahịhịa ndụ akpọnwụwo, okooko ya achanwụwo; ma okwu Chineke anyị ga-adịgide ruo mgbe ebighị ebi.” (Aịzaya 40:8; 1 Pita 1:25) Baịbụl Peshitta so mee ka Okwu Chineke a na-agwagbughị agwagbu ruo ndị mmadụ aka.