Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

ỤLỌ NCHE SEPTEMBA 2014

 AKỤKỌ NDỤ

Ndụ M M Ji Jeere Chineke Ozi Baara M Uru

Ndụ M M Ji Jeere Chineke Ozi Baara M Uru

Kemgbe m dị obere, otú ndị mmadụ si akpọ ndị agbụrụ ọzọ asị na-enye m nsogbu n’obi. Ihe ọzọ na-enye m nsogbu bụ na ọ na-adị m ka o nweghị ihe m ga-emetali ná ndụ. Abụkwa m onye ihere. M bidoro ịga chọọchị Katọlik dị n’obodo anyị ka ha nyere m aka ka m ghọta Baịbụl n’ihi na m tụrụ anya na Baịbụl ga-akasi m obi. Ma, o nweghị aka ha nyeere m. M bidoziri ime egwuregwu.

Mgbe obere oge gachara, m bidoro iso ndị na-emega ahụ́ na ndị na-apa ígwè dị arọ ka ha nwee akpụ obi. M mechara mepee ebe ndị mmadụ na-abịa emega ahụ́ ma na-apa ígwè ka ha nwee akpụ obi. Ọ bụ na San Liandro, nke dị na Kalịfọnịa, Amerịka, ka m mepere ya. Mụ na ọtụtụ ndị akpụ obi rụkọrọ ọrụ, ma onye nke gbara onye mbụ ná ndị kacha nwee akpụ obi n’Amerịka. M mechara nwee akpụ obi, ma o meghị ka ọ dị m ka ndụ m ọ̀ bara uru.

ACHỌTARA M IHE M NA-ACHỌ

E nwere otu enyi m nwoke mụ na ya na-arụ ọrụ. Ọ ma na m chọrọ ịghọta Baịbụl. Ọ gwara m na e nwere onye ya ma ga-akụziri m Baịbụl. N’ụtụtụ echi ya, Onyeàmà Jehova bịara n’ụlọ m. Mụ na ya nọrọ awa anọ, o jikwa Baịbụl zaa m ajụjụ niile m jụrụ ya. M gwara ya ka ọ bịaghachi ná mgbede ụbọchị ahụ. Mgbe ọ bịaghachiri, anyị mụrụ Baịbụl ruo etiti abalị. Ihe m mụtara tọrọ m ụtọ. M jụrụ ya ma m̀ nwere ike iso ya gaa ozi ọma echi ya ka m hụ otú o si ezi ozi ọma. Mgbe anyị gara, otú o si jiri Baịbụl zaa ndị mmadụ ajụjụ ha jụrụ ya tụrụ m n’anya. M kpebiri na ọ bụzi ihe m ga na-eme.

M hapụrụ ọrụ m soro Onyeàmà Jehova ahụ na-ekwusa ozi ọma oge niile gaa ozi ọma ọtụtụ ụbọchị. N’ọnwa Mee afọ 1948, e mere m baptizim ná mgbakọ e nwere n’ọgbọ egwuregwu a na-akpọ Kaụ Pales nke dị na San Fransisko, Kalịfọnịa. M mechakwara kwusawa ozi ọma oge niile n’afọ ahụ.

N’oge ahụ, m gwara Ndịàmà Jehova ka ha gaa zie mama m ozi ọma. Mgbe ha gara, ọ nabatara ha, mechaakwa ghọọ Onyeàmà Jehova. N’agbanyeghị na ndị ezinụlọ ya nyere ya nsogbu, o ji obi ya niile na-efe Jehova ruo mgbe ọ nwụrụ. E wepụ mama m, e nweghị onye ọzọ ghọrọ Onyeàmà Jehova n’ezinụlọ anyị.

OTÚ MỤ NA NWUNYE M SI MATA

N’afọ 1950, akwagara m na Grand Jọnkshọn nke dị na Kọlọrado. Ọ bụ ebe ahụ ka m nọ hụ Billie nwunye m. A mụrụ ya n’afọ 1928, ọ bụkwa n’oge ọ na-eto ka ihe siri ezigbo ike n’Amerịka. N’abalị ọ bụla, mama ya bụ́ Minnie na-eji mpanaka agụrụ ya Baịbụl. Mgbe Billie na-erula afọ anọ, ọ marala otú e si agụ ihe. O butekwara ọtụtụ akụkọ Baịbụl n’isi. N’ihe dị ka afọ 1948, mama ya na Ndịàmà Jehova bidoro ịmụ Baịbụl. Ọ mụtara na okwu a sụgharịrị “hel” n’ọtụtụ Baịbụl pụtara ili, ọ bụghị ebe a na-emekpa ndị mmadụ ahụ́. (Ekliziastis 9:5, 10) Minnie na di ya mechara ghọọ Ndịàmà Jehova.

N’afọ 1949, Billie pụtara kọleji ma mụsiwe Baịbụl ike. Kama ịbụ onye nkụzi, o nyefere Chineke ndụ ya. E mere ya baptizim ná mgbakọ mba niile nke Ndịàmà Jehova e mere n’afọ 1950 n’Ámá Egwuregwu  Yanki dị na Niu Yọk. Mgbe obere oge gachara, mụ na ya hụrụ ma lụọ, bidokwa ikwusa ozi ọma oge niile.

Ebe anyị bidoro ikwusa ozi ọma bụ n’ebe a na-akpọ Yujin nke dị na Oregọn. Anyị metakwara ọtụtụ ndị enyi. N’afọ 1953, anyị kwagara Grans Pas, nke dị n’Oregọn, ka anyị nyere otu ọgbakọ Ndịàmà Jehova nwere mmadụ ole na ole na-ekwusa ozi ọma aka. E mechara kpọọ anyị n’afọ ahụ ka anyị gaa gụọ akwụkwọ na klas nke iri abụọ na atọ n’ụlọ akwụkwọ Ndịàmà Jehova a na-akpọ Ụlọ Akwụkwọ Gilied, nke dị nso na Saụt Lansịn, Niu Yọk. Ọ bụ n’ụlọ akwụkwọ a ka a na-azụ ndị na-aga mba ọzọ ekwusa ozi ọma. Isi ebe ahụ gaa Niu Yọk Siti dị narị kilomita anọ.

OTÚ ANYỊ SI GAA OZI ỌMA NA BRAZIL

N’ọnwa Disemba afọ 1954, ya bụ, ọnwa ise anyị gachara Ụlọ Akwụkwọ Gilied, mụ na nwunye m bara ụgbọelu na-aga Brazil. Mgbe ụgbọelu ahụ gbara otu awa, otu injin ya nyụrụ ọkụ. Ma o fedatara n’ebe a na-akpọ Bamuda n’enweghị ihe mere onye ọ bụla. Ụgbọelu ahụ mechakwara fedata n’ike na Kuba. O were anyị awa iri atọ na isii ọzọ tupu anyị erute n’ụlọ ọrụ Ndịàmà Jehova dị na Rio de Jenero, Brazil.

Ụlọ Nzukọ Alaeze mbụ e nwere na Bauru, n’afọ 1955. Anyị na-akwụ onye nwe ya ụgwọ. Ọ bụ m dere ihe ahụ dị na saịn bọọdụ

Mgbe mụ na nwunye m nọrọ obere oge n’ebe ahụ, anyị na mmadụ abụọ ọzọ si mba ọzọ bịa Brazil izi ozi ọma gawara Bauru, nke dị na Saụ Paụlo, ka anyị nweta ụlọ ebe ndị na-ekwusa ozi ọma ná mba ọzọ ga-ebi. E nwere ihe karịrị iri puku mmadụ ise na Bauru. Ọ bụkwa anyị bụ Ndịàmà Jehova mbụ e nwere n’obodo ahụ.

Anyị bidoro ịga n’ụlọ ndị mmadụ na-ezi ha ozi ọma. Ma otu ụkọchukwu chọọchị Katọlik dị ebe ahụ bidoro inye anyị nsogbu ozugbo. Ọ na-abụ anyị gawa ozi ọma, ya esoro anyị na-agwa ndị mmadụ ka ha ghara ige anyị ntị. N’agbanyeghị ihe a ọ na-eme, izu ole na ole anyị bidoro izi ozi ọma n’ebe ahụ, otu ezinụlọ buru ibu anyị na-amụrụ Baịbụl bidoro iso anyị. E mechara mee ha baptizim. Ọ dịghị anya, ndị ọzọ kwetakwara ka anyị mụwara ha Baịbụl.

Otu onye ikwu ndị ezinụlọ a bụ onyeisi otu klọb a ma ama. M mere ndokwa ka anyị nọrọ n’ụlọ ezumezu ndị klọb ahụ nwee mgbakọ. Mgbe ụkọchukwu ahụ nụrụ ya, o siri ọnwụ na anyị agaghị anọ ebe ahụ. Onyeisi klọb ahụ gwara ndị òtù ya, sị: “Ma unu ekweghị ka ha nọrọ ebe a nwee mgbakọ a, mụ ahapụ unu.” Ha hapụziri anyị ka anyị nọrọ ebe ahụ nwee mgbakọ.

N’afọ na-eso ya, ya bụ, n’afọ 1956, a gwara anyị gaa mgbakọ distrikti na Santos nke dị na Saụ Paụlo. Ihe fọrọ obere ka ọ bụrụ Ndịàmà Jehova iri anọ nọ n’ọgbakọ anyị gbara ụgbọ okporo ígwè gaa mgbakọ ahụ. Mgbe anyị lọtara Bauru, m hụrụ akwụkwọ ozi e ziteere m. Akwụkwọ ozi ahụ kwuru na a họpụtala m ka m na-aga eleta ọgbakọ Ndịàmà Jehova. M mere otú ahụ na Brazil ruo ihe fọrọ obere ka ọ bụrụ afọ iri abụọ na ise. Ọrụ a mekwara ka m gaa ọtụtụ ebe na Brazil.

Naanị otu afọ anyị bịara Bauru, e nwee ìgwè mmadụ ji obi ha niile na-ekwusa ozi ọma

OTÚ ANYỊ SI KWUSAA OZI ỌMA

Ime njem na-enye nsogbu n’oge ahụ. N’agbanyeghị nke ahụ, ọ fọrọ ntakịrị ka anyị jiri ụkwụ, ígwè, bọs, na ụgbọ okporo ígwè gazuo mba ahụ. Otu n’ime obodo ndị anyị gara bụ Jaú nke dị na Saụ Paụlo. N’obodo ahụ, otu ụkọchukwu pụtara sị anyị:

“Unu ezila ‘atụrụ m’ ozi ọma.”

Anyị sịrị ya, “Ha abụghị nke gị. Ọ bụ Chineke nwe ha.”

Anyị mere ndokwa ka ndị mmadụ lee fim gosiri otú Ndịàmà Jehova si ekwusa ozi ọma n’ụwa niile. Aha fim ahụ bụ The New World Society in Action. Ma, ụkọchukwu ahụ gara kpọọ ìgwè mmadụ iwe ji ka ha bịa kụọ anyị ihe. Anyị gwara ndị uwe ojii ozugbo. Mgbe ụkọchukwu ahụ na ìgwè mmadụ ahụ rutere ebe anyị na-egosi fim ahụ, ndị uwe ojii tụgidere ha égbè. Fim ahụ tọrọ ndị bịara lee ya ụtọ.

 Ọ fọrọ obere ka ọ bụrụ na e nyere anyị nsogbu n’ebe niile anyị gara leta ọgbakọ. Dị ka ihe atụ, n’obodo a na-akpọ Brọsk, nke dị nso na Bluminaụ, Santa Katarina, anyị hụrụ ndị ọsụ ụzọ abụọ a na-enye ezigbo nsogbu n’ebe ha na-ekwusa ozi ọma. Ma otú ha si tachie obi mere ka e nwee ihe karịrị ọgbakọ iri isii n’ebe ahụ ugbu a ihe karịrị afọ iri ise gachara. E nwekwara ọmarịcha ụlọ mgbakọ n’obodo a na-akpọ Itajaí. Ọ dị nso n’ebe ahụ.

Otu ihe gbara ọkpụrụkpụ anyị mere n’oge anyị na-aga eleta ọgbakọ bụ na anyị so ụmụnna anyị hazie mgbakọ ukwu dị iche iche. Malite n’afọ 1975 ruo n’afọ 1977, a gwara m ka m bụrụ onye nlekọta mgbakọ distrikti ndị e mere ná nnukwu ámá egwuregwu a na-akpọ Morumbi. N’otu mgbakọ anyị nwere, anyị gwara ihe dị ka otu narị ọgbakọ e nwere n’ebe dị nso n’ámá egwuregwu ahụ ka ha nye anyị mmadụ iri iri ga-eso dowe ámá egwuregwu ahụ ọcha n’abalị ga-abọta ụbọchị mgbakọ ahụ.

Mgbe ndị bịara ebe ahụ gbaa bọl na-ala n’abalị ahụ, ụfọdụ n’ime ha nọ na-asị, “Legodị ụmụ nwaanyị a pechara mpe na azịza ha na ihe ha ji ehicha ala ụlọ.” Ma, mgbe ọ na-erula etiti abalị, ebe niile adịla ọcha. Onye na-elekọta ámá egwuregwu ahụ sịrị: “Ọ bụrụ ndị ọrụ m, ọ ga-ewe ha otu izu ịrụcha ọrụ a ununwa bụ́ Ndịàmà Jehova rụrụ awa ole na ole.”

ANYỊ LAGHACHIRI AMERỊKA

Papa m nwụrụ n’afọ 1980. Mgbe obere oge gachara, anyị laghachiri Amerịka lekọtawa mama m. O bi na Frimọnt dị na Kalịfọnịa. Anyị nwetara ọrụ ịna-ehicha ụlọ n’abalị. Anyị na-ekwusakwa ozi ọma oge niile ma na-akụziri ndị na-asụ Pọchugiiz bi ebe ahụ Baịbụl. Anyị mechara kwaga n’ebe a na-akpọ San Jọkin Vali. Anyị na-esi ebe ahụ aga ezi ndị na-asụ Pọchugiiz ozi ọma malite na Sakramento ruo Bekasfild. Ugbu a, e nwere ihe dị ka ọgbakọ iri ji asụsụ Pọchugiiz amụ ihe na Kalịfọnịa.

Mgbe mama m nwụrụ n’afọ 1995, anyị kwagara Flọrịda. Anyị nọ ebe ahụ lekọta papa nwunye m ruo mgbe ọ nwụrụ. Mama nwunye m nwụrụ n’afọ 1975. N’afọ 2000, anyị kwagara n’ebe ndịda Kọlọrado. Ebe ahụ dị ka ọzara, bụrụkwa ugwu ugwu. Anyị nọ ebe ahụ kwusaa ozi ọma oge niile. Ndị anyị na-ezi ozi ọma bụ ndị nwe ala Amerịka bi n’ebe a na-akpọ Navajo na Ute. Ọ dị mwute na nwunye m Billie nwụrụ na Febụwarị afọ 2014.

Obi dị m ezigbo ụtọ na m hụrụ Onyeàmà Jehova nke ji Baịbụl zaa m ọtụtụ ajụjụ m jụrụ ya n’ihe karịrị afọ iri isii na ise gara aga. Ihe kacha eme m obi ụtọ bụ na m mere nchọnchọ ka m mara ma ihe ndị ọ gwara m hà bụ ihe Baịbụl kwuru n’eziokwu. Ọ bụ ya mere m ji jiri ndụ m jewere Chineke ozi. O mekwara ka ndụ m baara m uru.