Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

ỤLỌ NCHE SEPTEMBA 2014

 ISIOKWU ỤLỌ NCHE A

Ndị Mmadụ Hà Ga-emebiru Ụwa A Otú Ọ Na-agaghịzi Ekwe Mmekwata?

Ndị Mmadụ Hà Ga-emebiru Ụwa A Otú Ọ Na-agaghịzi Ekwe Mmekwata?

“Otu ọgbọ na-ala, ọgbọ ọzọ na-abịakwa; ma ụwa na-adịru ọbụna mgbe ebighị ebi.”—Ọ BỤ SỌLỌMỌN, ONYE CHỊRỊ IZREL N’OGE OCHIE, KWURU IHE A. *

Ihe a Sọlọmọn kwuru gosiri na a gaghị eji ụmụ mmadụ na-anaghị adịte ndụ aka tụnyere ụwa anyị a na-enweghị ọgwụgwụ. Kemgbe ọtụtụ puku afọ, ọtụtụ ndị ebiela n’ụwa ma mechaa nwụọ, ma ụwa ka dịkwa. Ihe ndị na-eme ka ndị mmadụ dịrị ndụ ka dịkwa n’ụwa.

Kemgbe a lụchara Agha Ụwa nke Abụọ, otú ihe si na-agbanwe n’ụwa n’ike n’ike enweghị atụ. Kemgbe ihe dị ka afọ iri asaa gara aga, otú ndị mmadụ si eme njem, otú ha si ezirịta ozi, nakwa ihe ndị nkà na ụzụ mepụtarala emeela ka ihe kakwuoro ndị mmadụ mfe. Ọtụtụ ndị nweziri ihe ndị e ji ebi ndụ e cheburu na a gaghị enwe ike imepụta. Ndị bi n’ụwa amụbaakwala ihe fọrọ obere ka ọ bụrụ okpukpu atọ.

Ma, ihe ndị a akpatala ọtụtụ nsogbu. Otú ndị mmadụ si emebisị ihe ndị dị n’ụwa ugbu a na-aka njọ nke na n’oge na-adịghị anya, ihe ndị na-eme ka ụwa dị mma obibi ga-akwụsị ịrụ ọrụ nke ọma. Ụfọdụ ndị ọkà mmụta sayensị ekwuodịla na ọ bụ n’oge a ka ihe ụmụ mmadụ na-eme kacha akpa ụwa aka ọjọọ.

Baịbụl kwuru na e nwere oge ụmụ mmadụ ‘ga-ebibi ụwa.’ (Mkpughe 11:18) Ụfọdụ chere na ọ bụ ugbu a bụ oge ahụ. Ndị mmadụ hà ka ga-emebikwu ihe n’ụwa? Hà ga-emebiru ụwa otú ọ na-agaghịzi ekwe mmekwata?

È MEBIRUOLA ỤWA OTÚ Ọ NA-AGAGHỊ EKWE MMEKWATA?

Ndị mmadụ hà emebiruola ụwa otú ọ na-agaghị ekwe mmekwata? Ụfọdụ ndị ọkà mmụta sayensị sịrị na o siri ike ịmata nsogbu ihe ndị mmadụ na-emebi n’ụwa ga-akpata. N’ihi ya, ụjọ na-atụ ha na o nwere ike ịbụ na oge njinji ga-eji n’ụwa adịla nso, ya bụ, oge oké okpomọkụ na idei mmiri a na-enwe n’ụwa ga-aka njọ ma kpatara ndị mmadụ nsogbu.

Dị ka ihe atụ, n’ebe ndịda ụwa, e nwere nnukwu mmiri kpụkọrọ akpụkọ dị n’elu oké osimiri. Ụfọdụ ndị na-ekwu na ọ bụrụ na ụwa akwụsịghị ikpokwu ọkụ, e nwere oge ọ ga-eru a gaghịzi enwe ihe a ga-eme ka mmiri ahụ kpụkọrọ akpụkọ kwụsị ịgbaze. Ihe mere ha ji kwuo otú ahụ bụ na mmiri ahụ kpụkọrọ akpụkọ anaghị ekwe ka oké osimiri dị n’okpuru ya kporo ọkụ. Ma, ọ bụrụ na mmiri ahụ kpụkọrọ akpụkọ agbazee, o nweghịzi ihe ga-ekpuchi oké osimiri ahụ. Ebe ọ bụkwa na elu oké osimiri ahụ na-eji oji, ọ ga-ekporo ọkụ ngwa ngwa, mee ka mmiri ahụ kpụkọrọ akpụkọ na-agbazekwu. Ihe a nwere ike ịna-eme n’akwụsịghị akwụsị, meekwa ka oké osimiri ndị dị n’ụwa jubiga ókè ma kpatara ọtụtụ nde mmadụ ọdachi.

NDỊ MMADỤ NA-ERIKPỌ IHE NDỊ DỊ N’ỤWA

Ndị ọkachamara ekwuola ihe dị iche iche a ga-eme ka e gbochie njinji a sị ga-eji n’ụwa a n’ihi otú e sirila mebie ya. Otu n’ime ihe ndị ha na-eti mkpu ya kemgbe bụ ka ndị mmadụ na-echekwa ihe ndị dị n’ụwa, kama ịna-emebisị ha ebe ha na-achọ ka ha baa ọgaranya ma ọ bụ rụpụta ihe ọgbara ọhụrụ dị iche iche. Ihe a ha na-ekwu ò meela ka ihe dị mma?

Ọ dị mwute na nsogbu ndị mmadụ na-akpata n’ụwa n’ihi otú ha si emebisị ihe ndị dị na ya na-aka njọ. Otú e si erikpọ ihe ndị dị n’ụwa n’ike n’ike karịrị otú ụwa si emepụtaghachi ha. Ò nwere ihe a ga-eme ka nsogbu a kwụsị? Otu ọkachamara sịrị: “E nwere ike ikwu na anyị amaghị otú anyị ga-esi na-elekọta ụwa.” Ihe a o kwuru yiri ihe Baịbụl kwuru. Baịbụl sịrị: “Ọ dịrịghị mmadụ nke na-eje ije ọbụna iduzi nzọụkwụ ya.”—Jeremaya 10:23.

Ma, Baịbụl mere ka obi sie anyị ike na Chineke Onye kere ihe niile agaghị ekwe ka ndị mmadụ mebie ụwa a otú ọ na-agaghị ekwe mmekwata.  Abụ Ọma 115:16 kwuru, sị: “Ụwa ka [Chineke] nyere ụmụ mmadụ.” N’eziokwu, ụwa anyị a bụ “ezi onyinye” Chineke nyere anyị. (Jems 1:17) Chineke ọ̀ ga-enye ụmụ mmadụ ihe ọ ma ga-emebi emebi? Mba. Otú o si kee ụwa gosiri na ụwa agaghị emebi emebi.

IHE CHINEKE BU N’OBI KEE ỤWA

Akwụkwọ Jenesis gwara anyị otú Chineke si kee ụwa a ka ọ dị mma obibi. O kwuru na ná mmalite, “ọ dịghị ihe dị n’ụwa, ọ tọgbọ n’efu, ọchịchịrị gbakwara” na ya. O kwukwara na “mmiri” dị n’ụwa. Mmiri a ga-abara ihe ndị a ga-eke n’ụwa uru. (Jenesis 1:2) Chineke kwuziri “ka ìhè dị.” (Jenesis 1:3) O doro anya na anwụ bidoro ịchabata n’ụwa mgbe Chineke kwuchara ihe a, mee ka ìhè dị n’ụwa. Chineke mekwara ka e nwee ala akọrọ na oké osimiri. (Jenesis 1:9, 10) Ihe ọzọ merenụ bụ na ala malitere “ipupụta ahịhịa, ahịhịa ndụ nke na-amị mkpụrụ n’ụdị ya dị iche iche nakwa osisi ndị na-amị mkpụrụ.” (Jenesis 1:12) Ọ bụ otú ahụ ka Chineke si mee ka mmadụ na anụmanụ nwee ihe ndị ga-eme ka ha na-adị ndụ. Dị ka ihe atụ, o mere ka ahịhịa na-emepụta nri mmadụ na anụmanụ ga na-eri na ikuku ha ga na-ekuru. Gịnị mere Chineke ji kee ụwa otú a?

Aịzaya onye amụma kwuru na ọ bụ Chineke bụ “Onye kpụrụ ụwa na Onye kere ya, Onye mere ka o guzosie ike, onye na-ekeghị ya n’efu, onye kpụrụ ya ka e biri n’ime ya.” (Aịzaya 45:18) N’eziokwu, uche Chineke bụ ka ụmụ mmadụ biri n’ụwa ruo mgbe ebighị ebi.

Ọ dị mwute na ụmụ mmadụ na-emebi ụwa a Chineke nyere ha nke na ha chọziri ịla ya n’iyi. Ma, ihe Chineke bu n’obi kee ụwa agbanwebeghị. Otu nwoke dịrị ndụ n’oge ochie sịrị: “Chineke abụghị mmadụ nke na ọ ga-agha ụgha, ọ bụghịkwa nwa nke mmadụ nke na ọ ga-akwa ụta. Ọ bụrụ na o kwuo ihe, ọ́ gaghị eme ya?” (Ọnụ Ọgụgụ 23:19) N’eziokwu, Chineke agaghị ekwe ka ụmụ mmadụ laa ụwa a n’iyi. Kama n’oge na-adịghị anya, ‘ọ ga-ebibi ndị na-ebibi ụwa.’—Mkpughe 11:18.

ANYỊ GA-EBI N’ỤWA RUO MGBE EBIGHỊ EBI

Mgbe Jizọs Kraịst na-akụzi ihe n’elu ugwu, ọ sịrị: “Obi ụtọ na-adịrị ndị dị nwayọọ n’obi, n’ihi na ha ga-eketa ụwa.” (Matiu 5:5) Jizọs kwukwara ihe Chineke ga-eji eme ka ndị mmadụ kwụsị imebisị  ụwa a. Ọ gwara ndị na-eso ụzọ ya ka ha na-ekpe ekpere, sị: “Ka alaeze gị bịa. Ka uche gị meekwa n’ụwa, dị ka ọ na-eme n’eluigwe.” Alaeze Chineke, ya bụ, ọchịchị Chineke, ga-eme ka ihe Chineke bu n’obi kee ụwa mezuo.—Matiu 6:10.

Chineke kwuru otú Alaeze ya ga-esi eme ka ọtụtụ ihe gbanwee. Ọ sịrị: “Lee! Ana m eme ihe niile ka ha dị ọhụrụ.” (Mkpughe 21:5) Chineke ọ̀ ga-ewepụ ụwa a weta nke ọhụrụ? Mba, n’ihi na o nweghị ihe ụwa a mere. Ihe Chineke ga-eme bụ ibibi “ndị na-ebibi ụwa,” ya bụ, ọchịchị ụmụ mmadụ e nwere n’oge a. Chineke ga-ejizi “eluigwe ọhụrụ na ụwa ọhụrụ” dochie ọchịchị ụmụ mmadụ. Ihe ọ pụtara bụ na eluigwe ọhụrụ, ya bụ, Alaeze Chineke, ga-esi n’eluigwe na-achị ndị ezi omume bi n’ụwa.—Mkpughe 21:1.

Chineke ga-eme ka ihe ndị mmadụ mebiri n’ụwa dịghachi mma. Otu ọbụ abụ kwuru ihe Chineke ga-eme. Ọ sịrị: “I chewo ihu gị n’ebe ụwa dị, ka i wee mee ka ihe jupụta na ya; ị na-eme ka ihe jupụta n’ime ya.” Ebe ọ bụ na Chineke ga-agọzi ụwa, oké okpomọkụ na idei mmiri agakwaghị adị, ụwa ga-abụzi paradaịs ebe nri ga-abụ atụrụ tawa.—Abụ Ọma 65:9-13.

E nwere otu nwoke aha ya bụ Pyarelal. Ọ bụ odeakwụkwọ onyeisi okpukpe ndị India aha ya bụ Mohandas Gandhi. Ọ sịrị na mgbe Gandhi nọ ndụ, Gandhi kwuru na “ihe ụwa na-emepụta ga-ezuru onye ọ bụla nọ n’ụwa, ma e wezụga ndị anyaukwu.” Alaeze Chineke ga-ewepụ ihe kacha akpata nsogbu ndị e nwere n’ụwa. Otú ọ ga-esi ewepụ ya bụ ime ka ndị mmadụ gbanwee ndụ ọjọọ ha. Aịzaya onye amụma kwuru na mgbe Alaeze Chineke ga-achịwa ụwa, ndị mmadụ “agaghị emerụ ihe ọ bụla ahụ́, ha agaghịkwa emebi” ụwa na ụmụ mmadụ ibe ha. (Aịzaya 11:9) Ọtụtụ nde mmadụ si ebe dị iche iche n’ụwa amụwala ihe Chineke chọrọ ka ụmụ mmadụ na-eme. A na-akụziri ha ka ha hụ Chineke na ndị agbata obi ha n’anya, ka ihe ọma na-adị ha mma, ka ha na-elekọta ụwa, ka ha ghara imebisị ihe ndị dị n’ụwa, nakwa ka ha na-ebi ndụ otú gosiri na ha chọrọ ka ihe Chineke bu n’obi kee ụwa mezuo. Ha na-amụ ihe ndị a ka ha nwee ike ịdị ndụ n’ụwa mgbe ọ ga-aghọ paradaịs.—Ekliziastis 12:13; Matiu 22:37-39; Ndị Kọlọsi 3:15.

Chineke agaghị ekwe ka ụmụ mmadụ mebichaa ọmarịcha ụwa a o kere

Akwụkwọ Jenesis gwara anyị na mgbe Chineke kechara ihe, ọ “hụrụ ihe niile o mere, ma, lee! ha dị nnọọ mma.” (Jenesis 1:31) N’eziokwu, Chineke agaghị ekwe ka ụmụ mmadụ mebichaa ọmarịcha ụwa a o kere. Obi siri anyị ike na o nweghị ihe ga-eme ụwa a ebe ọ bụ Jehova Chineke, onye hụrụ anyị n’anya, nwe ya. O kwere anyị nkwa na “ndị ezi omume ga-enweta ụwa, ha ga-ebikwa n’elu ya ruo mgbe ebighị ebi.” (Abụ Ọma 37:29) Gbalịa ka i soro ná ndị Chineke ga-asị na ha bụ “ndị ezi omume,” bụ́ ndị ga-ebi n’ụwa ruo mgbe ebighị ebi.

^ para. 3 Ihe a o kwuru dị na Baịbụl, n’akwụkwọ Ekliziastis 1:4.

GỤKWUO GBASARA YA

Gịnị Bụ Agha Amagedọn?

Amagedọn gbara naanị otu ugbo na Baịbụl. Ma, e kwuru gbasara agha a n’ebe niile na Baịbụl.