Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

ỤLỌ NCHE SEPTEMBA 2014

Iwu Chineke Nyere Ụmụ Izrel Ọ̀ Dị Mma?

Iwu Chineke Nyere Ụmụ Izrel Ọ̀ Dị Mma?

O NWERE mgbe ụlọikpe dị n’otu mba mara ụmụ nwoke abụọ ikpe ọnwụ maka na a sịrị na ha gburu mmadụ. Ma, ebubo a e boro ha bụ ebubo ụgha. Mgbe e mechara mata na aka ha dị ọcha, ndị ọkàiwu jisiri ike kpepụta otu n’ime ha nọ n’ụlọ mkpọrọ. Ma, o nweghị ihe ha nwere ike imere onye nke ọzọ n’ihi na e gbuola ya tupu a mata na aka ya dị ọcha.

Ebe ọ bụ na ndị ọkàikpe nwere ike ikpe ndị mmadụ ikpe mkpegbu, Baịbụl gwara ndị na-ekpe ikpe, sị: ‘Ikpe ziri ezi—ikpe ziri ezi ka unu ga-agbaso.’ (Diuterọnọmi 16:20) Ọ bụrụ na ndị ọkàikpe emee ihe a Baịbụl kwuru, ọ ga-abara ndị mmadụ uru. Chineke nyere ụmụ Izrel iwu ga-enyere ha aka ka ha na-ekpe ikpe ziri ezi ma ghara ịna-ele mmadụ anya n’ihu. Ka anyị leba anya n’ihe iwu Chineke nyere ụmụ Izrel kwuru iji mata ma ‘ụzọ ya niile hà bụ ikpe ziri ezi.’—Diuterọnọmi 32:4.

NDỊ IKPE BỤ “NDỊ IKOM MAARA IHE NA NDỊ NWERE UCHE MA NWEE AHỤMAHỤ”

Ọ bụrụ na ndị ọkàikpe ma nke a na-akọ n’ikpe ikpe, na-akwụwa aka ha ọtọ ma ghara ile mmadụ anya n’ihu mgbe ha na-ekpe ikpe, ọrụ ha na-abara ndị mmadụ uru. Iwu Chineke nyere ụmụ Izrel gosiri na ọ bụ ụdị ndị ikpe a ka Chineke chọrọ ka ha na-ekpe ikpe. N’oge ụmụ Izrel bidoro ịgagharị n’ala ịkpa, Chineke gwara Mozis ka ọ chọta “ndị ikom ruru eru, ndị na-atụ egwu Chineke, ndị ikom a pụrụ ịtụkwasị obi, ndị kpọrọ uru na-ezighị ezi asị” ka ha bụrụ ndị ikpe. (Ọpụpụ 18:21, 22) Mgbe afọ iri anọ gachara, o kwukwara ka a “chọta ndị ikom maara ihe na ndị nwere uche ma nwee ahụmahụ” ka ha na-ekpe ụmụ Izrel ikpe.—Diuterọnọmi 1:13-17.

N’oge Jehọshafat * na-achị Juda, o nyere ndị ikpe iwu, sị: “Lezienụ anya n’ihe unu na-eme, n’ihi na ọ bụghị mmadụ ka unu na-ekpere ikpe kama ọ bụ Jehova; ọ nọnyekwaara unu n’ikpe ikpe. Na-atụnụ egwu Jehova. Kpacharanụ anya n’ihe unu na-eme, n’ihi na ajọ omume ma ọ bụ ile mmadụ anya n’ihu ma ọ bụ iri ngarị adịghị n’ebe Jehova bụ́ Chineke anyị nọ.” (2 Ihe E Mere 19:6, 7) Ihe a Jehọshafat gwara ndị ikpe mere ka ha mata na ọ bụrụ na ịkpọasị ma ọ bụ anyaukwu emee ka ha kpee ikpe na-ezighị ezi, ha ga-aza Chineke ajụjụ maka nsogbu ha kpatara.

Mgbe ndị ikpe Izrel na-ekpe ikpe otú Chineke chọrọ, ahụ́ ruru ụmụ Izrel ala, ha ebirikwa n’udo. Iwu Chineke nyere ụmụ Izrel kwukwara ihe ga-enyere ndị ikpe aka ka ha na-ekpe ikpe ziri ezi, ọ bụrụgodị na ikpe ha na-ekpe tara akpụ. Olee ụfọdụ n’ime ihe ndị e kwuru n’iwu ahụ?

IHE NDỊ GA-EME KA E KPEE IKPE ZIRI EZI

Ọ bụ eziokwu na ndị a na-ahọpụta ka ha bụrụ ndị ikpe bụ ndị ma ihe na ndị ga-ekpeli ikpe, ha anaghị eji ọgụgụ isi ha na amamihe ha ekpe ikpe. Jehova Chineke gwara ha ihe ndị ga na-enyere ha aka ikpe ikpe ziri ezi. Ka anyị leba anya n’ihe ụfọdụ Chineke gwara ha.

Meenụ nchọpụta nke ọma. Chineke si n’aka Mozis gwa ndị ikpe Izrel, sị: “Mgbe unu na-anụrụ okwu ikpe n’etiti ụmụnne unu, kpeenụ ikpe n’ezi  omume.” (Diuterọnọmi 1:16) Ndị ikpe ga-ekpe ikpe ziri ezi ma ọ bụrụ na ha eburu ụzọ chọpụta otú ihe niile si mee. Ọ bụ ya mere Chineke ji gwa ha na ha ‘ga-achọgharị ma sie imi n’ala, jụọkwa ase nke ọma.’ Ọ bụrụ na a sịrị na mmadụ mere ihe ọjọọ, ndị ikpe ga-ejide n’aka na onye ahụ mere ihe ahụ n’eziokwu tupu ha ekpewe ya ikpe.—Diuterọnọmi 13:14; 17:4.

Nụrụnụ ihe ndị akaebe ga-ekwu. Mgbe ndị ikpe na-eme nchọpụta, ha kwesịrị ịnụ ihe ndị akaebe ga-ekwu. Iwu Chineke sịrị: “Naanị otu onye akaebe agaghị ebili gbagide mmadụ akaebe n’ihe metụtara njehie ọ bụla ma ọ bụ mmehie ọ bụla, n’ihe banyere mmehie ọ bụla o mere. N’ọnụ ndị akaebe abụọ ma ọ bụ n’ọnụ ndị akaebe atọ ka a ga-ama na okwu bụ eziokwu.” (Diuterọnọmi 19:15) Iwu Chineke gwakwara ndị ga-agba akaebe, sị: “Akọsala akụkọ na-abụghị eziokwu. Adọnyerela onye ajọ omume úkwù site n’ịghọ onye akaebe nke na-akpa nkata ime ihe ọjọọ.”—Ọpụpụ 23:1.

Ndị na-agba akaebe kwesịrị ikwu eziokwu. Ihe Chineke kwuru na a ga-eme onye gbara akaebe ụgha kwesịrị ime ka onye na-agba akaebe chebara onwe ya echiche. Chineke kwuru, sị: “Ndị ikpe ahụ ga-eme nchọpụta nke ọma, ọ bụrụ na onye akaebe ahụ bụ onye akaebe ụgha, ọ bụrụkwa na ọ bụ ebubo ụgha ka o boro nwanne ya, unu ga-eme ya kpọmkwem ihe ahụ ọ kpara nkata ime nwanne ya, ị ga-ekpochapụkwa ihe ọjọọ n’etiti unu.” (Diuterọnọmi 19:18, 19) Ọ bụrụ na mmadụ ghara ụgha n’ụlọikpe ka ọ nara onye ọzọ ala ya, a ga-anara yanwa ala nke ya. Ọ bụrụ na ọ ghara ụgha ka e gbuo onye aka ya dị ọcha, a ga-egbu yanwa. Ihe a Chineke kwuru ga-eme ka ndị na-agba akaebe na-ekwu eziokwu.

Unu elela mmadụ anya n’ihu. Ndị ikpe chọpụtachaa ihe niile merenụ, ha akparịta ya n’etiti onwe ha ka ha nwee ike bie ikpe. Ọ bụ mgbe ahụ ka ha kwesịrị icheta ihe a Chineke kwuru. Chineke sịrị: “Unu elela onye ọ na-enweghị ka ọ hà ya anya n’ihu mgbe  unu na-emeso ya ihe, unu enwela mmasị karị n’ebe onye ukwu nọ. Unu ga-ekpe mmadụ ibe unu ikpe ziri ezi.” (Levitikọs 19:15) N’ikpe ọ bụla ndị ikpe na-ekpe, ha ekwesịghị ile otú mmadụ dị n’anya ma ọ bụ ọkwá ya anya bie ikpe.

Ihe ndị a Chineke kwuru n’iwu o nyere ụmụ Izrel ọtụtụ narị afọ gara aga ga-abara ma ndị na-ekpe ikpe ma ndị na-agba akaebe n’oge a uru. Ọ bụrụ na ndị mmadụ ana-eme ihe Chineke kwuru n’iwu ya mgbe ha na-ekpe ikpe, o nweghị onye a ga-ekpe ikpe mkpegbu.

Ọ bụrụ na ndị mmadụ ana-eme ihe Chineke kwuru n’iwu ya mgbe ha na-ekpe ikpe, a gaghị na-ekpe ndị mmadụ ikpe mkpegbu

IKPE ZIRI EZI BAARA ỤMỤ IZREL URU

Mozis jụrụ ụmụ Izrel, sị: ‘Olee mba ukwu nke nwere ụkpụrụ na mkpebi ikpe ziri ezi dị ka iwu a dum m na-enye unu taa?’ (Diuterọnọmi 4:8) E nweghị mba ọzọ nwere ụdị iwu ahụ e nyere ụmụ Izrel. Mgbe Eze Sọlọmọn na-edebe iwu Jehova n’oge ọ bụ okorobịa, ndị ọ na-achị bi n’udo, ‘obi rukwara ha ala,’ ihe gazikwaara ha, ha ‘ana-eri ihe, na-aṅụkwa ihe ọṅụṅụ ma na-aṅụrị ọṅụ.’—1 Ndị Eze 4:20, 25.

Ọ dị mwute na ụmụ Izrel mechara hapụ idebe iwu Chineke. Chineke gwara Jeremaya onye amụma ka ọ gwa ha, sị: “Lee! Ha ajụwo okwu Jehova, olee ụdị amamihe ha nwere?” (Jeremaya 8:9) Ebe ọ bụ na ụmụ Izrel jụrụ iwu Jehova, Jeruselem ghọrọ “obodo na-awụfu ọbara,” “ihe arụ” ejukwa na ya. E mechara bibie Jeruselem, ya atọgbọrọ n’efu ruo afọ iri asaa.—Ezikiel 22:2; Jeremaya 25:11.

Aịzaya onye amụma dịrị ndụ n’oge nsogbu juru n’Izrel. Mgbe o chebaara ihe ndị merenụ echiche, o kwuru banyere Jehova Chineke na iwu ya, sị: “Mgbe ị na-ekpe ụwa ikpe, ọ bụ ezi omume ka ndị bi n’elu ala ga-amụta.”—Aịzaya 26:9.

Obi dị Aịzaya ụtọ na Chineke nyere ya mmụọ nsọ, ya ebuo amụma banyere ọchịchị Mesaya ahụ bụ́ Jizọs Kraịst, sị: “Ọ bụghị naanị ihe anya ya hụrụ ka ọ ga-eji na-ekpe ikpe, ọ gaghịkwa adọ aka ná ntị naanị dị ka ihe ntị ya nụrụ si dị. Ọ ga na-ekpe ndị ogbenye ikpe ezi omume, ọ ga na-enyekwa ịdọ aka ná ntị n’izi ezi n’ihi ndị dị umeala n’obi n’ụwa. Ọ ga-apịa ụwa ụtarị nke si n’ọnụ ya; ọ ga-ejikwa mmụọ nke egbugbere ọnụ ya gbuo onye ajọ omume.” (Aịzaya 11:3, 4) Ihe a bụ ihe ọma Mesaya ahụ bụ́ Eze ga-emere ndị niile ọ ga-achị.—Matiu 6:10.

^ para. 6 Aha a bụ́ Jehọshafat pụtara “Jehova Bụ Onyeikpe.”

GỤKWUO GBASARA YA

Olee Otú Iwu Chineke Si Abara Anyị Uru?

Jizọs kọwara ihe mere o ji dị mma ka Chineke na-eduzi anyị, kwuokwa banyere iwu abụọ kacha mkpa.